Ezekiel 40 (BOICB)

1 Nʼafọ nke iri abụọ na ise nke e mere ka anyị biri na mba ọzọ, na mbido afọ ahụ, nʼụbọchị nke iri, nke ọnwa ahụ nʼafọ nke iri na anọ site na mgbe obodo ahụ dara, nʼotu ụbọchị ahụ ka aka ONYENWE ANYỊ dịkwasịrị m nʼahụ. O mere ka m bịa nʼebe ahụ. 2 Nʼọhụ dị iche iche Chineke mere ka m hụ, o buuru m gaa nʼala Izrel, debe m nʼelu ugwu dị elu nke ukwu, ebe m nọ hụ ihe dịka obodo a na-ewu ọhụrụ, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu ahụ. 3 O mere ka m bịaruo nʼebe ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwoke nke ụdịdị ya na-enwu dịka bronz ka o guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ọ na-ejide eriri akwa ọcha, na osisi e ji atụ ihe nʼaka ya. 4 Nwoke ahụ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, lezie anya nke ọma, gekwaa ntị tinyekwa ihe niile m gaje igosi gị nʼobi, nʼihi na-akpọtara m gị nʼebe a nʼihi ka ịhụ ihe ndị a. Gwakwa ụmụ Izrel ihe niile ị hụrụ.” 5 Mgbe ahụ, ahụrụ m mgbidi gbara ụlọnsọ ahụ gburugburu. Ịdị ogologo nke osisi ihe ọtụtụ nke dị nʼaka nwoke ahụ, ruru mita atọ na ụma abụọ, nke ọbụla nʼime ha ruru iri sentimita ise na atọ. Ọ tụrụ mgbidi ahụ, chọpụta na ịla elu ya dị mita atọ na ọkara. Ịsa mbara ya dịkwa mita atọ na ọkara. 6 Emesịa, ọ gara nʼọnụ ụzọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ, rigoro nʼihe nrigo elu, tụọ ala ala ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ahụ. Obosara ya dị mita atọ na ọkara. 7 Oghere dị nʼụlọ ahụ nke bụ ebe ndị nche na-anọ dị mita atọ nʼọkara nʼobosara. Mgbidi dị nʼetiti ha dị mita abụọ na ụma asaa nʼigbidi. Ebe e si abata na mpụta ọnụ ụzọ ama nke chere ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, dị mita atọ nʼọkara nʼomimi. 8 O jikwa ihe ọtụtụ tụọ ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, 9 ọ dị mita anọ na ụma abụọ nʼomimi. Ogidi dị nʼakụkụ ya dị otu mita nʼigbidi. Ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ụzọ ama ya chere ihu nʼụlọnsọ ukwu. 10 Nʼime ọnụ ụzọ ama nke ọwụwa anyanwụ, e nwere oghere atọ dị nʼakụkụ ọbụla, oghere atọ ndị ahụ ha nʼotu. Ihu akụkụ aja ya niile nke chere ha ihu bụkwa otu nʼọtụtụ. 11 Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara nke mbata ọnụ ụzọ ama ahụ, ọ dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, na mita isii na ụma itoolu nʼogologo. 12 Nʼihu oghere niile nke ụlọ ahụ e nwere mgbidi dị otu ọkara mita nʼịdị elu ya. Akụkụ anọ nke oghere ndị a ha otu. Ha ruru mita atọ mita atọ. 13 Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara ọnụ ụzọ ama ahụ, site nʼelu ụlọ nke otu ime ụlọ ruo nʼelu ụlọ nke ime ụlọ chere ya ihu; obosara ya dị mita iri na atọ, site nʼotu oghere ruo nʼoghere nke chere ya ihu. 14 Ọ tụrụ ogologo ogidi niile dị nʼakụkụ nʼime mgbidi ọnụ ụzọ ama ụlọ ahụ, chọpụta na ọ dị iri mita atọ na abụọ, ọ bụladị ruo nʼakụkụ mgbidi nke chere ihu nʼọnụ ụzọ ama ogige ahụ. 15 Site nʼihu ọnụ ụzọ ama mbata ahụ, ruo nʼebe ngwụcha nke ọnụ ụzọ dị na mpụta ọnụ ụlọ ya dị iri mita abụọ na asaa. 16 Ọnụ ụlọ ndị ahụ niile nwere oghereikuku dị warawara nʼakụkụ aja ụlọ ha, dịka mpụta ọnụ ụlọ ahụ nwekwara; oghereikuku ndị a dị gburugburu dị nʼime, nʼetiti ọnụ ụlọ ndị a. Nʼaja ụlọ ndị a niile, e nwere oyiyi nkwụ dị iche iche e sere nʼelu ha. 17 Ọ kpọbatara m nʼogige dị nʼezi. