Genesis 7 (BOICB)
1 Mgbe ụbọchị ahụ zuru, ONYENWE ANYỊ kpọrọ Noa sị ya, “Baa nʼime ụgbọ mmiri, gị na ezinaụlọ gị niile, nʼihi na nʼime ndị niile bi nʼọgbọ a, ọ bụ naanị gị bụ onye ezi omume m hụrụ. 2 Kpọrọ ụmụ anụmanụ ndị a a gụrụ dịka ndị dị ọcha, dịka ụdị ha si dị asaa asaa, oke na nwunye. Otu a kwa, kpọrọkwa ụmụ anụmanụ ndị a gụrụ dịka ndị na-adịghị ọcha, dịka ụdị ha si dị, abụọ abụọ, oke na nwunye, 3 na ụmụ anụ ufe asaa asaa, dịka ụdị ha si dị, oke na nwunye, maka idebe ụdị ndị a niile ndụ nʼụwa. 4 Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.” 5 Ya mere, Noa mere ihe niile ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu. 6 Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa. 7 Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ. 8 Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa, 9 oke na nwunye, bịakwutere Noa soro ya banye nʼụgbọ mmiri ahụ, dịka Chineke nyere Noa nʼiwu. 10 Mgbe abalị asaa gafere, uju mmiri ahụ bịakwasịrị ụwa. 11 Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa. 12 Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. 13 Nʼụbọchị ahụ kpomkwem, Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na Shem, Ham na Jafet, bụ ụmụ Noa, na nwunye Noa, na ndị nwunye atọ nke ụmụ ya. 14 Ha onwe ha, na anụ ọhịa ọbụla, nʼụdị ya, na anụ ụlọ ọbụla, nʼụdị ya na ihe ọbụla e kere eke na-akpụgharị nʼala, nʼụdị ya, na anụ ufe ọbụla nʼụdị ya, na aha nnụnụ ọbụla na ihe ọbụla nwere nku. 15 Ha bịakwutere Noa nʼime ụgbọ mmiri ahụ, abụọ abụọ site nʼihe niile ọbụla e kere eke, nke nwere ume ndụ nʼime ha. 16 Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ. 17 Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala. 18 Mmiri ndị a toro na-ala elu na-abawanyekwa ụba nʼelu ụwa. Ụgbọ mmiri ahụ segooro nʼelu mmiri. 19 Mmiri ndị ahụ toro laa elu kpuchie ugwu ukwu niile dị nʼokpuru mbara eluigwe. 20 Mmiri ndị a toro kpuchiri ugwu niile, ruo na ịla elu mmiri ndị a site nʼelu ugwu ukwu niile ruru mita asaa. 21 Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile. 22 Ee, ihe niile na-eku ume nke bi nʼelu ala nwụrụ. 23 Ihe niile nwere ume ndụ nʼelu ụwa ka e kpochapụrụ. Mmadụ na anụmanụ, na anụ na-akpụgharị nʼala na nnụnụ niile. A lara ha niile nʼiyi. Ma ọ bụ naanị Noa na ndị niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ ka a hapụrụ ndụ. 24 Narị ụbọchị na iri ụbọchị ise ka mmiri dọọrọ nʼelu ụwa dum.
