Genesis 38 (BOICB)
1 Nʼoge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa binyere otu nwoke onye Adulam a na-akpọ Hira. 2 Nʼebe ahụ, Juda hụrụ otu nwaagbọghọ, nwa otu nwoke onye Kenan, aha ya bụ Shua. Ọ lụrụ ya ma bakwuru ya. 3 Ọ tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye Juda gụrụ aha Ịa 4 Nwunye ya dịkwara ime ọzọ mụta nwa nwoke nke ya bụ nwunye ya gụrụ Onan. 5 Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ, onye ọ kpọrọ Shela. Ọ bụ na Kezib ka ọ mụrụ ya. 6 Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ Tama. 7 Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. ONYENWE ANYỊ gburu ya. 8 Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.” 9 Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa. 10 Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. Nʼihi ya ONYENWE ANYỊ gbukwara ya. 11 Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya. 12 Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị. 13 A gwara Tama sị ya, “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha atụrụ ya ajị.” 14 O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya. 15 Mgbe Juda hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya. 16 Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.”Tama jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?” 17 Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.”Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?” 18 Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?”Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime. 19 Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya. 20 Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya. 21 Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?”Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.” 22 Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ” 23 Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.” 24 Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.”Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.” 25 Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.” 26 Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ. 27 Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya. 28 Mgbe ọ na-amụ ha, otu nʼime ha sepụtara aka ya. Nwanyị na-aghọ nwa weere eriri na-acha uhie uhie kee ya na nkwoji aka kwuo sị, “Ọ bụ nke a bụ ụzọ pụta.” 29 Ma nwa ahụ mesịrị sekpuo aka ya, nwanne ya nke ọzọ eburu ya ụzọ pụta. Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ otu a ka ị si tikapụta?” A kpọrọ ya Perez. 30 Emesịa, nwanne ya, nke bu eriri uhie uhie ahụ na nkwoji aka pụtakwara. A kpọrọ ya Zera.
In Other Versions
Genesis 38 in the ANGEFD
Genesis 38 in the ANTPNG2D
Genesis 38 in the AS21
Genesis 38 in the BAGH
Genesis 38 in the BBPNG
Genesis 38 in the BBT1E
Genesis 38 in the BDS
Genesis 38 in the BEV
Genesis 38 in the BHAD
Genesis 38 in the BIB
Genesis 38 in the BLPT
Genesis 38 in the BNT
Genesis 38 in the BNTABOOT
Genesis 38 in the BNTLV
Genesis 38 in the BOATCB
Genesis 38 in the BOATCB2
Genesis 38 in the BOBCV
Genesis 38 in the BOCNT
Genesis 38 in the BOECS
Genesis 38 in the BOGWICC
Genesis 38 in the BOHCB
Genesis 38 in the BOHCV
Genesis 38 in the BOHLNT
Genesis 38 in the BOHNTLTAL
Genesis 38 in the BOILNTAP