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ụfọdụ ọnụụlọ dị na pevumentị e wunyere gburugburu ogige ahụ niile. Ha dị iri ọnụụlọ atọ dị nʼogologo pevumentị ahụ. 18 Ebe nzọkwasị ụkwụ a gara ogologo ruo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, ogologo ya na ọnụ ụzọ ama ahụ ha, nke a bụ pevumentị nke dịkarịrị ala. 19 Mgbe ahụ, ọ tụrụ ịdị ogologo ya, site nʼime ọnụ ụzọ ama nke dịkarịrị ala ruo nʼọnụ ụzọ nke ime ogige, o ruru iri mita ise na atọ nʼakụkụ ihu anyanwụ nakwa nʼakụkụ ugwu. 20 Ọ tụrụ ogologo na obosara ọnụ ụzọ nke dị nʼugwu, nke e si abanye nʼogige dị nʼezi. 21 Ime ụlọ ya dị ọnụ ụlọ atọ nʼakụkụ ya ọbụla. Akụkụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ya, bụ otu ọtụtụ dịka ọtụtụ nke ọnụ ụzọ ama mbụ. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ. 22 Oghereikuku ya, mpụta ọnụ ụzọ ya na osisi nkwụ e sere nʼahụ aja ụlọ ahụ niile, dịka e mere nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, bụ otu ọtụtụ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asaa dị nke e si aga na mpụta ọnụ ụlọ ahụ na ncherita ihu ogige ezi. 23 Otu ọnụ ụzọ dị nke gara nʼogige dị nʼime, nke chere ihu ọnụ ụzọ mbata dị nʼugwu, dịka ọ dịkwa nʼakụkụ nke ọwụwa anyanwụ. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ. 24 Mgbe ahụ, o duuru m gaa nʼakụkụ ndịda, a hụrụ m ọnụ ụzọ mbata ndịda. Ọ tụrụ tụọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ahụ na mpụta ọnụ ụlọ ya, chọpụta na ya na ndị ọzọ bụ otu ọtụtụ. 25 Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghereikuku dị warawara gbaa gburugburu, dịka e nwere na ndị ọzọ niile. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ 26 Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asaa dịkwa iji rigoo ya, mpụta ọnụ ụlọ ya dịkwa na ncherita ihu ha, o nwekwara ihe ịchọ mma osisi nkwụ e sere nʼahụ akụkụ aja ahụ, otu nʼotu akụkụ, nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ. 27 Ogige nke dị nʼime, nwekwara ọnụ ụzọ ama nke na-echere ihu na ndịda. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ. 28 O duuru m site nʼọnụ ụzọ dị na ndịda banye nʼogige dị nʼime. Ọ tụrụ ọnụ ụzọ mbata a hụ na ya na ọnụ ụzọ nke dị ọzọ bụ otu ọtụtụ. 29 Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ. 30 Mpụta ọnụ ụlọ nke ndị dị gburugburu ogige nke ime, dị iri mita na atọ nʼobosara, na mita abụọ na ụma atọ nʼịdị omimi. 31 Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi, oyiyi osisi nkwụ ka eji chọọ ogidi ọnụ ụlọ ahụ mma, ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya. 32 Ọ kpọbatakwara m nʼogige dị nʼime site nʼọnụ ụzọ mbata nke ọwụwa anyanwụ. Ọ tụkwara ọnụ ụzọ ama ahụ, chọpụta na ya na ndị ọzọ bụkwa otu ọtụtụ. 33 Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya niile bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ. 