Exodus 4 (BOICB)

1 Mosis zaghachiri ya sị, “Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ha agaghị ekwenye ihe m kwuru maọbụ ajụ ige m ntị? Ọ bụrụ na ha asị, ‘ONYENWE ANYỊ egosighị gị onwe ya.’ ” 2 Ma ONYENWE ANYỊ jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Gịnị ka i ji nʼaka?”Mosis zara sị, “Ọ bụ mkpanaka.” 3 ONYENWE ANYỊ sịrị ya, “Tụpụ ya nʼala.”Mosis tụpụrụ ya nʼala. Ma otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ agwọ. Mosis sitere nʼebe agwọ ahụ nọ gbapụ ọsọ. 4 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu ọzọ sị ya, “Jide agwọ ahụ aka nʼọdụdụ ya.” Mgbe Mosis mere nke a, agwọ ahụ ghọghachikwara mkpanaka. 5 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Ọ bụrụ na i mee ihe ịrịbama a, ha ga-ekwere ihe ị gwara ha. Ha ga-aghọta na ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna ha, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb gosiri gị onwe ya.” 6 ONYENWE ANYỊ gwara ya okwu ọzọ sị, “Tinye aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mgbe Mosis tinyere aka ya wepụta ya, ọ chọpụtara na ekpenta jupụtara nʼaka ahụ nke na-enwu ezi ọcha. 7 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, “Tinyekwa aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mosis mere otu a. Mgbe o wepụtara aka ya ọzọ, ọ hụrụ na ọ dịghachiri dịka akụkụ anụ ahụ ya ndị ọzọ. 8 Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ sịrị, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ekweghị gị maọbụ nabata ihe ama nke mbụ, ha ga-ekwe ihe ịrịbama nke abụọ a. 9 Ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị nʼihe ịrịbama abụọ ndị a ma ọ bụkwanụ gee gị ntị; kute mmiri nʼosimiri Naịl, wụpụ ya nʼala akọrọ. Mmiri ahụ nke i kutere site nʼosimiri ga-agbanwe, ghọọ ọbara nʼala akọrọ.” 10 Mosis sịrị ONYENWE ANYỊ, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.” 11 ONYENWE ANYỊ jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere ọnụ mmadụ? Onye na-emekwa ka ntị mmadụ chie ya, maọbụ ka mmadụ daa ogbi? Onye na-eme ka mmadụ hụ ụzọ, maọbụ kpụọ ìsì? Ọ bụghị mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ? 12 Ugbu a, gaa mee ihe m gwara gị. Aga m enyere gị aka ikwu okwu nke ọma. Aga m agwakwa gị ihe ị ga-ekwu.” 13 Ma ọ rịọrọ, “Biko Onyenwe m, ziganụ onye ọzọ.” 14 ONYENWE ANYỊ were iwe dị ọkụ megide Mosis sị ya, “Kedụ maka nwanne gị nwoke Erọn onye Livayị, amaara m na ọ bụ onye ọka okwu. Lee, ọ na-abịa izute gị. