Esther 1 (BOICB)

1 Nke a bụ ihe mere nʼoge ọchịchị eze Sekses, bụ Sekses nke chiri alaeze nwere mpaghara dị iche iche nke karịrị otu narị na iri abụọ na asaa (127), nke gbasakwara site nʼIndia rụọ Kush. 2 Nʼoge ahụ, isi ọchịchị obodo eze Sekses bụ Susa ebe ocheeze ya dịkwa. 3 Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o mere mmemme oke oriri nye ndịisi ọrụ ya niile. Ndị ọzọ ọ kpọkwara bụ ndịisi agha nke Peshịa na Midia, na ụmụ eze, na ndị ọchịchị sitere na mba dị iche iche ọ na-achị. 4 Mmemme a were otu narị na iri ụbọchị asatọ (180). Eze jikwa oge a gosi akụnụba, na ịma mma na ebube nke alaeze ya. 5 Mgbe ụbọchị ndị a gafesịrị, eze kpọrọ oke oriri nọrọ ụbọchị asaa nʼubi a gbara ogige dị nʼụlọeze, nye ndị niile nọ na Susa, site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta. 6 Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya. 7 E jikwa iko ọlaedo ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Iko ọlaedo ọbụla e wepụtara nʼụbọchị ahụ dị iche nʼiche. O nweghị nke yiri ibe ya. E mekwara ka mmanya eze baa ụba dịka afọ ọma aka eze si dị. 8 E nyeghịkwa iwu ọbụla banyere iko mmanya ole mmadụ kwesiri ịṅụ kama ndị chọrọ ga-aṅụ dịka o si masị ha. Nʼihi na eze agwalarị ndịisi ozi ya na onye ọbụla kwesiri ịṅụ dịka o si chọọ. 9 Nʼotu oge ahụ, eze nwanyị Vashti, kpọkwara oke oriri nye ụmụ nwanyị niile nọ nʼụlọeze, Sekses. 10 Nʼụbọchị nke asaa, mgbe obi dị eze Sekses mma nʼihi mmanya ọ ṅụrụ, ọ nyere ndị onozi asaa ndị a na-ejere ya ozi iwu, ha bụ, Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, 11 sị ha gaa kpọọ Vashti nwunye eze ka ọ bịakwute ya. Eze nyekwara iwu ka Vashti kpuru okpueze nʼisi ya, maka igosi ndị mmadụ niile na ndị a na-asọpụrụ nọ nʼebe ahụ ịma mma ya. Nʼihi na Vashti mara mma. 12 Ma mgbe e mere ka ozi eze ruo ya ntị, eze nwanyị, bụ Vashti jụrụ ịbịa. Nke a mere ka iwe wee eze nke ukwuu. 13 Dịka eze Sekses na-eme, ọ kpọkwara ndị ọkachamara nʼihe gbasara iwu na ikpe ziri ezi. Eze na ndị a mara ihe, bụ ndị maara ihe ụbọchị nyere kparịtara ụka. 14 Ha bụkwa ndị na-anọkarị eze nso. Aha ha bụ Kashena, na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan. A maara aha mmadụ asaa ndị a nʼala Midia na Peshịa. Ha bụ ndị na-aga nʼihu eze mgbe ọbụla ha chọrọ, bụrụkwa ndị dịkarịsịrị elu nʼalaeze ahụ. 15 Eze jụrụ sị, “Dịka iwu si dị, gịnị ka a ga-eme Vashti bụ nwunye eze nʼihi na o nupuru isi nʼiwu eze Sekses nyere nke o zigaara ya site nʼọnụ ndị onozi ya?” 16 Memukan kwuchitere ọnụ ndị ọzọ sị, “Ihe Vashti nwunye eze mere jọrọ njọ. O mehiela eze, mehiekwa ndị ọchịchị niile, na ndị niile bi nʼakụkụ niile nke alaeze Sekses. 17 Nʼihi na ndị inyom niile ga-amata ihe eze nwanyị mere, malite ilelị ndị di ha anya, ma na-ekwu sị, ‘Eze Sekses nyere Vashti nwunye ya iwu ka ọ bịa nʼihu ya, ma ọ jụrụ ịbịa.’ 18 Nʼụbọchị taa ka ndị inyom ndịisi nke Peshịa na Midia, bụ ndị nụrụ banyere omume nwunye eze mere, ga-azakwa ndịisi ọchịchị alaeze gị nʼụzọ dị otu a. A ga-enwe nleda anya na esemokwu nʼala a mgbe niile. 19 “Ya mere, ọ bụrụ na ọ masị eze, ya nye iwu, nke a ga-edepụta, ka ọ bụrụ iwu nʼala Peshịa na Midia, nke na-agaghị agbanwe, na Vashti agaghị abatakwa nʼihu eze Sekses ọzọ. Ka eze werekwa ọnọdụ eze nwanyị ahụ nye onye ọzọ ka ya mma. 20 Ọ ga-erukwa na mgbe a gụpụtara iwu a eze nyere nʼakụkụ alaeze a niile, ndị inyom niile ga-asọpụrụ ndị di ha site nʼonye dịkarịsịrị nta nʼetiti ha ruo nʼonye dị ukwuu.” 21 Eze na ndịisi ọchịchị ya nabatara ndụmọdụ a, nʼihi ya, eze mere ihe Memukan kwuru. 22 O zipụrụ akwụkwọ ozi a nye akụkụ niile a na-achị achị nke alaeze ahụ. E dekwara akwụkwọ ozi ahụ nʼasụsụ dị iche iche, na-ekwupụta nʼasụsụ ọbụla na nwoke ọbụla kwesiri ịbụ onye na-achị ezinaụlọ ya.

