Ezra 9 (BOICB)

1 Mgbe e mesịrị ihe ndị a, ndịisi bịakwutere m sị, “Ndị Izrel na ndị nchụaja, na ndị Livayị, ekewapụghị onwe ha site nʼetiti ndị agbataobi ha, na omume arụ ha niile, dịka nke ndị Kenan, na ndị Het; na ndị Periz, na ndị Jebus, na ndị Amọn, na ndị Moab, na ndị Ijipt, na ndị Amọrait. 2 Ha alụtarala onwe ha nwunye site nʼụmụ ndị inyom mba ọzọ ndị a, lụtakwara ụmụ ha ndị ikom. Ha agwakọtala mkpụrụ nsọ na ndị dị iche iche nọ ha gburugburu. Ọ bụ ndị ndu na ndịisi ọchịchị ha bụ ndị butere ụzọ nʼibi ndụ ekwesighị ntụkwasị obi a.” 3 Ma mgbe m nụrụ nke a, adọwara m uwe ahụ m na uwe mwụda m, dọpụkwa ụfọdụ agịrị isi nke isi m, na ajị afụọnụ m, nọdụkwa ala nʼọnọdụ mgbagwoju anya. 4 Mgbe ahụ, ndị niile mara jijiji nʼokwu Chineke nke Izrel, gbakọtara m gburugburu nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọtaranụ. Mụ onwe m nọkwa nʼọnọdụ mgbagwoju anya ruo oge ịchụ aja nsure ọkụ nke anyasị. 5 Nʼikpeazụ, nʼoge aja uhuruchi, esitere m nʼiweda onwe m ala bilie, eji m uwe na uwe mwụda dọkara adọka daa nʼala nʼikpere m, chilie aka m abụọ elu, tikuo ONYENWE ANYỊ Chineke m 6 nʼekpere sị,“Ihere na-eme m, Chineke m, amaghị otu m ga-esi lelie anya m lekwasị gị nʼihu, nʼihi na mmehie anyị babigara ụba oke, ikpe ọmụma dị na-eche anyị dịkwa ukwuu, nʼezie o ruola eluigwe. 7 Site nʼụbọchị nna nna anyị ha ruo taa, ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu. Nʼihi mmehie anyị, anyị na ndị eze anyị, na ndị nchụaja anyị ka enyefere nʼaka mma agha, na ndọta nʼagha, na ịpụnara anyị ihe nʼike na nweda nʼala nʼaka ndị eze ala mba ọzọ, dịka ọ dị taa. 8 “Ma ugbu a, na nwa oge nta a, gị bụ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị egosila anyị amara, mee ka ole na ole fọdụrụ anyị. O nyeela anyị ọnọdụ siri ike nʼime ebe nsọ ya. Chineke anyị na-enye anya anyị ìhè, mee ka anyị kurutu ume ndụ nʼoge a site nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. 9 Nʼihi na ndị ohu ka anyị bụ, ma nʼihi obiọma na obi ebere gị, ị gbakụtaghị anyị azụ nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. Kama i mere ka ndị eze Peshịa gosi anyị obi ebere. Ha enyekwala anyị ndụ ọhụrụ, nke anyị ga-eji nwee ike wughachi ụlọnsọ Chineke anyị, ma wuziekwa ebe ya niile dakpọrọ adakpọ. Ọzọkwa, o nyekwala anyị ebe ize ndụ site na mwugharị nke mgbidi Juda na Jerusalem. 10 “Ugbu a, Chineke anyị, gịnịkwa ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a niile mere? Lee na anyị ahapụla gị ọzọ, hapụkwa ịgbaso iwu gị, 11 nke i ji dọọ anyị aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma, bụ ndị ohu gị. Nʼihi na i si nʼọnụ ha kwuo sị, ‘Ala ahụ unu na-abanye inweta bụ ala nke ndị bi nʼime ya mere ka ọ rụọ arụ. Nʼihi na ndị bi nʼime ya esitela nʼomume ọjọọ ha mee ka akụkụ ala ahụ niile rụọ arụ. 12 Ya mere, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụrụ, maọbụ kwenye ka ụmụ unu ndị ikom lụọ ụmụ ha ndị inyom. Unu achọkwala udo nke ọdịmma ọbụla nʼetiti unu na ha nʼoge ọbụla, ka unu dị ike, rie ezi ihe nke ala ahụ, hapụkwara ya ụmụ unu dịka ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’ 13 “Ma ihe niile dakwasịrị anyị bụ maka ajọ omume anyị, nʼihi ikpe ọmụma dị ukwuu anyị. Ma lee, Chineke anyị ataghị anyị ahụhụ dịka ịdị ukwuu nke mmehie anyị si dị, kama, o mekwara ka ole na ole nʼime anyị fọdụ. 14 Ma anyị ọ ga-emebi iwu gị ọzọ, site nʼịlụ ndị a rụrụ arụ nʼomume ha? Ị gaghị eweso anyị iwe ruo na ị ga-ebibi anyị kpamkpam, na-afọdụghị otu onye? 15 Ma gị, ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, ị bụ onye ezi omume. Lee anyị ka anyị guzo nʼihu gị nʼọnọdụ ikpe ọmụma anyị, ọ bụ ezie na o nweghị onye ọbụla nʼime anyị kwesiri iguzo nʼihu gị nʼihi nke a.”

