2 Corinthians 6 (BOICB)

1 Dịka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ nʼotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nʼefu. 2 Nʼihi na ọ na-ekwu,“Nʼoge m na-anara mmadụ nke ọma anụrụ m olu unu.Ọ bụkwa ụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.”Lee, ugbu a bụ oge a na-anabata mmadụ nke ọma, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta. 3 Anyị etinyeghị ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ onye ọbụla ka ọ ghara iwetara ọrụ anyị ihe ịta ụta. 4 Kama nʼime ihe niile, anyị na-agbalịsị ike ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ ndị na-ejere Chineke ozi. Anyị ji ndidi na ntachiobi na-edi nsogbu niile na mkpagbu niile na ahụhụ niile na-adakwasị anyị. 5 A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nʼime ịmụ anya na-erighị nri, 6 nʼime ịdị ọcha na ezi nghọta na ntachiobi nke anyị nwere, nʼinwe obiọma na ezi ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị na ya nʼime Mmụọ Nsọ, 7 sitekwa nʼikwu eziokwu na site nʼike Chineke. Anyị buru ezi omume dịka ngwa agha nʼaka nri na nʼaka ekpe. 8 Ụfọdụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu. 9 Ụwa amaghị anyị, ma a maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe niile, ma lee anyị ka dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee anyị anwụghị. 10 Anyị na-anọ nʼihe mwute mgbe niile, ma lee ọṅụ juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọbụla, ma lee anyị nwere ihe niile. 11 Ndị enyi anyị nọ na Kọrint, anyị agwala unu ihe niile dị anyị nʼobi, anyị emeghepụla obi anyị nye unu. 12 Anyị ji obi anyị niile hụ unu nʼanya, ma unu mechiri obi unu nʼebe anyị nọ. 13 Ugbu a, ana m ekwu dịka ana m agwa ụmụntakịrị. Na-emesonu anyị dịka anyị si emeso unu, meenụ ka obi unu saa mbara nʼebe anyị nọ. 14 Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ? 15 Ọ bụ nwekọ dị aṅaa dị na-agbata Kraịst na ekwensu? Gịnịkwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ? 16 Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru,“M ga-ebi nʼime ha.Jegharịakwa nʼime ha.M ga-abụkwa Chineke ha,ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.” 17 Ya mere,“Sinụ nʼetiti ha pụta.Nọpụkwanụ iche nʼebe ha nọ.Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka.Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.” 18 Ma,“Aga m abụrụ unu Nna,unu onwe unu ga-abụkwara m ụmụ m ndị ikom na ndị inyom.Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”

