2 Kings 14 (BOICB)

1 Nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoash nwa Jehoahaz nʼIzrel, ka Amazaya nwa Joash eze Juda malitere ọchịchị ya. 2 Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ bụ eze na Jerusalem iri afọ abụọ na itoolu. Aha nne ya bụ Jehoadin, onye Jerusalem. 3 O mere ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ, ma o meghị dịka nna nna ya bụ Devid mere. Nʼihe niile, ọ gbasoro nzọ ụkwụ nna ya Joash. 4 Ọ wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda gara nʼihu na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ahụ niile. 5 Mgbe alaeze ahụ siri ike nʼọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya. 6 Ma o meghị ka ụmụ ndị ogbu mmadụ ahụ nwụọ, nʼusoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe ONYENWE ANYỊ nyere iwu sị: “Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.” 7 Amazaya bụ onye gburu puku ndị agha Edọm iri na Ndagwurugwu Nnu, dọtakwa obodo Sela nʼagha, gụgharịa ya Jekteel, nke bụ aha a na-akpọ ya ruo ụbọchị taa. 8 Mgbe ahụ, Amazaya zigara ndị ozi ka ha jekwuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jehu, eze Izrel, zie ya ozi ịma aka, sị, “Bịa, ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.” 9 Ma Jehoash eze Izrel zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda sị ya, “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi, sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ, zọpịa uke ahụ. 10 I meriela Edọm, nʼezie. Ugbu a, mpako abatala. Ṅụrịa ọṅụ nʼihi mmeri nke i nwetara, ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?” 11 Ma otu ọ dị, Amazaya egeghị ntị. Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha, ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda. 12 Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya. 13 Jehoash bụ eze Izrel nwudere Amazaya bụ eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash gara Jerusalem kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii. 14 Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, na nke dị nʼụlọakụ nke ụlọeze. Ọ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria. 15 Ihe banyere akụkọ ndị ọzọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha ọ lụrụ megide Amazaya eze Juda, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha? 16 Jehoash sooro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ, e lie ya na Sameria, ebe e liri eze ndị Izrel ndị ọzọ. Jeroboam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 17 Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị. 18 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amazaya, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 19 Ha gbara izuzu imegide ya nʼime Jerusalem, ọ gbapụrụ gbalaga Lakish. Ma ha zipụrụ ndị ikom chụụrụ ya gaa Lakish, gbuo ya nʼebe ahụ. 20 Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya na Jerusalem nʼebe e liri ndị nna nna ya ha, nʼobodo Devid. 21 Mgbe ahụ, ndị Juda niile duuru Azaraya onye aha ya bụkwa Uzaya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya. 22 Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. 23 Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze. 24 Ma o mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYỊ nʼihi na o wezugaghị onwe ya site na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye ahụ dubara ndị Izrel na mmehie. 25 Ọ bụ ya weghachitara oke ala Izrel site na Lebo Hamat ruo nʼosimiri Araba, dịka okwu ONYENWE ANYỊ, Chineke nke Izrel si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Jona nwa Amitai, onye amụma si Gat Hefa. 26 ONYENWE ANYỊ hụrụ ọnọdụ ọjọọ nke ndị Izrel nọ nʼime ya; onye ọbụla nʼime ha, ohu na onye nwe onwe ya, nọ nʼoke ahụhụ. Ọ dịkwaghị onye inyeaka ọbụla ha nwere. 27 Ma ọ bụghị uche ONYENWE ANYỊ ịla Izrel nʼiyi kpamkpam nʼokpuru eluigwe, nʼihi ya ka o mere ka Jeroboam nwa Jehoash napụta ha site nʼaka ndị iro ha. 28 Akụkọ niile gbasara ihe niile Jeroboam mere, na ike ya niile, na agha niile o buru, na otu o si nwetaghachiri ndị Izrel obodo Damaskọs na Hamat, bụ obodo ndị Juda, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha? 29 Jeroboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ndị eze Izrel nwụrụ anwụ. Ma Zekaraya nwa ya ghọrọ eze Izrel nʼọnọdụ ya.

