Judges 1 (BOICB)

1 Mgbe Joshua nwụrụ, ụmụ Izrel jụrụ ONYENWE ANYỊ sị, “Olee ebo ga-ebu ụzọ gaa lụso ndị Kenan agha nʼihi anyị?” 2 ONYENWE ANYỊ zara, “Ọ bụ ebo Juda. Enyefeela m ala ahụ nʼaka ha.” 3 Ndị Juda gwara ụmụ nwanne ha ndị ebo Simiọn sị, “Soronụ anyị banye nʼala ahụ anyị ketara site nʼife nza, ka anyị ga lụso ndị Kenan agha. Anyị ga-esokwara unu banye nʼala nke unu.” Ya mere, ndị ebo Simiọn soro ha gaa. 4 Mgbe Juda busoro ha agha, ONYENWE ANYỊ nyefere ndị Kenan, na ndị Periz nʼaka ha, mee ka ha gbuo puku ndị agha iri nʼime obodo Bezek. 5 Nʼebe ahụ ka ha zutere Adoni-Bezek, buso ya agha, tigbukwaa ndị Kenan na ndị Periz. 6 Ma Adoni-Bezek gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya, ma ha chụgidere ya, jide ya, gbupụ ya isi mkpụrụ aka ya abụọ na isi mkpụrụ ụkwụ ya abụọ. 7 Mgbe ahụ, Adoni-Bezek sịrị, “Iri ndị eze asaa ka m mesoro ụdị mmeso a unu mesoro m, ọ bụkwa nri si na tebul m dapụ ka ha riri. Ugbu a Chineke akwụghachila m ụgwọ ọrụ ọjọọ m.” Ha kpụụrụ ya gaa Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ. 8 Ndị Juda busoro obodo Jerusalem agha, were mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi nʼime ya, ma gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ. 9 Mgbe nke a gasịrị, ndị agha Juda busoro ndị Kenan bi na ndịda ala ugwu ugwu ahụ, bụ Negev, ya na akụkụ ọdịda anyanwụ nʼebe dị ala ala. 10 Ha jekwuru ndị Kenan bi nʼobodo Hebrọn (nke a na-akpọ Kiriat Aaba na mbụ) merie Sheshai, na Ahiman, na Talmai. 11 Site nʼebe ahụ, ha jekwuru ndị bi na Debịa (nke a na-akpọ Kiriat Sefa, nʼoge mbụ). 12 Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.” 13 Otniel nwa Kenaz, nwanne nta Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya. 14 Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?” 15 Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda. 16 Ụmụnna nwunye Mosis, onye Ken, si nʼobodo nkwụ nkwụ soro ndị Juda, gaa biri nʼetiti ndị ahụ bi nʼọzara Juda, na Negev, nke dị nso nʼArad. 17 Ndị ikom Juda sooro ndị ikom Simiọn, ụmụnna ha, lụso ndị Kenan bi na Zefat agha, bibie obodo ahụ kpamkpam. Nʼihi nke a, a gụgharịrị obodo ahụ, kpọọ ya Homa. 18 Ndị agha Juda lụgbukwara obodo Gaza, na Ashkelọn, na Ekrọn, tinyere ala niile gbara ha gburugburu. 