2 Samuel 14 (BOICB)

1 Joab, nwa Zeruaya matara na obi eze dị nʼebe Absalọm nọ. 2 Joab zigara ozi na Tekoa, si nʼebe ahụ kpọta otu nwanyị maara ihe. Mgbe nwanyị ahụ bịaruru, Joab gwara ya sị, “Mee onwe gị dịka onye na-eru ụjụ. Yiri akwa mkpe, etekwala mmanụ otite. Kpaa agwa dịka nwanyị nọ nʼiru ụjụ ogologo oge. 3 Emesịa, jekwuru eze, gwa ya okwu ndị a m na-agwa gị.” Joab tinyere okwu ndị ahụ nʼọnụ ya. 4 Mgbe nwanyị ahụ si Tekoa gara na nke eze, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala ịsọpụrụ eze. Ọ sịrị, “Biko nyere m aka, gị onye a na-asọpụrụ!” 5 Eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ mkpa gị?”Ọ zara sị, “Abụ m nwanyị isi mkpe, di m anwụọla. 6 Enwere m ụmụ ndị ikom abụọ ndị gara lụọ ọgụ nʼọhịa. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ, o nweghị onye pụtara gboo ha. Nʼihi ya, otu nʼime ha tigburu ibe ya. 7 Ma ugbu a, ndị ikwu di m na-esogbu m na-asị ‘Kpọpụta onye ahụ gburu nwanne ya ka anyị gbuo ya nʼihi ndụ nwanne ya o wepụrụ, ka anyị si otu a memilaa onye nke fọdụrụ ga-erita oke ezinaụlọ.’ Ha chọrọ isi otu a menyụọ icheku ọkụ nke fọdụụrụ m, nke bụ na di m agaghị enwezikwa aha maọbụ onye fọdụụrụ ya nʼelu ụwa.” 8 Eze sịrị nwanyị ahụ, “Laa nʼụlọ gị, aga m ahụ na o nweghị onye metụrụ ya aka.” 9 Ma nwanyị ahụ si Tekoa sịrị ya, “Ka onyenwe m, bụ eze, gbaghara mụ na ezinaụlọ m, ka ikpe ọmụma ọbụla ghara ịdịrị eze na ocheeze ya.” 10 Eze zara ya, “Enyela onwe gị nsogbu maka nke ahụ. Ọ bụrụ na onye ọbụla agwa gị okwu ọbụla, kpọtara m ya. Onye dị otu a agaghị enyekwa gị nsogbu ọzọ.” 11 Mgbe ahụ ọ zara, “Biko, ka eze kpọkuo aha ONYENWE ANYỊ Chineke ya ka ọ kwụsị onye na-agwa ọchụ, ka ọ ghara igbu onye ọzọ, ka a gharakwa ịla nwa m nwoke nʼiyi.”Ọ sịrị, “Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, otu agịrị isi agaghị esi nʼisi nwa gị dapụ nʼala.” 12 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ sịrị, “Biko kwere ka ohu gị nwanyị gwa onyenwe m eze otu mkpụrụ okwu ọzọ.”Ọ sịrị, “Gaa nʼihu kwuo.” 13 Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ nʼihi gịnị ka ị chere ihe dị otu a megide ndị nke Chineke? Mgbe eze na-ekwu otu a, ọ bụ na ọ dịghị ama onwe ya ikpe, nʼihi na eze a jụla ịkpọghachi nwa ya a chụpụrụ achụpụ? 14 Anyị niile ga-anwụ. Anyị dịkwa ka mmiri a wụsara nʼala, nke a na-apụghị ịchịkọtakwa ọzọ. Ma Chineke adịghị anapụ mmadụ ndụ ya, ma ọ na-emeghepụ ụzọ ga-eme ka onye ọ chụpụrụ achụpụ lọghachikwutekwa ya. 15 “Ma ugbu a, ebe m bịara ịgwa onyenwe m bụ eze, okwu a, nʼihi na ndị mmadụ emenyela m egwu. Ohu gị chere nʼobi ya, ‘Aga m agwa eze okwu; ma eleghị anya, ọ ga-emezuru ohu ya nwanyị ihe ọ rịọrọ. 16 Ma eleghị anya eze ga-anapụta ohu ya nwanyị site nʼaka nwoke ahụ na-agbalị ibipụ mụ na nwa m nwoke site nʼihe nketa nke Chineke.’ 