Exodus 21 (BOICB)

1 “Ndị a bụ iwu ị ga-edebe nʼihu ha. 2 “Ọ bụrụ na ị goro ohu onye Hibru, ọ ga-agbara gị odibo afọ isii. Ma nʼafọ nke asaa, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya laakwa nʼakwụghị ụgwọ ọbụla. 3 Ọ bụrụ na sọọsọ ya bịara, sọọsọ ya ga-ala, ma ọ bụrụ na o nwere nwunye tupu ọ bụrụ ohu, ya na nwunye ya ga-eso ala. 4 Ọ bụrụ na nna ya ukwu kpọnyere ya nwunye onye mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, nwanyị ahụ na ụmụ ya ga-abụ nke nna ya ukwu, naanị nwoke ahụ ga-enwere onwe ya. 5 “Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị, nʼezie, ‘Ahụrụ m onyenwe m na nwunye m na ụmụ m nʼanya, achọghị m inwere onwe,’ 6 mgbe ahụ, onyenwe ya ga-eduru ya bịakwute Chineke. Mgbe ọ kpọbatasịrị ya nʼọnụ ụzọ, onyenwe ya ga-eji agịga dupuo ntị ya. Malite nʼoge ahụ, ọ ga-abụkwa ohu ya ruo ọgwụgwụ ndụ ya. 7 “A sị na nwoke eree nwa ya nwanyị dịka ohu, agaghị ala otu ndị ohu nwoke si ala. 8 Ọ bụrụ na ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị onyenwe ya, onye họọrọ ya nye onwe ya, onyenwe ya ga-ekwere ka a gbapụta ya. Ma ọ gaghị eresi ya ndị ọbịa. Nʼihi na onyenwe ya emeela nwanyị ahụ ihe ọjọọ mgbe ọ jụrụ na ọ gaghị alụkwa ya ọzọ. 9 Ọ bụrụ na ọ chọrọ ka nwa ya nwoke lụọ ya dịka nwunye ya, ọ ga-emeso ya dịka omenaala si kwado e si emeso ndị bụ nwaada. 10 Ọ bụrụkwa na ọ lụta ya dịka nwunye nke aka ya, mesịakwa lụta nwunye ọzọ, ọ gaghị akwụsị inye ya uwe maọbụ ihe oriri. Ọ gaghị agọnarịkwa ya ihe ọbụla kwesiri ya dịka nwunye. 11 Ọ bụrụ na o mereghị ohu nwanyị a ihe ndị a, nwanyị a pụrụ ịhapụ ya gaara onwe ya na-akwụghị ụgwọ ọbụla. Mgbe ahụ, ọ ga-enwerekwa onwe ya. 12 “Ọzọkwa, ọ bụrụ na mmadụ etigbuo mmadụ ibe ya, aghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ. 13 Ma ọ bụrụ na o mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụkwa na Chineke kwagidere omume dị otu a, mgbe ahụ, a ga-ahọpụtara ya ebe ọ ga-agbaga, jee zere ndụ. 14 Ọ bụrụkwa na onye ọbụla akpachara anya jiri aghụghọ gbuo mmadụ ibe ya, a ga-adọpụta ya, ọ bụladị site nʼebe ịchụ aja m, gbuo ya. 15 “Ọ bụrụ na onye ọbụla etie nna ya maọbụ nne ya ihe, a ghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ. 16 “Onye ọbụla tọọrọ mmadụ ibe ya, ma o rere ya nʼahịa, maọbụ na a chọpụtara ya nʼaka ya, a ga-eme ka onye dị otu a nwụọ. 17 “Aghaghị ime ka onye ọbụla ga-akpọ nna ya maọbụ nne ya iyi nwụọ. 18 “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ alụọ ọgụ ma otu nʼime ha ewere nkume maọbụ osisi tie onye nke ọzọ. Ọ bụrụ na ọ nwụghị, kama na o merụrụ ahụ, dinaakwa nʼihe ndina ya, 19 ọ bụrụ na onye ahụ ebilie were mkpara ya na-ejegharị, ikpe agaghị ama onye ahụ tiri ya ihe, kama ọ ga-akwụ ụgwọ ihe onye ahụ ji gwọọ onwe ya, na oge onye ahụ o tiri ihe ji nọọ nʼihe ndina, ruo mgbe ahụ ya ga-adị mma. 20 “Ọ bụrụ na ohu ọbụla anwụọ site nʼihe otiti nke onyenwe ya tiri ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, a ga-adọ onyenwe ya aka na ntị site nʼinye ya ntaramahụhụ. 