2 Samuel 8 (BOICB)

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia. 2 Devid merikwara ndị Moab. O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla. 3 Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis. 4 Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya. 5 Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha. 6 O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. ONYENWE ANYỊ nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. 7 Devid chịkọtara ọta ọlaedo ndịisi agha Hadadeza ji lụọ agha webata ha na Jerusalem. 8 Site na Teba nakwa Beirotai, bụ obodo Hadadeza na-achị. Eze Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu. 9 Mgbe Tou, eze Hamat, nụrụ na Devid emeriela ndị agha Hadadeza niile, 10 o zipụrụ Joram, nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee Devid, nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Joram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaọcha, nke ọlaedo na nke bronz bịa. 11 Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye ONYENWE ANYỊ, dịka o si mee ọlaọcha na ọlaedo si na mba niile ndị ọ lụgburu. 12 Mba ndị a bụ: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. O dokwara nsọ nye ONYENWE ANYỊ ihe ọ kwatara nʼagha site nʼaka Hadadeza nwa Rehob, bụ eze Zoba. 13 Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite. 14 O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. ONYENWE ANYỊ nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. 15 Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ. 16 Onyeisi ndị agha ya bụ Joab nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud. 17 Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze. 18 Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja.

In Other Versions

2 Samuel 8 in the ANGEFD

2 Samuel 8 in the ANTPNG2D

2 Samuel 8 in the AS21

2 Samuel 8 in the BAGH

2 Samuel 8 in the BBPNG

2 Samuel 8 in the BBT1E

2 Samuel 8 in the BDS

2 Samuel 8 in the BEV

2 Samuel 8 in the BHAD

2 Samuel 8 in the BIB

2 Samuel 8 in the BLPT

2 Samuel 8 in the BNT

2 Samuel 8 in the BNTABOOT

2 Samuel 8 in the BNTLV

2 Samuel 8 in the BOATCB

2 Samuel 8 in the BOATCB2

2 Samuel 8 in the BOBCV

2 Samuel 8 in the BOCNT

2 Samuel 8 in the BOECS

2 Samuel 8 in the BOGWICC

2 Samuel 8 in the BOHCB

2 Samuel 8 in the BOHCV

2 Samuel 8 in the BOHLNT

2 Samuel 8 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 8 in the BOILNTAP

2 Samuel 8 in the BOITCV

2 Samuel 8 in the BOKCV

2 Samuel 8 in the BOKCV2

2 Samuel 8 in the BOKHWOG

2 Samuel 8 in the BOKSSV

2 Samuel 8 in the BOLCB

2 Samuel 8 in the BOLCB2

2 Samuel 8 in the BOMCV

2 Samuel 8 in the BONAV

2 Samuel 8 in the BONCB

2 Samuel 8 in the BONLT

2 Samuel 8 in the BONUT2

2 Samuel 8 in the BOPLNT

2 Samuel 8 in the BOSCB

2 Samuel 8 in the BOSNC

2 Samuel 8 in the BOTLNT

2 Samuel 8 in the BOVCB

2 Samuel 8 in the BOYCB

2 Samuel 8 in the BPBB

