1 Samuel 24 (BOICB)

1 Mgbe Sọl sitere nʼịlụso ndị Filistia agha lọta, a gwara ya sị, “Devid nọ nʼọzara En-Gedi.” 2 Sọl chịịrị puku ndị agha atọ a zụrụ nke ọma site nʼIzrel niile, pụọ ịchọ Devid na ndị ikom ya nʼetiti ọgba nkume, na nʼakụkụ ụzọ dị warawara nke Ewu Ọhịa. 3 Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ. 4 Ndị ikom Devid sịrị ya, “Ahaa ugbu a bụ oge gị! Taa bụ ụbọchị ahụ ONYENWE ANYỊ kwuru okwu ya, mgbe ọ sịrị, ‘Aghaghị m inyefe gị onye iro gị nʼaka, ka i mee ya dịka o si masị gị.’ ” Ma Devid ji nwayọọ gaa nso ebe Sọl nọ bipụ ọnụ ọnụ uwe mwụda ya. 5 Emesịa, obi Devid malitere ịma ya ikpe nʼihi na o bipụrụ ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl. 6 Ọ gwara ndị ya na ha so okwu sị, “ONYENWE ANYỊ ekwela na m ga-emeso nna m ukwu, onye ONYENWE ANYỊ tere mmanụ mmeso dị otu ahụ, maọbụ na m ga-eweli aka imegide ya. Nʼihi na onye ONYENWE ANYỊ tere mmanụ ka ọ bụ.” 7 Devid sitere nʼokwu ndị a o kwuru baara ndị so ya mba. O nyeghị ha ohere ibuso Sọl agha. Emesịa, Sọl hapụrụ ọgba nkume ahụ. 8 Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma Devid kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala. 9 Mgbe ahụ Devid gwara Sọl okwu sị, “Gịnị mere i ji na-aṅa ntị nʼokwu ndị mmadụ na-ekwu, ndị ahụ na-asị Devid na-achọ ụzọ ọ ga-esi merụọ gị ahụ? 10 Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. ONYENWE ANYỊ nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye ONYENWE ANYỊ tere mmanụ.’ 11 Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m. 12 Ka ONYENWE ANYỊ kpebie nʼetiti mụ na gị, ka ONYENWE ANYỊ bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka. 13 Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka. 14 “Ma onye kwanụ ka eze Izrel na-achọ ijide? Onye ka ọ na-atụfu oge ya ịchọgharị? Ọ bụ ozu nkịta? Ka ọ bụ akpị? 15 Ka ONYENWE ANYỊ bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.” 16 Mgbe Devid kwuchara okwu ndị a, Sọl zara sị ya, “Ọ bụ olu Devid nwa m dị nke ahụ?” Ọ malitekwara ịkwa akwa. 17 Ọ sịrị Devid, “Ị bụ ezi mmadụ karịa m, nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m. 18 E, i gosila m oke obi ebere taa, nʼihi na mgbe ONYENWE ANYỊ nyefere m nʼaka gị, ị gbughị m. 19 Ebee ka onye ahụ nọ nʼụwa niile, nke pụrụ ịhapụ onye iro ya mgbe ọ mara nʼọnya ya? Ka ONYENWE ANYỊ kwụghachi gị ezi ihe nʼihi obi ebere i gosiri m taa. 20 Ugbu a, amatala m na ị ghaghị ịbụ eze, ị ga-achịkwa alaeze Izrel. 21 Biko, ṅụọra m iyi nʼaha ONYENWE ANYỊ na mgbe oge ahụ ruru, na ị gaghị egbu ụmụ m, maọbụ hichapụ aha m site nʼezinaụlọ nna m.” 22 Devid ṅụụrụ Sọl iyi. Emesịa, Sọl laghachiri nʼụlọ ya, ma Devid na ndị ikom ya laghachiri nʼọgba nkume ha.

