Exodus 14 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis, 2 “Gwa ụmụ Izrel ka ha chigharịa azụ jee maa ụlọ ikwu ha na ncherita ihu Pi Hahirot, nke dị nʼetiti Migdol na osimiri. Ọ bụ nʼakụkụ osimiri, na ncherita ihu obodo Baal-Zefọn ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha. 3 Fero ga-asị banyere ụmụ Izrel, ‘Ha na-awagharị gburugburu ala ahụ nʼọnọdụ mgbagwoju anya ebe ọzara riri ha.’ 4 Aga m eme ka obi Fero sie ike ka ọ chụso unu ọsọ nʼazụ, ma m ga-ewetara onwe m otuto site na Fero na ndị agha ya niile. Ndị Ijipt niile ga-ama na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.” Ndị Izrel mekwara otu ahụ. 5 Mgbe a gwara eze Ijipt na ndị a agbaala ọsọ, obi Fero na ndị ozi ya gbanwere megide ndị Izrel. Ha sịrị, “Gịnị bụ ihe anyị mere, site na izipụ ndị Izrel nʼọrụ ife anyị?” 6 Na-atụfughị oge, Fero rigoro nʼelu ụgbọ agha ya, duru ndị agha ya ịchụso ha. 7 Ọ chịịrị ụgbọ agha dị narị isii e leziri anya họpụta, tinyere ụgbọ agha Ijipt niile. Ndịisi agha ndị Ijipt nọcha nʼelu ha niile. 8 ONYENWE ANYỊ mere ka obi Fero eze Ijipt sie ike. Ọ chụsoro ụmụ Izrel, ndị na-aga nʼihu nʼije ha, na-atụghị egwu maọbụ ịda mba. 9 Ndị Ijipt chụsoro ha ọsọ, ịnyịnya Fero na ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ndị ọzọ chụsoro ndị Izrel ọsọ chụkwute ha nʼebe ha na-ezu ike nʼakụkụ osimiri dị nso na Pi Hahirot na ncherita ihu Baal-Zefọn. 10 Mgbe ndị agha Fero na-abịa nso, ndị Izrel lere anya nʼazụ, hụ ndị Ijipt ka ha na-abịa nso. Ha tụrụ egwu, tie mkpu akwa, kpọkuo ONYENWE ANYỊ. 11 Ha jụrụ Mosis sị, “Ọ bụ na o nweghị ili dị nʼala Ijipt, i ji kwagide anyị ka anyị niile bịa nwụọ nʼebe a nʼọzara? Gịnị mere i ji kwagide anyị ka anyị hapụ Ijipt? 12 Ọ bụ na anyị agwaghị gị nʼala Ijipt si gị, ‘Hapụ anyị ka anyị nọgide na-ejere ndị Ijipt ozi?’ Ọ gara akara anyị mma ị bụ ohu ndị Ijipt karịa ịnwụ nʼọzara.” 13 Mosis zaghachiri ha sị, “Unu atụla egwu. Guzosienụ ike. Unu ga-ahụ ụzọ dị ebube ONYENWE ANYỊ ga-esi zọpụta unu taa. Ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụkwa ha ọzọ. 14 Nọrọnụ jii. ONYENWE ANYỊ ga-alụrụ unu ọgụ.” 15 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, “Gịnị mere i ji na-akpọku m. Gwa ụmụ Izrel ka ha gaa nʼihu. 16 Welie mkpanaka gị elu. Setịpụ ya nʼelu osimiri ahụ ka o kewaa abụọ. Ụzọ ga-adịkwa nʼetiti osimiri ahụ. Ụmụ Izrel ga-esitekwa nʼala akọrọ gafee. 