Deuteronomy 7 (BOICB)

1 Mgbe ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-akpọbata unu nʼala ahụ unu na-abanye inweta, mgbe o si nʼihu unu chụpụ ọtụtụ mba ndị a nʼihu unu, bụ ndị Het, ndị Gigash, ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus, bụ mba asaa ndị dị ike nke ukwuu, baakwa ụba karịa unu; 2 mgbe ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu nyefere ha nʼaka unu, unu meriekwa ha, lezienụ anya hụ na unu bibiri ha kpamkpam. Ka unu na ha ghara ịgba ndụ, unu emekwarala ha ebere. 3 Unu na ha alụrịtakwala di na nwunye, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụọ, maọbụ lụtara ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom. 4 Nʼihi na nke a ga-eme ka ụmụ unu site nʼiso m tụgharịa, malite ife chi ndị ọzọ. Mgbe ahụ iwe ONYENWE ANYỊ ga-adị ọkụ megide unu, laakwa unu nʼiyi ngwangwa. 5 Kama otu a ka unu ga-eme: tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha, ma suo arụsị ha niile ọkụ. 6 Nʼihi na unu bụ ndị dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu. ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ahọpụtala unu site nʼagbụrụ niile dị nʼụwa a, ka unu bụrụ ndị nke ya, ihe onwunwe ya dị oke ọnụahịa. 7 Ọ bụghị nʼihi na unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị mba ọzọ, ka ONYENWE ANYỊ ji họpụta unu, hụ unu nʼanya otu a, nʼezie unu dịkarịsịrị nta nʼọnụọgụgụ. 8 Kama, ọ bụ nʼihi ONYENWE ANYỊ hụrụ unu nʼanya, mezuokwa iyi ọ ṅụrụ nye nna nna unu ha, ka o ji site nʼaka ya dị ike gbapụta unu site nʼala ebe unu bụ ndị ohu, site nʼike nke Fero, bụ eze Ijipt. 9 Matanụ nke ọma na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kwesiri ntụkwasị obi, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya ruo puku ọgbọ, nye ndị niile hụrụ ya nʼanya, ndị na-edebe ihe niile o nyere nʼiwu. 10 Maonye kpọrọ ya asị, ọ na-eji mbibi kwụghachi ya ụgwọ nʼihu ya,ọ gaghị egbu oge ịkwụghachi onye kpọrọ ya asị ụgwọ nʼihu ha. 11 Nʼihi ya, hụ na unu debezuru iwu na ụkpụrụ ndị a m na-enye unu taa. 12 Ọ bụrụ na unu elezie anya, ṅaa ntị nʼiwu ndị a, debe ha, ma mezuokwa ha, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-emezuru unu ọgbụgba ndụ ịhụnanya ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha. 13 Ọ ga-ahụ unu nʼanya, gọzie unu, meekwa ka unu baa ụba nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-agọzi unu nʼọmụmụ, gọzie ihe ọkụkụ nke ala unu, ọka unu, na mmanya ọhụrụ unu, na mmanụ unu, na ụmụ ehi unu mụrụ, na ụmụ igwe atụrụ unu mụrụ, nʼala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu ha iyi inye unu. 14 A ga-agọzi unu karịa mba ndị ọzọ niile dị nʼụwa. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị ga-anọ na-amụtaghị nwa, ọ dịkwaghị anụ ụlọ unu ga-agba aka nwa. 15 ONYENWE ANYỊ ga-ewepụrụ unu ọrịa niile. Ọ gaghị ekwe ka ọrịa ndị Ijipt ọbụla, nke unu na-echeta nke ọma dakwasị unu, ọrịa ndị a niile ka ọ ga-eme ka ọ bịakwasị ndị iro unu! 16 Mba ọbụla ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu nyefere unu nʼaka ka unu ga-ala nʼiyi. Unu emerela ha ebere, unu efekwala chi niile ha, nʼihi na nke a ga-abụrụ unu ihe ịma nʼọnya. 17 Ma eleghị anya, unu ga na-eche nʼime onwe unu sị, “Mba ndị a dị ike karịa anyị, olee otu anyị ga-esi chụpụ ha?” 18 Ma unu atụla egwu! Naanị chetanụ ihe ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu mere Fero na ndị Ijipt niile. 19 Unu ji anya unu hụ ọnwụnwa ukwuu niile, ihe ịrịbama niile na ihe ebube niile, nʼaka ahụ dị ike na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, nke ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ji kpọpụta unu. ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ga-emekwa otu ihe ahụ nʼebe ndị niile a unu na-atụ egwu ugbu a. 20 Karịsịa, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ga-ezipụ ebu nʼetiti ha tutu ruo mgbe ọ bụladị ndị fọdụrụ ndụ, ndị ahụ ga-ezo onwe ha site nʼebe unu nọ, ghọrọ ndị e bibiri. 21 Unu amala jijiji nʼihu ha, nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu bụ Chineke dị ukwuu, dịkwa egwu. 22 ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu, ga-achụpụ mba ndị a ntakịrị ntakịrị. Ọ gaghị ekwe ka unu chụpụ ha otu ugboro, ma ọ bụghị ya, ụmụ anụ ọhịa ọjọọ ga-amụba megide unu. 23 ONYENWE ANYỊ Chineke unu ga-enyefe ha nʼaka unu, ọ ga-etinye ha oke ọgbaaghara nʼobi, tutu ruo mgbe ha lara nʼiyi. 24 Eze ha niile ka ọ ga-enyefe nʼaka unu, unu ga-ehichapụkwa aha ha nʼelu ụwa. Ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzo nʼihu unu, nʼihi na unu ga-ebibi ha niile. 25 Kpọọnụ arụsị niile nke apịrị apị nke chi niile ha ọkụ. Unu enwela anya ukwu nʼebe ọlaọcha maọbụ ọlaedo dị ha nʼahụ dị. Unu ewerela ya ka ọ bụrụ nke unu, ka unu ghara ịbụ ndị ọ matara nʼọnya, nʼihi na ọ bụ ihe arụ nye ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu. 26 Unu ewebatala ihe arụ ọbụla nʼụlọ unu, ka unu ghara ịbụ ihe e debere iche nye mbibi dịka ya. Kpọọnụ ihe arụ ahụ asị, ledakwanụ ya anya, nʼihi na ihe e debere iche nye mbibi ka ọ bụ.