19 ONYENWE ANYỊ nọnyeekwara ndị Juda mee ka ha kpochapụ ndị niile bi nʼobodo niile dị nʼala ugwu ugwu ahụ. Ma ha enweghị ike ịchụpụ ndị bi nʼala ndagwurugwu ahụ, nʼihi na ndị ahụ nwere ụgbọ agha igwe dị iche iche. 20 E nyekwara Kaleb obodo Hebrọn, dịka Mosis kwere ya na nkwa. Kaleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ site nʼala ahụ. 21 Ndị ebo Benjamin enweghị ike chụpụ ndị Jebus bi na Jerusalem. Nʼihi nke a, ha soro ụmụ Benjamin biri ruo taa. 22 Ma ndị sitere nʼebo Josef busoro obodo Betel agha. ONYENWE ANYỊ nọnyeere ha. 23 Mgbe ha zipuru ndị ikom ịga nyochapụta obodo Betel, nke a na-akpọ Luz, 24 ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke sị nʼobodo ahụ na-apụta. Ha gwara ya okwu sị ya, “Zi anyị ụzọ anyị ga-esi banye nʼime obodo a, anyị ga-ahụ na e mesoro gị mmeso dị mma.” 25 Ya mere, nwoke ahụ gosiri ha ụzọ, ha ji mma agha gbuo mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ, ma ha hapụrụ nwoke ahụ na ezinaụlọ ya ndụ. 26 Emesịa, nwoke ahụ kpọọrọ ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Het wuoro onwe ya otu obodo nʼebe ahụ. Ọ kpọrọ aha obodo ahụ Luz, nke bụkwa aha obodo ahụ ruo taa. 27 Manase achụpụghị ndị Bet-Shan na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Teanak na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Doa, maọbụ Ibleam, maọbụ Megido, tinyere obodo nta niile ndị ọzọ gbara ha gburugburu. Nʼihi na ndị Kenan bigidere nʼebe ahụ. 28 Mgbe ụmụ Izrel dịrị ike karịa, ha manyere ndị Kenan ị rụrụ ha ọrụ, ma ha achụpụghị ha site nʼala ahụ. 29 Ifrem enwekwaghị ike chụpụ ndị Kenan bi na Gaza. Ndị Kenan gara nʼihu biri nʼetiti ha nʼebe ahụ. 30 Otu a kwa, ebo Zebụlọn achụpụghị ndị Kenan bi nʼala Kitrọn, maọbụ na Nahalol, kama ha mere ha ndị ohu na-arụ ọrụ ike. 31 Ọzọkwa, ndị ebo Asha achụpụghị ndị niile bi nʼAkọ, na Saịdọn, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, maọbụ Rehob. 32 Ndị Asha binyere nʼetiti ndị Kenan bụ ndị bi nʼala ahụ, nʼihi na ha achụpụghị ha. 33 Ndị ebo Naftalị achụpụghịkwa ndị bi na Bet-Shemesh, maọbụ ndị bi na Bet-Anat. Kama ndị Naftalị binyere ndị Kenan bi nʼala ahụ. Ma ndị bi na Bet-Shemesh, na Bet-Anat ghọrọ ndị ohu ndị Naftalị. 34 Ma banyere ndị ebo Dan, ndị Amọrait chụpụrụ ha chụba ha nʼelu ugwu. Ha ekwenyeghị ka ha rịdata na ndịda ugwu ahụ. 35 Ma ndị Amọrait nọgidesịrị ike nʼugwu Heres, na Aijalon, na Shaalbim, ma mgbe ike ebo Josef bara ụba, ha meriri ha, mee ha ndị ohu ha. 36 Oke ala ụmụ ndị Amọrait malitere na mgbago Akrabim ruo, ma gafeekwa ebe a na-akpọ Sela.