17 Aga m eme ka obi ndị Ijipt sie ike, ka ha sorokwa unu nʼazụ banye. Aga m ewetara onwe m otuto site na Fero, na ndị agha niile, na ụgbọ agha niile nakwa ndị na-agba ịnyịnya ya. 18 Nʼoge ahụ, ndị Ijipt ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. M ga-enweta nsọpụrụ site na Fero, na ụgbọ agha ya niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.” 19 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke, onye na-aga nʼihu ndị agha Izrel, sitere nʼihu pụọ gaa nọdụ nʼazụ ha. Otu a kwa, ogidi igwe ojii ahụ sitere nʼihu gaa nʼazụ ha. 20 Nke a mere ka ogidi igwe ojii ahụ dịrị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Ijipt. Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ogidi igwe ojii ahụ nye ụmụ Izrel ìhè, ma ndị Ijipt nọgidere nʼọchịchịrị. Otu a, ndị Ijipt enweghị ike bịarute nʼebe ụmụ Izrel nọ. 21 Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. ONYENWE ANYỊ ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ. 22 Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha. 23 Mgbe ndị agha Ijipt na-achụ ha ọsọ hụrụ ha ka ha na-agafe, ha sogidere ha baa, ọ bụladị nʼetiti osimiri ahụ. Ndị agha Ijipt niile sooro ha, ya bụ, ụgbọ agha Fero, ndị agha ya na ndị na-agba ịnyịnya ya niile. 24 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ONYENWE ANYỊ ledatara anya site nʼogidi igwe ojii ahụ na-enye ihe. O legidere ndị agha Ijipt anya, tinyekwa ha ụjọ nʼobi nke mere na ha amakwaghị onwe ha. 25 O mebiri ụkwụ ụgbọ agha ha mee ka o siere ịnyịnya ha ike ịdọkpụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ahụ, ndị Ijipt kwuru sị, “Ka anyị sinụ nʼịchụ ndị Izrel gbapụ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-alụrụ ha ọgụ, na-emegidekwa anyị.” 26 Mgbe ụmụ Izrel gafesịrị ruo nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Setịpụ aka gị ọzọ ka mmiri ahụ kpuchigide ndị Ijipt, na ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.” 27 Mosis setịpụrụ aka nʼelu osimiri ahụ. Nʼụtụtụ ya, mmiri osimiri ahụ sọghachiri gaa ebe ọ nọ na mbụ. Ndị Ijipt chọsịrị ụzọ ha si agbapụ ike, ma ONYENWE ANYỊ mere ka osimiri ahụ kpuchie ha. 28 Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ. 29 Ma ụmụ Izrel esitelarị nʼala nke mmiri kọrọ gafee osimiri ahụ. Mgbe ha na-agafekwa, akụkụ abụọ nke osimiri ahụ guzoro ọtọ dịka mgbidi, nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha. 30 Site nʼụzọ dị otu a, ONYENWE ANYỊ zọpụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị Ijipt. Ụmụ Izrel hụkwara ozu ndị Ijipt nʼikpere mmiri osimiri ahụ. 31 Ụmụ Izrel tụrụ egwu Onyenwe anyị mgbe ha hụrụ ihe ịrịbama ndị a ONYENWE ANYỊ ji zọpụta ha site nʼaka ndị Ijipt. Ha kwenyere na ONYENWE ANYỊ, kwenyekwa na Mosis ohu ya.

