2 Chronicles 20 (BOICB)

1 Mgbe oge nta gasịrị, eze ndị Moab na nke ndị Amọn, na ndị ọzọkwa, bịara ibuso Jehoshafat na ndị Juda agha. 2 Ụfọdụ ndị mmadụ bịara gwa Jehoshafat sị, “Lee, igwe usuu ndị agha na-abịa imegide gị site nʼEdọm, nakwa nʼofe osimiri Nnu (osimiri nwụrụ anwụ). Ha erutela Hazezọn Tama, ebe a na-akpọkwa En-Gedi.” 3 Jehoshafat tụrụ egwu nke ukwuu, kpebiekwa ịchọ inyeaka ONYENWE ANYỊ. Nʼihi nke a, ọ kpọsara obubu ọnụ nye ndị Juda niile. 4 Ndị Juda zukọtara ịchọ inyeaka ONYENWE ANYỊ; nʼezie, ha sitere nʼobodo niile nke Juda bịa ịchọ ihu ONYENWE ANYỊ. 5 Mgbe ahụ, Jehoshafat guzoro nʼetiti nzukọ ndị Juda na Jerusalem nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ nʼihu ogige ọhụrụ ahụ, 6 sị;“O ONYENWE ANYỊ, Chineke nna nna anyị ha, ọ bụghị gị bụ Chineke onye bi nʼeluigwe? Ọ bụkwa gị na-achị alaeze niile nke mba dị iche iche. Ike na ume dị nʼaka gị, ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzogide gị. 7 O Chineke anyị, ọ bụghị gị onwe gị chụpụrụ ndị bi nʼala, site nʼihu ndị gị Izrel, were ya nye ụmụ ụmụ Ebraham, bụ enyi gị nwoke? 8 Ha ebiela nʼime ya wukwaa ebe nsọ nʼime nye nʼAha gị na-asị, 9 ‘Ọ bụrụ na ihe ọjọọ adakwasị anyị, maọbụ mma agha, ma nke ikpe ọmụma, maọbụ ajọọ ọrịa na-efe efe, maọbụ oke ụnwụ, anyị ga-eguzo nʼihu gị nʼụlọnsọ a nke a kpọkwasịrị Aha gị, kpọkuo gị nʼime nsogbu anyị, gị onwe gị ga-aza anyị, zọpụtakwa anyị.’ 10 “Ugbu a lee, ndị ikom si Amọn, na Moab, na nʼugwu Sia, ndị ị na-ekweghị ka ndị Izrel banye nʼoke ala ha mgbe ha si nʼIjipt pụta, kama ha sitere nʼakụkụ ọzọ gabiga si otu a chebe ndị a ndụ. 11 Lee ihe ha ji akwụ anyị ụgwọ bụ ịchọ ka ha chụpụ anyị nʼala a i nyere anyị ka ọ bụrụ ihe nketa anyị. 12 O Chineke anyị, ọ bụ na ị gaghị ekpe ha ikpe? Nʼihi na ike adịghị nʼime anyị iguzogide igwe mmadụ ndị a bara ụba na-abịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị amakwaghị ihe anyị ga-eme, kama ọ bụ na gị ka anya anyị na-adịkwasị.” 13 Ndị ikom Juda niile, ha na ndị nwunye ha, na ụmụ ha, na ụmụntakịrị ha guzoro nʼihu ONYENWE ANYỊ. 14 Mgbe ahụ, mmụọ Nsọ ONYENWE ANYỊ dakwasịrị Jahaziel nwa Zekaraya, nwa Benaya, nwa Jeiel, nwa Matanaya, bụ onye Livayị, onye si nʼikwu Asaf, dịka o guzo nʼetiti mkpọkọta ahụ. 15 Ọ sịrị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda niile na ndị bi na Jerusalem, na gị eze Jehoshafat. Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ na-asị unu. ‘Unu atụla ụjọ, maọbụ daa mba, nʼihi usuu ndị agha a niile dị unu nʼihu. Ọ bụghị unu ka agha a dịịrị, kama ọ bụ Chineke nwe ya. 16 Echi pụọnụ izute ha. Ha ga arịgota site nʼụzọ warawara nrigo Ziz, unu ga-ahụ ha na nsọtụ ndagwurugwu dị tupu e ruo nʼọzara Jeruel. 17 Ọ bụghị unu ka ọ dịrị ịlụ agha a, kama werenụ ọnọdụ unu, guzosienụ ike ka unu jiri anya unu hụ nzọpụta ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-enye unu, unu ndị Juda na Jerusalem. Unu atụla egwu, unu adakwala mba. Pụkwuru ha nʼihu agha mgbe chi echi bọrọ, ONYENWE ANYỊ ga-anọnyekwara unu.’ ” 18 Mgbe ahụ, Jehoshafat, na ndị Juda na ndị Jerusalem niile dara nʼala kelee ONYENWE ANYỊ, kpọọ isiala nye ya. 19 Mgbe ahụ kwa, ndị Livayị si nʼagbụrụ Kohat na Kora jiri ike ha niile too ONYENWE ANYỊ Chineke Izrel nʼabụ. 