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara gị. 15 Ị ga-agwa ya okwu, tinye okwu gị nʼọnụ ya. Aga m enyere unu abụọ aka ikwu okwu nke ọma, aga m ezikwa unu abụọ ihe unu ga-eme. 16 Ọ ga-abụ onye na-ekwuchite ọnụ gị nʼebe ndị mmadụ nọ. Ị ga-anọ dịka Chineke nʼebe ọ nọ, nʼihi na ị ga-agwa ya ihe niile ọ ga-ekwu. 17 Ma ị ga-ejide mkpanaka a dị nʼaka gị ka i nwee ike jiri ya mee ihe ịrịbama.” 18 Emesịa, Mosis lọghachiri nʼụlọ ebe o bi, jekwuru Jetro ọgọ ya nwoke rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m laghachi nʼIjipt gaa chọpụta ma o nwere ndị ikwu m ka dị ndụ.”Jetro sịrị, “Gaa nʼudo.” 19 Ugbu a ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu nʼala Midia sị ya, “Laghachi Ijipt nʼihi na ndị niile chọrọ igbu gị anwụchaala.” 20 Mosis kpọọrọ nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, laghachi nʼala Ijipt. O jikwa mkpanaka Chineke ahụ nʼaka ya. 21 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, “Mgbe i ruru Ijipt, hụ na ị gara nʼihu Fero mee ihe ebube niile m nyere gị ike ime. Ma aga m eme ka obi ya sie ike, ka ọ ghara ikwe ka ndị m laa. 22 Ị ga-agwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru, Izrel bụ Ọkpara m. 23 Agwara m gị okwu sị, “Hapụ nwa m nwoke ka o si nʼala Ijipt pụọ gaa ebe ọ ga-anọ fee m ofufe,” ma ị jụrụ ajụ. Ugbu a aga m egbu ọkpara gị.’ ” 24 Mgbe Mosis na ezinaụlọ ya na-alaghachi Ijipt, ha rutere ebe ha ga-ezu ike abalị. Nʼebe ahụ, ONYENWE ANYỊ bịakwutere Mosis chọọ igbu ya. 25 Ma Zipọra nwunye Mosis weere mma ntakịrị bie nwa ya ugwu. O were ihe o bipụtara nʼugwu a metụ nʼụkwụ Mosis, kwuo sị, “Nʼezie, ị bụ di ọbara nʼebe m nọ.” 26 Nʼihi ya, ONYENWE ANYỊ hapụrụ Mosis. (Mgbe ahụ, Zipọra kwuru sị, “Ị bụ di ọbara,” nʼihi obibi ugwu ahụ.) 27 Ugbu a, ONYENWE ANYỊ gwara Erọn okwu sị, “Gaa nʼime ọzara ka izute Mosis.” Erọn gara jekwuru Mosis nʼugwu Horeb, ugwu Chineke, sutu ya ọnụ. 28 Mgbe ahụ Mosis gwara Erọn ihe niile ONYENWE ANYỊ ziri ya ka o kwuo, ya na ihe ịrịbama ndị ahụ niile o nyere nʼiwu ka o mee. 29 Mosis na Erọn jeruru Ijipt kpọọ nzukọ ndị okenye ụmụ Izrel niile. 30 Erọn gwara ha ihe niile ONYENWE ANYỊ gwara Mosis. Mosis, nʼonwe ya mere ihe ịrịbama ahụ niile nʼihu anya ha. 31 Mgbe ahụ, ha kwenyere; dịka ha nụrụ na ONYENWE ANYỊ eletala ụmụ Izrel, ma hụkwa ahụhụ ha. Ha kpọrọ isiala fee ya ofufe.

