Deuteronomy 12 (BOICB)

1 Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ niile unu na-aghaghị idebe ogologo ụbọchị niile unu ga-ebi nʼala ahụ, ONYENWE ANYỊ Chineke nna unu ha nyere unu, dịka ihe nweta. 2 Tikpọọnụ ebe niile nke dị nʼelu ugwu niile dị elu na nʼelu ugwu niile dị nta, nakwa nʼokpuru osisi mgbasa ọbụla, bụ ebe mba niile unu na-anapụ ala ha fere chi niile ha ofufe. 3 Kwatuokwanụ ebe ịchụ aja ha niile, tijisie ogidi nsọ ha niile, kpọọkwa osisi Ashera ha ọkụ, gbutukwaanụ arụsị niile a apịrị apị nke chi niile ha. Kpochapụkwanụ aha ha niile site nʼebe niile ahụ. 4 Unu agaghị efe ONYENWE ANYỊ Chineke unu ofufe dịka ndị ahụ na-efe arụsị na-eme. 5 Kama unu chọpụta ebe ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu ga-ahọpụta, site nʼetiti ebo Izrel niile, ebe ọ ga-akpọkwasị aha ya. Nʼebe ahụ ka unu ga-abịakwute ya. 6 Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka unu ga-ewetara ONYENWE ANYỊ aja nsure ọkụ unu, na aja ndị ọzọ niile, na otu ụzọ nʼụzọ iri unu, na onyinye pụrụ iche unu, bụ onyinye unu kwere nkwa inye, na onyinye afọ ofufu unu, na onyinye ụmụ mbụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ unu. 7 Unu na ezinaụlọ unu ga-anọkwa nʼebe ahụ, nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke unu, rie oriri unu. Nʼihu ya kwa ka unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, nʼihi ihe niile ahụ unu setịpụrụ aka unu ime, na nʼihi ngọzị ONYENWE ANYỊ Chineke unu gọziri unu. 8 Unu agaghị emekwa ihe masịrị unu, dịka unu si eme taa, nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọbụla o chere na o ziri ezi nʼanya ya, 9 nʼihi na iwu ndị a ebidobeghị ịdị ire, ebe ọ bụ na unu abanyebeghị nʼebe izuike ahụ, na ihe nketa ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu na-enye unu. 10 Kama, mgbe unu gafere osimiri Jọdan, birikwa nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu na-enye unu dịka ihe nketa, mgbe ONYENWE ANYỊ nyere unu izuike, meekwa ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị iro unu nọ. 11 Mgbe ahụ, unu ga-eweta ihe ndị ahụ niile m nyere unu nʼiwu: aja nsure ọkụ unu niile, na aja ndị ọzọ, na onyinye ahụ pụrụ iche unu kwere nkwa inye, unu ga-eweta ya nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu họpụtara ebe o kpọkwasịrị aha ya. 12 Unu na ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị bi nʼobodo unu, ndị na-enweghị ihe nketa nke aka ha, ga-anọ nʼebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 13 Ị gaghị achụ aja nsure ọkụ gị nʼebe ọbụla masịrị gị, 14 ọ bụ naanị nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ ga-ahọpụta. Ọ ga-ahọpụta otu ebe, nʼala otu ebo. Ọ bụ naanị nʼebe ahụ ka ị ga-esure aja unu niile, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka ị ga-eweta onyinye gị niile. 15 Otu ọ dị, ị pụrụ ịnọ nʼebe ọbụla gbuo anụ ị ga-eri, dịka ọ bụ ele maọbụ mgbada ugbu a. Rie anụ mgbe ọbụla ọ gụrụ gị agụụ, na-erikwa ya mgbe ọbụla i nwetara ya, dịka ngọzị ONYENWE ANYỊ Chineke unu na-enye unu. Ma onye dị ọcha, ma onye na-adịghị ọcha nwere ike iso rie ya. 16 Naanị iwu dị nʼiri anụ ndị a bụ na ị gaghị eri ọbara ya, wụsa ọbara ya nʼala, dịka mmiri. 