Ezekiel 36 (BOICB)

1 “Nwa nke mmadụ, buo amụma nye ugwu niile dị nʼIzrel, na-asị ha, ‘Ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu nke ONYENWE ANYỊ. 2 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Ndị iro unu ekwuola megide unu sị, “Ahaa! Ebe niile dị elu nke mgbe ochie aghọọla ihe nnweta anyị.” ’ 3 Nʼihi ya, buo amụma sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Nʼihi na ha emeela ka unu tọgbọrọ nʼefu, chụgharịa unu ọsọ nʼakụkụ niile, mekwaa ka unu ghọọrọ mba niile ihe nnweta, ma meekwa ka unu bụrụ ndị a na-ekwujọ, na ndị a na-akọcha, 4 nʼihi ya, unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ. Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-agwa ugwu ukwuu na ugwu nta niile, na mgbawara niile dị nʼala, na ndagwurugwu niile, na ebe niile tọgbọrọ nʼefu, na obodo ndị ahụ niile ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya, nke ndị mba ọzọ kwakọọrọ ihe dị ha nʼime, ma jirikwa ha na-eme ihe ọchị. 5 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nke obi m ka m ji kwuo okwu megide mba ndị ọzọ, ma megidekwa Edọm, nʼihi na ọ bụ site nʼịkpọ asị nke obi ha ka ha ji mee ka ala m bụrụ ihe nnweta ha, ka ha si otu a kposaa, ma chịkọrọkwa ihe niile dị nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ala ahụ.’ 6 Nʼihi nke a, buo amụma banyere Izrel, gwa ugwu ukwu ya na ugwu nta ya niile, na mgbawara ala ya, na ndagwurugwu ya niile, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, ọ bụ site nʼọnụma nke ekworo ka m ji ekwu okwu ndị a, nʼihi na unu ahụọla ahụhụ site na nlelị ndị mba ọzọ na-elelị unu. 7 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, eweliri m aka m elu ṅụọ iyi na mba ndị a gbara unu gburugburu ga-anọkwa nʼọnọdụ ihere. 8 “ ‘Ma unu, ugwu niile nke Izrel ga-awapụta ngalaba, mịakwa mkpụrụ nke ndị m ga-eri, nʼihi na oge ha ga-alọghachi adịghịkwa anya. 9 Lee, mụ onwe m dịnyeere unu; aga m abịa inyere unu aka, nʼihi na a ga-akọgharịkwa unu, kụọkwa mkpụrụ nʼime unu. 10 Aga m emekwa ka ọnụọgụgụ ndị ga-ebi nʼime unu baa ụba, ọ bụladị ụlọ Izrel niile. Ha ga-ebikwa nʼobodo niile, wugharịakwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ. 11 Aga m eme ka ọnụọgụgụ ndị mmadụ, na anụ ụlọ dị nʼime gị baa ụba. Ha ga-amụbakwa, jupụtakwa ebe niile. Ndị mmadụ ga-ebikwa nʼelu gị dịka ha si biri nʼoge gara aga. Aga m emekwa ka ihe gaara ha nke ọma karịa ka ọ dị na mbụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 12 Aga m eme ka ndị m, ndị m bụ Izrel, biri nʼime unu. Unu ga-abụ ihe nweta ha, unu ga-aghọkwara ha ihe nketa. Unu agakwaghị agbaba ha aka ụmụ ọzọ. 13 “ ‘Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, nʼihi na ụfọdụ mba na-ekwutọ gị na-asị, “Ị bụ ala na-eri ụmụ ya, ala na-agbaba ndị ya aka ụmụ.” 14 Nʼihi nke a, ị gaghị erikwa mmadụ ọzọ. Ị gaghị agbawakwa mba gị aka ụmụ ọzọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 15 Agaghị m emekwa ka ị nụrụ mkparị nke ndị mba ọzọ na-akparị gị. Ị gaghị anọkwa ọnọdụ nke ga-eme ka ndị mba ọzọ lelịa gị, maọbụ nọọ ọnọdụ nke ga-eme ka ị sọọ ngọngọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.’ ” 16 Ọzọkwa, okwu nke ONYENWE ANYỊ rutere m ntị, sị, 17 “Nwa nke mmadụ, mgbe ụmụ Izrel bi nʼala nke aka ha, ha merụrụ ya, site na ndụ ọjọọ ha, na omume ha. Ndụ ọjọọ ha nʼihu m, dị ka adịghị ọcha nke nwanyị nʼoge ọ nọ na nsọ ya, nʼọnwa niile. 