Amos 7 (BOICB)

1 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ mere ka m hụ. Lee, ọ na-akwado igwe igurube nke ga-abịa bibie ihe ubi niile ga-etopụta mgbe e burula ụzọ wee ihe ubi nke mbụ nke a na-enye eze, dịka ihe ruuru ya. 2 Mgbe ha tachara ahịhịa niile dị nʼala ahụ, etiri m mkpu: “Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ biko arịọọ m gị, gbaghara. Jekọb ọ ga-esi aṅa guzosie ike? Lee, ọ dịkarịrị nta.” 3 ONYENWE ANYỊ chegharịrị banyere ihe ndị a. ONYENWE ANYỊ kwuru sị, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.” 4 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ gosiri m: Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-akpọku ọkụ iji ya kpee ikpe. Ọkụ ahụ repịara ogbu mmiri, repịakwa ala ahụ niile. 5 Mgbe ahụ, asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ biko, arịọọ m gị kwụsị! Olee otu Jekọb ga-esi guzosie ike? Lee na ọ dịkarịrị nta!” 6 ONYENWE ANYỊ chegharịrị banyere ihe ndị a.Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.” 7 Nke a ka o gosiri m, lee, Onyenwe anyị na-eguzo nʼakụkụ mgbidi nke e ji ihe ịtụ mgbidi tụọ nke ọma, o jikwa ihe ịtụ mgbidi nʼaka ya. 8 ONYENWE ANYỊ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?”Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.”Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee. 9 “Ebe niile e wuliri elu nke Aịzik aghaghị ịbụ ebe e mebiri emebi,ebe nsọ niile nke Izrel aghaghị ịbụ ebe tọgbọrọ nʼefu,aghakwaghị m iweli mma agha m elu iji megide ụlọ Jeroboam.” 10 Mgbe ahụ, Amazaya onye nchụaja nọ na Betel zigaara Jeroboam bụ eze Izrel ozi na-asị, “Emọs na-akwalị izu nzuzo ka ọ megide gị nʼetiti ụlọ Izrel, ala apụghị ibu okwu niile sị ya nʼọnụ apụta. 11 Nke bụ ihe Emọs nọ na-asị,“ ‘Jeroboam aghaghị ịnwụ site na mma agha,Izrel aghakwaghị isite nʼala amụrụ ha jee biri nʼala ọzọ,dịka ndị a dọtara nʼagha.’ ” 12 Mgbe ahụ, Amazaya gwara Emọs, “Gị onye ọhụ ụzọ, gbara ọsọ gbalaa ala Juda. Jee nʼebe ahụ, rie achịcha nke sitere nʼibu amụma gị, nọrọkwa nʼebe ahụ buo amụma gị. 13 Ebula amụma ọzọ na Betel, nʼihi na ọ bụ ebe nsọ nke eze, ọ bụkwa ụlọnsọ ukwu nke alaeze ya.” 14 Mgbe ahụ, Emọs zaghachiri Amazaya, “Ọ dịghị mgbe m bụ onye amụma, abụkwaghị m nwa onye amụma, kama abụ m onye na-elekọta igwe ewu na atụrụ, na onye ọrụ na-azụ osisi sikamọ. 15 Ma ONYENWE ANYỊ sitere nʼebe ịzụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta m, Onyenwe anyị sịrị m: ‘Gaa buoro ndị m Izrel amụma.’ 16 Nʼihi ya, ugbu a nụrụ okwu ONYENWE ANYỊ, ma unu na-asị,“ ‘Ebula amụma megide Izrel,ekwukwala okwu megide ụlọ Aịzik.’ 17 “Ya mere, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“ ‘Nwunye gị ga-aghọ nwanyị na-agba akwụna nʼime obodo.Ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwanyị ka a ga-eji mma agha gbuo.A ga-atụ ala gị nʼihe ọtụtụ, kewasịa ya nye ndị ọzọ,ma gị onwe gị ga-anwụ nʼala rụrụ arụ.A ghakwaghị ịdọta Izrel nʼaghamee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ.’ ”