20 Nʼisi ụtụtụ, ha pụrụ gawa nʼọzara Tekoa. Ma mgbe ha na-apụ, Jehoshafat guzoro ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem. Nweenụ okwukwe nʼime ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu, nwekwanụ ntụkwasị obi na ige ndị amụma ya ntị, ka ihe gaara unu nke ọma.” 21 Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too ONYENWE ANYỊ nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị:“Nyenụ ONYENWE ANYỊ ekele,nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi.” 22 Mgbe ndị Juda malitere ịbụ abụ na ito otuto, ONYENWE ANYỊ cheere ndị agha Amọn na nke ndị Moab, na ndị nke si nʼugwu Sia nʼụzọ, merie ha. 23 Ma ndị agha Amọn na Moab buru ụzọ lụso ndị agha si nʼugwu Sia ọgụ. Mgbe ha lakwara onwe ha nʼiyi, ọgụ dakwara nʼetiti ndị Moab na Amọn. 24 Mgbe ndị agha Juda rutere ebe ha ga-esi lepụ anya hụ ihe na-eme nʼọzara ahụ, ha lepụrụ anya ịhụ usuu ndị agha ahụ, ma ihe ha hụrụ bụ ozu ndị agha tọgbọcha nʼala. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị agha ahụ gbapụrụ na ndụ. 25 Ya mere Jehoshafat na ndị agha ya banyere nʼọgbọ agha ahụ kwakọrọ ihe nkwata nʼagha. Ha butere ọtụtụ ngwa agha, na uwe na ihe ndị ọzọ dị oke ọnụahịa ma ha enweghị ike ibutecha ihe niile. Ihe nkwata nʼagha hiri nne ruo na o were ha ụbọchị atọ ibutecha ha. 26 Nʼụbọchị nke anọ ha zukọtara na Ndagwurugwu Beraka ebe ha nọ too ONYENWE ANYỊ otuto. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Beraka ruo taa. 27 Emesịa, Jehoshafat duuru ndị Juda na Jerusalem niile laghachi na Jerusalem nʼọṅụ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ emeelara ha ihe ha kwesiri iji ṅụrịa ọṅụ nʼebe ndị iro ha nọ. 28 Ha ji une, na ụbọ akwara, na opi ike bata Jerusalem, gaa nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. 29 Egwu Chineke dakwasịrị alaeze niile bi gburugburu, mgbe ha nụrụ otu ONYENWE ANYỊ si lụọ ọgụ megide ndị iro Izrel niile. 30 Ya mere, udo dịrị nʼalaeze Jehoshafat, nʼihi na Chineke nyere ya udo. 31 Jehoshafat ghọrọ eze juda. Ọ gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze Juda. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi. 32 O jere ije nʼụzọ niile nke Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ. 33 Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ ka nọ na-ejighị obi ha niile tụkwasị na Chineke nke nna nna ha. 34 Ihe banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼọchịchị Jehoshafat, site na mbido ruo na ngwụcha, ka e dere nʼakwụkwọ ihe mere nke Jehu nwa Hanani, nke e debanyere nʼime akwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel. 35 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jehoshafat, bụ eze Juda jikọrọ onwe ha na Ahazaya, eze Izrel, onye ahụ omume ya jọrọ njọ. 36 Ha kwekọrịtara ka ha na ya wuo ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa. Emesịa, ha wuru ụgbọ ndị a nʼEziọn Geba. 37 Elieza nwa Dodavahu, onye Maresha buru amụma megide Jehoshafat, na-asị, “Nʼihi na i kwenyere ka gị na Ahazaya na-azụkọ ahịa, ONYENWE ANYỊ ga-emebi ihe ndị a ị rụrụ.” Ụgbọ mmiri ahụ niile kpuru, ha enwekwaghị ike ijeru Tashish zụọ ahịa.

