Exodus 34 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis, “Wapụta mbadamba nkume abụọ dịka nke mbụ, aga m edekwasị nʼelu ha okwu niile nke dị nʼelu mbadamba nkume ndị mbụ ahụ, bụ nke ị tụpịasịrị. 2 Jikere nʼụtụtụ, rigoro ugwu Saịnaị ka i chee onwe gị nʼihu m nʼelu ugwu ahụ. 3 Onye ọbụla esokwala gị, ma ọ bụkwanụ nọdụ nso ugwu ahụ. Ekwekwala ka igwe ehi maọbụ igwe atụrụ kpaa nri nso nso ugwu ahụ.” 4 Mosis biliri nʼisi ụtụtụ, waa mbadamba nkume abụọ dịka ndị nke mbụ, rigoro ugwu Saịnaị dịka ONYENWE ANYỊ gwara ya. Ọ jikwa nkume abụọ ahụ nʼaka ya. 5 Nʼoge ahụ, ONYENWE ANYỊ rịdatara nʼime ogidi igwe ojii, guzo nʼihu Mosis, kwupụta aha ya bụ ONYENWE ANYỊ. 6 O si nʼihu Mosis gafee na-ekwu na-asị, “ONYENWE ANYỊ, ONYENWE ANYỊ, Chineke ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, na onye babigara ụba oke nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 7 Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.” 8 Otu mgbe ahụ, Mosis hulatara kpọọ isiala, 9 sị ya, “Ọ bụrụ nʼezie na m achọtala ihuọma nʼanya gị, Onyenwe m, ka Onyenwe m, biko soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị isiike, gbaghara anyị ajọ omume anyị, na mmehie anyị niile, ka ị nabatakwa anyị dịka ndị nke gị.” 10 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sịrị, “Mụ onwe m na gị na-agba ndụ. Nʼihu ndị gị niile, aga m arụ oke ọrụ ịtụnanya dị ukwu, ụdị nke a na-emetụbeghị mbụ nʼụwa, maọbụ na mba ọ bụla. Ndị niile unu bi nʼetiti ha ga-ahụ ọrụ ONYENWE ANYỊ. Ọrụ ahụ dị oke egwu nke m ga-arụ nʼihi unu. 11 Debe ihe niile m nyere gị nʼiwu taa. Aga m esite nʼihu unu chụpụ ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus. 12 Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ unu na-aba nʼime ya ghara ịgba ndụ. Ka ha ghara ị bụ ihe ịma nʼọnya nʼetiti unu. 13 Kama, tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha jiri mere chi ha. 14 Unu efela chi ọzọ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ, onye aha ya bụ Ekworo, bụ Chineke na-ekwo ekworo. 15 “Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ ghara ịgba ndụ, nʼihi na mgbe ha na-akwaso chi ha iko, na-achụkwa aja nye chi ha, ha ga-akpọ unu oku nri, mgbe ahụ, unu ga-eri site nʼihe aja ha. 16 Mgbe unu lụtara ụfọdụ ndị inyom ha dịka nwunye nye ụmụ unu ndị ikom, ndị inyom ndị a na-akwaso chi ha iko, ga-eme ka ụmụ unu ndị ikom soro ha nʼomume dị otu a. 17 “Unu akpụla chi ọbụla. 18 “Na-emenụ mmemme achịcha na-ekoghị eko. Rienụ achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa, dịka m nyere nʼiwu na a ga-eme nʼụbọchị ndị ahụ a họpụtara, nʼọnwa Abib, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta. 19 “Nwa nwoke ọbụla e bụ ụzọ mụọ bụ nke m, tinyere ụmụ anụ ụlọ, ma ehi, ma atụrụ, ma ewu. 20 E nwere ike ịgbapụta nwa oke ịnyịnya ibu site nʼiwere nwa atụrụ dochie nʼọnọdụ ya. Ọ bụrụ na i kpebie na ị gaghị agbapụta ya, mgbe ahụ, ị ga-agbaji olu ya. Ma ụmụ unu ndị ikom niile ka a ga-agbapụta.