In Other Versions
Genesis 7 in the ANGEFD
Genesis 7 in the ANTPNG2D
Genesis 7 in the AS21
Genesis 7 in the BAGH
Genesis 7 in the BBPNG
Genesis 7 in the BBT1E
Genesis 7 in the BDS
Genesis 7 in the BEV
Genesis 7 in the BHAD
Genesis 7 in the BIB
Genesis 7 in the BLPT
Genesis 7 in the BNT
Genesis 7 in the BNTABOOT
Genesis 7 in the BNTLV
Genesis 7 in the BOATCB
Genesis 7 in the BOATCB2
Genesis 7 in the BOBCV
Genesis 7 in the BOCNT
Genesis 7 in the BOECS
Genesis 7 in the BOGWICC
Genesis 7 in the BOHCB
Genesis 7 in the BOHCV
Genesis 7 in the BOHLNT
Genesis 7 in the BOHNTLTAL
Genesis 7 in the BOILNTAP
Genesis 7 in the BOITCV
Genesis 7 in the BOKCV
Genesis 7 in the BOKCV2
Genesis 7 in the BOKHWOG
Genesis 7 in the BOKSSV
Genesis 7 in the BOLCB
Genesis 7 in the BOLCB2
Genesis 7 in the BOMCV
Genesis 7 in the BONAV
Genesis 7 in the BONCB
Genesis 7 in the BONLT
Genesis 7 in the BONUT2
Genesis 7 in the BOPLNT
Genesis 7 in the BOSCB
Genesis 7 in the BOSNC
Genesis 7 in the BOTLNT
Genesis 7 in the BOVCB
Genesis 7 in the BOYCB
Genesis 7 in the BPBB
Genesis 7 in the BPH
Genesis 7 in the BSB
Genesis 7 in the CCB
Genesis 7 in the CUV
Genesis 7 in the CUVS
Genesis 7 in the DBT
Genesis 7 in the DGDNT
Genesis 7 in the DHNT
Genesis 7 in the DNT
Genesis 7 in the ELBE
Genesis 7 in the EMTV
Genesis 7 in the ESV
Genesis 7 in the FBV
Genesis 7 in the FEB
Genesis 7 in the GGMNT
Genesis 7 in the GNT
Genesis 7 in the HARY
Genesis 7 in the HNT
Genesis 7 in the IRVA
Genesis 7 in the IRVB
Genesis 7 in the IRVG
Genesis 7 in the IRVH
Genesis 7 in the IRVK
Genesis 7 in the IRVM
Genesis 7 in the IRVM2
Genesis 7 in the IRVO
Genesis 7 in the IRVP
Genesis 7 in the IRVT
Genesis 7 in the IRVT2
Genesis 7 in the IRVU
Genesis 7 in the ISVN
Genesis 7 in the JSNT
Genesis 7 in the KAPI
Genesis 7 in the KBT1ETNIK
Genesis 7 in the KBV
Genesis 7 in the KJV
Genesis 7 in the KNFD
Genesis 7 in the LBA
Genesis 7 in the LBLA
Genesis 7 in the LNT
Genesis 7 in the LSV
Genesis 7 in the MAAL
Genesis 7 in the MBV
Genesis 7 in the MBV2
Genesis 7 in the MHNT
Genesis 7 in the MKNFD
Genesis 7 in the MNG
Genesis 7 in the MNT
Genesis 7 in the MNT2
Genesis 7 in the MRS1T
Genesis 7 in the NAA
Genesis 7 in the NASB
Genesis 7 in the NBLA
Genesis 7 in the NBS
Genesis 7 in the NBVTP
Genesis 7 in the NET2
Genesis 7 in the NIV11
Genesis 7 in the NNT
Genesis 7 in the NNT2
Genesis 7 in the NNT3
Genesis 7 in the PDDPT
Genesis 7 in the PFNT
Genesis 7 in the RMNT
Genesis 7 in the SBIAS
Genesis 7 in the SBIBS
Genesis 7 in the SBIBS2
Genesis 7 in the SBICS
Genesis 7 in the SBIDS
Genesis 7 in the SBIGS
Genesis 7 in the SBIHS
Genesis 7 in the SBIIS
Genesis 7 in the SBIIS2
Genesis 7 in the SBIIS3
Genesis 7 in the SBIKS
Genesis 7 in the SBIKS2
Genesis 7 in the SBIMS
Genesis 7 in the SBIOS
Genesis 7 in the SBIPS
Genesis 7 in the SBISS
Genesis 7 in the SBITS
Genesis 7 in the SBITS2
Genesis 7 in the SBITS3
Genesis 7 in the SBITS4
Genesis 7 in the SBIUS
Genesis 7 in the SBIVS
Genesis 7 in the SBT
Genesis 7 in the SBT1E
Genesis 7 in the SCHL
Genesis 7 in the SNT
Genesis 7 in the SUSU
Genesis 7 in the SUSU2
Genesis 7 in the SYNO
Genesis 7 in the TBIAOTANT
Genesis 7 in the TBT1E
Genesis 7 in the TBT1E2
Genesis 7 in the TFTIP
Genesis 7 in the TFTU
Genesis 7 in the TGNTATF3T
Genesis 7 in the THAI
Genesis 7 in the TNFD
Genesis 7 in the TNT
Genesis 7 in the TNTIK
Genesis 7 in the TNTIL
Genesis 7 in the TNTIN
Genesis 7 in the TNTIP
Genesis 7 in the TNTIZ
Genesis 7 in the TOMA
Genesis 7 in the TTENT
Genesis 7 in the UBG
Genesis 7 in the UGV
Genesis 7 in the UGV2
Genesis 7 in the UGV3
Genesis 7 in the VBL
Genesis 7 in the VDCC
Genesis 7 in the YALU
Genesis 7 in the YAPE
Genesis 7 in the YBVTP
Genesis 7 in the ZBP