Genesis 38 in the BOITCV
Genesis 38 in the BOKCV
Genesis 38 in the BOKCV2
Genesis 38 in the BOKHWOG
Genesis 38 in the BOKSSV
Genesis 38 in the BOLCB
Genesis 38 in the BOLCB2
Genesis 38 in the BOMCV
Genesis 38 in the BONAV
Genesis 38 in the BONCB
Genesis 38 in the BONLT
Genesis 38 in the BONUT2
Genesis 38 in the BOPLNT
Genesis 38 in the BOSCB
Genesis 38 in the BOSNC
Genesis 38 in the BOTLNT
Genesis 38 in the BOVCB
Genesis 38 in the BOYCB
Genesis 38 in the BPBB
Genesis 38 in the BPH
Genesis 38 in the BSB
Genesis 38 in the CCB
Genesis 38 in the CUV
Genesis 38 in the CUVS
Genesis 38 in the DBT
Genesis 38 in the DGDNT
Genesis 38 in the DHNT
Genesis 38 in the DNT
Genesis 38 in the ELBE
Genesis 38 in the EMTV
Genesis 38 in the ESV
Genesis 38 in the FBV
Genesis 38 in the FEB
Genesis 38 in the GGMNT
Genesis 38 in the GNT
Genesis 38 in the HARY
Genesis 38 in the HNT
Genesis 38 in the IRVA
Genesis 38 in the IRVB
Genesis 38 in the IRVG
Genesis 38 in the IRVH
Genesis 38 in the IRVK
Genesis 38 in the IRVM
Genesis 38 in the IRVM2
Genesis 38 in the IRVO
Genesis 38 in the IRVP
Genesis 38 in the IRVT
Genesis 38 in the IRVT2
Genesis 38 in the IRVU
Genesis 38 in the ISVN
Genesis 38 in the JSNT
Genesis 38 in the KAPI
Genesis 38 in the KBT1ETNIK
Genesis 38 in the KBV
Genesis 38 in the KJV
Genesis 38 in the KNFD
Genesis 38 in the LBA
Genesis 38 in the LBLA
Genesis 38 in the LNT
Genesis 38 in the LSV
Genesis 38 in the MAAL
Genesis 38 in the MBV
Genesis 38 in the MBV2
Genesis 38 in the MHNT
Genesis 38 in the MKNFD
Genesis 38 in the MNG
Genesis 38 in the MNT
Genesis 38 in the MNT2
Genesis 38 in the MRS1T
Genesis 38 in the NAA
Genesis 38 in the NASB
Genesis 38 in the NBLA
Genesis 38 in the NBS
Genesis 38 in the NBVTP
Genesis 38 in the NET2
Genesis 38 in the NIV11
Genesis 38 in the NNT
Genesis 38 in the NNT2
Genesis 38 in the NNT3
Genesis 38 in the PDDPT
Genesis 38 in the PFNT
Genesis 38 in the RMNT
Genesis 38 in the SBIAS
Genesis 38 in the SBIBS
Genesis 38 in the SBIBS2
Genesis 38 in the SBICS
Genesis 38 in the SBIDS
Genesis 38 in the SBIGS
Genesis 38 in the SBIHS
Genesis 38 in the SBIIS
Genesis 38 in the SBIIS2
Genesis 38 in the SBIIS3
Genesis 38 in the SBIKS
Genesis 38 in the SBIKS2
Genesis 38 in the SBIMS
Genesis 38 in the SBIOS
Genesis 38 in the SBIPS
Genesis 38 in the SBISS
Genesis 38 in the SBITS
Genesis 38 in the SBITS2
Genesis 38 in the SBITS3
Genesis 38 in the SBITS4
Genesis 38 in the SBIUS
Genesis 38 in the SBIVS
Genesis 38 in the SBT
Genesis 38 in the SBT1E
Genesis 38 in the SCHL
Genesis 38 in the SNT
Genesis 38 in the SUSU
Genesis 38 in the SUSU2
Genesis 38 in the SYNO
Genesis 38 in the TBIAOTANT
Genesis 38 in the TBT1E
Genesis 38 in the TBT1E2
Genesis 38 in the TFTIP
Genesis 38 in the TFTU
Genesis 38 in the TGNTATF3T
Genesis 38 in the THAI
Genesis 38 in the TNFD
Genesis 38 in the TNT
Genesis 38 in the TNTIK
Genesis 38 in the TNTIL
Genesis 38 in the TNTIN
Genesis 38 in the TNTIP
Genesis 38 in the TNTIZ
Genesis 38 in the TOMA
Genesis 38 in the TTENT
Genesis 38 in the UBG
Genesis 38 in the UGV
Genesis 38 in the UGV2
Genesis 38 in the UGV3
Genesis 38 in the VBL
Genesis 38 in the VDCC
Genesis 38 in the YALU
Genesis 38 in the YAPE
Genesis 38 in the YBVTP
Genesis 38 in the ZBP