17 “Ugbu a, ohu gị nwanyị na-asị, ‘Ka okwu onyenwe m eze kwuru wetara m izuike, nʼihi onyenwe m eze na-enyochapụta ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ dịka mmụọ ozi Chineke. Ka ONYENWE ANYỊ Chineke gị nọnyere gị.’ ” 18 Mgbe ahụ, eze gwara nwanyị ahụ okwu sị, “Achọrọ m ka ị gwa m eziokwu nʼajụjụ a m na-aga ịjụ gị.”Nwanyị ahụ zara sị, “Ka onyenwe m, bụ eze kwuo ihe dị ya nʼobi.” 19 Devid jụrụ ya sị, “Aka Joab ọ dị nʼokwu ndị a niile?”Nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka ị na-adị ndụ, onyenwe m, bụ eze, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi nʼihe onyenwe m bụ eze kwuru, chee ihu nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. E, ọ bụ ohu gị Joab nyere m iwu ime nke a, ya gwakwara ohu gị nwanyị okwu niile ndị a. 20 Ohu gị bụ Joab mere ihe a ka ọ gbanwee otu ọnọdụ ihe dị ugbu a. Onyenwe m nwere amamihe dịka ndị mmụọ ozi Chineke. Ọ maakwara ihe niile na-eme nʼala.” 21 Eze sịrị Joab, “Ọ dị mma, aga m eme ya. Gaa kpọghachite nwokorobịa ahụ bụ Absalọm.” 22 Joab dara nʼala kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala, gọzie eze. Joab sịrị, “Taa ka ohu gị maara na ahụtala m amara nʼihu gị, onyenwe m bụ eze, nʼihi na eze e merela ohu ya ihe ọ rịọrọ.” 23 Joab biliri gaa Geshua, kpọlata Absalọm na Jerusalem. 24 Mgbe ha bịaruru, eze gwara Joab okwu sị, “Gwa ya ka ọ laa nʼụlọ ya. Ọ gaghị abịa nʼihu m, nʼihi na-achọghị m ịhụ ya anya.” Ya mere, Absalọm lara nʼụlọ ya. Ọ hụkwaghị eze anya. 25 Ọ dịghị nwoke mara mma dịka Absalọm nʼala Izrel niile. Ọ dịkwaghị onye na-adịghị ekwu okwu banyere ịma mma ya. Nʼihi na ntụpọ ọbụla adịghị ya nʼahụ site nʼopi isi ya ruo nʼọbọ ụkwụ ya. 26 Mgbe ọbụla ọ kpụchara ntutu isi ya, nʼihi na ọ bụ otu ugboro nʼafọ ka ọ na-akpụcha agịrị isi mgbe o bidoro ịnyị ya arọ. Ọ na-atụ agịrị isi a na-akpụchapụta ya nʼisi, ịdị arọ ya na-eru narị shekel abụọ ma a tụọ ya nʼihe ọtụtụ eze. 27 Absalọm mụtara ụmụ ndị ikom atọ, na otu nwanyị, aha ya bụ Tama. Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu. 28 Mgbe Absalọm nọrọ afọ abụọ na Jerusalem na-ahụghị eze anya, 29 o ziri ozi ka Joab bịa, ka ọ gaa ziere ya eze ozi, ma Joab abịaghị. Absalọm zigakwara ozi ọzọ ka ọ bịa ma Joab ekweghị ịbịa. 30 Nʼikpeazụ, Absalọm gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Gaanụ sunye ubi ọka balị Joab dị nʼakụkụ nke m ọkụ.” Ha mekwara dịka a gwara ha. 31 Mgbe ahụ, Joab biliri jee nʼụlọ Absalọm, ma sị ya, “Gịnị mere ndị na-ejere gị ozi ji gbaa ubi m ọkụ?” 32 Absalọm sịrị ya, “Lee ezitere m gị ozi, sị, ‘Bịa nʼebe a ka m ziga gị na nke eze ka ị jụta, “Nʼihi gịnị ka m ji site na Geshua lọghachita? Ọ gara a kara m mma ma a sị na m nọ nʼebe ahụ ruo ugbu a.” ’ Ugbu a, achọrọ m ka mụ hụ ihu eze, ọ bụrụ na onwe ajọ omume dị nʼime m, ya mee ka m nwụọ.” 33 Joab gakwuru eze, gwa ya ihe Absalọm kwuru. Mgbe ahụ, eze kpọrọ Absalọm, onye batara ma kpọọ isiala nʼihu eze. Eze sutukwara ya ọnụ.