2 Samuel 8 in the BPH

2 Samuel 8 in the BSB

2 Samuel 8 in the CCB

2 Samuel 8 in the CUV

2 Samuel 8 in the CUVS

2 Samuel 8 in the DBT

2 Samuel 8 in the DGDNT

2 Samuel 8 in the DHNT

2 Samuel 8 in the DNT

2 Samuel 8 in the ELBE

2 Samuel 8 in the EMTV

2 Samuel 8 in the ESV

2 Samuel 8 in the FBV

2 Samuel 8 in the FEB

2 Samuel 8 in the GGMNT

2 Samuel 8 in the GNT

2 Samuel 8 in the HARY

2 Samuel 8 in the HNT

2 Samuel 8 in the IRVA

2 Samuel 8 in the IRVB

2 Samuel 8 in the IRVG

2 Samuel 8 in the IRVH

2 Samuel 8 in the IRVK

2 Samuel 8 in the IRVM

2 Samuel 8 in the IRVM2

2 Samuel 8 in the IRVO

2 Samuel 8 in the IRVP

2 Samuel 8 in the IRVT

2 Samuel 8 in the IRVT2

2 Samuel 8 in the IRVU

2 Samuel 8 in the ISVN

2 Samuel 8 in the JSNT

2 Samuel 8 in the KAPI

2 Samuel 8 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 8 in the KBV

2 Samuel 8 in the KJV

2 Samuel 8 in the KNFD

2 Samuel 8 in the LBA

2 Samuel 8 in the LBLA

2 Samuel 8 in the LNT

2 Samuel 8 in the LSV

2 Samuel 8 in the MAAL

2 Samuel 8 in the MBV

2 Samuel 8 in the MBV2

2 Samuel 8 in the MHNT

2 Samuel 8 in the MKNFD

2 Samuel 8 in the MNG

2 Samuel 8 in the MNT

2 Samuel 8 in the MNT2

2 Samuel 8 in the MRS1T

2 Samuel 8 in the NAA

2 Samuel 8 in the NASB

2 Samuel 8 in the NBLA

2 Samuel 8 in the NBS

2 Samuel 8 in the NBVTP

2 Samuel 8 in the NET2

2 Samuel 8 in the NIV11

2 Samuel 8 in the NNT

2 Samuel 8 in the NNT2

2 Samuel 8 in the NNT3

2 Samuel 8 in the PDDPT

2 Samuel 8 in the PFNT

2 Samuel 8 in the RMNT

2 Samuel 8 in the SBIAS

2 Samuel 8 in the SBIBS

2 Samuel 8 in the SBIBS2

2 Samuel 8 in the SBICS

2 Samuel 8 in the SBIDS

2 Samuel 8 in the SBIGS

2 Samuel 8 in the SBIHS

2 Samuel 8 in the SBIIS

2 Samuel 8 in the SBIIS2

2 Samuel 8 in the SBIIS3

2 Samuel 8 in the SBIKS

2 Samuel 8 in the SBIKS2

2 Samuel 8 in the SBIMS

2 Samuel 8 in the SBIOS

2 Samuel 8 in the SBIPS

2 Samuel 8 in the SBISS

2 Samuel 8 in the SBITS

2 Samuel 8 in the SBITS2

2 Samuel 8 in the SBITS3

2 Samuel 8 in the SBITS4

2 Samuel 8 in the SBIUS

2 Samuel 8 in the SBIVS

2 Samuel 8 in the SBT

2 Samuel 8 in the SBT1E

2 Samuel 8 in the SCHL

2 Samuel 8 in the SNT

2 Samuel 8 in the SUSU

2 Samuel 8 in the SUSU2

2 Samuel 8 in the SYNO

2 Samuel 8 in the TBIAOTANT

2 Samuel 8 in the TBT1E

2 Samuel 8 in the TBT1E2

2 Samuel 8 in the TFTIP

2 Samuel 8 in the TFTU

2 Samuel 8 in the TGNTATF3T

2 Samuel 8 in the THAI

2 Samuel 8 in the TNFD

2 Samuel 8 in the TNT

2 Samuel 8 in the TNTIK

2 Samuel 8 in the TNTIL

2 Samuel 8 in the TNTIN

2 Samuel 8 in the TNTIP

2 Samuel 8 in the TNTIZ

2 Samuel 8 in the TOMA

2 Samuel 8 in the TTENT

2 Samuel 8 in the UBG

2 Samuel 8 in the UGV

2 Samuel 8 in the UGV2

2 Samuel 8 in the UGV3

2 Samuel 8 in the VBL

2 Samuel 8 in the VDCC

2 Samuel 8 in the YALU

2 Samuel 8 in the YAPE

2 Samuel 8 in the YBVTP

2 Samuel 8 in the ZBP