2 Samuel 13 (BOICB)

1 Absalọm nwa Devid nwere otu nwanne nwanyị mara mma, aha ya bụ Tama. Ma Amnọn, otu nʼime ụmụ ndị ikom Devid, hụrụ nwaagbọghọ a nʼanya. 2 Ma ịhụnanya a Amnọn hụrụ Tama nwanne ya nwanyị mere ya ka ọ daa ọrịa, nʼihi na ọ bụ ihe rara Amnọn ahụ ịchọpụta ụzọ ya na Tama ga-esi nwee mmekọ, ebe ọ bụ na Tama bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. 3 Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid. 4 Otu ụbọchị, Jonadab bịakwutere Amnọn jụọ ya sị, “Gịnị mere, gị bụ nwa eze ji na-ata ahụ ụtụtụ niile? Ọ bụ na ị gaghị akọrọ m?”Amnọn gwara ya sị, “Ahụrụ m Tama nʼanya, bụ nwanne Absalọm, nwanne m nwoke.” 5 Jonadab gwara ya sị, “Ọ dị mma. Lee ihe ị ga-eme. Gaa dinaa ala, dịka a ga-asị na ahụ adịghị gị. Mgbe nna gị bịara ileta gị, gwa ya okwu sị ya, ‘Achọrọ m ka nwanne m nwanyị bụ Tama bịa nye m ihe oriri. Achọrọ m ka ọ nọdụ nʼihu m sie nri ahụ, mgbe m na-ele ya anya, ka o jirikwa aka ya nye m nri ahụ.’ ” 6 Amnọn mere otu a. Mgbe eze bịara ileta ya, Amnọn rịọrọ ya sị, “Biko, ka Tama bịa ebe a gheere m achịcha ole na ole ebe m ga-ahụ ya anya. Ka o jirikwa aka ya dozie ya nʼihu m ka m rie ya.” 7 Devid kwenyere, zie Tama ka ọ gaa nʼụlọ Amnọn gaa siere ya nri. 8 Tama gara nʼụlọ Amnọn, banyekwa nʼime ụlọ ebe o dinaa, ka Amnọn na-ele ya anya mgbe ọ na-agwọgharị ụtụ ọka. Emesịa, Tama gheere ya achịcha mara mma. 9 Mgbe o cheziri achịcha ahụ nʼihu Amnọn, Amnọn jụrụ iri ya.Ihe o mere mgbe ahụ bụ inye ndị na-ejere ya ozi nọ nʼebe ahụ iwu sị ha niile pụọ ngwangwa. Ha niile pụkwara. 10 Mgbe ahụ, Amnọn gwara Tama okwu sị, “Ugbu a, wetara m nri ahụ nʼime ụlọ ndina m, bịa jiri aka gị nye m ya.” Tama bugaara ya achịcha ahụ nʼime ụlọ ebe ihe ndina ya dị. 11 Ma mgbe Tama guzo nʼihu ya, Amnọn jidere ya nʼike sị ya, “Bịa, soro m dinaa, nwanne m nwanyị.” 12 Tama zara sị ya, “Mba! Nwanne m nwoke. Emerụla m. Ihe dị otu a ekwesighị ime nʼala Izrel. Emela ihe ọjọọ dị otu a. 13 Olee ihe ga-abụ ọnọdụ m? Oleekwanụ ihe ga-abụ ọnọdụ gị? Olee ebe m ga-agbala izo onwe m nʼihi ihe ihere ga-adịrị m ma i mee ihe dị otu a? Ị ga-adị ka otu nʼime ndị nzuzu ọjọọ dị nʼIzrel. Biko, gwa eze, ọ ga-ekwe ka ị lụọ m.” 14 Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya. 15 Emesịa, Amnọn kpọrọ Tama asị. Nʼezie, ọ kpọrọ ya asị ugbu a karịa ịhụnanya ọ hụrụ ya na mbụ. Ọ gwara Tama okwu sị ya, “Bilie si nʼebe a pụọ ọsịịsọ!” 16 Ma Tama kwara akwa sị ya, “Mba! Ịjụ m otu a ka njọ karịa ihe ọjọọ i mere m.”Ma Amnọn egeghị ya ntị. 17 Ọ kpọrọ nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Chụpụ nwanyị a nʼezi, kpachiere m ụzọ nʼazụ.” 18 Onyeozi ya chụpụrụ ya nʼezi, kpachie ụzọ nʼazụ ya. Uwe mwụda nwere aka ogologo ka Tama yi, nʼihi na ọ bụ ụdị nke ụmụ ndị inyom eze na-amaghị nwoke na-eyi. 19 Tama dọwara uwe mwụda ahụ o yi nʼahụ, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya nʼisi, buru aka ya nʼisi na-eti mkpu akwa dịka ọ na-ala. 20 Nwanne ya nwoke, Absalọm jụrụ ya sị, “Amnọn, nwanne gị nwoke, o dinakwuuru gị? Ma ugbu a, nwanne m, gba nkịtị, nwanne gị nwoke ka ọ bụ. Etinyela ihe a mere nʼobi.” Tama nọrọ dịka onye mmadụ niile jụrụ ajụ nʼụlọ nwanne ya nwoke, bụ Absalọm. 