Genesis 37 (BOICB)

1 Jekọb bigidere nʼala Kenan, ala ahụ nna ya buru ụzọ biri nʼime ya. 2 Nke a bụ usoro akụkọ banyere ezinaụlọ Jekọb. Josef, onye gbarala afọ iri na asaa, na-esonyere ụmụnne ya ndị ikom na-azụ igwe anụ ụlọ, ya onwe ya bụ naanị nwantakịrị na-enyere ụmụ Bilha na ụmụ Zilpa ndị nwunye nna ya aka. Ma Josef na-ewetara nna ha akụkọ maka ihe ọjọọ ha na-eme. 3 Ma Izrel hụrụ Josef nʼanya karịa ụmụ ya ndị ikom ndị ọzọ niile nʼihi na Josef bụ nwa a mụụrụ ya nʼoge agadi ya. Ọ kwaara ya uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa. 4 Mgbe ụmụnne ya chọpụtara na nna ha hụrụ ya nʼanya karịa onye ọbụla nʼime ha, ha kpọrọ ya asị, ha adịghị agwakwa ya okwu ọma. 5 Otu oge, Josef rọrọ nrọ, mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya nrọ a ọ rọrọ, ha kpọrọ ya asị karịa. 6 Ọ gwara ha, “Geenụ ntị na nrọ a m rọrọ. 7 Anyị niile nọ nʼubi na-achịkọta ọka, ngwangwa ukwu ọka nke m biliri guzoro ọtọ, ebe ukwu ọka nke unu niile gbara ukwu ọka nke m gburugburu, na-akpọ isiala nye ya.” 8 Ụmụnne ya jụrụ ya, “Ị na-akọwa na ọ bụ gị ga-abụ eze anyị? Na ọ bụ gị nʼezie ga-achị anyị?” Ha kpọrọ ya asị karịa nʼihi nrọ ya na okwu ya niile. 9 Josef rọkwara nrọ ọzọ, kọkwara ụmụnne ya. Ọ sịrị, “Geenụ ntị, arọrọ m nrọ ọzọ. Ma na nrọ nke ugbu a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu na-akpọ isiala nye m.” 10 Ma mgbe ọ kọọrọ nna ya na ụmụnne ya nrọ a. Nna ya baara ya mba, sị, “Nrọ nke a ị rọrọ bụ nrọ gịnị? Ọ bụ ezie na anyị niile, mụ onwe m na nne gị na ụmụnne gị, ga-abịa na-akpọrọ gị isiala?” 11 Ụmụnne ya kwosiri ya ekworo nʼihi ya, ma nna ya debere ihe ndị a niile nʼobi ya. 12 Ka ọ dị, ụmụnne ya gara ilekọta igwe anụ ụlọ nna ha na Shekem. 13 Izrel sịrị Josef, “Dịka ị maara, ụmụnne gị nọ na-eche anụ ụlọ na Shekem. Bịa, aga m eziga gị nʼebe ahụ.”Josef zara sị, “Ọ dị mma.” 14 Ya mere, ọ gwara ya, “Gaa ka ị chọpụta ma ihe ọ na-agazikwara ụmụnne gị na igwe anụ ụlọ ndị ahụ nke ọma, ma weghachiri m ozi.” O sitere na Ndagwurugwu Hebrọn zipụ ya.Ọ bịaruru Shekem, 15 ma otu nwoke hụrụ ya ka ọ na-awagharị gburugburu nʼọhịa dị nʼebe ahụ, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị na-achọ?” 16 Ọ sịrị, “Ana m achọ ụmụnne m. Biko, ị nwere ike ịgwa m ebe ha nọ na-azụ igwe anụ ụlọ ha?” 17 Nwoke ahụ zara sị, “Ha esitela nʼebe a pụọ. Anụrụ m ka ha na-asị, ‘Ka anyị gaa Dọtan.’ ”Ya mere, Josef gawara Dọtan ịchọ ụmụnne ya. Ọ hụkwara ha nʼebe dị nso na Dọtan. 18 Ma ha lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya. 19 Ha sịrịtara onwe ha, “Lee eze nrọ ahụ ka ọ na-abịa! 20 Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a. Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.” 21 Ruben nụrụ ihe a, ma napụtakwa ya site nʼaka ha. Ọ sịrị, “Ka anyị hapụ igbu ya.” 22 Ruben sịrị ha, “Ka unu hapụ ịkwafu ọbara. Kama tụnyenụ ya nʼime olulu a dị nʼọzara. Ma unu akpatụkwala ya aka.” Ma nzube ya bụ ịnapụta ya site nʼaka ha, dulaara ya nna ya. 23 Ya mere, mgbe Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ ya uwe mwụda ya, uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa o yi nʼahụ. 24 Ha duru ya tụnye ya nʼime olulu. Ọ bụ olulu tọgbọrọ nʼefu, nke mmiri na-adịghị nʼime ya. 25 Mgbe ha nọdụrụ ala bido iri nri, ha leliri anya ha hụ igwe ndị ahịa Ishmel si Gilead. Ịnyịnya kamel ha bu ụda na mgbaa na máá. Ọ bụkwa Ijipt ka ha bu ihe ndị a na-aga. 26 Mgbe ahụ, Juda jụrụ ụmụnne ya, “Uru gịnị ka ọ ga-abara anyị igbu nwanne anyị, ma kpuchie ọbara ya? 27 Bịanụ, ka anyị resi ya ndị Ishmel ndị a, ka aka anyị ghara nʼimetụ ya, nʼihi na nwanne anyị na otu anụ ahụ anyị ka ọ bụ.” Ụmụnne ya gere ya ntị. 28 Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt. 29 Ruben mechara lọghachi gaa nʼolulu ahụ, ma ka ọ na-ahụghị Josef nʼime olulu a, ọ dọwara uwe ya. 30 O jekwuru ụmụnne ya sị ha, “Nwata ahụ anọkwaghị ebe ahụ! Mụ onwe m, olee ebe m ga-ala?” 31 Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya. 32 Ha chịịrị uwe mwụda ahụ nwere ọtụtụ agwa jekwuru nna ha sị ya, “Anyị hụrụ uwe a nʼime ọhịa. Leruo ya anya ka ị mara maọbụ uwe mwụda nwa gị.” 33 Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.” 34 Mgbe ahụ, Jekọb dọwara uwe ya, yiri akwa mkpe, ruo ụjụ ọtụtụ ụbọchị nʼihi nwa ya. 35 Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya. 36 Ugbu a, ndị Midia ahụ rere Josef nʼIjipt, resi ya Pọtifa, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, onye bụ onyeisi ndị nche Fero, bụ eze Ijipt.

