Ezekiel 44 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, o mere ka m laghachi nʼụzọ, nʼọnụ ụzọ ama nke ebe nsọ ahụ, nke dị nʼezi, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, ma a gbachiri ya agbachi. 2 Ma ONYENWE ANYỊ sịrị m, “Ọnụ ụzọ ama nke a ga-abụ ihe e mechiri emechi. A gaghị emeghe ya ọzọ, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi na ya bata. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke Izrel esitela na ya bata. Ya mere, ọ bụ ihe emechiri emechi. 3 Naanị nwa eze, naanị ya onwe ya, bụ onye ga-anọdụ ala nʼime ya, iri nri nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ bata, ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-esi pụọ.” 4 Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke ONYENWE ANYỊ jupụtara nʼụlọnsọ nke ONYENWE ANYỊ. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja. 5 ONYENWE ANYỊ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, leruo anya nke ọma, gee ntị nke ọma nʼihe niile m na-agwa gị banyere iwu m niile na usoro niile nke ụlọnsọ ukwu nke ONYENWE ANYỊ. Leruo anya nke ọma banyere ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọnsọ ukwu a, na nke ọpụpụ niile nke ebe nsọ a. 6 Ị ga-agwa ndị Izrel bụ ndị ụlọ nnupu isi, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, o zuola bụ ibi ndụ arụ unu niile ahụ, unu ndị Izrel! 7 Nʼihi na ọ bụghị naanị na ihe arụ unu mere dị ukwu, kama unu mekwara ihe arụ kachasị site nʼịkpọbata ndị ala ọzọ a na-ebighị anụ ahụ ha na obi ha ugwu nʼime ụlọnsọ, si otu a merụọ ụlọnsọ mgbe unu na-ewetara m nri nsọ, nke bụ abụba na ọbara. Nʼụzọ dị otu a, unu emebiela ọgbụgba ndụ m. 8 Unu edebeghị iwu m nyere unu banyere ihe m ndị dị nsọ, kama unu goro ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-elekọta ebe nsọ m. 9 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, o nweghị onye ala ọzọ ọbụla a na-ebighị anụ ahụ ya na obi ya ugwu kwesiri ịbata nʼụlọnsọ m. Ọ bụladị ndị ọbịa ndị bi nʼetiti ụmụ Izrel. 10 “ ‘Ndị ikom agbụrụ Livayị niile, ndị sitere nʼijere m ozi wezuga onwe ha mgbe Izrel bidoro ịgbaso arụsị niile ha, ga-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. 11 Ha ga-abụ ndị na-eje ozi nʼime ebe nsọ m, ndị nlekọta nke ọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwuu, na-ejekwa ozi nʼime ya; ha ga-egburu ndị m anụ e wetara maka ịchụ aja nsure ọkụ na nke aja ndị ọzọ, ha ga-eguzokwa nʼihu ha jeere ha ozi. 12 Ma nʼihi na ha guzoro nʼihu arụsị jeere ha ozi, mee ka ụlọ Izrel daba na mmehie ikpere arụsị, nʼihi nke a, eweliela m aka elu na-aṅụ iyi na ha aghaghị ịta ahụhụ mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 13 Ha agaghị abịakwute m nso ije ozi dịka ndị nchụaja, maọbụ bịaruo nso ihe nsọ m niile ọbụla maọbụ onyinye m dị nsọ karịchasịa onyinye nsọ niile, ha aghaghị ibu ọnọdụ ihere nke ihe arụ niile ha mere. 14 Ma aga m ahọpụta ha ka ha bụrụ ndị ilekọta ụlọnsọ m dị nʼaka, nʼihi ịrụ ọrụ niile na ije ozi niile dị nʼime ya. 15 “ ‘Ma ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk, ndị Livayị, ndị chegidere ebe nsọ m nche, mgbe Izrel niile sitere nʼebe m nọ kpafuo, ga-abịa nso ijere m ozi, ha ga-eguzo nʼihu m chụọ aja abụba na ọbara. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 16 Ọ bụ naanị ha ga-abanye nʼime ebe nsọ m, naanị ha ga-abịakwa na tebul m ije ozi nʼihu m, na ife m dịka ndị nche. 17 “ ‘Mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama nke ogige dị nʼime, ha ga-eyi naanị akwa ọcha. Ha agaghị eyi uwe ọbụla e ji ajị anụ kpaa mgbe ha na-eje ozi nʼogige ime nke ụlọnsọ ukwu m. 18 Ha ga-eji akwa ọcha kee nʼisi ha, yirikwa uwe ọcha nʼukwu ha. Ha agaghị eyi ihe ọbụla ga-eme ka ọsịsọọ gbaa ha. 19 Mgbe ha na-apụ nʼogige dị nʼezi ebe ndị mmadụ nọ, ha ga-eyipụ uwe ha yi mgbe ha na-eje ozi, hapụkwa ha nʼime ọnụụlọ nsọ ndị a, yiri uwe ọzọ, ka ha ghara ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị e doro nsọ site nʼimetụ uwe ha ahụ. 20 “ ‘Ha agaghị ekwe ka agịrị isi ha too ogologo, ha agakwaghị akpụchapụ ya. Naanị mkpacha ka ha ga na-akpacha isi ha. 21 Onye nchụaja ọbụla agaghị aṅụ mmanya vaịnị mgbe ọ na-abata nʼogige dị nʼime. 22 Ha agaghị alụ nwanyị nke di ya nwụrụ anwụ, maọbụ nwanyị gbaara di ya alụkwaghị m. Kama ọ bụ naanị ụmụ agbọghọ ndị sitere nʼagbụrụ Izrel ndị na-amaghị nwoke, maọbụ nwunye ndị nchụaja nwụrụ anwụ. 23 Ha ga-akụziri ndị m ihe dị iche nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ; gosi ha otu esi amata ihe dị iche nʼetiti ihe na-adịghị ọcha na nke dị ọcha. 24 “ ‘Ha ga-abụ ndị ikpe, idozi esemokwu dapụtara nʼetiti ndị m. Usoro iwu m niile ka ha ga-eji kpee ikpe. Ndị nchụaja nʼonwe ha kwa ga-erube isi nʼiwu m niile nʼoge mmemme ọbụla dị nsọ. Ha ga-ahụkwa na e doro ụbọchị izuike nsọ. 25 “ ‘Onye nchụaja agaghị emerụ onwe ya site nʼije nʼebe ozu dị, karịakwa maọbụ ozu nna ya maọbụ nne ya, ma o bụ nwa ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị na-enweghị di. 26 Mgbe e mechara ka ọ dị ọcha ọzọ, ọ ga-echere ruo ụbọchị asaa. 27 Ma nʼụbọchị ahụ, ọ ga-alọghachi nʼụlọ ukwu ahụ ịbanye nʼime ebe nsọ, ọ ga-ebu ụzọ chụọ aja mmehie nʼihi onwe ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 28 “ ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m bụ ihe nketa nke ndị nchụaja ga-enweta. Unu agaghị enye ha ihe nweta ọbụla nʼIzrel. Mụ onwe m bụ ihe nketa ha. 29 Ha ga-eri onyinye ịnata ihuọma, ihe aja mmehie, ihe aja ikpe ọmụma, ihe niile dị nʼIzrel e doro nsọ nye ONYENWE ANYỊ ga-abụ nke ha. 30 Mkpụrụ mbụ kachasị mma site na mkpụrụ ubi ọbụla na onyinye niile pụrụ iche ga-abụ nke ndị nchụaja. Ọka mbụ a kwọrọ akwọ, nke a na-eweta nʼihe ubi ga-abụkwa nke ndị nchụaja, ime ka ngọzị dịkwasị nʼụlọ unu. 31 Ndị nchụaja agaghị ata nnụnụ ọbụla, maọbụ anụ nke nwụrụ ọnwụ chi ya, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu.