21 Mgbe eze Devid nụrụ ihe ndị a niile, iwe were ya nke ukwuu. 22 Absalọm agwaghị Amnọn okwu ọbụla, maọbụ nke dị mma, maọbụ okwu ọjọọ. Ma ọ kpọrọ Amnọn asị nke ukwuu nʼihi ọnọdụ iweda nʼala o wedara nwanne ya Tama, mee ya ihe ihere. 23 Mgbe afọ abụọ gasịrị, mgbe ndị na-akpụchara Absalọm ajị ụmụ atụrụ ya nọ na Baal-Hazọ, nʼoke ala Ifrem, ọ kpọkọtara ụmụ ndị ikom eze niile ka ha bịa nʼebe ahụ. 24 Absalọm jekwuuru eze sị ya, “Ndị na-akpụcha ajị ụmụ atụrụ ohu gị bịara. Eze na ndịisi ozi ya, ha ga-abịa sonyere m?” 25 Ma eze zara sị ya, “Mba, nwa m, anyị niile agaghị abịa, anyị ga-abụ ibu dị arọ nye gị.” Nʼagbanyeghị na Absalọm rugidere ya ma o kweghị aga, kama ọ gọziri ya. 26 Mgbe ahụ, Absalọm rịọrọ nna ya sị, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ị gaghị abịa, ị ga-emekwa ka nwanna m nwoke Amnọn, na ụmụ eze ndị ọzọ bịa?”Eze jụrụ ya sị, “Nʼihi gịnị ka Amnọn ga-eji soro gị gaa?” 27 Ma Absalọm rụgidere ya, ya mere o zipụrụ Amnọn na ụmụ eze ndị ọzọ ka ha soro ya gaa. 28 Mgbe ahụ, Absalọm nyere ndị na-ejere ya ozi iwu banyere Amnọn sị, “Cherenụ ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, mgbe m sịkwara unu tigbuo ya, unu atụla egwu, tigbuonụ ya. Ọ bụ m na-ekwu ihe ga-eme nʼebe a. Nweenụ obi ike, meekwanụ ya.” 29 Mgbe oge ruru, ndị ozi Absalọm tigburu Amnọn. Mgbe ahụ, ụmụ eze niile biliri makwasị nʼịnyịnya ha gbalaga. 30 Mgbe ha ka nọ nʼụzọ na-agbaga Jerusalem, ozi eruolarị Devid ntị sị, “Absalọm egbuchaala ụmụ eze niile, ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ!” 31 Eze biliri ọtọ, dọwaa uwe ya, daa nʼala, gbatịa onwe ya nʼihi obi ọjọọ. Ndị na-ejere ya ozi dọwakwara uwe ha nʼihi egwu na obi ọjọọ. 32 Ma Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid, sịrị, “Onyenwe m, echekwala na e gburu ụmụ ndị ikom eze niile, kama ọ bụ naanị Amnọn! Nke a bụ ihe Absalọm jikere ime site mgbe Amnọn wakporo nwanne ya nwanyị bụ Tama, dina ya. 33 Ma ugbu a, ka onyenwe m bụ eze ghara itinye akụkọ banyere ọnwụ ụmụ ndị ikom eze niile, nʼobi ya. Ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ.” 34 Ma Absalọm gbara ọsọ gbalaga.Ọ dịghị anya nwoke na-anọ nʼelu mgbidi Jerusalem na-eche nche, lepụrụ anya hụ ndị mmadụ ka ha si nʼụzọ dị nʼakụkụ ugwu nta na-abịa. Nwoke ahụ gara gwa eze sị ya, “Ahụrụ m ndị si nʼakụkụ Horonaim, nʼakụkụ ugwu na-abịa.” 35 Jonadab gwara eze sị, “Lee, ọ bụ ụmụ ndị ikom eze na-alọta dịka m kwuru.” 36 Mgbe ha lọbatara, ha bidoro ịkwa akwa nke ukwuu. Eze na ndị na-ejere ya ozi sokwa kwaa akwa. 37 Absalọm gbara ọsọ gbakwuru Talmai nwa Amihud, eze Geshua. Ma eze Devid ruru ụjụ nke ukwuu maka ọnwụ Amnọn. 38 Mgbe Absalọm gbara ọsọ gbaga Geshua, ọ nọrọ nʼebe ahụ afọ atọ. 39 Ọ gụrụ eze bụ Devid agụụ ịgakwuru Absalọm, nʼihi ọ kasịela obi maka ọnwụ Amnọn.