21 Otu ọ dị, ọ bụrụ na ohu ahụ dị ndụ nʼụbọchị mbụ, maọbụ nʼụbọchị nke abụọ, a gaghị enye onyenwe ya ntaramahụhụ nʼihi na ohu ahụ bụ akụ ya. 22 “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esite nʼịlụ ọgụ ha merụọ nwanyị dị ime ahụ, mee ka ime ahụ pụọ, ma nwanyị ahụ emerụghị nnukwu ahụ, di nwanyị ahụ ga-anara site nʼaka onye ahụ merụrụ nwunye ya ahụ ihe niile ọbụla o kwuru na a ga-akwụ ya, bụkwa nke ndị na-ekpe ikpe kpebiri. 23 Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ a nwụọ nʼihi mmerụ ahụ ahụ e merụrụ ya, a ga-eme ka nwoke ahụ merụrụ ya ahụ nwụọ. 24 Ọ bụrụ na ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze. Otu ahụ kwa, aka nʼọnọdụ aka, ụkwụ nʼọnọdụ ụkwụ. 25 Ịda ọkụ nʼọnọdụ ịda ọkụ, ọnya mma, nʼọnọdụ ọnya mma, ihe otiti nʼọnọdụ ihe otiti. 26 “Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla esite nʼihe otiti o tiri ohu ya kụkpọọ ya anya, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya, maọbụ ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, nʼihi na o jirila anya ya gbara onwe ya. 27 Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla etipụ eze ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya nʼihi eze ya nke e tipụrụ. 28 “Ọ bụrụ na ehi ejiri mpi ya sọda mmadụ si otu a mee ka onye ahụ nwụọ, a ga-atụgbu ehi ahụ na nkume. Mmadụ ọbụla agaghị erikwa anụ ehi ahụ. Ma a ga-agụ onyenwe ehi ahụ dịka onye ikpe na-amaghị. 29 Ọ bụrụ na ehi ahụ na-asọkarị ndị mmadụ mpi mgbe niile, agaghị eri anụ ya. Kama, ọ bụrụ na adọọla onyenwe ya aka na ntị banyere ehi ahụ ọtụtụ oge, ma o meghị ihe ọbụla banyere ya, a ga-eme ka ehi ahụ na onyenwe ya nwụọ. 30 Ma ọ bụrụ na ndị nwe mmadụ achọọ ka a kwụọ ha ụgwọ kama igbu onyenwe ehi ahụ, ndị ikpe ga-ekpebi ego ole onyenwe ehi ga-akwụ ha. 31 Otu a ka a ga-esikwa kpee ikpe nke ga-apụta ma ọ bụrụ na ehi asọda nwokorobịa maọbụ nwaagbọghọ ọbụla. 32 Kama ọ bụrụ na ehi asọda ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, onyenwe ehi ahụ ga-akwụ onyenwe ohu ahụ iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. Emesịa, a ga-eji nkume tugbuo ehi ahụ. 33 “Ọ bụrụ onye ọbụla meghere olulu maọbụ gwuo olulu, ghara imechi ya, nke mere na ehi mmadụ maọbụ ịnyịnya ibu adaba nʼime ya, 34 onye ahụ gwuru olulu ahụ ga-akwụ onyenwe anụ ụlọ ahụ ọnụọgụgụ ego o jiri zụta ya. Mgbe ahụ ọ ga-eburu ozu anụ ahụ nwụrụ anwụ. 35 “Ọ bụrụ na oke ehi mmadụ emerụọ oke ehi onye ọzọ ahụ, emesịa ehi dị otu a anwụọ, a ga-ere ehi nke dị ndụ, kewaa ego ya ụzọ abụọ. Otu a kwa, a ga-ekewa ehi nke nwụrụ anwụ, nye mmadụ abụọ ahụ otu ụzọ otu ụzọ. 36 Ọ bụrụ na amaara na oke ehi ahụ na-asọ mpi mgbe niile nʼoge gara aga, ma onyenwe ya emeghị ihe ọbụla banyere ya, ọ ga-akwụzu ụgwọ ehi ahụ nwụrụ anwụ. Emesịa ehi ahụ nwụrụ anwụ ga-abụrụ nke ya.

