Ezra 6 (BOICB)

1 Ya mere, Daraiọs nyere iwu ka a chọpụta nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị Babilọn ma ọ dị akwụkwọ ọbụla dị otu ahụ. 2 Emesịa, a chọpụtara otu akwụkwọ nʼụlọeze dị na Ekbatana nʼala Midia. Nke a bụ ihe e dere nʼime akwụkwọ ahụ:Akwụkwọ ozi eze; 3 Nʼafọ mbụ nke Sairọs bụ eze, o nyere iwu banyere ụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ebe ndị Juu na-efe Chineke. A ga-ewughachi ụlọnsọ ukwu ahụ ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja, ka a tọsiekwa ntọala ya ike. Ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-abụkwa otu ihe ahụ. 4 Ahịrị atọ nke oke nkume ka a ga-eji tọọ ntọala ya, tinyere otu ahịrị osisi. A ga-esi nʼụlọakụ eze Sairọs kwụọ ụgwọ ihe ndị a niile. 5 Ọzọkwa, a ga-ebughachikwa ngwongwo ọlaedo na ọlaọcha niile nke ụlọ Chineke, ndị Nebukadneza sitere nʼụlọnsọ ahụ dị nʼJerusalem buru gaa Babilọn, doghachikwa ha nʼụlọ Chineke. 6 Mgbe a gụsịrị ya, Daraiọs zighachiri Tatenai onye na-achị Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ nọ nʼọdịda anyanwụ Yufretis ozi sị ha, Unu hapụ ha ka ha rụọ ọrụ ha. 7 Unu egbochila owuwu ụlọ Chineke ahụ. Kwerenụ ka onyeisi ndị Juu na ndị okenye Juu wughachi ụlọ Chineke a nʼebe e wuru ya na mbụ. 8 Ọzọ, ana m enye iwu na nke a bụ ihe unu na-aghaghị imere ndị okenye, na ndị Juu niile na-ewugharị ụlọnsọ Chineke ahụ.Ka unu site nʼụtụ isi a na-atụrụ m kwụọ ụgwọ e ji ewu ụlọ ahụ na-atụfughị oge ọbụla. 9 Unu nye ha ihe ọbụla dịkwa ha mkpa, ụmụ oke ehi na ebule, ụmụ atụrụ, ha ga-eji chụọrọ Chineke nke eluigwe aja. Nyekwanụ ha ọka wiiti, na mmanya, na nnu, na mmanụ oliv, dịka ndị nchụaja rịọrọ, bụ ndị nọ na Jerusalem, aghaghị inye ha ihe ndị a kwa ụbọchị niile na-esepụghị aka. 10 Ka ha nwee ike ịchụ ezi aja nye Chineke nke eluigwe, kpeekwaara mụ na ụmụ m ekpere. 11 Ana m enye iwu na onye ọbụla ga-agbanwe okwu a, ka ehopụta osisi nʼụlọ ya jiri kwụgbuo ya. A ga-emekwa ụlọ ya ka ọ bụrụ ebe ikpofu ahịhịa. 12 Chineke ahụ, onye mere Jerusalem ebe obibi ya, ga-ebibi eze ọbụla maọbụ mba ọbụla gbanwere iwu a, maọbụ bibie ụlọnsọ ahụ ọzọ.