In Other Versions

Ezekiel 44 in the ANGEFD

Ezekiel 44 in the ANTPNG2D

Ezekiel 44 in the AS21

Ezekiel 44 in the BAGH

Ezekiel 44 in the BBPNG

Ezekiel 44 in the BBT1E

Ezekiel 44 in the BDS

Ezekiel 44 in the BEV

Ezekiel 44 in the BHAD

Ezekiel 44 in the BIB

Ezekiel 44 in the BLPT

Ezekiel 44 in the BNT

Ezekiel 44 in the BNTABOOT

Ezekiel 44 in the BNTLV

Ezekiel 44 in the BOATCB

Ezekiel 44 in the BOATCB2

Ezekiel 44 in the BOBCV

Ezekiel 44 in the BOCNT

Ezekiel 44 in the BOECS

Ezekiel 44 in the BOGWICC

Ezekiel 44 in the BOHCB

Ezekiel 44 in the BOHCV

Ezekiel 44 in the BOHLNT

Ezekiel 44 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 44 in the BOILNTAP

Ezekiel 44 in the BOITCV

Ezekiel 44 in the BOKCV

Ezekiel 44 in the BOKCV2

Ezekiel 44 in the BOKHWOG

Ezekiel 44 in the BOKSSV

Ezekiel 44 in the BOLCB

Ezekiel 44 in the BOLCB2

Ezekiel 44 in the BOMCV

Ezekiel 44 in the BONAV

Ezekiel 44 in the BONCB

Ezekiel 44 in the BONLT

Ezekiel 44 in the BONUT2

Ezekiel 44 in the BOPLNT

Ezekiel 44 in the BOSCB

Ezekiel 44 in the BOSNC

Ezekiel 44 in the BOTLNT

Ezekiel 44 in the BOVCB

Ezekiel 44 in the BOYCB

Ezekiel 44 in the BPBB

Ezekiel 44 in the BPH

Ezekiel 44 in the BSB

Ezekiel 44 in the CCB

Ezekiel 44 in the CUV

Ezekiel 44 in the CUVS

Ezekiel 44 in the DBT

Ezekiel 44 in the DGDNT

Ezekiel 44 in the DHNT

Ezekiel 44 in the DNT

Ezekiel 44 in the ELBE

Ezekiel 44 in the EMTV

Ezekiel 44 in the ESV

Ezekiel 44 in the FBV

Ezekiel 44 in the FEB

Ezekiel 44 in the GGMNT

Ezekiel 44 in the GNT

Ezekiel 44 in the HARY

Ezekiel 44 in the HNT

Ezekiel 44 in the IRVA

Ezekiel 44 in the IRVB

Ezekiel 44 in the IRVG

Ezekiel 44 in the IRVH

Ezekiel 44 in the IRVK

Ezekiel 44 in the IRVM

Ezekiel 44 in the IRVM2

Ezekiel 44 in the IRVO

Ezekiel 44 in the IRVP

Ezekiel 44 in the IRVT

Ezekiel 44 in the IRVT2

Ezekiel 44 in the IRVU

Ezekiel 44 in the ISVN

Ezekiel 44 in the JSNT

Ezekiel 44 in the KAPI

Ezekiel 44 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 44 in the KBV

Ezekiel 44 in the KJV

Ezekiel 44 in the KNFD

Ezekiel 44 in the LBA

Ezekiel 44 in the LBLA

Ezekiel 44 in the LNT

Ezekiel 44 in the LSV

Ezekiel 44 in the MAAL

Ezekiel 44 in the MBV

Ezekiel 44 in the MBV2

Ezekiel 44 in the MHNT

Ezekiel 44 in the MKNFD

Ezekiel 44 in the MNG

Ezekiel 44 in the MNT

Ezekiel 44 in the MNT2

Ezekiel 44 in the MRS1T

Ezekiel 44 in the NAA

Ezekiel 44 in the NASB

Ezekiel 44 in the NBLA

Ezekiel 44 in the NBS

Ezekiel 44 in the NBVTP

Ezekiel 44 in the NET2

Ezekiel 44 in the NIV11

Ezekiel 44 in the NNT

Ezekiel 44 in the NNT2

Ezekiel 44 in the NNT3

Ezekiel 44 in the PDDPT

Ezekiel 44 in the PFNT

Ezekiel 44 in the RMNT

Ezekiel 44 in the SBIAS

Ezekiel 44 in the SBIBS

Ezekiel 44 in the SBIBS2

Ezekiel 44 in the SBICS

Ezekiel 44 in the SBIDS

Ezekiel 44 in the SBIGS

Ezekiel 44 in the SBIHS

Ezekiel 44 in the SBIIS

Ezekiel 44 in the SBIIS2

Ezekiel 44 in the SBIIS3

Ezekiel 44 in the SBIKS

Ezekiel 44 in the SBIKS2

Ezekiel 44 in the SBIMS

Ezekiel 44 in the SBIOS

Ezekiel 44 in the SBIPS

Ezekiel 44 in the SBISS

Ezekiel 44 in the SBITS

Ezekiel 44 in the SBITS2

Ezekiel 44 in the SBITS3

Ezekiel 44 in the SBITS4

Ezekiel 44 in the SBIUS

Ezekiel 44 in the SBIVS

Ezekiel 44 in the SBT

Ezekiel 44 in the SBT1E

Ezekiel 44 in the SCHL

Ezekiel 44 in the SNT

Ezekiel 44 in the SUSU

Ezekiel 44 in the SUSU2

Ezekiel 44 in the SYNO

Ezekiel 44 in the TBIAOTANT

Ezekiel 44 in the TBT1E

Ezekiel 44 in the TBT1E2

Ezekiel 44 in the TFTIP

Ezekiel 44 in the TFTU

Ezekiel 44 in the TGNTATF3T

Ezekiel 44 in the THAI

Ezekiel 44 in the TNFD

Ezekiel 44 in the TNT

Ezekiel 44 in the TNTIK

Ezekiel 44 in the TNTIL

Ezekiel 44 in the TNTIN

Ezekiel 44 in the TNTIP

Ezekiel 44 in the TNTIZ

Ezekiel 44 in the TOMA

Ezekiel 44 in the TTENT

Ezekiel 44 in the UBG

Ezekiel 44 in the UGV

Ezekiel 44 in the UGV2

Ezekiel 44 in the UGV3

Ezekiel 44 in the VBL

Ezekiel 44 in the VDCC

Ezekiel 44 in the YALU

Ezekiel 44 in the YAPE

Ezekiel 44 in the YBVTP

Ezekiel 44 in the ZBP