Judges 3 (BOICB)

1 Ndị a bụ aha mba dị iche iche ONYENWE ANYỊ hapụrụ nʼala ahụ iji nwapụta ndị Izrel ahụ niile na-esoghị mgbe e buru agha nʼime ala Kenan. 2 O mere nke a naanị ka ọ kuziere ọgbọ niile ndị Izrel ibu agha, bụ ndị ahụ na-amabeghị ihe agha bụ nʼoge gara aga. 3 Ndịisi ise nke ndị Filistia, na ndị Kenan niile, ndị Saịdọn na ndị Hiv, ndị bi nʼelu ugwu Lebanọn, site nʼugwu Baal-Hemon ruo na mbata obodo Hamat. 4 A ga-esite na ndị a nwapụta okwukwe ụmụ Izrel ma ịmata ma ha ga-edebe iwu ONYENWE ANYỊ sitere nʼọnụ Mosis nye nna nna ha ochie. 5 Nʼihi nke a, ụmụ Izrel biri nʼetiti ndị Kenan, ndị Het, ndị Hiv, ndị Periz, ndị Amọrait, na ndị Jebus. 6 Ha lụtaara onwe ha ụmụ ha ndị inyom na nwunye, werekwa ụmụ ha ndị inyom nye ụmụ ha ndị ikom, feekwa chi ha niile ofufe. 7 Ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. Ha chefuru ONYENWE ANYỊ Chineke ha, malite ife chi Baal, na Ashera ofufe. 8 Nʼihi ya, iwe ọkụ ONYENWE ANYỊ kpaliri megide ụmụ Izrel. Ọ raara ha nye nʼaka eze Kushan Rishataim, eze Aram Naharaim, onye ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ya afọ asatọ. 9 Ma mgbe ụmụ Izrel kpọkuru ONYENWE ANYỊ, o mere ka Otniel, nwa Kenaz, bilie nʼetiti ha. Otniel bụ nwa nwanne Kaleb nke nta. Ọ bụkwa ya napụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị iro ha. 10 Mmụọ ONYENWE ANYỊ bịakwasịrị ya, nke mere ka ọ bụrụ onye ikpe ndị Izrel, ọ pụrụ ibu agha. ONYENWE ANYỊ nyefere Kushan Rishataim bụ eze ndị Aram nʼaka Otniel, onye ike ya karịrị nke ya. 11 Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, udo dịịrị nʼala niile iri afọ anọ, mgbe Otniel na-ekpe Izrel ikpe. Nʼikpeazụ, Otniel, nwa Kenaz nwụrụ. 12 Ụmụ Izrel bidoro ime ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. Ya mere, ONYENWE ANYỊ nyefere ha nʼaka Eglọn, eze Moab. 13 Ọ kpọtara ndị Amọn na ndị Amalek ka ha dịnyere ya. Eglọn bịara buso ndị Izrel agha, nweta obodo Nkwụ, ya abụrụzia nke ha. 14 Afọ iri na asatọ site nʼoge ahụ ka ụmụ Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị Eglọn, eze Moab. 15 Ma mgbe ụmụ Izrel tikuru ONYENWE ANYỊ banyere ọnọdụ ọjọọ ha, o zitere ha onye nzọpụta. Aha nwoke ahụ bụ Ehud, nwa Gera, onye sitere nʼagbụrụ Benjamin. Ọ bụ onye na-eme aka ekpe. Ya onwe ya bụkwa onye na-ebugara Eglọn, eze Moab, ego ụtụ niile ụmụ Izrel na-atụ kwa afọ. 16 Tupu ọ malite ije ya, o buru ụzọ kwadebere onwe ya mma agha nwere ihu abụọ na nzuzo. Ogologo mma ahụ ga-eru ihe dịka