Ọ bụ Daraiọs na-enye iwu a. Ka onye ọbụla were ike ya niile debe ya. 13 Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze Daraiọs zitere, Tatenai, onyeisi ọchịchị nʼala ofe mmiri, na Sheta Bozenai, na ndị otu ha, mere ihe niile dịka ozi ahụ si dị na-atụfughị oge ọbụla. 14 Nʼihi ya, ndịisi Juu gara nʼihu nʼọrụ, ihe na-agakwara ha nke ọma site na nkwusa onye amụma, bụ Hegai, na Zekaraya, nwa Ido. Ha wuchara ụlọnsọ ahụ dịka iwu Chineke Izrel nyere si dị, nakwa dịka Sairọs, na Daraiọs, na Ataksekses, ndị eze Peshịa, nyekwara nʼiwu. 15 Ha wusiri ya nʼabalị nke atọ nʼọnwa isii (dị ka ọgụgụ afọ ndị Juu si dị) nʼafọ nke isii nke ọchịchị Daraiọs. 16 Ụmụ Izrel, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị fọdụrụ nʼime ndị e mere ka ha ga biri nʼala ọzọ, ji ọṅụ mee mmemme nke ido ụlọ nke Chineke ahụ nsọ na gbaghee ya. 17 Nʼihi ido ụlọ ahụ nsọ, ha ji oke ehi dị otu narị nʼọnụọgụgụ, na narị ebule abụọ, na narị atụrụ anọ chụọ aja, werekwa mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile, dịka ebo niile nke Izrel si dị. 18 Ha guzobere ndị nchụaja na nkewa ha, ndị Livayị nʼotu ha maka ije ozi nke Chineke na Jerusalem, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. 19 Ndị ahụ emere ka ha gaa biri nʼala ọzọ, mere Mmemme Ngabiga nʼabalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. 20 Ndị nchụaja na ndị Livayị edoola onwe ha ọcha, ha niile dịkwa ọcha. Ndị Livayị nʼonwe ha gburu ọtụtụ atụrụ Mmemme Ngabiga maka ndị nchụaja, na ndị Livayị ndị ọzọ, na ndị ahụ niile lọtara alọta site na mba ọzọ. 21 Ya mere, ndị Izrel niile bụ ndị ahụ lọtara site nʼebe e mere ka ha gaa biri riri ihe ahụ, ha na ndị ahụ niile kewapụrụ onwe ha juu ibi ajọọ ndụ nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na-ebi, nʼihi ịchọ ONYENWE ANYỊ, Chineke nke Izrel. 22 Ha sokwa mee mmemme achịcha na-ekoghị eko, nke ha mere ụbọchị asaa. Oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile nʼihi na ONYENWE ANYỊ mere ka eze Asịrịa nwee obiọma nʼebe Izrel nọ, nyere ha aka iwugharị ụlọnsọ ukwu Chineke, onye bụ Chineke Izrel.

