2 Samuel 15 (BOICB)

1 Mgbe nke a gasịrị, Absalọm zụtaara onwe ya ụgbọ agha na ịnyịnya na-adọkpụ ya. O nwetakwaara onwe ya iri ndị ikom ise ndị na-agba ọsọ nʼihu ya. 2 Nʼisi ụtụtụ, ọ na-ebili gaa guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata Jerusalem. Ọ bụrụ na ọ hụ onye ọbụla nwere okwu ọ chọrọ ka eze mara ihe banyere ya, Absalọm na-akpọ onye ahụ jụọ ya sị, “Olee obodo i si bịa?” Onye ahụ na-aza sị, “Ohu gị si nʼotu nʼime ebo dị nʼIzrel.” 3 Absalọm na-agwa onye ahụ sị, “Ahụrụ m na okwu gị niile bụ eziokwu. Ma ọ na-ewute m na eze enweghị onye na-enyere ya aka ịnụ okwu ndị a niile.” 4 Absalọm na-ekwukwa sị, “Asị na m bụ onye ikpe nʼala Izrel, onye ọbụla nwere okwu na ụka gaara abịakwute m ka m mee ka ikpe ziri ezi rute ya aka.” 5 Mgbe onye ọbụla bịara ịkpọ isiala nye ya nʼọnọdụ nsọpụrụ, ọ na-eseti aka ya, jide onye ahụ sutu ya ọnụ. 6 Otu a ka Absalọm sị na-akpaso ndị Izrel agwa, bụ ndị ahụ niile na-abịakwute eze na-arịọ maka ikpe ziri ezi. O si otu a zuru obi ndị Izrel niile nʼohi. 7 Mgbe afọ anọ gasịrị, Absalọm bịakwutere eze rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m jee Hebrọn mezuoro ONYENWE ANYỊ nkwa m kwere ya. 8 Mgbe ohu gị bi na Geshua nʼime Aram, ekweere m nkwa a, ‘Ọ bụrụ na ONYENWE ANYỊ ga-eme ka m lọghachi ọzọ na Jerusalem, aga m efe ya ofufe na Hebrọn.’ ” 9 Eze sịrị ya, “Gaa nʼudo.” Ya mere, ọ pụrụ gaa Hebrọn. 10 Mgbe ahụ, Absalọm zigara ndị ozi na nzuzo, ka ha gaa nʼebo niile nke ala Izrel. Nke a bụ ihe o ziri ha, “Mgbe unu nụrụ ụda opi ike, tienụ mkpu sị, ‘Absalọm abụrụla eze na Hebrọn.’ ” 11 Narị mmadụ abụọ si Jerusalem soro Absalọm gaa dịka ndị ọ kpọrọ oku oriri ma ha amaghị ihe ọbụla. 12 Mgbe Absalọm nọkwa na-achụ aja ahụ, o ziri ozi ka a kpọọ Ahitofel onye Gailo, otu nʼime ndị na-adụ Devid ọdụ, ka o si Gailo bịa nke bụ obodo ya. Nke a mere ka nkwekọrịta nzuzo ọjọọ ahụ na-esi ike karịa, ndị dịnyere Absalọm na-amụbanyekwa. 13 Ọ dịghị anya, onyeozi bịaruru Jerusalem gwa Devid na ndị Izrel niile kwagidere Absalọm. 14 Mgbe ahụ, Devid gwara ndị ọrụ ya niile ndị ya na ha nọ na Jerusalem, sị, “Bilienụ! Anyị aghaghị ịgbapụ, ma ọ bụghị otu a, ọ dịghị onye nʼime anyị ga-agbanarị Absalọm. Anyị ga-ahapụ ugbu a, ma ọ bụghị ya, ọ ga-eme ngwa gafee anyị wetara anyị mbibi, werekwa mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo a.” 15 Ndị na-ejere ya ozi zara sị ya, “Anyị dịnyere gị! Anyị jikekwara ime ihe ọbụla onyenwe anyị eze kwuru.” 