In Other Versions

2 Kings 14 in the ANGEFD

2 Kings 14 in the ANTPNG2D

2 Kings 14 in the AS21

2 Kings 14 in the BAGH

2 Kings 14 in the BBPNG

2 Kings 14 in the BBT1E

2 Kings 14 in the BDS

2 Kings 14 in the BEV

2 Kings 14 in the BHAD

2 Kings 14 in the BIB

2 Kings 14 in the BLPT

2 Kings 14 in the BNT

2 Kings 14 in the BNTABOOT

2 Kings 14 in the BNTLV

2 Kings 14 in the BOATCB

2 Kings 14 in the BOATCB2

2 Kings 14 in the BOBCV

2 Kings 14 in the BOCNT

2 Kings 14 in the BOECS

2 Kings 14 in the BOGWICC

2 Kings 14 in the BOHCB

2 Kings 14 in the BOHCV

2 Kings 14 in the BOHLNT

2 Kings 14 in the BOHNTLTAL

2 Kings 14 in the BOILNTAP

2 Kings 14 in the BOITCV

2 Kings 14 in the BOKCV

2 Kings 14 in the BOKCV2

2 Kings 14 in the BOKHWOG

2 Kings 14 in the BOKSSV

2 Kings 14 in the BOLCB

2 Kings 14 in the BOLCB2

2 Kings 14 in the BOMCV

2 Kings 14 in the BONAV

2 Kings 14 in the BONCB

2 Kings 14 in the BONLT

2 Kings 14 in the BONUT2

2 Kings 14 in the BOPLNT

2 Kings 14 in the BOSCB

2 Kings 14 in the BOSNC

2 Kings 14 in the BOTLNT

2 Kings 14 in the BOVCB

2 Kings 14 in the BOYCB

2 Kings 14 in the BPBB

2 Kings 14 in the BPH

2 Kings 14 in the BSB

2 Kings 14 in the CCB

2 Kings 14 in the CUV

2 Kings 14 in the CUVS

2 Kings 14 in the DBT

2 Kings 14 in the DGDNT

2 Kings 14 in the DHNT

2 Kings 14 in the DNT

2 Kings 14 in the ELBE

2 Kings 14 in the EMTV

2 Kings 14 in the ESV

2 Kings 14 in the FBV

2 Kings 14 in the FEB

2 Kings 14 in the GGMNT

2 Kings 14 in the GNT

2 Kings 14 in the HARY

2 Kings 14 in the HNT

2 Kings 14 in the IRVA

2 Kings 14 in the IRVB

2 Kings 14 in the IRVG

2 Kings 14 in the IRVH

2 Kings 14 in the IRVK

2 Kings 14 in the IRVM

2 Kings 14 in the IRVM2

2 Kings 14 in the IRVO

2 Kings 14 in the IRVP

2 Kings 14 in the IRVT

2 Kings 14 in the IRVT2

2 Kings 14 in the IRVU

2 Kings 14 in the ISVN

2 Kings 14 in the JSNT

2 Kings 14 in the KAPI

2 Kings 14 in the KBT1ETNIK

2 Kings 14 in the KBV

2 Kings 14 in the KJV

2 Kings 14 in the KNFD

2 Kings 14 in the LBA

2 Kings 14 in the LBLA

2 Kings 14 in the LNT

2 Kings 14 in the LSV

2 Kings 14 in the MAAL

2 Kings 14 in the MBV

2 Kings 14 in the MBV2

2 Kings 14 in the MHNT

2 Kings 14 in the MKNFD

2 Kings 14 in the MNG

2 Kings 14 in the MNT

2 Kings 14 in the MNT2

2 Kings 14 in the MRS1T

2 Kings 14 in the NAA

2 Kings 14 in the NASB

2 Kings 14 in the NBLA

2 Kings 14 in the NBS

2 Kings 14 in the NBVTP

2 Kings 14 in the NET2

2 Kings 14 in the NIV11

2 Kings 14 in the NNT

2 Kings 14 in the NNT2

2 Kings 14 in the NNT3

2 Kings 14 in the PDDPT

2 Kings 14 in the PFNT

2 Kings 14 in the RMNT

2 Kings 14 in the SBIAS

2 Kings 14 in the SBIBS

2 Kings 14 in the SBIBS2

2 Kings 14 in the SBICS

2 Kings 14 in the SBIDS

2 Kings 14 in the SBIGS

2 Kings 14 in the SBIHS

2 Kings 14 in the SBIIS

2 Kings 14 in the SBIIS2

2 Kings 14 in the SBIIS3

2 Kings 14 in the SBIKS

2 Kings 14 in the SBIKS2

2 Kings 14 in the SBIMS

2 Kings 14 in the SBIOS

2 Kings 14 in the SBIPS

2 Kings 14 in the SBISS

2 Kings 14 in the SBITS

2 Kings 14 in the SBITS2

2 Kings 14 in the SBITS3

2 Kings 14 in the SBITS4

2 Kings 14 in the SBIUS

2 Kings 14 in the SBIVS

2 Kings 14 in the SBT

2 Kings 14 in the SBT1E

2 Kings 14 in the SCHL

2 Kings 14 in the SNT

2 Kings 14 in the SUSU

2 Kings 14 in the SUSU2

2 Kings 14 in the SYNO

2 Kings 14 in the TBIAOTANT

2 Kings 14 in the TBT1E

2 Kings 14 in the TBT1E2

2 Kings 14 in the TFTIP

2 Kings 14 in the TFTU

2 Kings 14 in the TGNTATF3T

2 Kings 14 in the THAI

2 Kings 14 in the TNFD

2 Kings 14 in the TNT

2 Kings 14 in the TNTIK

2 Kings 14 in the TNTIL

2 Kings 14 in the TNTIN

2 Kings 14 in the TNTIP

2 Kings 14 in the TNTIZ

2 Kings 14 in the TOMA

2 Kings 14 in the TTENT

2 Kings 14 in the UBG

2 Kings 14 in the UGV

2 Kings 14 in the UGV2

2 Kings 14 in the UGV3

2 Kings 14 in the VBL

2 Kings 14 in the VDCC

2 Kings 14 in the YALU

2 Kings 14 in the YAPE

2 Kings 14 in the YBVTP

2 Kings 14 in the ZBP