In Other Versions

Deuteronomy 7 in the ANGEFD

Deuteronomy 7 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 7 in the AS21

Deuteronomy 7 in the BAGH

Deuteronomy 7 in the BBPNG

Deuteronomy 7 in the BBT1E

Deuteronomy 7 in the BDS

Deuteronomy 7 in the BEV

Deuteronomy 7 in the BHAD

Deuteronomy 7 in the BIB

Deuteronomy 7 in the BLPT

Deuteronomy 7 in the BNT

Deuteronomy 7 in the BNTABOOT

Deuteronomy 7 in the BNTLV

Deuteronomy 7 in the BOATCB

Deuteronomy 7 in the BOATCB2

Deuteronomy 7 in the BOBCV

Deuteronomy 7 in the BOCNT

Deuteronomy 7 in the BOECS

Deuteronomy 7 in the BOGWICC

Deuteronomy 7 in the BOHCB

Deuteronomy 7 in the BOHCV

Deuteronomy 7 in the BOHLNT

Deuteronomy 7 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 7 in the BOILNTAP

Deuteronomy 7 in the BOITCV

Deuteronomy 7 in the BOKCV

Deuteronomy 7 in the BOKCV2

Deuteronomy 7 in the BOKHWOG

Deuteronomy 7 in the BOKSSV

Deuteronomy 7 in the BOLCB

Deuteronomy 7 in the BOLCB2

Deuteronomy 7 in the BOMCV

Deuteronomy 7 in the BONAV

Deuteronomy 7 in the BONCB

Deuteronomy 7 in the BONLT

Deuteronomy 7 in the BONUT2

Deuteronomy 7 in the BOPLNT

Deuteronomy 7 in the BOSCB

Deuteronomy 7 in the BOSNC

Deuteronomy 7 in the BOTLNT

Deuteronomy 7 in the BOVCB

Deuteronomy 7 in the BOYCB

Deuteronomy 7 in the BPBB

Deuteronomy 7 in the BPH

Deuteronomy 7 in the BSB

Deuteronomy 7 in the CCB

Deuteronomy 7 in the CUV

Deuteronomy 7 in the CUVS

Deuteronomy 7 in the DBT

Deuteronomy 7 in the DGDNT

Deuteronomy 7 in the DHNT

Deuteronomy 7 in the DNT

Deuteronomy 7 in the ELBE

Deuteronomy 7 in the EMTV

Deuteronomy 7 in the ESV

Deuteronomy 7 in the FBV

Deuteronomy 7 in the FEB

Deuteronomy 7 in the GGMNT

Deuteronomy 7 in the GNT

Deuteronomy 7 in the HARY

Deuteronomy 7 in the HNT

Deuteronomy 7 in the IRVA

Deuteronomy 7 in the IRVB

Deuteronomy 7 in the IRVG

Deuteronomy 7 in the IRVH

Deuteronomy 7 in the IRVK

Deuteronomy 7 in the IRVM

Deuteronomy 7 in the IRVM2

Deuteronomy 7 in the IRVO

Deuteronomy 7 in the IRVP

Deuteronomy 7 in the IRVT

Deuteronomy 7 in the IRVT2

Deuteronomy 7 in the IRVU

Deuteronomy 7 in the ISVN

Deuteronomy 7 in the JSNT

Deuteronomy 7 in the KAPI

Deuteronomy 7 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 7 in the KBV

Deuteronomy 7 in the KJV