site nʼọnụ mkpịsịaka ruo nʼisi mbụ aka. Ehud kekwasịrị mma ahụ nʼapata ụkwụ aka nri ya, yikwasị ya uwe mwụda ya. 17 O bunyere Eglọn, eze Moab ego ụtụ ahụ. Eglọn bụ nwoke buru oke ibu. 18 Mgbe Ehud nyesịrị eze Eglọn ego ụtụ ahụ o ji bịa, o zilagara ndị butere ego ahụ. 19 Mgbe ọ bịaruru nso nʼobodo Gilgal, ebe arụsị dị iche iche a pịrị apị dị, ọ laghachiri azụ jekwuru eze Eglọn sị ya, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ma ọ ga-abụ na nzuzo.”Mgbe ahụ, eze zipụrụ ndị so ya nọdụ, ka ya na Ehud naanị nwee ike ịnọ kparịa ụka ha na nzuzo. 20 Ehud bịakwutere ya mgbe ọ nọ naanị ya nʼọnụụlọ dị nʼime nʼelu ụlọeze ya, sị, “Enwere m ozi Chineke sị m zie gị.” Dịka eze ahụ si nʼoche ya bilite ọtọ, 21 Ehud tinyere aka ekpe ya nʼime uwe ya, mịpụta mma ahụ nwere ihu abụọ nke o kegidere nʼapata ụkwụ aka nri ya. O weere ya mapuo eze Eglọn afọ. 22 Ọ bụladị isi mma ahụ sooro ihu mma ahụ mibanye nʼime afọ ukwu eze Eglọn. Ọnụ mma ahụ pụtakwara nʼazụ eze ahụ. Ehud amịpụtaghị mma ahụ, kama abụba dị nʼafọ eze ahụ kpuchiri ya. 23 Ya mere, Ehud pụrụ nʼezi, mechibido ya ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼọnụụlọ elu ahụ, kpọchie ha. 24 Mgbe ọ pụchara, ndị na-ejere eze ozi bịara chọọ ịbanye nʼụlọ ahụ. Ma mgbe ha hụrụ na a kpọchiri ọnụ ụzọ ụlọ ahụ akpọchi, ha kwuru nʼonwe ha sị, “Ọ ga-abụ na ọ na-anyụ nsị nʼụlọ mposi.” 25 Ma mgbe oge dị anya gasịrị ma eze apụtaghị, ha enweghị ike ijide onwe ha ọzọ. Ha weere ọtụghe ụzọ tụghee ọnụ ụzọ ahụ, hụ ebe eze ha tọgbọrọ nʼala, nwụọ. 26 Mgbe ahụ ha nọ na-eche, Ehud gbapụrụ. O sitere nʼebe ahụ arụsị ndị ahụ a pịrị apị dị gbafee, gbaga Seira. 27 Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ fụrụ opi ike nʼala ugwu ugwu Ifrem, ndị Izrel sooro ya site nʼugwu ahụ rịda, ya onwe ya na-edu ha. 28 Ọ sịrị ha, “Soronụ m nʼazụ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ enyela ndị Moab ndị iro unu nʼaka unu.” Ya mere, ha sooro ya gbadaa, gaa nọchie ụzọ niile ndị Moab nwere ike isi gafee osimiri Jọdan. Ha ekwekwaghị ka onye Moab ọbụla si nʼebe ahụ gafee. 29 Nʼụbọchị ahụ, ha gburu puku ndị agha Moab iri, ha niile siri ike bụrụkwa dimkpa. O nweghị otu onye gbapụrụ. 30 Nʼụbọchị ahụ, e mere ka Moab nọdụ nʼokpuru ndị Izrel. Ala ahụ nwere ozuzu ike na udo, iri afọ asatọ. 31 Mgbe Ehud chịsịrị, Shamga, nwa Anat rịgotara ịchị. O tigburu narị ndị Filistia isii. Ọ bụ ndụdụ e ji achị ehi ka o ji tigbuo ha. Ya onwe ya kwa, zọpụtara ndị Izrel.