In Other Versions

Exodus 4 in the ANGEFD

Exodus 4 in the ANTPNG2D

Exodus 4 in the AS21

Exodus 4 in the BAGH

Exodus 4 in the BBPNG

Exodus 4 in the BBT1E

Exodus 4 in the BDS

Exodus 4 in the BEV

Exodus 4 in the BHAD

Exodus 4 in the BIB

Exodus 4 in the BLPT

Exodus 4 in the BNT

Exodus 4 in the BNTABOOT

Exodus 4 in the BNTLV

Exodus 4 in the BOATCB

Exodus 4 in the BOATCB2

Exodus 4 in the BOBCV

Exodus 4 in the BOCNT

Exodus 4 in the BOECS

Exodus 4 in the BOGWICC

Exodus 4 in the BOHCB

Exodus 4 in the BOHCV

Exodus 4 in the BOHLNT

Exodus 4 in the BOHNTLTAL

Exodus 4 in the BOILNTAP

Exodus 4 in the BOITCV

Exodus 4 in the BOKCV

Exodus 4 in the BOKCV2

Exodus 4 in the BOKHWOG

Exodus 4 in the BOKSSV

Exodus 4 in the BOLCB

Exodus 4 in the BOLCB2

Exodus 4 in the BOMCV

Exodus 4 in the BONAV

Exodus 4 in the BONCB

Exodus 4 in the BONLT

Exodus 4 in the BONUT2

Exodus 4 in the BOPLNT

Exodus 4 in the BOSCB

Exodus 4 in the BOSNC

Exodus 4 in the BOTLNT

Exodus 4 in the BOVCB

Exodus 4 in the BOYCB

Exodus 4 in the BPBB

Exodus 4 in the BPH

Exodus 4 in the BSB

Exodus 4 in the CCB

Exodus 4 in the CUV

Exodus 4 in the CUVS

Exodus 4 in the DBT

Exodus 4 in the DGDNT

Exodus 4 in the DHNT

Exodus 4 in the DNT

Exodus 4 in the ELBE

Exodus 4 in the EMTV

Exodus 4 in the ESV

Exodus 4 in the FBV

Exodus 4 in the FEB

Exodus 4 in the GGMNT

Exodus 4 in the GNT

Exodus 4 in the HARY

Exodus 4 in the HNT

Exodus 4 in the IRVA

Exodus 4 in the IRVB

Exodus 4 in the IRVG

Exodus 4 in the IRVH

Exodus 4 in the IRVK

Exodus 4 in the IRVM

Exodus 4 in the IRVM2

Exodus 4 in the IRVO

Exodus 4 in the IRVP

Exodus 4 in the IRVT

Exodus 4 in the IRVT2

Exodus 4 in the IRVU

Exodus 4 in the ISVN

Exodus 4 in the JSNT

Exodus 4 in the KAPI

Exodus 4 in the KBT1ETNIK

Exodus 4 in the KBV

Exodus 4 in the KJV

Exodus 4 in the KNFD

Exodus 4 in the LBA

Exodus 4 in the LBLA

Exodus 4 in the LNT

Exodus 4 in the LSV

Exodus 4 in the MAAL

Exodus 4 in the MBV

Exodus 4 in the MBV2

Exodus 4 in the MHNT

Exodus 4 in the MKNFD

Exodus 4 in the MNG

Exodus 4 in the MNT

Exodus 4 in the MNT2

Exodus 4 in the MRS1T

Exodus 4 in the NAA

Exodus 4 in the NASB

Exodus 4 in the NBLA

Exodus 4 in the NBS

Exodus 4 in the NBVTP

Exodus 4 in the NET2

Exodus 4 in the NIV11

Exodus 4 in the NNT

Exodus 4 in the NNT2

Exodus 4 in the NNT3

Exodus 4 in the PDDPT

Exodus 4 in the PFNT

Exodus 4 in the RMNT

Exodus 4 in the SBIAS

Exodus 4 in the SBIBS

Exodus 4 in the SBIBS2

Exodus 4 in the SBICS

Exodus 4 in the SBIDS

Exodus 4 in the SBIGS

Exodus 4 in the SBIHS

Exodus 4 in the SBIIS

Exodus 4 in the SBIIS2

Exodus 4 in the SBIIS3

Exodus 4 in the SBIKS

Exodus 4 in the SBIKS2

Exodus 4 in the SBIMS

Exodus 4 in the SBIOS

Exodus 4 in the SBIPS

Exodus 4 in the SBISS

Exodus 4 in the SBITS

Exodus 4 in the SBITS2

Exodus 4 in the SBITS3

Exodus 4 in the SBITS4

Exodus 4 in the SBIUS

Exodus 4 in the SBIVS

Exodus 4 in the SBT

Exodus 4 in the SBT1E

Exodus 4 in the SCHL

Exodus 4 in the SNT

Exodus 4 in the SUSU

Exodus 4 in the SUSU2

Exodus 4 in the SYNO

Exodus 4 in the TBIAOTANT

Exodus 4 in the TBT1E

Exodus 4 in the TBT1E2

Exodus 4 in the TFTIP

Exodus 4 in the TFTU

Exodus 4 in the TGNTATF3T

Exodus 4 in the THAI

Exodus 4 in the TNFD

Exodus 4 in the TNT

Exodus 4 in the TNTIK

Exodus 4 in the TNTIL

Exodus 4 in the TNTIN

Exodus 4 in the TNTIP

Exodus 4 in the TNTIZ

Exodus 4 in the TOMA

Exodus 4 in the TTENT

Exodus 4 in the UBG

Exodus 4 in the UGV

Exodus 4 in the UGV2

Exodus 4 in the UGV3

Exodus 4 in the VBL

Exodus 4 in the VDCC

Exodus 4 in the YALU

Exodus 4 in the YAPE

Exodus 4 in the YBVTP

Exodus 4 in the ZBP