In Other Versions

2 Samuel 14 in the ANGEFD

2 Samuel 14 in the ANTPNG2D

2 Samuel 14 in the AS21

2 Samuel 14 in the BAGH

2 Samuel 14 in the BBPNG

2 Samuel 14 in the BBT1E

2 Samuel 14 in the BDS

2 Samuel 14 in the BEV

2 Samuel 14 in the BHAD

2 Samuel 14 in the BIB

2 Samuel 14 in the BLPT

2 Samuel 14 in the BNT

2 Samuel 14 in the BNTABOOT

2 Samuel 14 in the BNTLV

2 Samuel 14 in the BOATCB

2 Samuel 14 in the BOATCB2

2 Samuel 14 in the BOBCV

2 Samuel 14 in the BOCNT

2 Samuel 14 in the BOECS

2 Samuel 14 in the BOGWICC

2 Samuel 14 in the BOHCB

2 Samuel 14 in the BOHCV

2 Samuel 14 in the BOHLNT

2 Samuel 14 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 14 in the BOILNTAP

2 Samuel 14 in the BOITCV

2 Samuel 14 in the BOKCV

2 Samuel 14 in the BOKCV2

2 Samuel 14 in the BOKHWOG

2 Samuel 14 in the BOKSSV

2 Samuel 14 in the BOLCB

2 Samuel 14 in the BOLCB2

2 Samuel 14 in the BOMCV

2 Samuel 14 in the BONAV

2 Samuel 14 in the BONCB

2 Samuel 14 in the BONLT

2 Samuel 14 in the BONUT2

2 Samuel 14 in the BOPLNT

2 Samuel 14 in the BOSCB

2 Samuel 14 in the BOSNC

2 Samuel 14 in the BOTLNT

2 Samuel 14 in the BOVCB

2 Samuel 14 in the BOYCB

2 Samuel 14 in the BPBB

2 Samuel 14 in the BPH

2 Samuel 14 in the BSB

2 Samuel 14 in the CCB

2 Samuel 14 in the CUV

2 Samuel 14 in the CUVS

2 Samuel 14 in the DBT

2 Samuel 14 in the DGDNT

2 Samuel 14 in the DHNT

2 Samuel 14 in the DNT

2 Samuel 14 in the ELBE

2 Samuel 14 in the EMTV

2 Samuel 14 in the ESV

2 Samuel 14 in the FBV

2 Samuel 14 in the FEB

2 Samuel 14 in the GGMNT

2 Samuel 14 in the GNT

2 Samuel 14 in the HARY

2 Samuel 14 in the HNT

2 Samuel 14 in the IRVA

2 Samuel 14 in the IRVB

2 Samuel 14 in the IRVG

2 Samuel 14 in the IRVH

2 Samuel 14 in the IRVK

2 Samuel 14 in the IRVM

2 Samuel 14 in the IRVM2

2 Samuel 14 in the IRVO

2 Samuel 14 in the IRVP

2 Samuel 14 in the IRVT

2 Samuel 14 in the IRVT2

2 Samuel 14 in the IRVU

2 Samuel 14 in the ISVN

2 Samuel 14 in the JSNT

2 Samuel 14 in the KAPI

2 Samuel 14 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 14 in the KBV