In Other Versions

Genesis 37 in the ANGEFD

Genesis 37 in the ANTPNG2D

Genesis 37 in the AS21

Genesis 37 in the BAGH

Genesis 37 in the BBPNG

Genesis 37 in the BBT1E

Genesis 37 in the BDS

Genesis 37 in the BEV

Genesis 37 in the BHAD

Genesis 37 in the BIB

Genesis 37 in the BLPT

Genesis 37 in the BNT

Genesis 37 in the BNTABOOT

Genesis 37 in the BNTLV

Genesis 37 in the BOATCB

Genesis 37 in the BOATCB2

Genesis 37 in the BOBCV

Genesis 37 in the BOCNT

Genesis 37 in the BOECS

Genesis 37 in the BOGWICC

Genesis 37 in the BOHCB

Genesis 37 in the BOHCV

Genesis 37 in the BOHLNT

Genesis 37 in the BOHNTLTAL

Genesis 37 in the BOILNTAP

Genesis 37 in the BOITCV

Genesis 37 in the BOKCV

Genesis 37 in the BOKCV2

Genesis 37 in the BOKHWOG

Genesis 37 in the BOKSSV

Genesis 37 in the BOLCB

Genesis 37 in the BOLCB2

Genesis 37 in the BOMCV

Genesis 37 in the BONAV

Genesis 37 in the BONCB

Genesis 37 in the BONLT

Genesis 37 in the BONUT2

Genesis 37 in the BOPLNT

Genesis 37 in the BOSCB

Genesis 37 in the BOSNC

Genesis 37 in the BOTLNT

Genesis 37 in the BOVCB

Genesis 37 in the BOYCB

Genesis 37 in the BPBB

Genesis 37 in the BPH

Genesis 37 in the BSB

Genesis 37 in the CCB

Genesis 37 in the CUV

Genesis 37 in the CUVS

Genesis 37 in the DBT

Genesis 37 in the DGDNT

Genesis 37 in the DHNT

Genesis 37 in the DNT

Genesis 37 in the ELBE

Genesis 37 in the EMTV

Genesis 37 in the ESV

Genesis 37 in the FBV

Genesis 37 in the FEB

Genesis 37 in the GGMNT

Genesis 37 in the GNT

Genesis 37 in the HARY

Genesis 37 in the HNT

Genesis 37 in the IRVA

Genesis 37 in the IRVB

Genesis 37 in the IRVG

Genesis 37 in the IRVH

Genesis 37 in the IRVK

Genesis 37 in the IRVM

Genesis 37 in the IRVM2

Genesis 37 in the IRVO

Genesis 37 in the IRVP

Genesis 37 in the IRVT

Genesis 37 in the IRVT2

Genesis 37 in the IRVU

Genesis 37 in the ISVN

Genesis 37 in the JSNT

Genesis 37 in the KAPI

Genesis 37 in the KBT1ETNIK

Genesis 37 in the KBV

Genesis 37 in the KJV

Genesis 37 in the KNFD

Genesis 37 in the LBA

Genesis 37 in the LBLA

Genesis 37 in the LNT

Genesis 37 in the LSV

Genesis 37 in the MAAL

Genesis 37 in the MBV

Genesis 37 in the MBV2

Genesis 37 in the MHNT

Genesis 37 in the MKNFD

Genesis 37 in the MNG

Genesis 37 in the MNT

Genesis 37 in the MNT2

Genesis 37 in the MRS1T

Genesis 37 in the NAA

Genesis 37 in the NASB

Genesis 37 in the NBLA

Genesis 37 in the NBS

Genesis 37 in the NBVTP

Genesis 37 in the NET2

Genesis 37 in the NIV11

Genesis 37 in the NNT

Genesis 37 in the NNT2

Genesis 37 in the NNT3

Genesis 37 in the PDDPT

Genesis 37 in the PFNT

Genesis 37 in the RMNT

Genesis 37 in the SBIAS

Genesis 37 in the SBIBS

Genesis 37 in the SBIBS2

Genesis 37 in the SBICS

Genesis 37 in the SBIDS

Genesis 37 in the SBIGS

Genesis 37 in the SBIHS

Genesis 37 in the SBIIS

Genesis 37 in the SBIIS2

Genesis 37 in the SBIIS3

Genesis 37 in the SBIKS

Genesis 37 in the SBIKS2

Genesis 37 in the SBIMS

Genesis 37 in the SBIOS

Genesis 37 in the SBIPS

Genesis 37 in the SBISS

Genesis 37 in the SBITS

Genesis 37 in the SBITS2

Genesis 37 in the SBITS3

Genesis 37 in the SBITS4

Genesis 37 in the SBIUS

Genesis 37 in the SBIVS

Genesis 37 in the SBT

Genesis 37 in the SBT1E

Genesis 37 in the SCHL

Genesis 37 in the SNT

Genesis 37 in the SUSU

Genesis 37 in the SUSU2

Genesis 37 in the SYNO

Genesis 37 in the TBIAOTANT

Genesis 37 in the TBT1E

Genesis 37 in the TBT1E2

Genesis 37 in the TFTIP

Genesis 37 in the TFTU

Genesis 37 in the TGNTATF3T

Genesis 37 in the THAI

Genesis 37 in the TNFD

Genesis 37 in the TNT

Genesis 37 in the TNTIK

Genesis 37 in the TNTIL

Genesis 37 in the TNTIN

Genesis 37 in the TNTIP

Genesis 37 in the TNTIZ

Genesis 37 in the TOMA

Genesis 37 in the TTENT

Genesis 37 in the UBG

Genesis 37 in the UGV

Genesis 37 in the UGV2

Genesis 37 in the UGV3

Genesis 37 in the VBL

Genesis 37 in the VDCC

Genesis 37 in the YALU

Genesis 37 in the YAPE

Genesis 37 in the YBVTP

Genesis 37 in the ZBP