17 Ma o nweghị onyinye ọbụla a na-enye ONYENWE ANYỊ i kwesiri ịnọ nʼụlọ gị rie. I kwesighị ịnọ nʼụlọ gị rie onyinye ndị a: onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka na mmanya ọhụrụ gị, na nke mmanụ oliv, na ụmụ mbụ nke igwe ehi na igwe ewu na atụrụ gị, na ihe ọbụla i kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu gị, na onyinye ndị ọzọ pụrụ iche. 18 Kama unu ga-eri ha nʼihu ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu, nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu ga-ahọpụta, gị onwe gị, na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwanyị, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị si nʼobodo unu niile, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihu ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu, nʼihe niile aka gị rụpụtara. 19 Echefukwala ndị Livayị, gị na ha ga na-enwekọ ihe ndị a niile, ogologo ụbọchị niile i biri nʼala ahụ. 20 Mgbe ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke gị mere ka oke ala gị saa mbara, dịka o kwere gị na nkwa, i nwee oke agụụ maka iri anụ na-asị, “Achọrọ m iri anụ,” mgbe ahụ, i nwere ike rie anụ dịka i si chọọ. 21 Ọ bụrụ nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị kpọkwasịrị aha ya dị gị anya site nʼebe i nọ, i nwere ike gbuo anụ ụlọ site nʼigwe ehi maọbụ ewu na atụrụ nke ONYENWE ANYỊ nyere gị, dịka m si nye gị nʼiwu. Gbuo ha nʼobodo ebe i bi, riekwa ha otu ị chọrọ. 22 Rie ha dịka ị ga-esi rie ele maọbụ mgbada. Onye ọbụla nʼime unu nwere ike rie ya, ma onye dị ọcha ma onye na-adịghị ọcha. 23 Ma lezie anya hụ na i righị ọbara, nʼihi na ndụ dị nʼọbara. Ị gaghị erikọta anụ ọbụla na ndụ ya. 24 Erila ọbara, wụsa ya nʼala dịka mmiri. 25 Erila ya, ka ihe si otu a gaara gị na ụmụ ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ị na-eme ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ. 26 Ma were ihe ndị ahụ niile i doro nsọ, ya na ihe ọbụla i kwere ONYENWE ANYỊ na nkwa gaa nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ ga-ahọpụta. 27 Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ONYENWE ANYỊ Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke ONYENWE ANYỊ Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja. 28 Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya ONYENWE ANYỊ Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme. 29 ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-ala mba niile bi nʼala ahụ ị na-aga ibuso agha nʼiyi. Ma mgbe i si nʼala ahụ chụpụ ha, ị ga-ebichi nʼala ha. 30 Mgbe ị lachara ha nʼiyi, lezie anya ka ị ghara ịma nʼọnya, site nʼịjụ ajụjụ ka ịjụpụta otu ha si efe chi ha, na-asị, “Mba ndị a o si aṅaa na-efe chi ha ofufe? Anyị ga-emekwa otu a.” 31 Efekwala ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị dịka ha si efe chi ha, nʼihi na mgbe ha na-efe chi ha ofufe, ha na-eme ihe arụ dị iche iche nke ONYENWE ANYỊ kpọrọ asị. Ọ bụladị ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ka ha na-esure nʼọkụ nye chi ha dị iche iche dịka aja. 32 Lezienụ anya hụ na unu na-eme ihe niile bụ nke m nyere unu nʼiwu. Unu etinyela ihe nʼime ya maọbụ wepụkwa ihe site na ya.

