Genesis 47 (BOICB)

1 Josef gara gwa Fero sị, “Nna m na ụmụnne m ejirila igwe ewu na atụrụ ha, igwe ehi ha na ihe niile ha nwere site nʼala Kenan bịa nʼebe a. Ha nọ nʼala Goshen.” 2 Mgbe ọ gara ịgwa Fero okwu, o duuru mmadụ ise nʼetiti ụmụnne ya ndị ikom gosi ha Fero. 3 Fero jụrụ ụmụnne ya ajụjụ sị ha, “Gịnị bụ ọrụ aka unu?”Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ atụrụ dịka nna nna anyị ha.” 4 Ha kwukwara sị, “Anyị bịara ịnọ dịka ọbịa nʼala a nʼihi na ụnwụ a siri oke ike nʼala Kenan. O nweghị nri igwe ewu na atụrụ anyị nwere iri nʼala ahụ. Ya mere, anyị na-arịọ ka i nye ndị ohu gị ike ka ha biri nʼala Goshen.” 5 Fero gwara Josef sị, “Nna gị na ụmụnne gị abịakwutela gị. Ha biri nʼala Goshen. 6 Ala Ijipt dịkwa gị nʼihu. Họrọ ebe ọbụla masịrị gị nke dịkwa ezi mma nye nna gị na ụmụnne gị ka ha biri. Ka ha biri na Goshen. Ọ bụrụkwa na ị maara ndị ikom nʼetiti ha ndị nwere ike, mee ha ndị na-elekọta igwe anụ ụlọ m.” 7 Josef kpọtara nna ya Jekọb, mee ka o guzo nʼihu Fero. Jekọb nọ nʼebe ahụ gọzie Fero. 8 Fero jụrụ Jekọb sị, “Ị gbaala afọ ole ugbu a?” 9 Jekọb zara Fero sị ya: “Ebiela m dịka onye ọbịa narị afọ na iri afọ atọ. Ọnụọgụgụ afọ ndị a ehighị nne, ma ha jupụtara nʼahụhụ na nsogbu. Ma a nọrubeghị m ọnụọgụgụ afọ nna m ha gbara mgbe ha biri nʼụwa dịka ọbịa.” 10 Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ. 11 Ya mere, Josef mere ka nna ya na ụmụnne ya biri nʼala Ijipt. O nyere ha ala kachasị mma nʼala ahụ na mpaghara Ramesis, dịka Fero nyere nʼiwu. 12 Josef nyere nna ya na ụmụnne ya na ezinaụlọ nna ya nri dịka ọnụọgụgụ nke ụmụ ha si dị. 13 Ma nri adịghị nʼala ahụ niile nʼihi na ụnwụ ahụ dị nnọọ njọ. Ihe siri ike nʼala Ijipt ma nʼala Kenan nʼihi ụnwụ a. 14 Josef chịkọtara ego niile dị nʼala Ijipt, na nʼala Kenan, nke ndị mmadụ ji kwụọ ụgwọ nri ha zụrụ webata ha nʼụlọeze Fero. 15 Mgbe ego niile dị ndị mmadụ nʼaka gwụchara nʼala Ijipt ma nʼala Kenan, ndị Ijipt niile bịakwutere Josef sị ya, “Nye anyị nri, gịnị mere anyị ga-eji nwụọ nʼihu gị? Ego anyị agwụla.” 16 Mgbe ahụ Josef zara sị ha: “Jirinụ anụ ụlọ unu kwụọ ụgwọ nri m ga-enye unu, ebe ọ bụ na ego unu agwụla.” 17 Ya mere, ha kpụtaara Josef anụ ụlọ ha. Josef nyere ha nri nʼọnọdụ ịnyịnya ha, na atụrụ ha, na ewu ha, na ehi, na ịnyịnya ibu ha. O were nri zụọ ha nʼafọ ahụ nʼọnọdụ anụ ụlọ ha niile. 