“O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abịa guzo m nʼihu na-ejighị onyinye. 21 “Nʼoge ịkụ ihe nʼubi na nʼoge owuwe ihe ubi, rụọnụ ọrụ naanị ụbọchị isii. Zukwanụ ike nʼụbọchị nke asaa. 22 “Mee Mmemme Izu Ụka asaa, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ọka wiiti mee, na Mmemme Nchịkọta Ihe nʼọgwụgwụ afọ ọbụla. 23 Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ nke Izrel. 24 Nʼihi na aga m esite nʼihu unu chụpụ mba dị iche iche. Meekwa ka ala unu saa mbara. Ọ dịghị onye ọbụla ga-enwe anya ukwu nʼebe ala unu dị, mgbe unu na-aga iche onwe unu nʼihu ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu, ugbo atọ nʼafọ. 25 “Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nye m. Unu ahapụkwala aja sitere na Mmemme Ngabiga ka ọ nọọ ruo ụtụtụ. 26 “Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma nʼụlọ ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke unu.“Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya.” 27 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Dee iwu ndị a m nyere gị, nʼihi na dịka okwu ndị a si dị, ka ọgbụgba ndụ mụ na gị na ụmụ Izrel gbara si dị.” 28 Mosis na ONYENWE ANYỊ nọ nʼebe ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Ma nʼoge ndị a niile o righị nri ọbụla. Ọ ṅụkwaghị ihe ọṅụṅụ ọbụla. O dere na mbadamba nkume abụọ ahụ okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke bụ iwu iri ahụ. 29 Mgbe Mosis ji mbadamba nkume abụọ nke ihe ama ahụ na-arịdata site nʼelu ugwu ahụ, ọ mataghị na ihu ya na-egbuke egbuke, nʼihi ọnọdụ nke ọ nọrọ nʼihu ONYENWE ANYỊ. 30 Nʼihi mgbuke ahụ ihu Mosis na-egbuke, ụjọ ekweghị Erọn na ụmụ Izrel bịaruo ya nso. 31 Ma Mosis kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Nʼihi ya, Erọn na ndị ndu nzukọ Izrel bịara ka ha na Mosis kparịtaa ụka. 32 Mgbe e mesịrị, ndị Izrel niile bịakwutere ya. O nyekwara ha iwu ndị ahụ ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼelu ugwu Saịnaị. 33 Mgbe Mosis gwachara ha okwu, o weere akwa kpuchie ihu ya. 34 Ma mgbe ọbụla ọ na-abanye nʼihu ONYENWE ANYỊ ka ha kparịtaa ụka nʼime ụlọ nzute ahụ, ọ na-ekepụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya tutu ruo mgbe ọ nọchara pụta. Mgbe ọ pụtara, ọ na-agwa ndị Izrel ihe niile ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu. 35 Ha hụkwara na ihu ya na akpụkpọ ihu ya na-egbuke egbuke. Emesịa, Mosis na-ekpuchikwa ihu ya tutu ruo mgbe ọ ga-abanye nʼime ka ya na ONYENWE ANYỊ kparịta ụka.