In Other Versions

Esther 1 in the ANGEFD

Esther 1 in the ANTPNG2D

Esther 1 in the AS21

Esther 1 in the BAGH

Esther 1 in the BBPNG

Esther 1 in the BBT1E

Esther 1 in the BDS

Esther 1 in the BEV

Esther 1 in the BHAD

Esther 1 in the BIB

Esther 1 in the BLPT

Esther 1 in the BNT

Esther 1 in the BNTABOOT

Esther 1 in the BNTLV

Esther 1 in the BOATCB

Esther 1 in the BOATCB2

Esther 1 in the BOBCV

Esther 1 in the BOCNT

Esther 1 in the BOECS

Esther 1 in the BOGWICC

Esther 1 in the BOHCB

Esther 1 in the BOHCV

Esther 1 in the BOHLNT

Esther 1 in the BOHNTLTAL

Esther 1 in the BOILNTAP

Esther 1 in the BOITCV

Esther 1 in the BOKCV

Esther 1 in the BOKCV2

Esther 1 in the BOKHWOG

Esther 1 in the BOKSSV

Esther 1 in the BOLCB

Esther 1 in the BOLCB2

Esther 1 in the BOMCV

Esther 1 in the BONAV

Esther 1 in the BONCB

Esther 1 in the BONLT

Esther 1 in the BONUT2

Esther 1 in the BOPLNT

Esther 1 in the BOSCB

Esther 1 in the BOSNC

Esther 1 in the BOTLNT

Esther 1 in the BOVCB

Esther 1 in the BOYCB

Esther 1 in the BPBB

Esther 1 in the BPH

Esther 1 in the BSB

Esther 1 in the CCB

Esther 1 in the CUV

Esther 1 in the CUVS

Esther 1 in the DBT

Esther 1 in the DGDNT

Esther 1 in the DHNT

Esther 1 in the DNT

Esther 1 in the ELBE

Esther 1 in the EMTV

Esther 1 in the ESV

Esther 1 in the FBV

Esther 1 in the FEB

Esther 1 in the GGMNT

Esther 1 in the GNT

Esther 1 in the HARY

Esther 1 in the HNT

Esther 1 in the IRVA

Esther 1 in the IRVB

Esther 1 in the IRVG

Esther 1 in the IRVH

Esther 1 in the IRVK

Esther 1 in the IRVM

Esther 1 in the IRVM2

Esther 1 in the IRVO

Esther 1 in the IRVP

Esther 1 in the IRVT

Esther 1 in the IRVT2

Esther 1 in the IRVU

Esther 1 in the ISVN

Esther 1 in the JSNT

Esther 1 in the KAPI

Esther 1 in the KBT1ETNIK

Esther 1 in the KBV

Esther 1 in the KJV

Esther 1 in the KNFD

Esther 1 in the LBA

Esther 1 in the LBLA

Esther 1 in the LNT

Esther 1 in the LSV

Esther 1 in the MAAL

Esther 1 in the MBV

Esther 1 in the MBV2

Esther 1 in the MHNT

Esther 1 in the MKNFD

Esther 1 in the MNG

Esther 1 in the MNT

Esther 1 in the MNT2

Esther 1 in the MRS1T

Esther 1 in the NAA

Esther 1 in the NASB

Esther 1 in the NBLA

Esther 1 in the NBS

Esther 1 in the NBVTP

Esther 1 in the NET2

Esther 1 in the NIV11

Esther 1 in the NNT

Esther 1 in the NNT2

Esther 1 in the NNT3

Esther 1 in the PDDPT

Esther 1 in the PFNT

Esther 1 in the RMNT

Esther 1 in the SBIAS

Esther 1 in the SBIBS

Esther 1 in the SBIBS2

Esther 1 in the SBICS

Esther 1 in the SBIDS

Esther 1 in the SBIGS

Esther 1 in the SBIHS

Esther 1 in the SBIIS

Esther 1 in the SBIIS2

Esther 1 in the SBIIS3

Esther 1 in the SBIKS

Esther 1 in the SBIKS2

Esther 1 in the SBIMS

Esther 1 in the SBIOS

Esther 1 in the SBIPS

Esther 1 in the SBISS

Esther 1 in the SBITS

Esther 1 in the SBITS2

Esther 1 in the SBITS3

Esther 1 in the SBITS4

Esther 1 in the SBIUS

Esther 1 in the SBIVS

Esther 1 in the SBT

Esther 1 in the SBT1E

Esther 1 in the SCHL

Esther 1 in the SNT

Esther 1 in the SUSU

Esther 1 in the SUSU2

Esther 1 in the SYNO

Esther 1 in the TBIAOTANT

Esther 1 in the TBT1E

Esther 1 in the TBT1E2

Esther 1 in the TFTIP

Esther 1 in the TFTU

Esther 1 in the TGNTATF3T

Esther 1 in the THAI

Esther 1 in the TNFD

Esther 1 in the TNT

Esther 1 in the TNTIK

Esther 1 in the TNTIL

Esther 1 in the TNTIN

Esther 1 in the TNTIP

Esther 1 in the TNTIZ

Esther 1 in the TOMA

Esther 1 in the TTENT

Esther 1 in the UBG

Esther 1 in the UGV

Esther 1 in the UGV2

Esther 1 in the UGV3

Esther 1 in the VBL

Esther 1 in the VDCC

Esther 1 in the YALU

Esther 1 in the YAPE

Esther 1 in the YBVTP

Esther 1 in the ZBP