Daniel 7 (BOICB)

1 Nʼafọ mbụ, mgbe Belshaza bidoro ịchị ala Babilọn, Daniel rọrọ nrọ, hụkwa ọhụ dị iche iche, o dere ihe ndị ahụ nʼakwụkwọ. 2 “Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri. 3 Anụ ọhịa anọ buru ibu si nʼime osimiri ahụ rịpụta. O nweghị nke yiri ibe ya. 4 “Nke mbụ dị ka ọdụm, kama o nwere nku dịka ugo. Mgbe m nọ na-ele ya anya, a nyakapụrụ nku ya, welie ya, hapụ ya ka o guzo nʼelu ala nʼụkwụ ya abụọ dịka mmadụ. E nyekwara ya ụdị obi nke mmadụ nwere. 5 “Anụ ọhịa nke abụọ yiri anụ ọhịa buru ibu a na-akpọ bịa (nʼasụsụ bekee). E weliri ya nʼotu akụkụ, ọ kpụkwa ọgịrịga atọ nʼọnụ ya, nʼetiti eze ya. A gwara ya, ‘Bilie, rie anụ ka o si dị gị mma.’ 6 “Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị. 7 “Mgbe nke a gasịrị, nʼime ọhụ nke abalị, ahụrụ m anụ ọhịa nke anọ. Anụ ọhịa a na-eyi oke egwu, ọnụ apụghị ịkọwa ihe o yiri. Ọ bụkwa anụ ọhịa dị nnọọ ike, nke na-eji eze igwe ya dị ukwuu na-adọwasị ma na-etipịasịkwa ihe ọbụla, nke na-ejikwa ụkwụ ya azọgbu ihe ọbụla fọdụrụ. Ọ bụ anụ ọhịa gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, bụrụkwa anụ nwere mpi iri. 8 “Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya. Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi. 9 “Anọkwa m na-ele anya“hụ ka e doziri ocheeze,ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ.Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo,agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha.Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ,ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ. 10 Iyi na-asọ ka ọkụsi nʼihu ya na-asọpụta.Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi.Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya.Ndị ikpe nọdụrụ ala,asaghekwara akwụkwọ dị iche iche. 11 “Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ. 12 (Gbasara ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa nʼihu nwantakịrị oge). 13 “Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya. 14 E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya. 15 “Mụ onwe m, bụ Daniel, ọhụ a m hụrụ tụrụ mmụọ m ụjọ nke ukwuu, mekwa ka obi m ma jijiji. 16 Ejekwuuru m otu nʼime ndị guzo nʼebe ahụ nso jụọ ya ihe ihe ndị a niile pụtara.“Ọ gwara m ma kọwakwara m ihe ihe ndị a pụtara. 17 ‘Anụ ọhịa anọ ndị a bụ alaeze anọ nke ga-ebili nʼụwa. 18 Ma ọ bụ ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ga-anara alaeze. Ọ ga-abụkwa nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’ 19 “Mgbe ahụ, achọrọ m ịmata ihe banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, nke ahụ gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, na-eyikwa oke egwu, nke nwere eze dịka igwe, na mbọ yiri nke e ji bronz kpụọ. Nke ahụ na-adọwasị ndị mmadụ, na nke na-azọgbukwa ndị fọdụrụ. 20 Asịkwa m ya kọwaara m ihe mpi iri ahụ dị ya nʼisi pụtara, na ihe banyere mpi nke ọzọ puputara, na ihe mere e ji nyakapụ mpi atọ ahụ nʼihi ya. Asị m ya kọwakwara m ihe banyere mpi ahụ, nke nwere anya, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi, ma dịkwa ka ọ dị ike karịa ndị ọzọ. 21 Mgbe m na-ele anya, ahụrụ m ka mpi a na-alụso ndị nsọ ọgụ na-emerikwa. 22 Tutu ruo mgbe onye ahụ na-adị site na mbụ bịara kpee ikpe nke gaara ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ma oge bịakwara mgbe ha natara alaeze ahụ. 23 “Nke a bụ ihe o kwuru: ‘Anụ ọhịa nke anọ a bụ alaeze nke ga-apụta nʼụwa. Ọ ga-adị iche site nʼalaeze ndị ọzọ. Ọ ga-azọpịa, kụrie, ma bibiekwa ụwa niile. 24 Mpi iri ahụ nọchiri anya ndị eze iri ga-esi nʼalaeze ya pụta. Mgbe ndị eze a ga na-achị, eze ọzọ, nke dị iche site na ndị bụrụ ya ụzọ ga-ebilikwa, ma merie ndị eze atọ ndị ọzọ ahụ ma laa ha nʼiyi. 25 Ọ ga-ekwu okwu kwugide Onye kachasị ihe niile elu. O ga-emekpa ndị nsọ ahụ. Ọ ga-agbalịkwa ịgbanwe iwu niile na omenaala niile. A ga-enyefe ndị nsọ nʼaka ya afọ atọ na ọkara. 26 “ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam. 27 Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’ 28 “Nke a bụ ọgwụgwụ okwu ahụ. Mụ onwe m, bụ Daniel, echiche m mere ka m tụọ egwu nke ukwu, ihu m gbanwere dịka onye ahụ na-adịghị, ma o nweghị onye ọbụla m gwara ihe m hụrụ.”