18 Mgbe afọ ahụ gafesịrị, ha bịakwutekwara ya nʼafọ nke ọzọ sị ya, “Anyị agaghị ezoro onyenwe anyị na ego anyị agwụla, na igwe anụ ụlọ anyị bụkwa nke gị. O nweghị ihe ọzọ fọdụrụ anyị karịa ahụ anyị na ala anyị. 19 Gịnị mere anyị ga-eji nọọ nʼagụụ nʼihu gị? Zụrụ anyị na ala anyị nʼọnọdụ ụgwọ anyị ga-akwụ maka nri ị ga-enye anyị. Ka anyị na ala anyị bụrụ ndị ohu Fero. Nye anyị mkpụrụ ubi ka anyị dịrị ndụ ghara ịnwụ, ka ala a ghara ịbụ ihe tọgbọrọ nʼefu.” 20 Ya mere, Josef zụtaara Fero ala Ijipt niile. Ndị Ijipt niile nʼotu nʼotu rere ala ha nʼihi oke ụnwụ ahụ dakwasịrị ha. Mgbe ahụ, ala ha niile ghọrọ nke Fero. 21 Ya mere, Josef si otu a mee ka ndị Ijipt niile ghọọ ndị ohu Fero, site nʼotu obodo nʼala ahụ ruo na nke ọzọ ya. 22 Ala nke Josef na-azụtaghị nʼoge a bụ naanị ala ndị nchụaja. Nʼihi na ndị nchụaja si nʼaka Fero na-enweta nri ha site nʼoge ruo nʼoge. Ha nwekwara nri na-ezuru ha site na oke ahụ Fero na-enye ha. Ya mere ha ereghị ala ha. 23 Mgbe ahụ, Josef gwara ndị mmadụ ahụ niile okwu sị, “Lee, azụọla unu taa, zụkwaa a ala unu nye Fero. 24 Nʼoge owuwe ihe ubi, otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe unu nwetara nʼubi unu bụ nke Fero. Deberenụ onwe unu ụzọ anọ fọdụrụ ka ọ bụrụ ihe unu ga-akụ nʼubi na ihe unu ga-eri na ihe ndị ezinaụlọ unu, na nke ụmụntakịrị unu ga-eri.” 25 Ha zara sị ya, “Ị zọpụtala ndụ anyị. Ka anyị hụta amara nʼihu nna anyị ukwu. Anyị ga-abụ ndị ohu Fero.” 26 Josef mere ka nke a bụrụ iwu nʼala Ijipt niile ruo taa, na Fero ga-ewe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe ọbụla si nʼala. Naanị ihe si nʼala ndị nchụaja bụ nke na-esoghị nʼiwu a. 27 Izrel biri na Goshen nke dị nʼala Ijipt. Ha kpatara akụ hie nne, mụbaa nʼọmụmụ, ma nʼọnụọgụgụ. 28 Jekọb biri nʼala Ijipt afọ iri na asaa. Ya mere, afọ niile Jekọb gbara bụ narị afọ na iri afọ anọ na asaa. 29 Mgbe ụbọchị ọnwụ Izrel na-abịaru nso, ọ kpọrọ Josef nwa ya sị ya, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, tinye aka gị nʼokpuru apata m, kwee m nkwa na ị ga-egosi m obi ebere na ezi ntụkwasị obi. Elila m nʼala nʼIjipt. 30 Kama, mgbe m nwụrụ, site nʼala Ijipt bupụ m. Buru ozu m gaa lie ya ebe e liri nna m ha.”Ọ zara, “Aga m eme dịka i kwuru.” 31 Ọ sịrị ya, “Ṅụọrọ m iyi na ị ga-eme ya.” Josef ṅụọrọ ya iyi. Izrel nʼonwe ya, kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya.