34 Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya. 35 O mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama mbata nke ugwu. Ọ tụrụ ya, chọpụta na ọtụtụ ya dịkwa ka nke ndị ọzọ, 36 dịka ọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya, ha niile nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ 37 Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi. Oyiyi nkwụ e sere ese ka eji chọọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ya mma, nʼakụkụ nke a, nakwa nʼakụkụ nke ọzọ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya. 38 Otu ọnụụlọ nke nwere ọnụ ụzọ dịkwa nʼakụkụ mpụta ọnụ ụlọ nke ime ime ọnụ ụzọ ama ọbụla, ebe a na anọ asacha anụ aja nsure ọkụ niile. 39 Nʼime mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ka tebul abụọ dị nʼotu akụkụ, abụọ nke ọzọ dịkwa nʼakụkụ nke ọzọ nke ọnụ ụlọ ahụ. Nʼelu ha ka a na-egbu anụ e ji achụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja mmehie, maọbụ onyinye nʼihi aja ikpe ọmụma. 40 Nʼakụkụ mgbidi ezi nke mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, nʼakụkụ ihe nrigo nke dị na mbata ọnụ ụzọ ugwu, e nwere tebul abụọ, nʼakụkụ nke ọzọkwa nke ihe nrigo ahụ, e nwekwara tebul abụọ nʼebe ahụ. 41 Ya mere, e nwere tebul anọ nʼotu akụkụ ihe nrigo ahụ, nwekwa anọ nʼakụkụ nke ọzọ ya, ya bụ, tebul asatọ ma agụkọta ya ọnụ, ebe a na-anọ egbu anụ e ji achụ aja. 42 E nwekwara tebul anọ ndị ọzọ nʼime ọnụ ụlọ ahụ e ji nkume a wara awa wuo. Nʼelu ya ka a na-anọ akwado anụ a ga-eji chụọ aja nsure ọkụ. Ịdị elu tebul ndị a bụ iri sentimita asatọ. Obosara elu ha nʼakụkụ niile dị iri sentimita ise na atọ. Ngwongwo niile e ji egbu anụ e ji achụ aja na-adị nʼelu tebul ndị a. 43 E ji nko nke ịdị ogologo ya dị sentimita itoolu ejigidesi tebul ndị ahụ ike nʼahụ aja ụlọ. Nko ndị a dị gburugburu tebul ndị ahụ. Ọ bụkwa nʼelu tebul ndị a ka a na-edebe anụ niile e ji enye onyinye. 44 Nʼime ogige dị nʼime, e nwere ọnụụlọ abụọ nke nwere ụzọ e si abanye nʼogige dị nʼime. Otu dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, chee ihu nʼọdịda anyanwụ, nke ọzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼọdịda anyanwụ, chee ihu nʼugwu. 45 Ọ gwara m, “Ọnụụlọ ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼugwu bụ nke ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu. 46 Ọnụụlọ nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama chere ihu nʼugwu, bụ nke ndị nchụaja ndị na-eche ebe ịchụ aja nche. Ndị a bụ ụmụ ụmụ Zadọk. Ọ bụ naanị ha ka e kwere ka ha nwee ike ịbịaru ONYENWE ANYỊ nso, ijere ya ozi site nʼetiti ebo Livayị niile.” 47 Mgbe ahụ, ọ tụrụ ogige ime ahụ, chọpụta na ogologo ya dị iri mita ise na asatọ. Obosara ya bụkwa otu ihe ahụ. Ebe ịchụ aja dịkwa nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. 48 O mere ka m bịaruo na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ nke mpụta ọnụ ụlọ ahụ, o ruru mita abụọ na ụma atọ nʼobosara, nʼakụkụ ya abụọ. Ebe mbata ya ruru mita asaa na ụma anọ nʼobosara, ebe akụkụ aja ụlọ ahụ ruru otu mita na ụma isii nʼobosara, nʼotu akụkụ nakwa nʼakụkụ nke ọzọ ya. 49 Ebe mpụta ọnụ ụlọ ahụ dị ihe ruru mita iri na otu nʼobosara, sitekwa nʼazụ ruo nʼihu ya ruru mita isii na ụma anọ. Ọ bụ ihe nrigo iri ka eji arịgo ya. Ogidi dịkwa nʼakụkụ ọnụ ụzọ abụọ ahụ otu nʼakụkụ nke a ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ ya.

