Exodus 8 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Jekwuru Fero gwa ya, ‘Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru. Hapụ ndị m, ka ha gaa fee m ofufe. 2 Ọ bụrụ na ị jụ ịhapụ ha ka ha gaa, aga m eme ka awọ jupụta nʼala Ijipt niile. 3 Osimiri Naịl ga-ejupụta nʼawọ. Ha ga-abata nʼụlọeze gị na nʼime ọnụụlọ ndina gị, ma nʼelu ihe ndina gị, ma nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, ma nʼụlọ ndị gị niile, na nʼebe a na-esi nri, ma nʼime ihe e ji agwakọta ụtụ ọka. 4 Awọ ndị a ga-arịgokwa nʼahụ gị, na nʼahụ ndị gị, na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi.’ ” 5 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Gwa Erọn, ‘Setịpụ aka gị ya na mkpanaka gị nʼelu osimiri niile, na mmiri nta na ọdọ mmiri ndị Ijipt, mee ka awọ jupụta ala Ijipt niile.’ ” 6 Erọn setịpụrụ aka nʼelu mmiri niile nke Ijipt, awọ pụtara kpuchie ala ahụ niile. 7 Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ihe ahụ Mosis na Erọn mere. Ha mekwara ka awọ jupụta ala ahụ niile. 8 Fero kpọrọ Mosis na Erọn rịọọ ha sị, “Rịọọnụ ONYENWE ANYỊ ka o wepụrụ mụ na ndị m awọ ndị a. Emesịa aga m ekwe ka ndị gị gaa chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja.” 9 Mosis zaghachiri Fero sị, “Gị ka ọ dịrị ịgwa m mgbe m ga-arịọ arịrịọ a nʼisi gị na nʼisi ndị gị, ka e wezuga awọ ndị a site nʼụlọ unu, ma hapụ naanị ndị nọ nʼosimiri Naịl.” 10 Mgbe ahụ Fero sịrị Mosis, “Achọrọ m ka i mee ya echi.”Mosis zaghachiri Fero sị, “Ọ dị mma, ka ọ dịrị dịka i kwuru. Mgbe ahụ, ị ga-amata na o nweghị onye dịka ONYENWE ANYỊ Chineke anyị. 11 Awọ ndị a niile ga-apụ site nʼebe ị nọ, na site nʼụlọ gị na site nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi na site nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ọ bụ naanị nʼosimiri Naịl ka ha ga-anọ.” 12 Mgbe Mosis na Erọn sitere nʼụlọ Fero pụọ, Mosis kpọkuru ONYENWE ANYỊ ka o wepụ awọ ndị a o mere ka ha bịakwasị Fero. 13 ONYENWE ANYỊ mere ihe Mosis rịọrọ. Awọ ndị ahụ niile nwụrụ nʼime ụlọ, na nʼama, na nʼọhịa. 14 E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu. 15 Ma mgbe Fero hụrụ na awọ ndị a anwụchaala, o mechiri obi ya jụ ige Mosis na Erọn ntị, dịka ONYENWE ANYỊ kwuru na ọ ga-eme. 16 Ya mere, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala Ijipt niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.” 17 Mosis na Erọn mere nke a. Mgbe Erọn setịpụrụ aka tie mkpanaka ya nʼelu ala, anwụ nta jupụtara nʼala Ijipt niile, nʼahụ ndị mmadụ, na nʼahụ anụmanụ ha. Ndanda ndị a jupụtakwara nʼuzuzu niile dị nʼala ahụ. 18 Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta.Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile. 19 Naanị ihe ndị na-eme majiki gwara Fero bụ, “Nke a bụ akaọrụ Chineke.” Ma Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ chọghị ige, ọ bụladị ndị majiki ya ntị, dịka ONYENWE ANYỊ kwuru na ọ ga-eme. 20 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru Fero. Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri, gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe. 21 Ọ bụrụ na ị chọghị ime otu a, aga m eme ka igwe ijiji jupụta nʼala Ijipt niile. Ha ga-ejupụta gị nʼahụ na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi, na nʼahụ ndị gị niile, na nʼime ụlọ unu niile. 22 “ ‘Nʼụbọchị ahụ, igwe ijiji ndị a agaghị emetụ ndị nọ na Goshen ebe ndị m bi. Mgbe ahụ ka ị ga-amata na mụ bụ ONYENWE ANYỊ bịara ije nʼala a. 23 Aga m emekwa ka ọ pụta ìhè na o nwere ihe dị iche nʼetiti ndị m na ndị gị. Ihe ịrịbama a ga-emezukwa echi.’ ” 24 Nʼechi ya, ONYENWE ANYỊ mere dịka o kwuru. Igwe ijiji dị egwu nʼọnụọgụgụ bịara nʼala Ijipt, jupụta nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị niile na-ejere ya ozi, na nʼala Ijipt niile. E mere ka ala Ijipt bụrụ ihe e ji ijiji mebie. 25 Mgbe ihe ndị a na-eme, Fero kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha okwu sị, “Gaanụ chụọrọ Chineke unu aja, ma ka ọ bụrụ nʼala Ijipt.” 26 Mosis zaghachiri Fero sị, “Nke ahụ abụghị ihe ziri ezi, nʼihi na aja anyị na-aga ịchụrụ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ndị Ijipt. Ọ bụrụ na anyị achụọ aja a nʼihu ha, ha ga-eji nkume tugbuo anyị. 27 Anyị ga-aga njem ụbọchị atọ nʼime ọzara gaa chụọrọ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị aja, dịka o nyere anyị iwu ka anyị mee.” 28 Fero zaghachiri ha sị, “Aga m ekwenye ka unu ga chụọrọ ONYENWE ANYỊ Chineke unu aja nʼọzara, ma unu agaghị aga ebe dị anya. Ugbu a, kperenụ m ekpere.” 29 Mosis zara Fero sị ya, “Ngwangwa m si nʼihu gị pụọ, aga m arịọ ONYENWE ANYỊ arịrịọ. Echi, a ga-esite nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị na-ejere ya ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile wezuga ijiji ndị a. Ọ ga-adị mkpa na Fero ga-elezi anya hapụ ịghọ aghụghọ ọzọ site ịjụ ka ụmụ Izrel gaa chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja.” 30 Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Fero pụọ rịọọ ONYENWE ANYỊ ka o mee ka ijiji ndị a gabiga. 31 ONYENWE ANYỊ mere dịka Mosis rịọrọ. Ijiji ndị a sitere nʼụlọ Fero na ụlọ ndị na-ejere ya ozi na ụlọ ndị Ijipt niile pụọ. O nwekwaghị ijiji ọ bụla fọdụrụ nʼala ahụ. 32 Ma nʼoge a, Fero gara nʼihu ime ka obi ya sie ike. O kweghị ka ụmụ Izrel laa.

