2 Kings 18 (BOICB)

1 Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa eze Izrel ka Hezekaya nwa Ehaz eze Juda malitere ọchịchị nke ya. 2 Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Abija, ada Zekaraya. 3 O mere ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ, dịka nna nna ya Devid. 4 O wepụrụ ebe niile dị elu, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. O tipịakwara agwọ bronz ahụ Mosis mere, nʼihi na ruo nʼoge ahụ, ụmụ Izrel na-esure aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ya. (A kpọrọ ya Nehushtan.) 5 Hezekaya tụkwasịrị ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel obi ya. Nʼezie, o nwekwaghị onye ọzọ dị ka ya nʼetiti ndị eze Juda niile, ndị bu ya ụzọ chịa, na ndị so ya. 6 Ọ gbasoro ONYENWE ANYỊ nʼụzọ niile. O sitekwaghị nʼụzọ ONYENWE ANYỊ wezuga onwe ya. O debere ihe niile ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 7 ONYENWE ANYỊ nọnyeere ya nʼebe ọbụla ọ gara, ihe niile o mere gaara ya nke ọma. O nupuru isi jụ ịnọkwa nʼokpuru eze ndị Asịrịa, o fekwaghị ya ofufe. 8 O tigburu ndị Filistia nʼala ha niile ruo na Gaza, na obodo dị ya gburugburu. Ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, obodo ukwu niile e wusiri ike na obodo nta niile a na-ewusighị ike. 9 Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Hezekaya, nke bụkwa afọ nke asaa nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa, bụ eze Izrel, Shalmanesa, eze Asịrịa gbagoro imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu. 10 Mgbe afọ atọ gasịrị, nʼafọ nke isii nke ọchịchị Hezekaya, na afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshea, bụ eze Izrel, ndị agha Asịrịa dọtara Sameria nʼagha. 11 Ọ bụ nʼoge ahụ ka eze Asịrịa bupụrụ ndị Izrel niile bulaa ha Asịrịa nʼime obodo Hala, na Gozan nʼakụkụ iyi ukwu Hoboa, na nʼobodo ndị Midia. 12 Nke a mere nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼolu ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ha, jụkwa ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Ha edebeghị ọgbụgba ndụ ya na iwu niile Mosis onyeozi ONYENWE ANYỊ nyere ha. Ha jụrụ ige ntị nʼiwu ndị a, maọbụ debe ha. 13 Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, merikwaa ha. 14 Mgbe ahụ, Hezekaya chọrọ ụzọ ọ ga-esi mee udo, zie ozi zigara eze Asịrịa nʼobodo Lakish sị ya, “Emehiela m, biko, site nʼala m pụọ. Aga m akwụ gị ihe ọbụla ị chọrọ nʼaka m.” Eze Asịrịa sitere nʼaka Hezekaya eze Juda nara narị talenti ọlaọcha atọ, na iri talenti ọlaedo atọ. 15 Hezekaya chịịrị ọlaọcha niile ọ chọtara nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, na akụ niile dị nʼụlọeze, nye ya eze Asịrịa. 16 Nʼoge ahụ, Hezekaya bụ eze Juda, nyakapụtachara ọlaedo niile o ji techie ibo na ibo ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, chịrị ihe ndị a niile nye eze Asịrịa. 17 Eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha onye ọkwa ya kasị ukwuu, onyeisi ndị na-eje ozi na ọchịagha ya na usuu ndị agha ka ha jekwuru Hezekaya na Jerusalem. Ndị agha a bịaruru Jerusalem kwụsị nʼakụkụ olulu warawara e gwuru ebe Ọdọ mmiri dị elu si nʼasọfe, nʼụzọ e si aga obosara ala ndị na-asụ akwa. 18 Mgbe ha kpọrọ eze oku ka ọ bịa, Eliakịm nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ha. 19 Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya:“ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere? 20 Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi mere i ji enupu isi nʼokpuru m? 21 Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi. 22 Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị ONYENWE ANYỊ bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja dị nʼime Jerusalem?” 23 “ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha. 24 Ị ga-esi aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼIjipt maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya? 25 Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma enweghị okwu sitere na Chineke bịa? Ọ bụ ONYENWE ANYỊ ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’ ” 26 Mgbe ahụ, Eliakịm nwa Hilkaya, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik, ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.” 27 Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?” 28 Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa. 29 Nke a bụ ihe eze sịrị, unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu site nʼaka m. 30 Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị ONYENWE ANYỊ obi. Mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, ONYENWE ANYỊ aghaghị ịnapụta anyị, a gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’ 31 “Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya: 32 ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị, ala mmanụ aṅụ na osisi oliv jupụtara nʼime ya. Họrọnụ ndụ ka unu ghara ịnwụ.“Unu egela Hezekaya ntị, nʼihi na ọ bụ nrafu ka ọ na-arafu unu mgbe ọ na-asị, ‘ONYENWE ANYỊ ga-anapụta anyị.’ 33 O nwere chi mba ọbụla nke napụtara ha site nʼaka eze Asịrịa? 34 Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim, Hena na Iva nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m? 35 Olee chi nʼime chi mba ndị a niile bụ nke zọpụtarala ala ya site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na ONYENWE ANYỊ pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?” 36 Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.” 37 Mgbe ahụ, Eliakịm nwa Hilkaya, onye na-elekọta ụlọeze, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf ode akwụkwọ, ha yi uwe ha dọwara adọwa, bịakwute Hezekaya gwa ya ihe niile onyeisi agha ahụ kwuru.