In Other Versions

Exodus 21 in the ANGEFD

Exodus 21 in the ANTPNG2D

Exodus 21 in the AS21

Exodus 21 in the BAGH

Exodus 21 in the BBPNG

Exodus 21 in the BBT1E

Exodus 21 in the BDS

Exodus 21 in the BEV

Exodus 21 in the BHAD

Exodus 21 in the BIB

Exodus 21 in the BLPT

Exodus 21 in the BNT

Exodus 21 in the BNTABOOT

Exodus 21 in the BNTLV

Exodus 21 in the BOATCB

Exodus 21 in the BOATCB2

Exodus 21 in the BOBCV

Exodus 21 in the BOCNT

Exodus 21 in the BOECS

Exodus 21 in the BOGWICC

Exodus 21 in the BOHCB

Exodus 21 in the BOHCV

Exodus 21 in the BOHLNT

Exodus 21 in the BOHNTLTAL

Exodus 21 in the BOILNTAP

Exodus 21 in the BOITCV

Exodus 21 in the BOKCV

Exodus 21 in the BOKCV2

Exodus 21 in the BOKHWOG

Exodus 21 in the BOKSSV

Exodus 21 in the BOLCB

Exodus 21 in the BOLCB2

Exodus 21 in the BOMCV

Exodus 21 in the BONAV

Exodus 21 in the BONCB

Exodus 21 in the BONLT

Exodus 21 in the BONUT2

Exodus 21 in the BOPLNT

Exodus 21 in the BOSCB

Exodus 21 in the BOSNC

Exodus 21 in the BOTLNT

Exodus 21 in the BOVCB

Exodus 21 in the BOYCB

Exodus 21 in the BPBB

Exodus 21 in the BPH

Exodus 21 in the BSB

Exodus 21 in the CCB

Exodus 21 in the CUV

Exodus 21 in the CUVS

Exodus 21 in the DBT

Exodus 21 in the DGDNT

Exodus 21 in the DHNT

Exodus 21 in the DNT

Exodus 21 in the ELBE

Exodus 21 in the EMTV

Exodus 21 in the ESV

Exodus 21 in the FBV

Exodus 21 in the FEB

Exodus 21 in the GGMNT

Exodus 21 in the GNT

Exodus 21 in the HARY

Exodus 21 in the HNT

Exodus 21 in the IRVA

Exodus 21 in the IRVB

Exodus 21 in the IRVG

Exodus 21 in the IRVH

Exodus 21 in the IRVK

Exodus 21 in the IRVM

Exodus 21 in the IRVM2

Exodus 21 in the IRVO

Exodus 21 in the IRVP

Exodus 21 in the IRVT

Exodus 21 in the IRVT2

Exodus 21 in the IRVU

Exodus 21 in the ISVN

Exodus 21 in the JSNT

Exodus 21 in the KAPI

Exodus 21 in the KBT1ETNIK

Exodus 21 in the KBV

Exodus 21 in the KJV

Exodus 21 in the KNFD

Exodus 21 in the LBA

Exodus 21 in the LBLA

Exodus 21 in the LNT

Exodus 21 in the LSV

Exodus 21 in the MAAL

Exodus 21 in the MBV

Exodus 21 in the MBV2

Exodus 21 in the MHNT

Exodus 21 in the MKNFD

Exodus 21 in the MNG

Exodus 21 in the MNT

Exodus 21 in the MNT2

Exodus 21 in the MRS1T

Exodus 21 in the NAA

Exodus 21 in the NASB

Exodus 21 in the NBLA

Exodus 21 in the NBS

Exodus 21 in the NBVTP

Exodus 21 in the NET2

Exodus 21 in the NIV11

Exodus 21 in the NNT

Exodus 21 in the NNT2

Exodus 21 in the NNT3

Exodus 21 in the PDDPT

Exodus 21 in the PFNT

Exodus 21 in the RMNT

Exodus 21 in the SBIAS

Exodus 21 in the SBIBS

Exodus 21 in the SBIBS2

Exodus 21 in the SBICS

Exodus 21 in the SBIDS

Exodus 21 in the SBIGS

Exodus 21 in the SBIHS

Exodus 21 in the SBIIS

Exodus 21 in the SBIIS2

Exodus 21 in the SBIIS3

Exodus 21 in the SBIKS

Exodus 21 in the SBIKS2

Exodus 21 in the SBIMS

Exodus 21 in the SBIOS

Exodus 21 in the SBIPS

Exodus 21 in the SBISS

Exodus 21 in the SBITS

Exodus 21 in the SBITS2

Exodus 21 in the SBITS3

Exodus 21 in the SBITS4

Exodus 21 in the SBIUS

Exodus 21 in the SBIVS

Exodus 21 in the SBT

Exodus 21 in the SBT1E

Exodus 21 in the SCHL

Exodus 21 in the SNT

Exodus 21 in the SUSU

Exodus 21 in the SUSU2

Exodus 21 in the SYNO

Exodus 21 in the TBIAOTANT

Exodus 21 in the TBT1E

Exodus 21 in the TBT1E2

Exodus 21 in the TFTIP

Exodus 21 in the TFTU

Exodus 21 in the TGNTATF3T

Exodus 21 in the THAI

Exodus 21 in the TNFD

Exodus 21 in the TNT

Exodus 21 in the TNTIK

Exodus 21 in the TNTIL

Exodus 21 in the TNTIN

Exodus 21 in the TNTIP

Exodus 21 in the TNTIZ

Exodus 21 in the TOMA

Exodus 21 in the TTENT

Exodus 21 in the UBG

Exodus 21 in the UGV

Exodus 21 in the UGV2

Exodus 21 in the UGV3

Exodus 21 in the VBL

Exodus 21 in the VDCC

Exodus 21 in the YALU

Exodus 21 in the YAPE

Exodus 21 in the YBVTP

Exodus 21 in the ZBP