In Other Versions

Ezra 9 in the ANGEFD

Ezra 9 in the ANTPNG2D

Ezra 9 in the AS21

Ezra 9 in the BAGH

Ezra 9 in the BBPNG

Ezra 9 in the BBT1E

Ezra 9 in the BDS

Ezra 9 in the BEV

Ezra 9 in the BHAD

Ezra 9 in the BIB

Ezra 9 in the BLPT

Ezra 9 in the BNT

Ezra 9 in the BNTABOOT

Ezra 9 in the BNTLV

Ezra 9 in the BOATCB

Ezra 9 in the BOATCB2

Ezra 9 in the BOBCV

Ezra 9 in the BOCNT

Ezra 9 in the BOECS

Ezra 9 in the BOGWICC

Ezra 9 in the BOHCB

Ezra 9 in the BOHCV

Ezra 9 in the BOHLNT

Ezra 9 in the BOHNTLTAL

Ezra 9 in the BOILNTAP

Ezra 9 in the BOITCV

Ezra 9 in the BOKCV

Ezra 9 in the BOKCV2

Ezra 9 in the BOKHWOG

Ezra 9 in the BOKSSV

Ezra 9 in the BOLCB

Ezra 9 in the BOLCB2

Ezra 9 in the BOMCV

Ezra 9 in the BONAV

Ezra 9 in the BONCB

Ezra 9 in the BONLT

Ezra 9 in the BONUT2

Ezra 9 in the BOPLNT

Ezra 9 in the BOSCB

Ezra 9 in the BOSNC

Ezra 9 in the BOTLNT

Ezra 9 in the BOVCB

Ezra 9 in the BOYCB

Ezra 9 in the BPBB

Ezra 9 in the BPH

Ezra 9 in the BSB

Ezra 9 in the CCB

Ezra 9 in the CUV

Ezra 9 in the CUVS

Ezra 9 in the DBT

Ezra 9 in the DGDNT

Ezra 9 in the DHNT

Ezra 9 in the DNT

Ezra 9 in the ELBE

Ezra 9 in the EMTV

Ezra 9 in the ESV

Ezra 9 in the FBV

Ezra 9 in the FEB

Ezra 9 in the GGMNT

Ezra 9 in the GNT

Ezra 9 in the HARY

Ezra 9 in the HNT

Ezra 9 in the IRVA

Ezra 9 in the IRVB

Ezra 9 in the IRVG

Ezra 9 in the IRVH

Ezra 9 in the IRVK

Ezra 9 in the IRVM

Ezra 9 in the IRVM2

Ezra 9 in the IRVO

Ezra 9 in the IRVP

Ezra 9 in the IRVT

Ezra 9 in the IRVT2

Ezra 9 in the IRVU

Ezra 9 in the ISVN

Ezra 9 in the JSNT

Ezra 9 in the KAPI

Ezra 9 in the KBT1ETNIK

Ezra 9 in the KBV

Ezra 9 in the KJV

Ezra 9 in the KNFD

Ezra 9 in the LBA

Ezra 9 in the LBLA

Ezra 9 in the LNT

Ezra 9 in the LSV

Ezra 9 in the MAAL

Ezra 9 in the MBV

Ezra 9 in the MBV2

Ezra 9 in the MHNT

Ezra 9 in the MKNFD

Ezra 9 in the MNG

Ezra 9 in the MNT

Ezra 9 in the MNT2

Ezra 9 in the MRS1T

Ezra 9 in the NAA

Ezra 9 in the NASB

Ezra 9 in the NBLA

Ezra 9 in the NBS

Ezra 9 in the NBVTP

Ezra 9 in the NET2

Ezra 9 in the NIV11

Ezra 9 in the NNT

Ezra 9 in the NNT2

Ezra 9 in the NNT3

Ezra 9 in the PDDPT

Ezra 9 in the PFNT

Ezra 9 in the RMNT

Ezra 9 in the SBIAS

Ezra 9 in the SBIBS

Ezra 9 in the SBIBS2

Ezra 9 in the SBICS

Ezra 9 in the SBIDS

Ezra 9 in the SBIGS

Ezra 9 in the SBIHS

Ezra 9 in the SBIIS

Ezra 9 in the SBIIS2

Ezra 9 in the SBIIS3

Ezra 9 in the SBIKS

Ezra 9 in the SBIKS2

Ezra 9 in the SBIMS

Ezra 9 in the SBIOS

Ezra 9 in the SBIPS

Ezra 9 in the SBISS

Ezra 9 in the SBITS

Ezra 9 in the SBITS2

Ezra 9 in the SBITS3

Ezra 9 in the SBITS4

Ezra 9 in the SBIUS

Ezra 9 in the SBIVS

Ezra 9 in the SBT

Ezra 9 in the SBT1E

Ezra 9 in the SCHL

Ezra 9 in the SNT

Ezra 9 in the SUSU

Ezra 9 in the SUSU2

Ezra 9 in the SYNO

Ezra 9 in the TBIAOTANT

Ezra 9 in the TBT1E

Ezra 9 in the TBT1E2

Ezra 9 in the TFTIP

Ezra 9 in the TFTU

Ezra 9 in the TGNTATF3T

Ezra 9 in the THAI

Ezra 9 in the TNFD

Ezra 9 in the TNT

Ezra 9 in the TNTIK

Ezra 9 in the TNTIL

Ezra 9 in the TNTIN

Ezra 9 in the TNTIP

Ezra 9 in the TNTIZ

Ezra 9 in the TOMA

Ezra 9 in the TTENT

Ezra 9 in the UBG

Ezra 9 in the UGV

Ezra 9 in the UGV2

Ezra 9 in the UGV3

Ezra 9 in the VBL

Ezra 9 in the VDCC

Ezra 9 in the YALU

Ezra 9 in the YAPE

Ezra 9 in the YBVTP

Ezra 9 in the ZBP