In Other Versions

2 Kings 18 in the ANGEFD

2 Kings 18 in the ANTPNG2D

2 Kings 18 in the AS21

2 Kings 18 in the BAGH

2 Kings 18 in the BBPNG

2 Kings 18 in the BBT1E

2 Kings 18 in the BDS

2 Kings 18 in the BEV

2 Kings 18 in the BHAD

2 Kings 18 in the BIB

2 Kings 18 in the BLPT

2 Kings 18 in the BNT

2 Kings 18 in the BNTABOOT

2 Kings 18 in the BNTLV

2 Kings 18 in the BOATCB

2 Kings 18 in the BOATCB2

2 Kings 18 in the BOBCV

2 Kings 18 in the BOCNT

2 Kings 18 in the BOECS

2 Kings 18 in the BOGWICC

2 Kings 18 in the BOHCB

2 Kings 18 in the BOHCV

2 Kings 18 in the BOHLNT

2 Kings 18 in the BOHNTLTAL

2 Kings 18 in the BOILNTAP

2 Kings 18 in the BOITCV

2 Kings 18 in the BOKCV

2 Kings 18 in the BOKCV2

2 Kings 18 in the BOKHWOG

2 Kings 18 in the BOKSSV

2 Kings 18 in the BOLCB

2 Kings 18 in the BOLCB2

2 Kings 18 in the BOMCV

2 Kings 18 in the BONAV

2 Kings 18 in the BONCB

2 Kings 18 in the BONLT

2 Kings 18 in the BONUT2

2 Kings 18 in the BOPLNT

2 Kings 18 in the BOSCB

2 Kings 18 in the BOSNC

2 Kings 18 in the BOTLNT

2 Kings 18 in the BOVCB

2 Kings 18 in the BOYCB

2 Kings 18 in the BPBB

2 Kings 18 in the BPH

2 Kings 18 in the BSB

2 Kings 18 in the CCB

2 Kings 18 in the CUV

2 Kings 18 in the CUVS

2 Kings 18 in the DBT

2 Kings 18 in the DGDNT

2 Kings 18 in the DHNT

2 Kings 18 in the DNT

2 Kings 18 in the ELBE

2 Kings 18 in the EMTV

2 Kings 18 in the ESV

2 Kings 18 in the FBV

2 Kings 18 in the FEB

2 Kings 18 in the GGMNT

2 Kings 18 in the GNT

2 Kings 18 in the HARY

2 Kings 18 in the HNT

2 Kings 18 in the IRVA

2 Kings 18 in the IRVB

2 Kings 18 in the IRVG

2 Kings 18 in the IRVH

2 Kings 18 in the IRVK

2 Kings 18 in the IRVM

2 Kings 18 in the IRVM2

2 Kings 18 in the IRVO

2 Kings 18 in the IRVP

2 Kings 18 in the IRVT

2 Kings 18 in the IRVT2

2 Kings 18 in the IRVU

2 Kings 18 in the ISVN

2 Kings 18 in the JSNT

2 Kings 18 in the KAPI

2 Kings 18 in the KBT1ETNIK

2 Kings 18 in the KBV

2 Kings 18 in the KJV