In Other Versions

Judges 1 in the ANGEFD

Judges 1 in the ANTPNG2D

Judges 1 in the AS21

Judges 1 in the BAGH

Judges 1 in the BBPNG

Judges 1 in the BBT1E

Judges 1 in the BDS

Judges 1 in the BEV

Judges 1 in the BHAD

Judges 1 in the BIB

Judges 1 in the BLPT

Judges 1 in the BNT

Judges 1 in the BNTABOOT

Judges 1 in the BNTLV

Judges 1 in the BOATCB

Judges 1 in the BOATCB2

Judges 1 in the BOBCV

Judges 1 in the BOCNT

Judges 1 in the BOECS

Judges 1 in the BOGWICC

Judges 1 in the BOHCB

Judges 1 in the BOHCV

Judges 1 in the BOHLNT

Judges 1 in the BOHNTLTAL

Judges 1 in the BOILNTAP

Judges 1 in the BOITCV

Judges 1 in the BOKCV

Judges 1 in the BOKCV2

Judges 1 in the BOKHWOG

Judges 1 in the BOKSSV

Judges 1 in the BOLCB

Judges 1 in the BOLCB2

Judges 1 in the BOMCV

Judges 1 in the BONAV

Judges 1 in the BONCB

Judges 1 in the BONLT

Judges 1 in the BONUT2

Judges 1 in the BOPLNT

Judges 1 in the BOSCB

Judges 1 in the BOSNC

Judges 1 in the BOTLNT

Judges 1 in the BOVCB

Judges 1 in the BOYCB

Judges 1 in the BPBB

Judges 1 in the BPH

Judges 1 in the BSB

Judges 1 in the CCB

Judges 1 in the CUV

Judges 1 in the CUVS

Judges 1 in the DBT

Judges 1 in the DGDNT

Judges 1 in the DHNT

Judges 1 in the DNT

Judges 1 in the ELBE

Judges 1 in the EMTV

Judges 1 in the ESV

Judges 1 in the FBV

Judges 1 in the FEB

Judges 1 in the GGMNT

Judges 1 in the GNT

Judges 1 in the HARY

Judges 1 in the HNT

Judges 1 in the IRVA

Judges 1 in the IRVB

Judges 1 in the IRVG

Judges 1 in the IRVH

Judges 1 in the IRVK

Judges 1 in the IRVM

Judges 1 in the IRVM2

Judges 1 in the IRVO

Judges 1 in the IRVP

Judges 1 in the IRVT

Judges 1 in the IRVT2

Judges 1 in the IRVU

Judges 1 in the ISVN

Judges 1 in the JSNT

Judges 1 in the KAPI

Judges 1 in the KBT1ETNIK

Judges 1 in the KBV

Judges 1 in the KJV

Judges 1 in the KNFD

Judges 1 in the LBA

Judges 1 in the LBLA

Judges 1 in the LNT

Judges 1 in the LSV

Judges 1 in the MAAL

Judges 1 in the MBV

Judges 1 in the MBV2

Judges 1 in the MHNT

Judges 1 in the MKNFD

Judges 1 in the MNG

Judges 1 in the MNT

Judges 1 in the MNT2

Judges 1 in the MRS1T

Judges 1 in the NAA

Judges 1 in the NASB

Judges 1 in the NBLA

Judges 1 in the NBS

Judges 1 in the NBVTP

Judges 1 in the NET2

Judges 1 in the NIV11

Judges 1 in the NNT

Judges 1 in the NNT2

Judges 1 in the NNT3

Judges 1 in the PDDPT

Judges 1 in the PFNT

Judges 1 in the RMNT

Judges 1 in the SBIAS

Judges 1 in the SBIBS

Judges 1 in the SBIBS2

Judges 1 in the SBICS

Judges 1 in the SBIDS

Judges 1 in the SBIGS

Judges 1 in the SBIHS

Judges 1 in the SBIIS

Judges 1 in the SBIIS2

Judges 1 in the SBIIS3

Judges 1 in the SBIKS

Judges 1 in the SBIKS2

Judges 1 in the SBIMS

Judges 1 in the SBIOS

Judges 1 in the SBIPS

Judges 1 in the SBISS

Judges 1 in the SBITS

Judges 1 in the SBITS2

Judges 1 in the SBITS3

Judges 1 in the SBITS4

Judges 1 in the SBIUS

Judges 1 in the SBIVS

Judges 1 in the SBT

Judges 1 in the SBT1E

Judges 1 in the SCHL

Judges 1 in the SNT

Judges 1 in the SUSU

Judges 1 in the SUSU2

Judges 1 in the SYNO

Judges 1 in the TBIAOTANT

Judges 1 in the TBT1E

Judges 1 in the TBT1E2

Judges 1 in the TFTIP

Judges 1 in the TFTU

Judges 1 in the TGNTATF3T

Judges 1 in the THAI

Judges 1 in the TNFD

Judges 1 in the TNT

Judges 1 in the TNTIK

Judges 1 in the TNTIL

Judges 1 in the TNTIN

Judges 1 in the TNTIP

Judges 1 in the TNTIZ

Judges 1 in the TOMA

Judges 1 in the TTENT

Judges 1 in the UBG

Judges 1 in the UGV

Judges 1 in the UGV2

Judges 1 in the UGV3

Judges 1 in the VBL

Judges 1 in the VDCC

Judges 1 in the YALU

Judges 1 in the YAPE

Judges 1 in the YBVTP

Judges 1 in the ZBP