In Other Versions

Amos 7 in the ANGEFD

Amos 7 in the ANTPNG2D

Amos 7 in the AS21

Amos 7 in the BAGH

Amos 7 in the BBPNG

Amos 7 in the BBT1E

Amos 7 in the BDS

Amos 7 in the BEV

Amos 7 in the BHAD

Amos 7 in the BIB

Amos 7 in the BLPT

Amos 7 in the BNT

Amos 7 in the BNTABOOT

Amos 7 in the BNTLV

Amos 7 in the BOATCB

Amos 7 in the BOATCB2

Amos 7 in the BOBCV

Amos 7 in the BOCNT

Amos 7 in the BOECS

Amos 7 in the BOGWICC

Amos 7 in the BOHCB

Amos 7 in the BOHCV

Amos 7 in the BOHLNT

Amos 7 in the BOHNTLTAL

Amos 7 in the BOILNTAP

Amos 7 in the BOITCV

Amos 7 in the BOKCV

Amos 7 in the BOKCV2

Amos 7 in the BOKHWOG

Amos 7 in the BOKSSV

Amos 7 in the BOLCB

Amos 7 in the BOLCB2

Amos 7 in the BOMCV

Amos 7 in the BONAV

Amos 7 in the BONCB

Amos 7 in the BONLT

Amos 7 in the BONUT2

Amos 7 in the BOPLNT

Amos 7 in the BOSCB

Amos 7 in the BOSNC

Amos 7 in the BOTLNT

Amos 7 in the BOVCB

Amos 7 in the BOYCB

Amos 7 in the BPBB

Amos 7 in the BPH

Amos 7 in the BSB

Amos 7 in the CCB

Amos 7 in the CUV

Amos 7 in the CUVS

Amos 7 in the DBT

Amos 7 in the DGDNT

Amos 7 in the DHNT

Amos 7 in the DNT

Amos 7 in the ELBE

Amos 7 in the EMTV

Amos 7 in the ESV

Amos 7 in the FBV

Amos 7 in the FEB

Amos 7 in the GGMNT

Amos 7 in the GNT

Amos 7 in the HARY

Amos 7 in the HNT

Amos 7 in the IRVA

Amos 7 in the IRVB

Amos 7 in the IRVG

Amos 7 in the IRVH

Amos 7 in the IRVK

Amos 7 in the IRVM

Amos 7 in the IRVM2

Amos 7 in the IRVO

Amos 7 in the IRVP

Amos 7 in the IRVT

Amos 7 in the IRVT2

Amos 7 in the IRVU

Amos 7 in the ISVN

Amos 7 in the JSNT

Amos 7 in the KAPI

Amos 7 in the KBT1ETNIK

Amos 7 in the KBV

Amos 7 in the KJV

Amos 7 in the KNFD

Amos 7 in the LBA

Amos 7 in the LBLA

Amos 7 in the LNT

Amos 7 in the LSV

Amos 7 in the MAAL

Amos 7 in the MBV

Amos 7 in the MBV2

Amos 7 in the MHNT

Amos 7 in the MKNFD

Amos 7 in the MNG

Amos 7 in the MNT

Amos 7 in the MNT2

Amos 7 in the MRS1T

Amos 7 in the NAA

Amos 7 in the NASB

Amos 7 in the NBLA

Amos 7 in the NBS

Amos 7 in the NBVTP

Amos 7 in the NET2

Amos 7 in the NIV11

Amos 7 in the NNT

Amos 7 in the NNT2

Amos 7 in the NNT3

Amos 7 in the PDDPT

Amos 7 in the PFNT

Amos 7 in the RMNT

Amos 7 in the SBIAS

Amos 7 in the SBIBS

Amos 7 in the SBIBS2

Amos 7 in the SBICS

Amos 7 in the SBIDS

Amos 7 in the SBIGS

Amos 7 in the SBIHS

Amos 7 in the SBIIS

Amos 7 in the SBIIS2

Amos 7 in the SBIIS3

Amos 7 in the SBIKS

Amos 7 in the SBIKS2

Amos 7 in the SBIMS

Amos 7 in the SBIOS

Amos 7 in the SBIPS

Amos 7 in the SBISS

Amos 7 in the SBITS

Amos 7 in the SBITS2

Amos 7 in the SBITS3

Amos 7 in the SBITS4

Amos 7 in the SBIUS

Amos 7 in the SBIVS

Amos 7 in the SBT

Amos 7 in the SBT1E

Amos 7 in the SCHL

Amos 7 in the SNT

Amos 7 in the SUSU

Amos 7 in the SUSU2

Amos 7 in the SYNO

Amos 7 in the TBIAOTANT

Amos 7 in the TBT1E

Amos 7 in the TBT1E2

Amos 7 in the TFTIP

Amos 7 in the TFTU

Amos 7 in the TGNTATF3T

Amos 7 in the THAI

Amos 7 in the TNFD

Amos 7 in the TNT

Amos 7 in the TNTIK

Amos 7 in the TNTIL

Amos 7 in the TNTIN

Amos 7 in the TNTIP

Amos 7 in the TNTIZ

Amos 7 in the TOMA

Amos 7 in the TTENT

Amos 7 in the UBG

Amos 7 in the UGV

Amos 7 in the UGV2

Amos 7 in the UGV3

Amos 7 in the VBL

Amos 7 in the VDCC

Amos 7 in the YALU

Amos 7 in the YAPE

Amos 7 in the YBVTP

Amos 7 in the ZBP