18 Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m, nʼihi na ha na-awụsi ọbara nʼala ahụ, jirikwa arụsị ha na-emerụ ya. 19 Achụsasịrị m ha na mba dị iche iche. Otu a ka m si kpee ha ikpe nʼihi ụzọ ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha. 20 Ma ebe niile ha gara nʼetiti mba niile, ha mere ka aha nsọ m gharakwa ịdị nsọ, nʼihi na a na-ekwu banyere ha, sị, ‘Ndị a bụ ndị nke ONYENWE ANYỊ, ma agbanyeghị nke a, ha sitere nʼala ya pụọ.’ 21 Ihe na-ewutekwa m bụ aha nsọ m, nke ụlọ Izrel mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile bụ ebe ha gara. 22 “Ya mere, gwa ụlọ Izrel, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Ọ bụghị nʼihi na unu, ụlọ Izrel, ka m ji na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ nʼihi aha nsọ m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile dị iche iche ebe ndị unu gara. 23 Aga m eme ka ịdị nsọ nke aha ukwuu m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile, pụta ìhè. Mgbe ahụ, mba niile ga-amakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara, mgbe a ga-edo m nsọ site nʼime unu nʼanya ha. 24 “ ‘Nʼihi na aga m esi na mba niile dị iche iche kpọpụta unu. Aga m achịkọta unu site nʼala niile, mee ka unu bata nʼala unu. 25 Aga m efekwasị unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha. Aga m eme ka unu dị ọcha site na-adịghị ọcha unu niile, na site nʼikpere arụsị unu niile. 26 Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ. 27 Aga m etinyekwa mmụọ m nʼime unu, mee ka unu gbaso ụkpụrụ m niile ma lezie anya mekwaa ihe niile m nyere nʼiwu. 28 Unu ga-ebikwa nʼala ahụ nke m nyere nna unu ha. Unu ga-abụ ndị m, aga m abụkwa Chineke unu. 29 Aga m azọpụta unu site na-adịghị ọcha unu niile. M ga-akpọ mkpụrụ ubi, mee ka o rie nne nke ukwu, agaghị m emekwa ka ụnwụ dakwasị unu ọzọ. 30 Aga m emekwa ka mkpụrụ osisi na ihe owuwe ubi baa ụba nke ukwuu, ka unu gharakwa ịnata ihere ọzọ nʼihi ụnwụ, nʼetiti mba niile dị iche iche. 31 Mgbe ahụ, unu ga-echeta ụzọ ọjọọ unu niile na omume ọjọọ unu niile, unu ga-asọkwa onwe unu oyi nʼihi mmehie unu na ihe arụ niile unu mere. 32 Ma achọrọ m ka unu mata na ọ bụghị nʼihi mma unu ka m ji na-eme ihe ndị a. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara. Unu ụlọ Izrel, ihere kwesiri ime unu nʼihi omume ọjọọ unu mere. 33 “ ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ka ị dị ọcha site na mmehie gị niile, aga m eme ka unu lọghachi nʼobodo unu biri, a ga-ewugharịkwa ebe niile tọgbọrọ nʼefu. 34 Ala ubi ndị ahụ nke tọgbọrọ nʼefu agaghị atọgbọkwa nʼefu nʼihu anya ndị na-agafe agafe. A ga-akọkwa ha niile. 35 Mgbe ahụ, ha ga-asị, “Ala a, nke naara atọgbọ nʼefu, aghọọla ubi a gbara ogige, nke yiri ogige Iden. Leekwa na obodo niile ndị ahụ e tikpọrọ etikpọ, ka e wuzikwara, werekwa mgbidi gbaa ha ogige. Ugbu a, ndị mmadụ jupụtakwara nʼime ha.” 36 Mgbe ahụ, mba niile gbara unu gburugburu, bụ ndị fọdụrụ, ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ wuziri ebe niile e tikpọrọ etikpọ, kụọkwa mkpụrụ nʼebe niile tọgbọrọ nʼefu. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, ekwuola, aga m emekwa ya.’ 37 “Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, ọzọkwa, aga m ege ntị, zaa ekpere ụlọ Izrel, mezuoro ha arịrịọ ha. Aga m eme ka ha baa ụba dịka igwe anụ ụlọ, 38 dịka igwe anụ ụlọ, nke na-ejupụta na Jerusalem nʼoge mmemme ya niile a kara aka. Nʼụzọ dị otu a, obodo niile e tikpọrọ etikpọ ga-ejupụtakwa na mmadụ ọzọ. Mgbe ahụ ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.”

