Exodus 12 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn okwu nʼala Ijipt sị ha, 2 “Ọnwa a ga-abụrụ unu isi ọnwa. Ọ ga-abụ ọnwa mbụ nke ọnwa niile nʼafọ unu. 3 Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha, Nʼafọ ọbụla, nʼabalị iri nke ọnwa a, nwoke ọbụla ga-eweta nwa atụrụ nʼisi ezinaụlọ ọbụla. 4 Ezinaụlọ ọbụla nke dịkarịrị nta, nke na-enweghị ike iweta na iricha otu nwa atụrụ, ga-ejekwuru ezinaụlọ ọzọ dịkwa nta, ka ha jikọtaa onwe ha ọnụ weta nwa atụrụ. Ndị ga-ejikọta onwe ha ọnụ aghaghị ibu ụzọ pịa mmadụ ole ha ga-adị nwee ike richaa otu atụrụ. 5 Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu. 6 Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ Izrel niile ga-egbu ya. 7 Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ. 8 Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu. 9 A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya. 10 Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ. 11 Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga ONYENWE ANYỊ. 12 “Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 13 Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị Ijipt. 14 “Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye ONYENWE ANYỊ. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 15 Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko. Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala Izrel. 16 Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri. 17 “Unu ga-edobekwa mmemme achịcha na-ekoghị eko nʼihi na ọ bụ nʼime otu ụbọchị a ka m sitere nʼala Ijipt kpọpụta unu dịka usuu ndị agha. Unu ga-emekwa mmemme ụbọchị a ka ọ bụrụ ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ 18 Nʼọnwa mbụ, nʼanyasị nke ụbọchị nke iri na anọ, ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ruo nʼanyasị nke ụbọchị iri abụọ na otu. 19 Nʼime ụbọchị asaa ahụ, agaghị ahụ ihe na-eko achịcha nʼụlọ unu. A ga-esite nʼọgbakọ ndị Izrel bipụ onye ọbụla riri ihe ọbụla nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya. Iwu a dịrị ndị ọbịa niile nʼala Izrel, dịkwara ndị nwa afọ ala. 20 Unu agaghị eri ihe ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee. Nʼebe obibi unu niile, ọ bụ naanị achịcha na-ekoghị eko ka unu ga-eri.” 21 Mgbe ahụ, Mosis kpọkọtara ndị okenye ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, “Gaanụ họpụta ụmụ atụrụ nʼihi agbụrụ unu niile, gbuonụ atụrụ ngabiga ndị a. 22 Were ahịhịa hisọp, denye ya nʼọbara si nʼatụrụ ndị a nke a ga-awụnye nʼefere, tee ya nʼelu ibo na nʼakụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ụlọ unu. Onye ọbụla nʼime unu agaghị apụ nʼezi tutu ruo ụtụtụ. 23 Mgbe ONYENWE ANYỊ ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu. 24 “Unu ga-edobe mmemme a dịka iwu ga-adịgide nye unu na ụmụ unu. 25 Mgbe unu batara nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ ga-enye unu dịka o kwere na nkwa, unu ga-edobe ofufe a. 26 Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị ka ofufe a pụtara?’ 27 Unu ga-azaghachi ha sị, ‘Ọ bụ aja ngabiga anyị na-achụrụ ONYENWE ANYỊ nʼihi na ọ gafere ụlọ ụmụ Izrel nʼala Ijipt, mgbe o gburu ndị Ijipt, ma o nweghị onye ọbụla nʼime anyị o gburu.’ ” 28 Ụmụ Izrel mezuru ihe niile ONYENWE ANYỊ gwara ha site nʼọnụ Mosis na Erọn. 29 Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, ONYENWE ANYỊ gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, malite nʼọkpara Fero onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye Ijipt nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ. 30 Nʼabalị ahụ kwa, Fero na ndị ozi ya, na ndị Ijipt niile biliri. Oke iti mkpu akwa dakwara nʼala Ijipt, nʼihi na ọ dịghị ezinaụlọ ọnwụ na-erughị. 31 Nʼotu abalị ahụ, Fero zipụrụ ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Ngwa bilienụ, unu bụ ụmụ Izrel niile. Kewapụnụ onwe unu site nʼetiti anyị. Gaanụ, fee ONYENWE ANYỊ unu ofufe dịka unu rịọrọ. 32 Durunụ igwe ehi na atụrụ unu mgbe unu na-aga. Gọziekwanụ m mgbe unu na-apụ.” 33 Ndị Ijipt gbalịrị ime ka ụmụ Izrel hapụ ha ngwangwa. Ha sịrịtara onwe ha, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ahapụghị anyị ugbu a, anyị niile ga-anwụkwa.” 34 Ya mere, ụmụ Izrel buuru ụtụ ọka e ji eme achịcha na-ekoghị eko, nke ha tinyere nʼefere e ji agwakọta ya. Ha ji akwa kechie ha, bukwasị ha nʼubu ha. 35 Ha mekwara ihe ndị ọzọ dịka Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ka ha nye ha ihe iji ngwa nke ọlaọcha na ọlaedo, na uwe. 36 ONYENWE ANYỊ nyere ndị ya amara nʼihu ndị Ijipt, ha nyere ha ihe niile ha rịọrọ. Site nʼụzọ dị otu a, ụmụ Izrel napụtara ndị Ijipt ihe niile ha ji biri nʼụlọ. 37 Mgbe nke a gasịrị, ụmụ Izrel malitere ije ha site na Ramesis. Mgbe ha hapụrụ Ramesis, na-eje Sukọt, ha dị narị puku ndị ikom isii, na-agụghị ndị inyom na ụmụntakịrị. 38 Ọtụtụ mmadụ dị iche iche sooro ha nʼije ha. Ha dukwa igwe anụ ụlọ, igwe ewu na atụrụ ha, nke dị ukwu nʼọnụọgụgụ. 39 Ha ji ụtụ ọka ha si Ijipt buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼIjipt, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri. 40 Tupu ha ahapụ ala Ijipt, ụmụ Izrel ebiela nʼebe ahụ narị afọ anọ na iri afọ atọ. 41 Mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ zuru, nʼụbọchị ahụ o zuru, usuu ndị ONYENWE ANYỊ niile hapụrụ Ijipt. 42 ONYENWE ANYỊ chere nche nʼabalị ụbọchị ahụ maka ịkpọpụta ha site nʼala Ijipt. Nʼihi ya, abalị ụbọchị ahụ bụ mgbe pụrụ iche nye ụmụ Izrel maka iji iche nche sọpụrụ ONYENWE ANYỊ nʼọgbọ ha niile. 43 ONYENWE ANYỊ kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha sị, “Ndị a bụ usoro iwu metụtara Mmemme Ngabiga:“Onye mba ọzọ agaghị eri anụ nwa atụrụ ahụ. 44 Ohu ọbụla a kwụrụ ụgwọ nʼisi ya ga-eri ya naanị ma e biri ya ugwu. 45 Ohu e goro ọrụ, maọbụ onye ọbịa ọbụla agaghị eri ya. 46 “A ga-eri ya naanị nʼime otu ụlọ. Ọ gaghị apụ nʼezi. Unu agaghị atapịa ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. 47 Nzukọ niile nke ụmụ Izrel ga-eme Mmemme Ngabiga a. 48 “Onye mba ọzọ bi nʼetiti unu chọrọ isoro unu na Mmemme Ngabiga ONYENWE ANYỊ aghaghị ibi ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya ugwu. Mgbe ahụ, ọ ga-abịaru nso isoro na mmemme, nʼihi na a ga-agụ ya dịka nwa afọ ala. Ọ dịghị onye ikom a na-ebighị ugwu ga-eri nri ahụ. 49 Otu iwu a dịrị nwa afọ ala na ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel.” 50 Ụmụ Izrel mere ihe ndị a niile, dịka ONYENWE ANYỊ nyere ha nʼiwu site nʼọnụ Mosis na Erọn. 51 Ọ bụkwa nʼotu ụbọchị ahụ ka ONYENWE ANYỊ sitere nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel, dịka usuu ha niile si dị.