In Other Versions

Daniel 7 in the ANGEFD

Daniel 7 in the ANTPNG2D

Daniel 7 in the AS21

Daniel 7 in the BAGH

Daniel 7 in the BBPNG

Daniel 7 in the BBT1E

Daniel 7 in the BDS

Daniel 7 in the BEV

Daniel 7 in the BHAD

Daniel 7 in the BIB

Daniel 7 in the BLPT

Daniel 7 in the BNT

Daniel 7 in the BNTABOOT

Daniel 7 in the BNTLV

Daniel 7 in the BOATCB

Daniel 7 in the BOATCB2

Daniel 7 in the BOBCV

Daniel 7 in the BOCNT

Daniel 7 in the BOECS

Daniel 7 in the BOGWICC

Daniel 7 in the BOHCB

Daniel 7 in the BOHCV

Daniel 7 in the BOHLNT

Daniel 7 in the BOHNTLTAL

Daniel 7 in the BOILNTAP

Daniel 7 in the BOITCV

Daniel 7 in the BOKCV

Daniel 7 in the BOKCV2

Daniel 7 in the BOKHWOG

Daniel 7 in the BOKSSV

Daniel 7 in the BOLCB

Daniel 7 in the BOLCB2

Daniel 7 in the BOMCV

Daniel 7 in the BONAV

Daniel 7 in the BONCB

Daniel 7 in the BONLT

Daniel 7 in the BONUT2

Daniel 7 in the BOPLNT

Daniel 7 in the BOSCB

Daniel 7 in the BOSNC

Daniel 7 in the BOTLNT

Daniel 7 in the BOVCB

Daniel 7 in the BOYCB

Daniel 7 in the BPBB

Daniel 7 in the BPH

Daniel 7 in the BSB

Daniel 7 in the CCB

Daniel 7 in the CUV

Daniel 7 in the CUVS

Daniel 7 in the DBT

Daniel 7 in the DGDNT

Daniel 7 in the DHNT

Daniel 7 in the DNT

Daniel 7 in the ELBE

Daniel 7 in the EMTV

Daniel 7 in the ESV

Daniel 7 in the FBV

Daniel 7 in the FEB

Daniel 7 in the GGMNT

Daniel 7 in the GNT

Daniel 7 in the HARY

Daniel 7 in the HNT

Daniel 7 in the IRVA

Daniel 7 in the IRVB

Daniel 7 in the IRVG

Daniel 7 in the IRVH

Daniel 7 in the IRVK

Daniel 7 in the IRVM

Daniel 7 in the IRVM2

Daniel 7 in the IRVO

Daniel 7 in the IRVP

Daniel 7 in the IRVT

Daniel 7 in the IRVT2

Daniel 7 in the IRVU

Daniel 7 in the ISVN

Daniel 7 in the JSNT

Daniel 7 in the KAPI

Daniel 7 in the KBT1ETNIK

Daniel 7 in the KBV

Daniel 7 in the KJV

Daniel 7 in the KNFD

Daniel 7 in the LBA

Daniel 7 in the LBLA

Daniel 7 in the LNT

Daniel 7 in the LSV

Daniel 7 in the MAAL

Daniel 7 in the MBV

Daniel 7 in the MBV2

Daniel 7 in the MHNT

Daniel 7 in the MKNFD

Daniel 7 in the MNG

Daniel 7 in the MNT

Daniel 7 in the MNT2

Daniel 7 in the MRS1T

Daniel 7 in the NAA

Daniel 7 in the NASB

Daniel 7 in the NBLA

Daniel 7 in the NBS

Daniel 7 in the NBVTP

Daniel 7 in the NET2

Daniel 7 in the NIV11

Daniel 7 in the NNT

Daniel 7 in the NNT2

Daniel 7 in the NNT3

Daniel 7 in the PDDPT

Daniel 7 in the PFNT

Daniel 7 in the RMNT

Daniel 7 in the SBIAS

Daniel 7 in the SBIBS

Daniel 7 in the SBIBS2

Daniel 7 in the SBICS

Daniel 7 in the SBIDS

Daniel 7 in the SBIGS

Daniel 7 in the SBIHS

Daniel 7 in the SBIIS

Daniel 7 in the SBIIS2

Daniel 7 in the SBIIS3

Daniel 7 in the SBIKS

Daniel 7 in the SBIKS2

Daniel 7 in the SBIMS

Daniel 7 in the SBIOS

Daniel 7 in the SBIPS

Daniel 7 in the SBISS

Daniel 7 in the SBITS

Daniel 7 in the SBITS2

Daniel 7 in the SBITS3

Daniel 7 in the SBITS4

Daniel 7 in the SBIUS

Daniel 7 in the SBIVS

Daniel 7 in the SBT

Daniel 7 in the SBT1E

Daniel 7 in the SCHL

Daniel 7 in the SNT

Daniel 7 in the SUSU

Daniel 7 in the SUSU2

Daniel 7 in the SYNO

Daniel 7 in the TBIAOTANT

Daniel 7 in the TBT1E

Daniel 7 in the TBT1E2

Daniel 7 in the TFTIP

Daniel 7 in the TFTU

Daniel 7 in the TGNTATF3T

Daniel 7 in the THAI

Daniel 7 in the TNFD

Daniel 7 in the TNT

Daniel 7 in the TNTIK

Daniel 7 in the TNTIL

Daniel 7 in the TNTIN

Daniel 7 in the TNTIP

Daniel 7 in the TNTIZ

Daniel 7 in the TOMA

Daniel 7 in the TTENT

Daniel 7 in the UBG

Daniel 7 in the UGV

Daniel 7 in the UGV2

Daniel 7 in the UGV3

Daniel 7 in the VBL

Daniel 7 in the VDCC

Daniel 7 in the YALU

Daniel 7 in the YAPE

Daniel 7 in the YBVTP

Daniel 7 in the ZBP