In Other Versions

Ezekiel 36 in the ANGEFD

Ezekiel 36 in the ANTPNG2D

Ezekiel 36 in the AS21

Ezekiel 36 in the BAGH

Ezekiel 36 in the BBPNG

Ezekiel 36 in the BBT1E

Ezekiel 36 in the BDS

Ezekiel 36 in the BEV

Ezekiel 36 in the BHAD

Ezekiel 36 in the BIB

Ezekiel 36 in the BLPT

Ezekiel 36 in the BNT

Ezekiel 36 in the BNTABOOT

Ezekiel 36 in the BNTLV

Ezekiel 36 in the BOATCB

Ezekiel 36 in the BOATCB2

Ezekiel 36 in the BOBCV

Ezekiel 36 in the BOCNT

Ezekiel 36 in the BOECS

Ezekiel 36 in the BOGWICC

Ezekiel 36 in the BOHCB

Ezekiel 36 in the BOHCV

Ezekiel 36 in the BOHLNT

Ezekiel 36 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 36 in the BOILNTAP

Ezekiel 36 in the BOITCV

Ezekiel 36 in the BOKCV

Ezekiel 36 in the BOKCV2

Ezekiel 36 in the BOKHWOG

Ezekiel 36 in the BOKSSV

Ezekiel 36 in the BOLCB

Ezekiel 36 in the BOLCB2

Ezekiel 36 in the BOMCV

Ezekiel 36 in the BONAV

Ezekiel 36 in the BONCB

Ezekiel 36 in the BONLT

Ezekiel 36 in the BONUT2

Ezekiel 36 in the BOPLNT

Ezekiel 36 in the BOSCB

Ezekiel 36 in the BOSNC

Ezekiel 36 in the BOTLNT

Ezekiel 36 in the BOVCB

Ezekiel 36 in the BOYCB

Ezekiel 36 in the BPBB

Ezekiel 36 in the BPH

Ezekiel 36 in the BSB

Ezekiel 36 in the CCB

Ezekiel 36 in the CUV

Ezekiel 36 in the CUVS

Ezekiel 36 in the DBT

Ezekiel 36 in the DGDNT

Ezekiel 36 in the DHNT

Ezekiel 36 in the DNT

Ezekiel 36 in the ELBE

Ezekiel 36 in the EMTV

Ezekiel 36 in the ESV

Ezekiel 36 in the FBV

Ezekiel 36 in the FEB

Ezekiel 36 in the GGMNT

Ezekiel 36 in the GNT

Ezekiel 36 in the HARY

Ezekiel 36 in the HNT

Ezekiel 36 in the IRVA

Ezekiel 36 in the IRVB

Ezekiel 36 in the IRVG

Ezekiel 36 in the IRVH

Ezekiel 36 in the IRVK

Ezekiel 36 in the IRVM

Ezekiel 36 in the IRVM2

Ezekiel 36 in the IRVO

Ezekiel 36 in the IRVP

Ezekiel 36 in the IRVT

Ezekiel 36 in the IRVT2

Ezekiel 36 in the IRVU

Ezekiel 36 in the ISVN

Ezekiel 36 in the JSNT

Ezekiel 36 in the KAPI

Ezekiel 36 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 36 in the KBV