In Other Versions

2 Chronicles 20 in the ANGEFD

2 Chronicles 20 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 20 in the AS21

2 Chronicles 20 in the BAGH

2 Chronicles 20 in the BBPNG

2 Chronicles 20 in the BBT1E

2 Chronicles 20 in the BDS

2 Chronicles 20 in the BEV

2 Chronicles 20 in the BHAD

2 Chronicles 20 in the BIB

2 Chronicles 20 in the BLPT

2 Chronicles 20 in the BNT

2 Chronicles 20 in the BNTABOOT

2 Chronicles 20 in the BNTLV

2 Chronicles 20 in the BOATCB

2 Chronicles 20 in the BOATCB2

2 Chronicles 20 in the BOBCV

2 Chronicles 20 in the BOCNT

2 Chronicles 20 in the BOECS

2 Chronicles 20 in the BOGWICC

2 Chronicles 20 in the BOHCB

2 Chronicles 20 in the BOHCV

2 Chronicles 20 in the BOHLNT

2 Chronicles 20 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 20 in the BOILNTAP

2 Chronicles 20 in the BOITCV

2 Chronicles 20 in the BOKCV

2 Chronicles 20 in the BOKCV2

2 Chronicles 20 in the BOKHWOG

2 Chronicles 20 in the BOKSSV

2 Chronicles 20 in the BOLCB

2 Chronicles 20 in the BOLCB2

2 Chronicles 20 in the BOMCV

2 Chronicles 20 in the BONAV

2 Chronicles 20 in the BONCB

2 Chronicles 20 in the BONLT

2 Chronicles 20 in the BONUT2

2 Chronicles 20 in the BOPLNT

2 Chronicles 20 in the BOSCB

2 Chronicles 20 in the BOSNC

2 Chronicles 20 in the BOTLNT

2 Chronicles 20 in the BOVCB

2 Chronicles 20 in the BOYCB

2 Chronicles 20 in the BPBB

2 Chronicles 20 in the BPH

2 Chronicles 20 in the BSB

2 Chronicles 20 in the CCB

2 Chronicles 20 in the CUV

2 Chronicles 20 in the CUVS

2 Chronicles 20 in the DBT

2 Chronicles 20 in the DGDNT

2 Chronicles 20 in the DHNT

2 Chronicles 20 in the DNT

2 Chronicles 20 in the ELBE

2 Chronicles 20 in the EMTV

2 Chronicles 20 in the ESV

2 Chronicles 20 in the FBV

2 Chronicles 20 in the FEB

2 Chronicles 20 in the GGMNT

2 Chronicles 20 in the GNT

2 Chronicles 20 in the HARY

2 Chronicles 20 in the HNT

2 Chronicles 20 in the IRVA

2 Chronicles 20 in the IRVB

2 Chronicles 20 in the IRVG

2 Chronicles 20 in the IRVH

2 Chronicles 20 in the IRVK

2 Chronicles 20 in the IRVM

2 Chronicles 20 in the IRVM2

2 Chronicles 20 in the IRVO

2 Chronicles 20 in the IRVP

2 Chronicles 20 in the IRVT

2 Chronicles 20 in the IRVT2

2 Chronicles 20 in the IRVU

2 Chronicles 20 in the ISVN

2 Chronicles 20 in the JSNT

2 Chronicles 20 in the KAPI

2 Chronicles 20 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 20 in the KBV

2 Chronicles 20 in the KJV