In Other Versions

1 Samuel 24 in the ANGEFD

1 Samuel 24 in the ANTPNG2D

1 Samuel 24 in the AS21

1 Samuel 24 in the BAGH

1 Samuel 24 in the BBPNG

1 Samuel 24 in the BBT1E

1 Samuel 24 in the BDS

1 Samuel 24 in the BEV

1 Samuel 24 in the BHAD

1 Samuel 24 in the BIB

1 Samuel 24 in the BLPT

1 Samuel 24 in the BNT

1 Samuel 24 in the BNTABOOT

1 Samuel 24 in the BNTLV

1 Samuel 24 in the BOATCB

1 Samuel 24 in the BOATCB2

1 Samuel 24 in the BOBCV

1 Samuel 24 in the BOCNT

1 Samuel 24 in the BOECS

1 Samuel 24 in the BOGWICC

1 Samuel 24 in the BOHCB

1 Samuel 24 in the BOHCV

1 Samuel 24 in the BOHLNT

1 Samuel 24 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 24 in the BOILNTAP

1 Samuel 24 in the BOITCV

1 Samuel 24 in the BOKCV

1 Samuel 24 in the BOKCV2

1 Samuel 24 in the BOKHWOG

1 Samuel 24 in the BOKSSV

1 Samuel 24 in the BOLCB

1 Samuel 24 in the BOLCB2

1 Samuel 24 in the BOMCV

1 Samuel 24 in the BONAV

1 Samuel 24 in the BONCB

1 Samuel 24 in the BONLT

1 Samuel 24 in the BONUT2

1 Samuel 24 in the BOPLNT

1 Samuel 24 in the BOSCB

1 Samuel 24 in the BOSNC

1 Samuel 24 in the BOTLNT

1 Samuel 24 in the BOVCB

1 Samuel 24 in the BOYCB

1 Samuel 24 in the BPBB

1 Samuel 24 in the BPH

1 Samuel 24 in the BSB

1 Samuel 24 in the CCB

1 Samuel 24 in the CUV

1 Samuel 24 in the CUVS

1 Samuel 24 in the DBT

1 Samuel 24 in the DGDNT

1 Samuel 24 in the DHNT

1 Samuel 24 in the DNT

1 Samuel 24 in the ELBE

1 Samuel 24 in the EMTV

1 Samuel 24 in the ESV

1 Samuel 24 in the FBV

1 Samuel 24 in the FEB

1 Samuel 24 in the GGMNT

1 Samuel 24 in the GNT

1 Samuel 24 in the HARY

1 Samuel 24 in the HNT

1 Samuel 24 in the IRVA

1 Samuel 24 in the IRVB

1 Samuel 24 in the IRVG

1 Samuel 24 in the IRVH

1 Samuel 24 in the IRVK

1 Samuel 24 in the IRVM

1 Samuel 24 in the IRVM2

1 Samuel 24 in the IRVO

1 Samuel 24 in the IRVP

1 Samuel 24 in the IRVT

1 Samuel 24 in the IRVT2

1 Samuel 24 in the IRVU

1 Samuel 24 in the ISVN

1 Samuel 24 in the JSNT

1 Samuel 24 in the KAPI

1 Samuel 24 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 24 in the KBV

1 Samuel 24 in the KJV

1 Samuel 24 in the KNFD

1 Samuel 24 in the LBA

1 Samuel 24 in the LBLA

1 Samuel 24 in the LNT

1 Samuel 24 in the LSV

1 Samuel 24 in the MAAL

1 Samuel 24 in the MBV

1 Samuel 24 in the MBV2

1 Samuel 24 in the MHNT

1 Samuel 24 in the MKNFD

1 Samuel 24 in the MNG

1 Samuel 24 in the MNT

1 Samuel 24 in the MNT2

1 Samuel 24 in the MRS1T

1 Samuel 24 in the NAA

1 Samuel 24 in the NASB

1 Samuel 24 in the NBLA

1 Samuel 24 in the NBS

1 Samuel 24 in the NBVTP

1 Samuel 24 in the NET2

1 Samuel 24 in the NIV11

1 Samuel 24 in the NNT

1 Samuel 24 in the NNT2

1 Samuel 24 in the NNT3

1 Samuel 24 in the PDDPT

1 Samuel 24 in the PFNT

1 Samuel 24 in the RMNT

1 Samuel 24 in the SBIAS

1 Samuel 24 in the SBIBS

1 Samuel 24 in the SBIBS2

1 Samuel 24 in the SBICS

1 Samuel 24 in the SBIDS

1 Samuel 24 in the SBIGS

1 Samuel 24 in the SBIHS

1 Samuel 24 in the SBIIS

1 Samuel 24 in the SBIIS2

1 Samuel 24 in the SBIIS3

1 Samuel 24 in the SBIKS

1 Samuel 24 in the SBIKS2

1 Samuel 24 in the SBIMS

1 Samuel 24 in the SBIOS

1 Samuel 24 in the SBIPS

1 Samuel 24 in the SBISS

1 Samuel 24 in the SBITS

1 Samuel 24 in the SBITS2

1 Samuel 24 in the SBITS3

1 Samuel 24 in the SBITS4

1 Samuel 24 in the SBIUS

1 Samuel 24 in the SBIVS

1 Samuel 24 in the SBT

1 Samuel 24 in the SBT1E

1 Samuel 24 in the SCHL

1 Samuel 24 in the SNT

1 Samuel 24 in the SUSU

1 Samuel 24 in the SUSU2

1 Samuel 24 in the SYNO

1 Samuel 24 in the TBIAOTANT

1 Samuel 24 in the TBT1E

1 Samuel 24 in the TBT1E2

1 Samuel 24 in the TFTIP

1 Samuel 24 in the TFTU

1 Samuel 24 in the TGNTATF3T

1 Samuel 24 in the THAI

1 Samuel 24 in the TNFD

1 Samuel 24 in the TNT

1 Samuel 24 in the TNTIK

1 Samuel 24 in the TNTIL

1 Samuel 24 in the TNTIN

1 Samuel 24 in the TNTIP

1 Samuel 24 in the TNTIZ

1 Samuel 24 in the TOMA

1 Samuel 24 in the TTENT

1 Samuel 24 in the UBG

1 Samuel 24 in the UGV

1 Samuel 24 in the UGV2

1 Samuel 24 in the UGV3

1 Samuel 24 in the VBL

1 Samuel 24 in the VDCC

1 Samuel 24 in the YALU

1 Samuel 24 in the YAPE

1 Samuel 24 in the YBVTP

1 Samuel 24 in the ZBP