In Other Versions

2 Samuel 13 in the ANGEFD

2 Samuel 13 in the ANTPNG2D

2 Samuel 13 in the AS21

2 Samuel 13 in the BAGH

2 Samuel 13 in the BBPNG

2 Samuel 13 in the BBT1E

2 Samuel 13 in the BDS

2 Samuel 13 in the BEV

2 Samuel 13 in the BHAD

2 Samuel 13 in the BIB

2 Samuel 13 in the BLPT

2 Samuel 13 in the BNT

2 Samuel 13 in the BNTABOOT

2 Samuel 13 in the BNTLV

2 Samuel 13 in the BOATCB

2 Samuel 13 in the BOATCB2

2 Samuel 13 in the BOBCV

2 Samuel 13 in the BOCNT

2 Samuel 13 in the BOECS

2 Samuel 13 in the BOGWICC

2 Samuel 13 in the BOHCB

2 Samuel 13 in the BOHCV

2 Samuel 13 in the BOHLNT

2 Samuel 13 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 13 in the BOILNTAP

2 Samuel 13 in the BOITCV

2 Samuel 13 in the BOKCV

2 Samuel 13 in the BOKCV2

2 Samuel 13 in the BOKHWOG

2 Samuel 13 in the BOKSSV

2 Samuel 13 in the BOLCB

2 Samuel 13 in the BOLCB2

2 Samuel 13 in the BOMCV

2 Samuel 13 in the BONAV

2 Samuel 13 in the BONCB

2 Samuel 13 in the BONLT

2 Samuel 13 in the BONUT2

2 Samuel 13 in the BOPLNT

2 Samuel 13 in the BOSCB

2 Samuel 13 in the BOSNC

2 Samuel 13 in the BOTLNT

2 Samuel 13 in the BOVCB

2 Samuel 13 in the BOYCB

2 Samuel 13 in the BPBB

2 Samuel 13 in the BPH

2 Samuel 13 in the BSB

2 Samuel 13 in the CCB

2 Samuel 13 in the CUV

2 Samuel 13 in the CUVS

2 Samuel 13 in the DBT

2 Samuel 13 in the DGDNT

2 Samuel 13 in the DHNT

2 Samuel 13 in the DNT

2 Samuel 13 in the ELBE

2 Samuel 13 in the EMTV

2 Samuel 13 in the ESV

2 Samuel 13 in the FBV

2 Samuel 13 in the FEB

2 Samuel 13 in the GGMNT

2 Samuel 13 in the GNT

2 Samuel 13 in the HARY

2 Samuel 13 in the HNT

2 Samuel 13 in the IRVA

2 Samuel 13 in the IRVB

2 Samuel 13 in the IRVG

2 Samuel 13 in the IRVH

2 Samuel 13 in the IRVK

2 Samuel 13 in the IRVM

2 Samuel 13 in the IRVM2

2 Samuel 13 in the IRVO

2 Samuel 13 in the IRVP

2 Samuel 13 in the IRVT

2 Samuel 13 in the IRVT2

2 Samuel 13 in the IRVU

2 Samuel 13 in the ISVN

2 Samuel 13 in the JSNT

2 Samuel 13 in the KAPI

2 Samuel 13 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 13 in the KBV