In Other Versions

Exodus 12 in the ANGEFD

Exodus 12 in the ANTPNG2D

Exodus 12 in the AS21

Exodus 12 in the BAGH

Exodus 12 in the BBPNG

Exodus 12 in the BBT1E

Exodus 12 in the BDS

Exodus 12 in the BEV

Exodus 12 in the BHAD

Exodus 12 in the BIB

Exodus 12 in the BLPT

Exodus 12 in the BNT

Exodus 12 in the BNTABOOT

Exodus 12 in the BNTLV

Exodus 12 in the BOATCB

Exodus 12 in the BOATCB2

Exodus 12 in the BOBCV

Exodus 12 in the BOCNT

Exodus 12 in the BOECS

Exodus 12 in the BOGWICC

Exodus 12 in the BOHCB

Exodus 12 in the BOHCV

Exodus 12 in the BOHLNT

Exodus 12 in the BOHNTLTAL

Exodus 12 in the BOILNTAP

Exodus 12 in the BOITCV

Exodus 12 in the BOKCV

Exodus 12 in the BOKCV2

Exodus 12 in the BOKHWOG

Exodus 12 in the BOKSSV

Exodus 12 in the BOLCB

Exodus 12 in the BOLCB2

Exodus 12 in the BOMCV

Exodus 12 in the BONAV

Exodus 12 in the BONCB

Exodus 12 in the BONLT

Exodus 12 in the BONUT2

Exodus 12 in the BOPLNT

Exodus 12 in the BOSCB

Exodus 12 in the BOSNC

Exodus 12 in the BOTLNT

Exodus 12 in the BOVCB

Exodus 12 in the BOYCB

Exodus 12 in the BPBB

Exodus 12 in the BPH

Exodus 12 in the BSB

Exodus 12 in the CCB

Exodus 12 in the CUV

Exodus 12 in the CUVS

Exodus 12 in the DBT

Exodus 12 in the DGDNT

Exodus 12 in the DHNT

Exodus 12 in the DNT

Exodus 12 in the ELBE

Exodus 12 in the EMTV

Exodus 12 in the ESV

Exodus 12 in the FBV

Exodus 12 in the FEB

Exodus 12 in the GGMNT

Exodus 12 in the GNT

Exodus 12 in the HARY

Exodus 12 in the HNT

Exodus 12 in the IRVA

Exodus 12 in the IRVB

Exodus 12 in the IRVG

Exodus 12 in the IRVH

Exodus 12 in the IRVK

Exodus 12 in the IRVM

Exodus 12 in the IRVM2

Exodus 12 in the IRVO

Exodus 12 in the IRVP

Exodus 12 in the IRVT

Exodus 12 in the IRVT2

Exodus 12 in the IRVU

Exodus 12 in the ISVN

Exodus 12 in the JSNT

Exodus 12 in the KAPI

Exodus 12 in the KBT1ETNIK

Exodus 12 in the KBV

Exodus 12 in the KJV

Exodus 12 in the KNFD

Exodus 12 in the LBA

Exodus 12 in the LBLA

Exodus 12 in the LNT

Exodus 12 in the LSV

Exodus 12 in the MAAL

Exodus 12 in the MBV

Exodus 12 in the MBV2

Exodus 12 in the MHNT

Exodus 12 in the MKNFD

Exodus 12 in the MNG

Exodus 12 in the MNT

Exodus 12 in the MNT2

Exodus 12 in the MRS1T

Exodus 12 in the NAA

Exodus 12 in the NASB

Exodus 12 in the NBLA

Exodus 12 in the NBS

Exodus 12 in the NBVTP

Exodus 12 in the NET2

Exodus 12 in the NIV11

Exodus 12 in the NNT

Exodus 12 in the NNT2

Exodus 12 in the NNT3

Exodus 12 in the PDDPT

Exodus 12 in the PFNT

Exodus 12 in the RMNT

Exodus 12 in the SBIAS

Exodus 12 in the SBIBS

Exodus 12 in the SBIBS2

Exodus 12 in the SBICS

Exodus 12 in the SBIDS

Exodus 12 in the SBIGS

Exodus 12 in the SBIHS

Exodus 12 in the SBIIS

Exodus 12 in the SBIIS2

Exodus 12 in the SBIIS3

Exodus 12 in the SBIKS

Exodus 12 in the SBIKS2

Exodus 12 in the SBIMS

Exodus 12 in the SBIOS

Exodus 12 in the SBIPS

Exodus 12 in the SBISS

Exodus 12 in the SBITS

Exodus 12 in the SBITS2

Exodus 12 in the SBITS3

Exodus 12 in the SBITS4

Exodus 12 in the SBIUS

Exodus 12 in the SBIVS

Exodus 12 in the SBT

Exodus 12 in the SBT1E

Exodus 12 in the SCHL

Exodus 12 in the SNT

Exodus 12 in the SUSU

Exodus 12 in the SUSU2

Exodus 12 in the SYNO

Exodus 12 in the TBIAOTANT

Exodus 12 in the TBT1E

Exodus 12 in the TBT1E2

Exodus 12 in the TFTIP

Exodus 12 in the TFTU

Exodus 12 in the TGNTATF3T

Exodus 12 in the THAI

Exodus 12 in the TNFD

Exodus 12 in the TNT

Exodus 12 in the TNTIK

Exodus 12 in the TNTIL

Exodus 12 in the TNTIN

Exodus 12 in the TNTIP

Exodus 12 in the TNTIZ

Exodus 12 in the TOMA

Exodus 12 in the TTENT

Exodus 12 in the UBG

Exodus 12 in the UGV

Exodus 12 in the UGV2

Exodus 12 in the UGV3

Exodus 12 in the VBL

Exodus 12 in the VDCC

Exodus 12 in the YALU

Exodus 12 in the YAPE

Exodus 12 in the YBVTP

Exodus 12 in the ZBP