In Other Versions

Ezekiel 40 in the ANGEFD

Ezekiel 40 in the ANTPNG2D

Ezekiel 40 in the AS21

Ezekiel 40 in the BAGH

Ezekiel 40 in the BBPNG

Ezekiel 40 in the BBT1E

Ezekiel 40 in the BDS

Ezekiel 40 in the BEV

Ezekiel 40 in the BHAD

Ezekiel 40 in the BIB

Ezekiel 40 in the BLPT

Ezekiel 40 in the BNT

Ezekiel 40 in the BNTABOOT

Ezekiel 40 in the BNTLV

Ezekiel 40 in the BOATCB

Ezekiel 40 in the BOATCB2

Ezekiel 40 in the BOBCV

Ezekiel 40 in the BOCNT

Ezekiel 40 in the BOECS

Ezekiel 40 in the BOGWICC

Ezekiel 40 in the BOHCB

Ezekiel 40 in the BOHCV

Ezekiel 40 in the BOHLNT

Ezekiel 40 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 40 in the BOILNTAP

Ezekiel 40 in the BOITCV

Ezekiel 40 in the BOKCV

Ezekiel 40 in the BOKCV2

Ezekiel 40 in the BOKHWOG

Ezekiel 40 in the BOKSSV

Ezekiel 40 in the BOLCB

Ezekiel 40 in the BOLCB2

Ezekiel 40 in the BOMCV

Ezekiel 40 in the BONAV

Ezekiel 40 in the BONCB

Ezekiel 40 in the BONLT

Ezekiel 40 in the BONUT2

Ezekiel 40 in the BOPLNT

Ezekiel 40 in the BOSCB

Ezekiel 40 in the BOSNC

Ezekiel 40 in the BOTLNT

Ezekiel 40 in the BOVCB

Ezekiel 40 in the BOYCB

Ezekiel 40 in the BPBB

Ezekiel 40 in the BPH

Ezekiel 40 in the BSB

Ezekiel 40 in the CCB

Ezekiel 40 in the CUV

Ezekiel 40 in the CUVS

Ezekiel 40 in the DBT

Ezekiel 40 in the DGDNT

Ezekiel 40 in the DHNT

Ezekiel 40 in the DNT

Ezekiel 40 in the ELBE

Ezekiel 40 in the EMTV

Ezekiel 40 in the ESV

Ezekiel 40 in the FBV

Ezekiel 40 in the FEB

Ezekiel 40 in the GGMNT

Ezekiel 40 in the GNT

Ezekiel 40 in the HARY

Ezekiel 40 in the HNT

Ezekiel 40 in the IRVA

Ezekiel 40 in the IRVB

Ezekiel 40 in the IRVG

Ezekiel 40 in the IRVH

Ezekiel 40 in the IRVK

Ezekiel 40 in the IRVM

Ezekiel 40 in the IRVM2

Ezekiel 40 in the IRVO

Ezekiel 40 in the IRVP

Ezekiel 40 in the IRVT

Ezekiel 40 in the IRVT2

Ezekiel 40 in the IRVU

Ezekiel 40 in the ISVN

Ezekiel 40 in the JSNT

Ezekiel 40 in the KAPI

Ezekiel 40 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 40 in the KBV

Ezekiel 40 in the KJV

Ezekiel 40 in the KNFD

Ezekiel 40 in the LBA

Ezekiel 40 in the LBLA

Ezekiel 40 in the LNT

Ezekiel 40 in the LSV

Ezekiel 40 in the MAAL

Ezekiel 40 in the MBV

Ezekiel 40 in the MBV2

Ezekiel 40 in the MHNT

Ezekiel 40 in the MKNFD

Ezekiel 40 in the MNG

Ezekiel 40 in the MNT

Ezekiel 40 in the MNT2

Ezekiel 40 in the MRS1T

Ezekiel 40 in the NAA

Ezekiel 40 in the NASB

Ezekiel 40 in the NBLA

Ezekiel 40 in the NBS

Ezekiel 40 in the NBVTP

Ezekiel 40 in the NET2

Ezekiel 40 in the NIV11

Ezekiel 40 in the NNT

Ezekiel 40 in the NNT2

Ezekiel 40 in the NNT3

Ezekiel 40 in the PDDPT

Ezekiel 40 in the PFNT

Ezekiel 40 in the RMNT

Ezekiel 40 in the SBIAS

Ezekiel 40 in the SBIBS

Ezekiel 40 in the SBIBS2

Ezekiel 40 in the SBICS

Ezekiel 40 in the SBIDS

Ezekiel 40 in the SBIGS

Ezekiel 40 in the SBIHS

Ezekiel 40 in the SBIIS

Ezekiel 40 in the SBIIS2

Ezekiel 40 in the SBIIS3

Ezekiel 40 in the SBIKS

Ezekiel 40 in the SBIKS2

Ezekiel 40 in the SBIMS

Ezekiel 40 in the SBIOS

Ezekiel 40 in the SBIPS

Ezekiel 40 in the SBISS

Ezekiel 40 in the SBITS

Ezekiel 40 in the SBITS2

Ezekiel 40 in the SBITS3

Ezekiel 40 in the SBITS4

Ezekiel 40 in the SBIUS

Ezekiel 40 in the SBIVS

Ezekiel 40 in the SBT

Ezekiel 40 in the SBT1E

Ezekiel 40 in the SCHL

Ezekiel 40 in the SNT

Ezekiel 40 in the SUSU

Ezekiel 40 in the SUSU2

Ezekiel 40 in the SYNO

Ezekiel 40 in the TBIAOTANT

Ezekiel 40 in the TBT1E

Ezekiel 40 in the TBT1E2

Ezekiel 40 in the TFTIP

Ezekiel 40 in the TFTU

Ezekiel 40 in the TGNTATF3T

Ezekiel 40 in the THAI

Ezekiel 40 in the TNFD

Ezekiel 40 in the TNT

Ezekiel 40 in the TNTIK

Ezekiel 40 in the TNTIL

Ezekiel 40 in the TNTIN

Ezekiel 40 in the TNTIP

Ezekiel 40 in the TNTIZ

Ezekiel 40 in the TOMA

Ezekiel 40 in the TTENT

Ezekiel 40 in the UBG

Ezekiel 40 in the UGV

Ezekiel 40 in the UGV2

Ezekiel 40 in the UGV3

Ezekiel 40 in the VBL

Ezekiel 40 in the VDCC

Ezekiel 40 in the YALU

Ezekiel 40 in the YAPE

Ezekiel 40 in the YBVTP

Ezekiel 40 in the ZBP