Ezekiel 36 in the KJV

Ezekiel 36 in the KNFD

Ezekiel 36 in the LBA

Ezekiel 36 in the LBLA

Ezekiel 36 in the LNT

Ezekiel 36 in the LSV

Ezekiel 36 in the MAAL

Ezekiel 36 in the MBV

Ezekiel 36 in the MBV2

Ezekiel 36 in the MHNT

Ezekiel 36 in the MKNFD

Ezekiel 36 in the MNG

Ezekiel 36 in the MNT

Ezekiel 36 in the MNT2

Ezekiel 36 in the MRS1T

Ezekiel 36 in the NAA

Ezekiel 36 in the NASB

Ezekiel 36 in the NBLA

Ezekiel 36 in the NBS

Ezekiel 36 in the NBVTP

Ezekiel 36 in the NET2

Ezekiel 36 in the NIV11

Ezekiel 36 in the NNT

Ezekiel 36 in the NNT2

Ezekiel 36 in the NNT3

Ezekiel 36 in the PDDPT

Ezekiel 36 in the PFNT

Ezekiel 36 in the RMNT

Ezekiel 36 in the SBIAS

Ezekiel 36 in the SBIBS

Ezekiel 36 in the SBIBS2

Ezekiel 36 in the SBICS

Ezekiel 36 in the SBIDS

Ezekiel 36 in the SBIGS

Ezekiel 36 in the SBIHS

Ezekiel 36 in the SBIIS

Ezekiel 36 in the SBIIS2

Ezekiel 36 in the SBIIS3

Ezekiel 36 in the SBIKS

Ezekiel 36 in the SBIKS2

Ezekiel 36 in the SBIMS

Ezekiel 36 in the SBIOS

Ezekiel 36 in the SBIPS

Ezekiel 36 in the SBISS

Ezekiel 36 in the SBITS

Ezekiel 36 in the SBITS2

Ezekiel 36 in the SBITS3

Ezekiel 36 in the SBITS4

Ezekiel 36 in the SBIUS

Ezekiel 36 in the SBIVS

Ezekiel 36 in the SBT

Ezekiel 36 in the SBT1E

Ezekiel 36 in the SCHL

Ezekiel 36 in the SNT

Ezekiel 36 in the SUSU

Ezekiel 36 in the SUSU2

Ezekiel 36 in the SYNO

Ezekiel 36 in the TBIAOTANT

Ezekiel 36 in the TBT1E

Ezekiel 36 in the TBT1E2

Ezekiel 36 in the TFTIP

Ezekiel 36 in the TFTU

Ezekiel 36 in the TGNTATF3T

Ezekiel 36 in the THAI

Ezekiel 36 in the TNFD

Ezekiel 36 in the TNT

Ezekiel 36 in the TNTIK

Ezekiel 36 in the TNTIL

Ezekiel 36 in the TNTIN

Ezekiel 36 in the TNTIP

Ezekiel 36 in the TNTIZ

Ezekiel 36 in the TOMA

Ezekiel 36 in the TTENT

Ezekiel 36 in the UBG

Ezekiel 36 in the UGV

Ezekiel 36 in the UGV2

Ezekiel 36 in the UGV3

Ezekiel 36 in the VBL

Ezekiel 36 in the VDCC

Ezekiel 36 in the YALU

Ezekiel 36 in the YAPE

Ezekiel 36 in the YBVTP

Ezekiel 36 in the ZBP