16 Ya mere, eze na ndị ụlọ ya niile si na Jerusalem pụọ. Ọ dịghị onye ọ hapụrụ karịakwa ndị iko ya nwanyị iri nʼihi ilekọta obieze ahụ. 17 Eze biliri pụọ, ya na ndị niile so ya, ha kwụsịrị nʼoke ala nke obodo ahụ. 18 Ndị niile na-ejere ya ozi, gafere nʼakụkụ ya, ha na ndị Keret na Pelet, na narị ndị ikom isii ndị Git, bụ ndị so ya site na Gat, gafekwara nọrọ nʼihu eze. 19 Mgbe ahụ, Devid tụgharịrị kpọọ Itai, onye Git, ọchịagha narị ndị agha isii ahụ sị ya, “Gịnị mere i ji eso m? Laghachi azụ soro eze Absalọm, nʼihi na ị bụ ọbịa nʼIzrel, onye gbatara ọsọ ndụ. 20 Ọ dịbeghị anya kemgbe ị bịara. M ga-esi aṅaa kwere ka i soro m na-awagharị, ebe ọ bụ na m amaghị ebe m na-aga. Chịrị ndị agha gị laghachi. Ka obiọma na ikwesi ntụkwasị obi dịnyere unu.” 21 Ma Itai zara eze sị, “Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, onyenwe m na-adịkwa ndụ, ebe ọbụla onyenwe m bụ eze ga-anọ, ma ọ pụtara ndụ maọbụ ọnwụ, nʼebe ahụ ka odibo gị ga-anọkwa.” 22 Devid sịrị Itai, “Gaa nʼihu, gabiga.” Ya mere Itai, onye Git gabigara ya na ndị ikom ya niile, na ezinaụlọ niile ndị so ya. 23 Obodo niile tiri mkpu akwa mgbe ndị ahụ niile na-agabiga. Eze gafere ọdọ mmiri Kidrọn, ya na ndị mmadụ niile chere ihu nʼụzọ ọzara. 24 Zadọk bịakwara, ya na ndị Livayị niile, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ha dọbara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼala. Abịata chụgidere aja tutu ruo mgbe mmadụ niile sitere nʼobodo ahụ gabigasịrị. 25 Mgbe ahụ, eze sịrị Zadọk, “Bughachi igbe Chineke a nʼime obodo. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼanya ONYENWE ANYỊ, ọ ga-akpọghachi m mee ka m hụ ya, na ebe obibi ya anya ọzọ. 26 Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ihe banyere gị adịghị atọkwa m ụtọ,’ lee m, ya mee m otu o si dị ya mma nʼanya.” 27 Mgbe ahụ, eze gwara Zadọk bụ onye nchụaja sị, “Ọkwa ị bụ onye ọhụ ụzọ? Laghachi nʼobodo nʼudo, kpọrọ Ahimaaz nwa gị nwoke, na Jonatan nwa Abịata. Gị na Abịata kpọrọ ụmụ unu ndị ikom abụọ ndị a laghachi nʼobodo. 28 Aga m akwụsị chere nʼebe e si akwọfe osimiri Jọdan, ruo mgbe ozi ga-esi nʼebe ị nọ bịa.” 29 Mgbe ahụ, Zadọk na Abịata bughachiri igbe Chineke na Jerusalem. Ha nọdụkwara nʼebe ahụ. 30 Ma Devid na ndị so ya chere ihu irigo Ugwu Oliv. Mgbe ọ na-aga, Devid nọ na-akwa akwa. O yikwaghị ihe ọbụla nʼụkwụ ya, ma o ji ihe kpuchie isi ya. Ndị niile so ya kpuchikwara isi ha na-akwakwa akwa ka ha na-arịgo. 31 Mgbe a gwara Devid na Ahitofel onye na-adụ ya ọdụ dịnyere Absalọm, Devid kpere ekpere sị, “O ONYENWE ANYỊ, biko, tụgharịa ndụmọdụ Ahitofel ka ọ bụrụ ndụmọdụ nzuzu.” 32 Mgbe Devid bịaruru nʼelu Ugwu Oliv, ebe ndị mmadụ na-anọ na-efe Chineke ofufe, Hushaị, onye Akai nọ nʼebe ahụ na-eche izute ya. Uwe ya dọwakwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi. 33 Ma Devid sịrị ya, “Ọ bụrụ na i soro m, ị ga-abụ ibu arọ nye m. 34 Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel. 35 Ọ bụ na Zadọk na Abịata ndị nchụaja agaghị eso gị nọdụ nʼebe ahụ? Gwa ha ihe ọbụla ị ga-anụta nʼụlọeze. 36 Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.” 37 Ya mere Hushaị, enyi Devid, bịarutere Jerusalem mgbe Absalọm na-abata obodo ahụ.