2 Samuel 13 in the KJV

2 Samuel 13 in the KNFD

2 Samuel 13 in the LBA

2 Samuel 13 in the LBLA

2 Samuel 13 in the LNT

2 Samuel 13 in the LSV

2 Samuel 13 in the MAAL

2 Samuel 13 in the MBV

2 Samuel 13 in the MBV2

2 Samuel 13 in the MHNT

2 Samuel 13 in the MKNFD

2 Samuel 13 in the MNG

2 Samuel 13 in the MNT

2 Samuel 13 in the MNT2

2 Samuel 13 in the MRS1T

2 Samuel 13 in the NAA

2 Samuel 13 in the NASB

2 Samuel 13 in the NBLA

2 Samuel 13 in the NBS

2 Samuel 13 in the NBVTP

2 Samuel 13 in the NET2

2 Samuel 13 in the NIV11

2 Samuel 13 in the NNT

2 Samuel 13 in the NNT2

2 Samuel 13 in the NNT3

2 Samuel 13 in the PDDPT

2 Samuel 13 in the PFNT

2 Samuel 13 in the RMNT

2 Samuel 13 in the SBIAS

2 Samuel 13 in the SBIBS

2 Samuel 13 in the SBIBS2

2 Samuel 13 in the SBICS

2 Samuel 13 in the SBIDS

2 Samuel 13 in the SBIGS

2 Samuel 13 in the SBIHS

2 Samuel 13 in the SBIIS

2 Samuel 13 in the SBIIS2

2 Samuel 13 in the SBIIS3

2 Samuel 13 in the SBIKS

2 Samuel 13 in the SBIKS2

2 Samuel 13 in the SBIMS

2 Samuel 13 in the SBIOS

2 Samuel 13 in the SBIPS

2 Samuel 13 in the SBISS

2 Samuel 13 in the SBITS

2 Samuel 13 in the SBITS2

2 Samuel 13 in the SBITS3

2 Samuel 13 in the SBITS4

2 Samuel 13 in the SBIUS

2 Samuel 13 in the SBIVS

2 Samuel 13 in the SBT

2 Samuel 13 in the SBT1E

2 Samuel 13 in the SCHL

2 Samuel 13 in the SNT

2 Samuel 13 in the SUSU

2 Samuel 13 in the SUSU2

2 Samuel 13 in the SYNO

2 Samuel 13 in the TBIAOTANT

2 Samuel 13 in the TBT1E

2 Samuel 13 in the TBT1E2

2 Samuel 13 in the TFTIP

2 Samuel 13 in the TFTU

2 Samuel 13 in the TGNTATF3T

2 Samuel 13 in the THAI

2 Samuel 13 in the TNFD

2 Samuel 13 in the TNT

2 Samuel 13 in the TNTIK

2 Samuel 13 in the TNTIL

2 Samuel 13 in the TNTIN

2 Samuel 13 in the TNTIP

2 Samuel 13 in the TNTIZ

2 Samuel 13 in the TOMA

2 Samuel 13 in the TTENT

2 Samuel 13 in the UBG

2 Samuel 13 in the UGV

2 Samuel 13 in the UGV2

2 Samuel 13 in the UGV3

2 Samuel 13 in the VBL

2 Samuel 13 in the VDCC

2 Samuel 13 in the YALU

2 Samuel 13 in the YAPE

2 Samuel 13 in the YBVTP

2 Samuel 13 in the ZBP