In Other Versions

Ezra 6 in the ANGEFD

Ezra 6 in the ANTPNG2D

Ezra 6 in the AS21

Ezra 6 in the BAGH

Ezra 6 in the BBPNG

Ezra 6 in the BBT1E

Ezra 6 in the BDS

Ezra 6 in the BEV

Ezra 6 in the BHAD

Ezra 6 in the BIB

Ezra 6 in the BLPT

Ezra 6 in the BNT

Ezra 6 in the BNTABOOT

Ezra 6 in the BNTLV

Ezra 6 in the BOATCB

Ezra 6 in the BOATCB2

Ezra 6 in the BOBCV

Ezra 6 in the BOCNT

Ezra 6 in the BOECS

Ezra 6 in the BOGWICC

Ezra 6 in the BOHCB

Ezra 6 in the BOHCV

Ezra 6 in the BOHLNT

Ezra 6 in the BOHNTLTAL

Ezra 6 in the BOILNTAP

Ezra 6 in the BOITCV

Ezra 6 in the BOKCV

Ezra 6 in the BOKCV2

Ezra 6 in the BOKHWOG

Ezra 6 in the BOKSSV

Ezra 6 in the BOLCB

Ezra 6 in the BOLCB2

Ezra 6 in the BOMCV

Ezra 6 in the BONAV

Ezra 6 in the BONCB

Ezra 6 in the BONLT

Ezra 6 in the BONUT2

Ezra 6 in the BOPLNT

Ezra 6 in the BOSCB

Ezra 6 in the BOSNC

Ezra 6 in the BOTLNT

Ezra 6 in the BOVCB

Ezra 6 in the BOYCB

Ezra 6 in the BPBB

Ezra 6 in the BPH

Ezra 6 in the BSB

Ezra 6 in the CCB

Ezra 6 in the CUV

Ezra 6 in the CUVS

Ezra 6 in the DBT

Ezra 6 in the DGDNT

Ezra 6 in the DHNT

Ezra 6 in the DNT

Ezra 6 in the ELBE

Ezra 6 in the EMTV

Ezra 6 in the ESV

Ezra 6 in the FBV

Ezra 6 in the FEB

Ezra 6 in the GGMNT

Ezra 6 in the GNT

Ezra 6 in the HARY

Ezra 6 in the HNT

Ezra 6 in the IRVA

Ezra 6 in the IRVB

Ezra 6 in the IRVG

Ezra 6 in the IRVH

Ezra 6 in the IRVK

Ezra 6 in the IRVM

Ezra 6 in the IRVM2

Ezra 6 in the IRVO

Ezra 6 in the IRVP

Ezra 6 in the IRVT

Ezra 6 in the IRVT2

Ezra 6 in the IRVU

Ezra 6 in the ISVN

Ezra 6 in the JSNT

Ezra 6 in the KAPI

Ezra 6 in the KBT1ETNIK

Ezra 6 in the KBV

Ezra 6 in the KJV

Ezra 6 in the KNFD

Ezra 6 in the LBA

Ezra 6 in the LBLA

Ezra 6 in the LNT

Ezra 6 in the LSV

Ezra 6 in the MAAL

Ezra 6 in the MBV

Ezra 6 in the MBV2

Ezra 6 in the MHNT

Ezra 6 in the MKNFD

Ezra 6 in the MNG

Ezra 6 in the MNT

Ezra 6 in the MNT2

Ezra 6 in the MRS1T

Ezra 6 in the NAA

Ezra 6 in the NASB

Ezra 6 in the NBLA

Ezra 6 in the NBS

Ezra 6 in the NBVTP

Ezra 6 in the NET2

Ezra 6 in the NIV11

Ezra 6 in the NNT

Ezra 6 in the NNT2

Ezra 6 in the NNT3

Ezra 6 in the PDDPT

Ezra 6 in the PFNT

Ezra 6 in the RMNT

Ezra 6 in the SBIAS

Ezra 6 in the SBIBS

Ezra 6 in the SBIBS2

Ezra 6 in the SBICS

Ezra 6 in the SBIDS

Ezra 6 in the SBIGS

Ezra 6 in the SBIHS

Ezra 6 in the SBIIS

Ezra 6 in the SBIIS2

Ezra 6 in the SBIIS3

Ezra 6 in the SBIKS

Ezra 6 in the SBIKS2

Ezra 6 in the SBIMS

Ezra 6 in the SBIOS

Ezra 6 in the SBIPS

Ezra 6 in the SBISS

Ezra 6 in the SBITS

Ezra 6 in the SBITS2

Ezra 6 in the SBITS3

Ezra 6 in the SBITS4

Ezra 6 in the SBIUS

Ezra 6 in the SBIVS

Ezra 6 in the SBT

Ezra 6 in the SBT1E

Ezra 6 in the SCHL

Ezra 6 in the SNT

Ezra 6 in the SUSU

Ezra 6 in the SUSU2

Ezra 6 in the SYNO

Ezra 6 in the TBIAOTANT

Ezra 6 in the TBT1E

Ezra 6 in the TBT1E2

Ezra 6 in the TFTIP

Ezra 6 in the TFTU

Ezra 6 in the TGNTATF3T

Ezra 6 in the THAI

Ezra 6 in the TNFD

Ezra 6 in the TNT

Ezra 6 in the TNTIK

Ezra 6 in the TNTIL

Ezra 6 in the TNTIN

Ezra 6 in the TNTIP

Ezra 6 in the TNTIZ

Ezra 6 in the TOMA

Ezra 6 in the TTENT

Ezra 6 in the UBG

Ezra 6 in the UGV

Ezra 6 in the UGV2

Ezra 6 in the UGV3

Ezra 6 in the VBL

Ezra 6 in the VDCC

Ezra 6 in the YALU

Ezra 6 in the YAPE

Ezra 6 in the YBVTP

Ezra 6 in the ZBP