In Other Versions

Exodus 8 in the ANGEFD

Exodus 8 in the ANTPNG2D

Exodus 8 in the AS21

Exodus 8 in the BAGH

Exodus 8 in the BBPNG

Exodus 8 in the BBT1E

Exodus 8 in the BDS

Exodus 8 in the BEV

Exodus 8 in the BHAD

Exodus 8 in the BIB

Exodus 8 in the BLPT

Exodus 8 in the BNT

Exodus 8 in the BNTABOOT

Exodus 8 in the BNTLV

Exodus 8 in the BOATCB

Exodus 8 in the BOATCB2

Exodus 8 in the BOBCV

Exodus 8 in the BOCNT

Exodus 8 in the BOECS

Exodus 8 in the BOGWICC

Exodus 8 in the BOHCB

Exodus 8 in the BOHCV

Exodus 8 in the BOHLNT

Exodus 8 in the BOHNTLTAL

Exodus 8 in the BOILNTAP

Exodus 8 in the BOITCV

Exodus 8 in the BOKCV

Exodus 8 in the BOKCV2

Exodus 8 in the BOKHWOG

Exodus 8 in the BOKSSV

Exodus 8 in the BOLCB

Exodus 8 in the BOLCB2

Exodus 8 in the BOMCV

Exodus 8 in the BONAV

Exodus 8 in the BONCB

Exodus 8 in the BONLT

Exodus 8 in the BONUT2

Exodus 8 in the BOPLNT

Exodus 8 in the BOSCB

Exodus 8 in the BOSNC

Exodus 8 in the BOTLNT

Exodus 8 in the BOVCB

Exodus 8 in the BOYCB

Exodus 8 in the BPBB

Exodus 8 in the BPH

Exodus 8 in the BSB

Exodus 8 in the CCB

Exodus 8 in the CUV

Exodus 8 in the CUVS

Exodus 8 in the DBT

Exodus 8 in the DGDNT

Exodus 8 in the DHNT

Exodus 8 in the DNT

Exodus 8 in the ELBE

Exodus 8 in the EMTV

Exodus 8 in the ESV

Exodus 8 in the FBV

Exodus 8 in the FEB

Exodus 8 in the GGMNT

Exodus 8 in the GNT

Exodus 8 in the HARY

Exodus 8 in the HNT

Exodus 8 in the IRVA

Exodus 8 in the IRVB

Exodus 8 in the IRVG

Exodus 8 in the IRVH

Exodus 8 in the IRVK

Exodus 8 in the IRVM

Exodus 8 in the IRVM2

Exodus 8 in the IRVO

Exodus 8 in the IRVP

Exodus 8 in the IRVT

Exodus 8 in the IRVT2

Exodus 8 in the IRVU

Exodus 8 in the ISVN

Exodus 8 in the JSNT

Exodus 8 in the KAPI

Exodus 8 in the KBT1ETNIK

Exodus 8 in the KBV

Exodus 8 in the KJV

Exodus 8 in the KNFD

Exodus 8 in the LBA

Exodus 8 in the LBLA

Exodus 8 in the LNT

Exodus 8 in the LSV

Exodus 8 in the MAAL

Exodus 8 in the MBV

Exodus 8 in the MBV2

Exodus 8 in the MHNT

Exodus 8 in the MKNFD

Exodus 8 in the MNG

Exodus 8 in the MNT

Exodus 8 in the MNT2

Exodus 8 in the MRS1T

Exodus 8 in the NAA

Exodus 8 in the NASB

Exodus 8 in the NBLA

Exodus 8 in the NBS

Exodus 8 in the NBVTP

Exodus 8 in the NET2

Exodus 8 in the NIV11

Exodus 8 in the NNT

Exodus 8 in the NNT2

Exodus 8 in the NNT3

Exodus 8 in the PDDPT

Exodus 8 in the PFNT

Exodus 8 in the RMNT

Exodus 8 in the SBIAS

Exodus 8 in the SBIBS

Exodus 8 in the SBIBS2

Exodus 8 in the SBICS

Exodus 8 in the SBIDS

Exodus 8 in the SBIGS

Exodus 8 in the SBIHS

Exodus 8 in the SBIIS

Exodus 8 in the SBIIS2

Exodus 8 in the SBIIS3

Exodus 8 in the SBIKS

Exodus 8 in the SBIKS2

Exodus 8 in the SBIMS

Exodus 8 in the SBIOS

Exodus 8 in the SBIPS

Exodus 8 in the SBISS

Exodus 8 in the SBITS

Exodus 8 in the SBITS2

Exodus 8 in the SBITS3

Exodus 8 in the SBITS4

Exodus 8 in the SBIUS

Exodus 8 in the SBIVS

Exodus 8 in the SBT

Exodus 8 in the SBT1E

Exodus 8 in the SCHL

Exodus 8 in the SNT

Exodus 8 in the SUSU

Exodus 8 in the SUSU2

Exodus 8 in the SYNO

Exodus 8 in the TBIAOTANT

Exodus 8 in the TBT1E

Exodus 8 in the TBT1E2

Exodus 8 in the TFTIP

Exodus 8 in the TFTU

Exodus 8 in the TGNTATF3T

Exodus 8 in the THAI

Exodus 8 in the TNFD

Exodus 8 in the TNT

Exodus 8 in the TNTIK

Exodus 8 in the TNTIL

Exodus 8 in the TNTIN

Exodus 8 in the TNTIP

Exodus 8 in the TNTIZ

Exodus 8 in the TOMA

Exodus 8 in the TTENT

Exodus 8 in the UBG

Exodus 8 in the UGV

Exodus 8 in the UGV2

Exodus 8 in the UGV3

Exodus 8 in the VBL

Exodus 8 in the VDCC

Exodus 8 in the YALU

Exodus 8 in the YAPE

Exodus 8 in the YBVTP

Exodus 8 in the ZBP