2 Kings 18 in the KNFD

2 Kings 18 in the LBA

2 Kings 18 in the LBLA

2 Kings 18 in the LNT

2 Kings 18 in the LSV

2 Kings 18 in the MAAL

2 Kings 18 in the MBV

2 Kings 18 in the MBV2

2 Kings 18 in the MHNT

2 Kings 18 in the MKNFD

2 Kings 18 in the MNG

2 Kings 18 in the MNT

2 Kings 18 in the MNT2

2 Kings 18 in the MRS1T

2 Kings 18 in the NAA

2 Kings 18 in the NASB

2 Kings 18 in the NBLA

2 Kings 18 in the NBS

2 Kings 18 in the NBVTP

2 Kings 18 in the NET2

2 Kings 18 in the NIV11

2 Kings 18 in the NNT

2 Kings 18 in the NNT2

2 Kings 18 in the NNT3

2 Kings 18 in the PDDPT

2 Kings 18 in the PFNT

2 Kings 18 in the RMNT

2 Kings 18 in the SBIAS

2 Kings 18 in the SBIBS

2 Kings 18 in the SBIBS2

2 Kings 18 in the SBICS

2 Kings 18 in the SBIDS

2 Kings 18 in the SBIGS

2 Kings 18 in the SBIHS

2 Kings 18 in the SBIIS

2 Kings 18 in the SBIIS2

2 Kings 18 in the SBIIS3

2 Kings 18 in the SBIKS

2 Kings 18 in the SBIKS2

2 Kings 18 in the SBIMS

2 Kings 18 in the SBIOS

2 Kings 18 in the SBIPS

2 Kings 18 in the SBISS

2 Kings 18 in the SBITS

2 Kings 18 in the SBITS2

2 Kings 18 in the SBITS3

2 Kings 18 in the SBITS4

2 Kings 18 in the SBIUS

2 Kings 18 in the SBIVS

2 Kings 18 in the SBT

2 Kings 18 in the SBT1E

2 Kings 18 in the SCHL

2 Kings 18 in the SNT

2 Kings 18 in the SUSU

2 Kings 18 in the SUSU2

2 Kings 18 in the SYNO

2 Kings 18 in the TBIAOTANT

2 Kings 18 in the TBT1E

2 Kings 18 in the TBT1E2

2 Kings 18 in the TFTIP

2 Kings 18 in the TFTU

2 Kings 18 in the TGNTATF3T

2 Kings 18 in the THAI

2 Kings 18 in the TNFD

2 Kings 18 in the TNT

2 Kings 18 in the TNTIK

2 Kings 18 in the TNTIL

2 Kings 18 in the TNTIN

2 Kings 18 in the TNTIP

2 Kings 18 in the TNTIZ

2 Kings 18 in the TOMA

2 Kings 18 in the TTENT

2 Kings 18 in the UBG

2 Kings 18 in the UGV

2 Kings 18 in the UGV2

2 Kings 18 in the UGV3

2 Kings 18 in the VBL

2 Kings 18 in the VDCC

2 Kings 18 in the YALU

2 Kings 18 in the YAPE

2 Kings 18 in the YBVTP

2 Kings 18 in the ZBP