Deuteronomy 7 in the KNFD

Deuteronomy 7 in the LBA

Deuteronomy 7 in the LBLA

Deuteronomy 7 in the LNT

Deuteronomy 7 in the LSV

Deuteronomy 7 in the MAAL

Deuteronomy 7 in the MBV

Deuteronomy 7 in the MBV2

Deuteronomy 7 in the MHNT

Deuteronomy 7 in the MKNFD

Deuteronomy 7 in the MNG

Deuteronomy 7 in the MNT

Deuteronomy 7 in the MNT2

Deuteronomy 7 in the MRS1T

Deuteronomy 7 in the NAA

Deuteronomy 7 in the NASB

Deuteronomy 7 in the NBLA

Deuteronomy 7 in the NBS

Deuteronomy 7 in the NBVTP

Deuteronomy 7 in the NET2

Deuteronomy 7 in the NIV11

Deuteronomy 7 in the NNT

Deuteronomy 7 in the NNT2

Deuteronomy 7 in the NNT3

Deuteronomy 7 in the PDDPT

Deuteronomy 7 in the PFNT

Deuteronomy 7 in the RMNT

Deuteronomy 7 in the SBIAS

Deuteronomy 7 in the SBIBS

Deuteronomy 7 in the SBIBS2

Deuteronomy 7 in the SBICS

Deuteronomy 7 in the SBIDS

Deuteronomy 7 in the SBIGS

Deuteronomy 7 in the SBIHS

Deuteronomy 7 in the SBIIS

Deuteronomy 7 in the SBIIS2

Deuteronomy 7 in the SBIIS3

Deuteronomy 7 in the SBIKS

Deuteronomy 7 in the SBIKS2

Deuteronomy 7 in the SBIMS

Deuteronomy 7 in the SBIOS

Deuteronomy 7 in the SBIPS

Deuteronomy 7 in the SBISS

Deuteronomy 7 in the SBITS

Deuteronomy 7 in the SBITS2

Deuteronomy 7 in the SBITS3

Deuteronomy 7 in the SBITS4

Deuteronomy 7 in the SBIUS

Deuteronomy 7 in the SBIVS

Deuteronomy 7 in the SBT

Deuteronomy 7 in the SBT1E

Deuteronomy 7 in the SCHL

Deuteronomy 7 in the SNT

Deuteronomy 7 in the SUSU

Deuteronomy 7 in the SUSU2

Deuteronomy 7 in the SYNO

Deuteronomy 7 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 7 in the TBT1E

Deuteronomy 7 in the TBT1E2

Deuteronomy 7 in the TFTIP

Deuteronomy 7 in the TFTU

Deuteronomy 7 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 7 in the THAI

Deuteronomy 7 in the TNFD

Deuteronomy 7 in the TNT

Deuteronomy 7 in the TNTIK

Deuteronomy 7 in the TNTIL

Deuteronomy 7 in the TNTIN

Deuteronomy 7 in the TNTIP

Deuteronomy 7 in the TNTIZ

Deuteronomy 7 in the TOMA

Deuteronomy 7 in the TTENT

Deuteronomy 7 in the UBG

Deuteronomy 7 in the UGV

Deuteronomy 7 in the UGV2

Deuteronomy 7 in the UGV3

Deuteronomy 7 in the VBL

Deuteronomy 7 in the VDCC

Deuteronomy 7 in the YALU

Deuteronomy 7 in the YAPE

Deuteronomy 7 in the YBVTP

Deuteronomy 7 in the ZBP