In Other Versions

Genesis 47 in the ANGEFD

Genesis 47 in the ANTPNG2D

Genesis 47 in the AS21

Genesis 47 in the BAGH

Genesis 47 in the BBPNG

Genesis 47 in the BBT1E

Genesis 47 in the BDS

Genesis 47 in the BEV

Genesis 47 in the BHAD

Genesis 47 in the BIB

Genesis 47 in the BLPT

Genesis 47 in the BNT

Genesis 47 in the BNTABOOT

Genesis 47 in the BNTLV

Genesis 47 in the BOATCB

Genesis 47 in the BOATCB2

Genesis 47 in the BOBCV

Genesis 47 in the BOCNT

Genesis 47 in the BOECS

Genesis 47 in the BOGWICC

Genesis 47 in the BOHCB

Genesis 47 in the BOHCV

Genesis 47 in the BOHLNT

Genesis 47 in the BOHNTLTAL

Genesis 47 in the BOILNTAP

Genesis 47 in the BOITCV

Genesis 47 in the BOKCV

Genesis 47 in the BOKCV2

Genesis 47 in the BOKHWOG

Genesis 47 in the BOKSSV

Genesis 47 in the BOLCB

Genesis 47 in the BOLCB2

Genesis 47 in the BOMCV

Genesis 47 in the BONAV

Genesis 47 in the BONCB

Genesis 47 in the BONLT

Genesis 47 in the BONUT2

Genesis 47 in the BOPLNT

Genesis 47 in the BOSCB

Genesis 47 in the BOSNC

Genesis 47 in the BOTLNT

Genesis 47 in the BOVCB

Genesis 47 in the BOYCB

Genesis 47 in the BPBB

Genesis 47 in the BPH

Genesis 47 in the BSB

Genesis 47 in the CCB

Genesis 47 in the CUV

Genesis 47 in the CUVS

Genesis 47 in the DBT

Genesis 47 in the DGDNT

Genesis 47 in the DHNT

Genesis 47 in the DNT

Genesis 47 in the ELBE

Genesis 47 in the EMTV

Genesis 47 in the ESV

Genesis 47 in the FBV

Genesis 47 in the FEB

Genesis 47 in the GGMNT

Genesis 47 in the GNT

Genesis 47 in the HARY

Genesis 47 in the HNT

Genesis 47 in the IRVA

Genesis 47 in the IRVB

Genesis 47 in the IRVG

Genesis 47 in the IRVH

Genesis 47 in the IRVK

Genesis 47 in the IRVM

Genesis 47 in the IRVM2

Genesis 47 in the IRVO

Genesis 47 in the IRVP

Genesis 47 in the IRVT

Genesis 47 in the IRVT2

Genesis 47 in the IRVU

Genesis 47 in the ISVN

Genesis 47 in the JSNT

Genesis 47 in the KAPI

Genesis 47 in the KBT1ETNIK

Genesis 47 in the KBV

Genesis 47 in the KJV

Genesis 47 in the KNFD

Genesis 47 in the LBA

Genesis 47 in the LBLA

Genesis 47 in the LNT

Genesis 47 in the LSV

Genesis 47 in the MAAL

Genesis 47 in the MBV

Genesis 47 in the MBV2

Genesis 47 in the MHNT

Genesis 47 in the MKNFD

Genesis 47 in the MNG

Genesis 47 in the MNT

Genesis 47 in the MNT2

Genesis 47 in the MRS1T

Genesis 47 in the NAA

Genesis 47 in the NASB

Genesis 47 in the NBLA

Genesis 47 in the NBS

Genesis 47 in the NBVTP

Genesis 47 in the NET2

Genesis 47 in the NIV11

Genesis 47 in the NNT

Genesis 47 in the NNT2

Genesis 47 in the NNT3

Genesis 47 in the PDDPT

Genesis 47 in the PFNT

Genesis 47 in the RMNT

Genesis 47 in the SBIAS

Genesis 47 in the SBIBS

Genesis 47 in the SBIBS2

Genesis 47 in the SBICS

Genesis 47 in the SBIDS

Genesis 47 in the SBIGS

Genesis 47 in the SBIHS

Genesis 47 in the SBIIS

Genesis 47 in the SBIIS2

Genesis 47 in the SBIIS3

Genesis 47 in the SBIKS

Genesis 47 in the SBIKS2

Genesis 47 in the SBIMS

Genesis 47 in the SBIOS

Genesis 47 in the SBIPS

Genesis 47 in the SBISS

Genesis 47 in the SBITS

Genesis 47 in the SBITS2

Genesis 47 in the SBITS3

Genesis 47 in the SBITS4

Genesis 47 in the SBIUS

Genesis 47 in the SBIVS

Genesis 47 in the SBT

Genesis 47 in the SBT1E

Genesis 47 in the SCHL

Genesis 47 in the SNT

Genesis 47 in the SUSU

Genesis 47 in the SUSU2

Genesis 47 in the SYNO

Genesis 47 in the TBIAOTANT

Genesis 47 in the TBT1E

Genesis 47 in the TBT1E2

Genesis 47 in the TFTIP

Genesis 47 in the TFTU

Genesis 47 in the TGNTATF3T

Genesis 47 in the THAI

Genesis 47 in the TNFD

Genesis 47 in the TNT

Genesis 47 in the TNTIK

Genesis 47 in the TNTIL

Genesis 47 in the TNTIN

Genesis 47 in the TNTIP

Genesis 47 in the TNTIZ

Genesis 47 in the TOMA

Genesis 47 in the TTENT

Genesis 47 in the UBG

Genesis 47 in the UGV

Genesis 47 in the UGV2

Genesis 47 in the UGV3

Genesis 47 in the VBL

Genesis 47 in the VDCC

Genesis 47 in the YALU

Genesis 47 in the YAPE

Genesis 47 in the YBVTP

Genesis 47 in the ZBP