In Other Versions

2 Samuel 15 in the ANGEFD

2 Samuel 15 in the ANTPNG2D

2 Samuel 15 in the AS21

2 Samuel 15 in the BAGH

2 Samuel 15 in the BBPNG

2 Samuel 15 in the BBT1E

2 Samuel 15 in the BDS

2 Samuel 15 in the BEV

2 Samuel 15 in the BHAD

2 Samuel 15 in the BIB

2 Samuel 15 in the BLPT

2 Samuel 15 in the BNT

2 Samuel 15 in the BNTABOOT

2 Samuel 15 in the BNTLV

2 Samuel 15 in the BOATCB

2 Samuel 15 in the BOATCB2

2 Samuel 15 in the BOBCV

2 Samuel 15 in the BOCNT

2 Samuel 15 in the BOECS

2 Samuel 15 in the BOGWICC

2 Samuel 15 in the BOHCB

2 Samuel 15 in the BOHCV

2 Samuel 15 in the BOHLNT

2 Samuel 15 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 15 in the BOILNTAP

2 Samuel 15 in the BOITCV

2 Samuel 15 in the BOKCV

2 Samuel 15 in the BOKCV2

2 Samuel 15 in the BOKHWOG

2 Samuel 15 in the BOKSSV

2 Samuel 15 in the BOLCB

2 Samuel 15 in the BOLCB2

2 Samuel 15 in the BOMCV

2 Samuel 15 in the BONAV

2 Samuel 15 in the BONCB

2 Samuel 15 in the BONLT

2 Samuel 15 in the BONUT2

2 Samuel 15 in the BOPLNT

2 Samuel 15 in the BOSCB

2 Samuel 15 in the BOSNC

2 Samuel 15 in the BOTLNT

2 Samuel 15 in the BOVCB

2 Samuel 15 in the BOYCB

2 Samuel 15 in the BPBB

2 Samuel 15 in the BPH

2 Samuel 15 in the BSB

2 Samuel 15 in the CCB

2 Samuel 15 in the CUV

2 Samuel 15 in the CUVS

2 Samuel 15 in the DBT

2 Samuel 15 in the DGDNT

2 Samuel 15 in the DHNT

2 Samuel 15 in the DNT

2 Samuel 15 in the ELBE

2 Samuel 15 in the EMTV

2 Samuel 15 in the ESV

2 Samuel 15 in the FBV

2 Samuel 15 in the FEB

2 Samuel 15 in the GGMNT

2 Samuel 15 in the GNT

2 Samuel 15 in the HARY

2 Samuel 15 in the HNT

2 Samuel 15 in the IRVA

2 Samuel 15 in the IRVB

2 Samuel 15 in the IRVG

2 Samuel 15 in the IRVH

2 Samuel 15 in the IRVK

2 Samuel 15 in the IRVM

2 Samuel 15 in the IRVM2

2 Samuel 15 in the IRVO

2 Samuel 15 in the IRVP

2 Samuel 15 in the IRVT

2 Samuel 15 in the IRVT2

2 Samuel 15 in the IRVU

2 Samuel 15 in the ISVN

2 Samuel 15 in the JSNT

2 Samuel 15 in the KAPI

2 Samuel 15 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 15 in the KBV

2 Samuel 15 in the KJV

2 Samuel 15 in the KNFD

2 Samuel 15 in the LBA

2 Samuel 15 in the LBLA

2 Samuel 15 in the LNT

2 Samuel 15 in the LSV

2 Samuel 15 in the MAAL

2 Samuel 15 in the MBV

2 Samuel 15 in the MBV2

2 Samuel 15 in the MHNT

2 Samuel 15 in the MKNFD

2 Samuel 15 in the MNG

2 Samuel 15 in the MNT

2 Samuel 15 in the MNT2

2 Samuel 15 in the MRS1T

2 Samuel 15 in the NAA

2 Samuel 15 in the NASB

2 Samuel 15 in the NBLA

2 Samuel 15 in the NBS

2 Samuel 15 in the NBVTP

2 Samuel 15 in the NET2

2 Samuel 15 in the NIV11

2 Samuel 15 in the NNT

2 Samuel 15 in the NNT2

2 Samuel 15 in the NNT3

2 Samuel 15 in the PDDPT

2 Samuel 15 in the PFNT

2 Samuel 15 in the RMNT

2 Samuel 15 in the SBIAS

2 Samuel 15 in the SBIBS

2 Samuel 15 in the SBIBS2

2 Samuel 15 in the SBICS

2 Samuel 15 in the SBIDS

2 Samuel 15 in the SBIGS

2 Samuel 15 in the SBIHS

2 Samuel 15 in the SBIIS

2 Samuel 15 in the SBIIS2

2 Samuel 15 in the SBIIS3

2 Samuel 15 in the SBIKS

2 Samuel 15 in the SBIKS2

2 Samuel 15 in the SBIMS

2 Samuel 15 in the SBIOS

2 Samuel 15 in the SBIPS

2 Samuel 15 in the SBISS

2 Samuel 15 in the SBITS

2 Samuel 15 in the SBITS2

2 Samuel 15 in the SBITS3

2 Samuel 15 in the SBITS4

2 Samuel 15 in the SBIUS

2 Samuel 15 in the SBIVS

2 Samuel 15 in the SBT

2 Samuel 15 in the SBT1E

2 Samuel 15 in the SCHL

2 Samuel 15 in the SNT

2 Samuel 15 in the SUSU

2 Samuel 15 in the SUSU2

2 Samuel 15 in the SYNO

2 Samuel 15 in the TBIAOTANT

2 Samuel 15 in the TBT1E

2 Samuel 15 in the TBT1E2

2 Samuel 15 in the TFTIP

2 Samuel 15 in the TFTU

2 Samuel 15 in the TGNTATF3T

2 Samuel 15 in the THAI

2 Samuel 15 in the TNFD

2 Samuel 15 in the TNT

2 Samuel 15 in the TNTIK

2 Samuel 15 in the TNTIL

2 Samuel 15 in the TNTIN

2 Samuel 15 in the TNTIP

2 Samuel 15 in the TNTIZ

2 Samuel 15 in the TOMA

2 Samuel 15 in the TTENT

2 Samuel 15 in the UBG

2 Samuel 15 in the UGV

2 Samuel 15 in the UGV2

2 Samuel 15 in the UGV3

2 Samuel 15 in the VBL

2 Samuel 15 in the VDCC

2 Samuel 15 in the YALU

2 Samuel 15 in the YAPE

2 Samuel 15 in the YBVTP

2 Samuel 15 in the ZBP