2 Chronicles 20 in the KNFD

2 Chronicles 20 in the LBA

2 Chronicles 20 in the LBLA

2 Chronicles 20 in the LNT

2 Chronicles 20 in the LSV

2 Chronicles 20 in the MAAL

2 Chronicles 20 in the MBV

2 Chronicles 20 in the MBV2

2 Chronicles 20 in the MHNT

2 Chronicles 20 in the MKNFD

2 Chronicles 20 in the MNG

2 Chronicles 20 in the MNT

2 Chronicles 20 in the MNT2

2 Chronicles 20 in the MRS1T

2 Chronicles 20 in the NAA

2 Chronicles 20 in the NASB

2 Chronicles 20 in the NBLA

2 Chronicles 20 in the NBS

2 Chronicles 20 in the NBVTP

2 Chronicles 20 in the NET2

2 Chronicles 20 in the NIV11

2 Chronicles 20 in the NNT

2 Chronicles 20 in the NNT2

2 Chronicles 20 in the NNT3

2 Chronicles 20 in the PDDPT

2 Chronicles 20 in the PFNT

2 Chronicles 20 in the RMNT

2 Chronicles 20 in the SBIAS

2 Chronicles 20 in the SBIBS

2 Chronicles 20 in the SBIBS2

2 Chronicles 20 in the SBICS

2 Chronicles 20 in the SBIDS

2 Chronicles 20 in the SBIGS

2 Chronicles 20 in the SBIHS

2 Chronicles 20 in the SBIIS

2 Chronicles 20 in the SBIIS2

2 Chronicles 20 in the SBIIS3

2 Chronicles 20 in the SBIKS

2 Chronicles 20 in the SBIKS2

2 Chronicles 20 in the SBIMS

2 Chronicles 20 in the SBIOS

2 Chronicles 20 in the SBIPS

2 Chronicles 20 in the SBISS

2 Chronicles 20 in the SBITS

2 Chronicles 20 in the SBITS2

2 Chronicles 20 in the SBITS3

2 Chronicles 20 in the SBITS4

2 Chronicles 20 in the SBIUS

2 Chronicles 20 in the SBIVS

2 Chronicles 20 in the SBT

2 Chronicles 20 in the SBT1E

2 Chronicles 20 in the SCHL

2 Chronicles 20 in the SNT

2 Chronicles 20 in the SUSU

2 Chronicles 20 in the SUSU2

2 Chronicles 20 in the SYNO

2 Chronicles 20 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 20 in the TBT1E

2 Chronicles 20 in the TBT1E2

2 Chronicles 20 in the TFTIP

2 Chronicles 20 in the TFTU

2 Chronicles 20 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 20 in the THAI

2 Chronicles 20 in the TNFD

2 Chronicles 20 in the TNT

2 Chronicles 20 in the TNTIK

2 Chronicles 20 in the TNTIL

2 Chronicles 20 in the TNTIN

2 Chronicles 20 in the TNTIP

2 Chronicles 20 in the TNTIZ

2 Chronicles 20 in the TOMA

2 Chronicles 20 in the TTENT

2 Chronicles 20 in the UBG

2 Chronicles 20 in the UGV

2 Chronicles 20 in the UGV2

2 Chronicles 20 in the UGV3

2 Chronicles 20 in the VBL

2 Chronicles 20 in the VDCC

2 Chronicles 20 in the YALU

2 Chronicles 20 in the YAPE

2 Chronicles 20 in the YBVTP

2 Chronicles 20 in the ZBP