In Other Versions

Exodus 34 in the ANGEFD

Exodus 34 in the ANTPNG2D

Exodus 34 in the AS21

Exodus 34 in the BAGH

Exodus 34 in the BBPNG

Exodus 34 in the BBT1E

Exodus 34 in the BDS

Exodus 34 in the BEV

Exodus 34 in the BHAD

Exodus 34 in the BIB

Exodus 34 in the BLPT

Exodus 34 in the BNT

Exodus 34 in the BNTABOOT

Exodus 34 in the BNTLV

Exodus 34 in the BOATCB

Exodus 34 in the BOATCB2

Exodus 34 in the BOBCV

Exodus 34 in the BOCNT

Exodus 34 in the BOECS

Exodus 34 in the BOGWICC

Exodus 34 in the BOHCB

Exodus 34 in the BOHCV

Exodus 34 in the BOHLNT

Exodus 34 in the BOHNTLTAL

Exodus 34 in the BOILNTAP

Exodus 34 in the BOITCV

Exodus 34 in the BOKCV

Exodus 34 in the BOKCV2

Exodus 34 in the BOKHWOG

Exodus 34 in the BOKSSV

Exodus 34 in the BOLCB

Exodus 34 in the BOLCB2

Exodus 34 in the BOMCV

Exodus 34 in the BONAV

Exodus 34 in the BONCB

Exodus 34 in the BONLT

Exodus 34 in the BONUT2

Exodus 34 in the BOPLNT

Exodus 34 in the BOSCB

Exodus 34 in the BOSNC

Exodus 34 in the BOTLNT

Exodus 34 in the BOVCB

Exodus 34 in the BOYCB

Exodus 34 in the BPBB

Exodus 34 in the BPH

Exodus 34 in the BSB

Exodus 34 in the CCB

Exodus 34 in the CUV

Exodus 34 in the CUVS

Exodus 34 in the DBT

Exodus 34 in the DGDNT

Exodus 34 in the DHNT

Exodus 34 in the DNT

Exodus 34 in the ELBE

Exodus 34 in the EMTV

Exodus 34 in the ESV

Exodus 34 in the FBV

Exodus 34 in the FEB

Exodus 34 in the GGMNT

Exodus 34 in the GNT

Exodus 34 in the HARY

Exodus 34 in the HNT

Exodus 34 in the IRVA

Exodus 34 in the IRVB

Exodus 34 in the IRVG

Exodus 34 in the IRVH

Exodus 34 in the IRVK

Exodus 34 in the IRVM

Exodus 34 in the IRVM2

Exodus 34 in the IRVO

Exodus 34 in the IRVP

Exodus 34 in the IRVT

Exodus 34 in the IRVT2

Exodus 34 in the IRVU

Exodus 34 in the ISVN

Exodus 34 in the JSNT

Exodus 34 in the KAPI

Exodus 34 in the KBT1ETNIK

Exodus 34 in the KBV

Exodus 34 in the KJV

Exodus 34 in the KNFD

Exodus 34 in the LBA

Exodus 34 in the LBLA

Exodus 34 in the LNT

Exodus 34 in the LSV

Exodus 34 in the MAAL

Exodus 34 in the MBV

Exodus 34 in the MBV2

Exodus 34 in the MHNT

Exodus 34 in the MKNFD

Exodus 34 in the MNG

Exodus 34 in the MNT

Exodus 34 in the MNT2

Exodus 34 in the MRS1T

Exodus 34 in the NAA

Exodus 34 in the NASB

Exodus 34 in the NBLA

Exodus 34 in the NBS

Exodus 34 in the NBVTP

Exodus 34 in the NET2

Exodus 34 in the NIV11

Exodus 34 in the NNT

Exodus 34 in the NNT2

Exodus 34 in the NNT3

Exodus 34 in the PDDPT

Exodus 34 in the PFNT

Exodus 34 in the RMNT

Exodus 34 in the SBIAS

Exodus 34 in the SBIBS

Exodus 34 in the SBIBS2

Exodus 34 in the SBICS

Exodus 34 in the SBIDS

Exodus 34 in the SBIGS

Exodus 34 in the SBIHS

Exodus 34 in the SBIIS

Exodus 34 in the SBIIS2

Exodus 34 in the SBIIS3

Exodus 34 in the SBIKS

Exodus 34 in the SBIKS2

Exodus 34 in the SBIMS

Exodus 34 in the SBIOS

Exodus 34 in the SBIPS

Exodus 34 in the SBISS

Exodus 34 in the SBITS

Exodus 34 in the SBITS2

Exodus 34 in the SBITS3

Exodus 34 in the SBITS4

Exodus 34 in the SBIUS

Exodus 34 in the SBIVS

Exodus 34 in the SBT

Exodus 34 in the SBT1E

Exodus 34 in the SCHL

Exodus 34 in the SNT

Exodus 34 in the SUSU

Exodus 34 in the SUSU2

Exodus 34 in the SYNO

Exodus 34 in the TBIAOTANT

Exodus 34 in the TBT1E

Exodus 34 in the TBT1E2

Exodus 34 in the TFTIP

Exodus 34 in the TFTU

Exodus 34 in the TGNTATF3T

Exodus 34 in the THAI

Exodus 34 in the TNFD

Exodus 34 in the TNT

Exodus 34 in the TNTIK

Exodus 34 in the TNTIL

Exodus 34 in the TNTIN

Exodus 34 in the TNTIP

Exodus 34 in the TNTIZ

Exodus 34 in the TOMA

Exodus 34 in the TTENT

Exodus 34 in the UBG

Exodus 34 in the UGV

Exodus 34 in the UGV2

Exodus 34 in the UGV3

Exodus 34 in the VBL

Exodus 34 in the VDCC

Exodus 34 in the YALU

Exodus 34 in the YAPE

Exodus 34 in the YBVTP

Exodus 34 in the ZBP