In Other Versions

Exodus 14 in the ANGEFD

Exodus 14 in the ANTPNG2D

Exodus 14 in the AS21

Exodus 14 in the BAGH

Exodus 14 in the BBPNG

Exodus 14 in the BBT1E

Exodus 14 in the BDS

Exodus 14 in the BEV

Exodus 14 in the BHAD

Exodus 14 in the BIB

Exodus 14 in the BLPT

Exodus 14 in the BNT

Exodus 14 in the BNTABOOT

Exodus 14 in the BNTLV

Exodus 14 in the BOATCB

Exodus 14 in the BOATCB2

Exodus 14 in the BOBCV

Exodus 14 in the BOCNT

Exodus 14 in the BOECS

Exodus 14 in the BOGWICC

Exodus 14 in the BOHCB

Exodus 14 in the BOHCV

Exodus 14 in the BOHLNT

Exodus 14 in the BOHNTLTAL

Exodus 14 in the BOILNTAP

Exodus 14 in the BOITCV

Exodus 14 in the BOKCV

Exodus 14 in the BOKCV2

Exodus 14 in the BOKHWOG

Exodus 14 in the BOKSSV

Exodus 14 in the BOLCB

Exodus 14 in the BOLCB2

Exodus 14 in the BOMCV

Exodus 14 in the BONAV

Exodus 14 in the BONCB

Exodus 14 in the BONLT

Exodus 14 in the BONUT2

Exodus 14 in the BOPLNT

Exodus 14 in the BOSCB

Exodus 14 in the BOSNC

Exodus 14 in the BOTLNT

Exodus 14 in the BOVCB

Exodus 14 in the BOYCB

Exodus 14 in the BPBB

Exodus 14 in the BPH

Exodus 14 in the BSB

Exodus 14 in the CCB

Exodus 14 in the CUV

Exodus 14 in the CUVS

Exodus 14 in the DBT

Exodus 14 in the DGDNT

Exodus 14 in the DHNT

Exodus 14 in the DNT

Exodus 14 in the ELBE

Exodus 14 in the EMTV

Exodus 14 in the ESV

Exodus 14 in the FBV

Exodus 14 in the FEB

Exodus 14 in the GGMNT

Exodus 14 in the GNT

Exodus 14 in the HARY

Exodus 14 in the HNT

Exodus 14 in the IRVA

Exodus 14 in the IRVB

Exodus 14 in the IRVG

Exodus 14 in the IRVH

Exodus 14 in the IRVK

Exodus 14 in the IRVM

Exodus 14 in the IRVM2

Exodus 14 in the IRVO

Exodus 14 in the IRVP

Exodus 14 in the IRVT

Exodus 14 in the IRVT2

Exodus 14 in the IRVU

Exodus 14 in the ISVN

Exodus 14 in the JSNT

Exodus 14 in the KAPI

Exodus 14 in the KBT1ETNIK

Exodus 14 in the KBV

Exodus 14 in the KJV

Exodus 14 in the KNFD

Exodus 14 in the LBA

Exodus 14 in the LBLA

Exodus 14 in the LNT

Exodus 14 in the LSV

Exodus 14 in the MAAL

Exodus 14 in the MBV

Exodus 14 in the MBV2

Exodus 14 in the MHNT

Exodus 14 in the MKNFD

Exodus 14 in the MNG

Exodus 14 in the MNT

Exodus 14 in the MNT2

Exodus 14 in the MRS1T

Exodus 14 in the NAA

Exodus 14 in the NASB

Exodus 14 in the NBLA

Exodus 14 in the NBS

Exodus 14 in the NBVTP

Exodus 14 in the NET2

Exodus 14 in the NIV11

Exodus 14 in the NNT

Exodus 14 in the NNT2

Exodus 14 in the NNT3

Exodus 14 in the PDDPT

Exodus 14 in the PFNT

Exodus 14 in the RMNT

Exodus 14 in the SBIAS

Exodus 14 in the SBIBS

Exodus 14 in the SBIBS2

Exodus 14 in the SBICS

Exodus 14 in the SBIDS

Exodus 14 in the SBIGS

Exodus 14 in the SBIHS

Exodus 14 in the SBIIS

Exodus 14 in the SBIIS2

Exodus 14 in the SBIIS3

Exodus 14 in the SBIKS

Exodus 14 in the SBIKS2

Exodus 14 in the SBIMS

Exodus 14 in the SBIOS

Exodus 14 in the SBIPS

Exodus 14 in the SBISS

Exodus 14 in the SBITS

Exodus 14 in the SBITS2

Exodus 14 in the SBITS3

Exodus 14 in the SBITS4

Exodus 14 in the SBIUS

Exodus 14 in the SBIVS

Exodus 14 in the SBT

Exodus 14 in the SBT1E

Exodus 14 in the SCHL

Exodus 14 in the SNT

Exodus 14 in the SUSU

Exodus 14 in the SUSU2

Exodus 14 in the SYNO

Exodus 14 in the TBIAOTANT

Exodus 14 in the TBT1E

Exodus 14 in the TBT1E2

Exodus 14 in the TFTIP

Exodus 14 in the TFTU

Exodus 14 in the TGNTATF3T

Exodus 14 in the THAI

Exodus 14 in the TNFD

Exodus 14 in the TNT

Exodus 14 in the TNTIK

Exodus 14 in the TNTIL

Exodus 14 in the TNTIN

Exodus 14 in the TNTIP

Exodus 14 in the TNTIZ

Exodus 14 in the TOMA

Exodus 14 in the TTENT

Exodus 14 in the UBG

Exodus 14 in the UGV

Exodus 14 in the UGV2

Exodus 14 in the UGV3

Exodus 14 in the VBL

Exodus 14 in the VDCC

Exodus 14 in the YALU

Exodus 14 in the YAPE

Exodus 14 in the YBVTP

Exodus 14 in the ZBP