In Other Versions

2 Corinthians 6 in the ANGEFD

2 Corinthians 6 in the ANTPNG2D

2 Corinthians 6 in the AS21

2 Corinthians 6 in the BAGH

2 Corinthians 6 in the BBPNG

2 Corinthians 6 in the BBT1E

2 Corinthians 6 in the BDS

2 Corinthians 6 in the BEV

2 Corinthians 6 in the BHAD

2 Corinthians 6 in the BIB

2 Corinthians 6 in the BLPT

2 Corinthians 6 in the BNT

2 Corinthians 6 in the BNTABOOT

2 Corinthians 6 in the BNTLV

2 Corinthians 6 in the BOATCB

2 Corinthians 6 in the BOATCB2

2 Corinthians 6 in the BOBCV

2 Corinthians 6 in the BOCNT

2 Corinthians 6 in the BOECS

2 Corinthians 6 in the BOGWICC

2 Corinthians 6 in the BOHCB

2 Corinthians 6 in the BOHCV

2 Corinthians 6 in the BOHLNT

2 Corinthians 6 in the BOHNTLTAL

2 Corinthians 6 in the BOILNTAP

2 Corinthians 6 in the BOITCV

2 Corinthians 6 in the BOKCV

2 Corinthians 6 in the BOKCV2

2 Corinthians 6 in the BOKHWOG

2 Corinthians 6 in the BOKSSV

2 Corinthians 6 in the BOLCB

2 Corinthians 6 in the BOLCB2

2 Corinthians 6 in the BOMCV

2 Corinthians 6 in the BONAV

2 Corinthians 6 in the BONCB

2 Corinthians 6 in the BONLT

2 Corinthians 6 in the BONUT2

2 Corinthians 6 in the BOPLNT

2 Corinthians 6 in the BOSCB

2 Corinthians 6 in the BOSNC

2 Corinthians 6 in the BOTLNT

2 Corinthians 6 in the BOVCB

2 Corinthians 6 in the BOYCB

2 Corinthians 6 in the BPBB

2 Corinthians 6 in the BPH

2 Corinthians 6 in the BSB

2 Corinthians 6 in the CCB

2 Corinthians 6 in the CUV

2 Corinthians 6 in the CUVS

2 Corinthians 6 in the DBT

2 Corinthians 6 in the DGDNT

2 Corinthians 6 in the DHNT

2 Corinthians 6 in the DNT

2 Corinthians 6 in the ELBE

2 Corinthians 6 in the EMTV

2 Corinthians 6 in the ESV

2 Corinthians 6 in the FBV

2 Corinthians 6 in the FEB

2 Corinthians 6 in the GGMNT

2 Corinthians 6 in the GNT

2 Corinthians 6 in the HARY

2 Corinthians 6 in the HNT

2 Corinthians 6 in the IRVA

2 Corinthians 6 in the IRVB

2 Corinthians 6 in the IRVG

2 Corinthians 6 in the IRVH

2 Corinthians 6 in the IRVK

2 Corinthians 6 in the IRVM

2 Corinthians 6 in the IRVM2

2 Corinthians 6 in the IRVO

2 Corinthians 6 in the IRVP

2 Corinthians 6 in the IRVT

2 Corinthians 6 in the IRVT2

2 Corinthians 6 in the IRVU

2 Corinthians 6 in the ISVN

2 Corinthians 6 in the JSNT

2 Corinthians 6 in the KAPI

2 Corinthians 6 in the KBT1ETNIK

2 Corinthians 6 in the KBV

2 Corinthians 6 in the KJV

2 Corinthians 6 in the KNFD

2 Corinthians 6 in the LBA

2 Corinthians 6 in the LBLA

2 Corinthians 6 in the LNT

2 Corinthians 6 in the LSV

2 Corinthians 6 in the MAAL

2 Corinthians 6 in the MBV

2 Corinthians 6 in the MBV2

2 Corinthians 6 in the MHNT

2 Corinthians 6 in the MKNFD

2 Corinthians 6 in the MNG

2 Corinthians 6 in the MNT

2 Corinthians 6 in the MNT2

2 Corinthians 6 in the MRS1T

2 Corinthians 6 in the NAA

2 Corinthians 6 in the NASB

2 Corinthians 6 in the NBLA

2 Corinthians 6 in the NBS

2 Corinthians 6 in the NBVTP

2 Corinthians 6 in the NET2

2 Corinthians 6 in the NIV11

2 Corinthians 6 in the NNT

2 Corinthians 6 in the NNT2

2 Corinthians 6 in the NNT3

2 Corinthians 6 in the PDDPT

2 Corinthians 6 in the PFNT

2 Corinthians 6 in the RMNT

2 Corinthians 6 in the SBIAS

2 Corinthians 6 in the SBIBS

2 Corinthians 6 in the SBIBS2

2 Corinthians 6 in the SBICS

2 Corinthians 6 in the SBIDS

2 Corinthians 6 in the SBIGS

2 Corinthians 6 in the SBIHS

2 Corinthians 6 in the SBIIS

2 Corinthians 6 in the SBIIS2

2 Corinthians 6 in the SBIIS3

2 Corinthians 6 in the SBIKS

2 Corinthians 6 in the SBIKS2

2 Corinthians 6 in the SBIMS

2 Corinthians 6 in the SBIOS

2 Corinthians 6 in the SBIPS

2 Corinthians 6 in the SBISS

2 Corinthians 6 in the SBITS

2 Corinthians 6 in the SBITS2

2 Corinthians 6 in the SBITS3

2 Corinthians 6 in the SBITS4

2 Corinthians 6 in the SBIUS

2 Corinthians 6 in the SBIVS

2 Corinthians 6 in the SBT

2 Corinthians 6 in the SBT1E

2 Corinthians 6 in the SCHL

2 Corinthians 6 in the SNT

2 Corinthians 6 in the SUSU

2 Corinthians 6 in the SUSU2

2 Corinthians 6 in the SYNO

2 Corinthians 6 in the TBIAOTANT

2 Corinthians 6 in the TBT1E

2 Corinthians 6 in the TBT1E2

2 Corinthians 6 in the TFTIP

2 Corinthians 6 in the TFTU

2 Corinthians 6 in the TGNTATF3T

2 Corinthians 6 in the THAI

2 Corinthians 6 in the TNFD

2 Corinthians 6 in the TNT

2 Corinthians 6 in the TNTIK

2 Corinthians 6 in the TNTIL

2 Corinthians 6 in the TNTIN

2 Corinthians 6 in the TNTIP

2 Corinthians 6 in the TNTIZ

2 Corinthians 6 in the TOMA

2 Corinthians 6 in the TTENT

2 Corinthians 6 in the UBG

2 Corinthians 6 in the UGV

2 Corinthians 6 in the UGV2

2 Corinthians 6 in the UGV3

2 Corinthians 6 in the VBL

2 Corinthians 6 in the VDCC

2 Corinthians 6 in the YALU

2 Corinthians 6 in the YAPE

2 Corinthians 6 in the YBVTP

2 Corinthians 6 in the ZBP