In Other Versions

Deuteronomy 12 in the ANGEFD

Deuteronomy 12 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 12 in the AS21

Deuteronomy 12 in the BAGH

Deuteronomy 12 in the BBPNG

Deuteronomy 12 in the BBT1E

Deuteronomy 12 in the BDS

Deuteronomy 12 in the BEV

Deuteronomy 12 in the BHAD

Deuteronomy 12 in the BIB

Deuteronomy 12 in the BLPT

Deuteronomy 12 in the BNT

Deuteronomy 12 in the BNTABOOT

Deuteronomy 12 in the BNTLV

Deuteronomy 12 in the BOATCB

Deuteronomy 12 in the BOATCB2

Deuteronomy 12 in the BOBCV

Deuteronomy 12 in the BOCNT

Deuteronomy 12 in the BOECS

Deuteronomy 12 in the BOGWICC

Deuteronomy 12 in the BOHCB

Deuteronomy 12 in the BOHCV

Deuteronomy 12 in the BOHLNT

Deuteronomy 12 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 12 in the BOILNTAP

Deuteronomy 12 in the BOITCV

Deuteronomy 12 in the BOKCV

Deuteronomy 12 in the BOKCV2

Deuteronomy 12 in the BOKHWOG

Deuteronomy 12 in the BOKSSV

Deuteronomy 12 in the BOLCB

Deuteronomy 12 in the BOLCB2

Deuteronomy 12 in the BOMCV

Deuteronomy 12 in the BONAV

Deuteronomy 12 in the BONCB

Deuteronomy 12 in the BONLT

Deuteronomy 12 in the BONUT2

Deuteronomy 12 in the BOPLNT

Deuteronomy 12 in the BOSCB

Deuteronomy 12 in the BOSNC

Deuteronomy 12 in the BOTLNT

Deuteronomy 12 in the BOVCB

Deuteronomy 12 in the BOYCB

Deuteronomy 12 in the BPBB

Deuteronomy 12 in the BPH

Deuteronomy 12 in the BSB

Deuteronomy 12 in the CCB

Deuteronomy 12 in the CUV

Deuteronomy 12 in the CUVS

Deuteronomy 12 in the DBT

Deuteronomy 12 in the DGDNT

Deuteronomy 12 in the DHNT

Deuteronomy 12 in the DNT

Deuteronomy 12 in the ELBE

Deuteronomy 12 in the EMTV

Deuteronomy 12 in the ESV

Deuteronomy 12 in the FBV

Deuteronomy 12 in the FEB

Deuteronomy 12 in the GGMNT

Deuteronomy 12 in the GNT

Deuteronomy 12 in the HARY

Deuteronomy 12 in the HNT

Deuteronomy 12 in the IRVA

Deuteronomy 12 in the IRVB

Deuteronomy 12 in the IRVG

Deuteronomy 12 in the IRVH

Deuteronomy 12 in the IRVK

Deuteronomy 12 in the IRVM

Deuteronomy 12 in the IRVM2

Deuteronomy 12 in the IRVO

Deuteronomy 12 in the IRVP

Deuteronomy 12 in the IRVT

Deuteronomy 12 in the IRVT2

Deuteronomy 12 in the IRVU

Deuteronomy 12 in the ISVN

Deuteronomy 12 in the JSNT

Deuteronomy 12 in the KAPI

Deuteronomy 12 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 12 in the KBV

Deuteronomy 12 in the KJV

Deuteronomy 12 in the KNFD

Deuteronomy 12 in the LBA

Deuteronomy 12 in the LBLA

Deuteronomy 12 in the LNT

Deuteronomy 12 in the LSV

Deuteronomy 12 in the MAAL

Deuteronomy 12 in the MBV

Deuteronomy 12 in the MBV2

Deuteronomy 12 in the MHNT

Deuteronomy 12 in the MKNFD

Deuteronomy 12 in the MNG

Deuteronomy 12 in the MNT

Deuteronomy 12 in the MNT2

Deuteronomy 12 in the MRS1T

Deuteronomy 12 in the NAA

Deuteronomy 12 in the NASB

Deuteronomy 12 in the NBLA

Deuteronomy 12 in the NBS

Deuteronomy 12 in the NBVTP

Deuteronomy 12 in the NET2

Deuteronomy 12 in the NIV11

Deuteronomy 12 in the NNT

Deuteronomy 12 in the NNT2

Deuteronomy 12 in the NNT3

Deuteronomy 12 in the PDDPT

Deuteronomy 12 in the PFNT

Deuteronomy 12 in the RMNT

Deuteronomy 12 in the SBIAS

Deuteronomy 12 in the SBIBS

Deuteronomy 12 in the SBIBS2

Deuteronomy 12 in the SBICS

Deuteronomy 12 in the SBIDS

Deuteronomy 12 in the SBIGS

Deuteronomy 12 in the SBIHS

Deuteronomy 12 in the SBIIS

Deuteronomy 12 in the SBIIS2

Deuteronomy 12 in the SBIIS3

Deuteronomy 12 in the SBIKS

Deuteronomy 12 in the SBIKS2

Deuteronomy 12 in the SBIMS

Deuteronomy 12 in the SBIOS

Deuteronomy 12 in the SBIPS

Deuteronomy 12 in the SBISS

Deuteronomy 12 in the SBITS

Deuteronomy 12 in the SBITS2

Deuteronomy 12 in the SBITS3

Deuteronomy 12 in the SBITS4

Deuteronomy 12 in the SBIUS

Deuteronomy 12 in the SBIVS

Deuteronomy 12 in the SBT

Deuteronomy 12 in the SBT1E

Deuteronomy 12 in the SCHL

Deuteronomy 12 in the SNT

Deuteronomy 12 in the SUSU

Deuteronomy 12 in the SUSU2

Deuteronomy 12 in the SYNO

Deuteronomy 12 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 12 in the TBT1E

Deuteronomy 12 in the TBT1E2

Deuteronomy 12 in the TFTIP

Deuteronomy 12 in the TFTU

Deuteronomy 12 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 12 in the THAI

Deuteronomy 12 in the TNFD

Deuteronomy 12 in the TNT

Deuteronomy 12 in the TNTIK

Deuteronomy 12 in the TNTIL

Deuteronomy 12 in the TNTIN

Deuteronomy 12 in the TNTIP

Deuteronomy 12 in the TNTIZ

Deuteronomy 12 in the TOMA

Deuteronomy 12 in the TTENT

Deuteronomy 12 in the UBG

Deuteronomy 12 in the UGV

Deuteronomy 12 in the UGV2

Deuteronomy 12 in the UGV3

Deuteronomy 12 in the VBL

Deuteronomy 12 in the VDCC

Deuteronomy 12 in the YALU

Deuteronomy 12 in the YAPE

Deuteronomy 12 in the YBVTP

Deuteronomy 12 in the ZBP