2 Samuel 14 in the KJV

2 Samuel 14 in the KNFD

2 Samuel 14 in the LBA

2 Samuel 14 in the LBLA

2 Samuel 14 in the LNT

2 Samuel 14 in the LSV

2 Samuel 14 in the MAAL

2 Samuel 14 in the MBV

2 Samuel 14 in the MBV2

2 Samuel 14 in the MHNT

2 Samuel 14 in the MKNFD

2 Samuel 14 in the MNG

2 Samuel 14 in the MNT

2 Samuel 14 in the MNT2

2 Samuel 14 in the MRS1T

2 Samuel 14 in the NAA

2 Samuel 14 in the NASB

2 Samuel 14 in the NBLA

2 Samuel 14 in the NBS

2 Samuel 14 in the NBVTP

2 Samuel 14 in the NET2

2 Samuel 14 in the NIV11

2 Samuel 14 in the NNT

2 Samuel 14 in the NNT2

2 Samuel 14 in the NNT3

2 Samuel 14 in the PDDPT

2 Samuel 14 in the PFNT

2 Samuel 14 in the RMNT

2 Samuel 14 in the SBIAS

2 Samuel 14 in the SBIBS

2 Samuel 14 in the SBIBS2

2 Samuel 14 in the SBICS

2 Samuel 14 in the SBIDS

2 Samuel 14 in the SBIGS

2 Samuel 14 in the SBIHS

2 Samuel 14 in the SBIIS

2 Samuel 14 in the SBIIS2

2 Samuel 14 in the SBIIS3

2 Samuel 14 in the SBIKS

2 Samuel 14 in the SBIKS2

2 Samuel 14 in the SBIMS

2 Samuel 14 in the SBIOS

2 Samuel 14 in the SBIPS

2 Samuel 14 in the SBISS

2 Samuel 14 in the SBITS

2 Samuel 14 in the SBITS2

2 Samuel 14 in the SBITS3

2 Samuel 14 in the SBITS4

2 Samuel 14 in the SBIUS

2 Samuel 14 in the SBIVS

2 Samuel 14 in the SBT

2 Samuel 14 in the SBT1E

2 Samuel 14 in the SCHL

2 Samuel 14 in the SNT

2 Samuel 14 in the SUSU

2 Samuel 14 in the SUSU2

2 Samuel 14 in the SYNO

2 Samuel 14 in the TBIAOTANT

2 Samuel 14 in the TBT1E

2 Samuel 14 in the TBT1E2

2 Samuel 14 in the TFTIP

2 Samuel 14 in the TFTU

2 Samuel 14 in the TGNTATF3T

2 Samuel 14 in the THAI

2 Samuel 14 in the TNFD

2 Samuel 14 in the TNT

2 Samuel 14 in the TNTIK

2 Samuel 14 in the TNTIL

2 Samuel 14 in the TNTIN

2 Samuel 14 in the TNTIP

2 Samuel 14 in the TNTIZ

2 Samuel 14 in the TOMA

2 Samuel 14 in the TTENT

2 Samuel 14 in the UBG

2 Samuel 14 in the UGV

2 Samuel 14 in the UGV2

2 Samuel 14 in the UGV3

2 Samuel 14 in the VBL

2 Samuel 14 in the VDCC

2 Samuel 14 in the YALU

2 Samuel 14 in the YAPE

2 Samuel 14 in the YBVTP

2 Samuel 14 in the ZBP