In Other Versions

Judges 3 in the ANGEFD

Judges 3 in the ANTPNG2D

Judges 3 in the AS21

Judges 3 in the BAGH

Judges 3 in the BBPNG

Judges 3 in the BBT1E

Judges 3 in the BDS

Judges 3 in the BEV

Judges 3 in the BHAD

Judges 3 in the BIB

Judges 3 in the BLPT

Judges 3 in the BNT

Judges 3 in the BNTABOOT

Judges 3 in the BNTLV

Judges 3 in the BOATCB

Judges 3 in the BOATCB2

Judges 3 in the BOBCV

Judges 3 in the BOCNT

Judges 3 in the BOECS

Judges 3 in the BOGWICC

Judges 3 in the BOHCB

Judges 3 in the BOHCV

Judges 3 in the BOHLNT

Judges 3 in the BOHNTLTAL

Judges 3 in the BOILNTAP

Judges 3 in the BOITCV

Judges 3 in the BOKCV

Judges 3 in the BOKCV2

Judges 3 in the BOKHWOG

Judges 3 in the BOKSSV

Judges 3 in the BOLCB

Judges 3 in the BOLCB2

Judges 3 in the BOMCV

Judges 3 in the BONAV

Judges 3 in the BONCB

Judges 3 in the BONLT

Judges 3 in the BONUT2

Judges 3 in the BOPLNT

Judges 3 in the BOSCB

Judges 3 in the BOSNC

Judges 3 in the BOTLNT

Judges 3 in the BOVCB

Judges 3 in the BOYCB

Judges 3 in the BPBB

Judges 3 in the BPH

Judges 3 in the BSB

Judges 3 in the CCB

Judges 3 in the CUV

Judges 3 in the CUVS

Judges 3 in the DBT

Judges 3 in the DGDNT

Judges 3 in the DHNT

Judges 3 in the DNT

Judges 3 in the ELBE

Judges 3 in the EMTV

Judges 3 in the ESV

Judges 3 in the FBV

Judges 3 in the FEB

Judges 3 in the GGMNT

Judges 3 in the GNT

Judges 3 in the HARY

Judges 3 in the HNT

Judges 3 in the IRVA

Judges 3 in the IRVB

Judges 3 in the IRVG

Judges 3 in the IRVH

Judges 3 in the IRVK

Judges 3 in the IRVM

Judges 3 in the IRVM2

Judges 3 in the IRVO

Judges 3 in the IRVP

Judges 3 in the IRVT

Judges 3 in the IRVT2

Judges 3 in the IRVU

Judges 3 in the ISVN

Judges 3 in the JSNT

Judges 3 in the KAPI

Judges 3 in the KBT1ETNIK

Judges 3 in the KBV

Judges 3 in the KJV

Judges 3 in the KNFD

Judges 3 in the LBA

Judges 3 in the LBLA

Judges 3 in the LNT

Judges 3 in the LSV

Judges 3 in the MAAL

Judges 3 in the MBV

Judges 3 in the MBV2

Judges 3 in the MHNT

Judges 3 in the MKNFD

Judges 3 in the MNG

Judges 3 in the MNT

Judges 3 in the MNT2

Judges 3 in the MRS1T

Judges 3 in the NAA

Judges 3 in the NASB

Judges 3 in the NBLA

Judges 3 in the NBS

Judges 3 in the NBVTP

Judges 3 in the NET2

Judges 3 in the NIV11

Judges 3 in the NNT

Judges 3 in the NNT2

Judges 3 in the NNT3

Judges 3 in the PDDPT

Judges 3 in the PFNT

Judges 3 in the RMNT

Judges 3 in the SBIAS

Judges 3 in the SBIBS

Judges 3 in the SBIBS2

Judges 3 in the SBICS

Judges 3 in the SBIDS

Judges 3 in the SBIGS

Judges 3 in the SBIHS

Judges 3 in the SBIIS

Judges 3 in the SBIIS2

Judges 3 in the SBIIS3

Judges 3 in the SBIKS

Judges 3 in the SBIKS2

Judges 3 in the SBIMS

Judges 3 in the SBIOS

Judges 3 in the SBIPS

Judges 3 in the SBISS

Judges 3 in the SBITS

Judges 3 in the SBITS2

Judges 3 in the SBITS3

Judges 3 in the SBITS4

Judges 3 in the SBIUS

Judges 3 in the SBIVS

Judges 3 in the SBT

Judges 3 in the SBT1E

Judges 3 in the SCHL

Judges 3 in the SNT

Judges 3 in the SUSU

Judges 3 in the SUSU2

Judges 3 in the SYNO

Judges 3 in the TBIAOTANT

Judges 3 in the TBT1E

Judges 3 in the TBT1E2

Judges 3 in the TFTIP

Judges 3 in the TFTU

Judges 3 in the TGNTATF3T

Judges 3 in the THAI

Judges 3 in the TNFD

Judges 3 in the TNT

Judges 3 in the TNTIK

Judges 3 in the TNTIL

Judges 3 in the TNTIN

Judges 3 in the TNTIP

Judges 3 in the TNTIZ

Judges 3 in the TOMA

Judges 3 in the TTENT

Judges 3 in the UBG

Judges 3 in the UGV

Judges 3 in the UGV2

Judges 3 in the UGV3

Judges 3 in the VBL

Judges 3 in the VDCC

Judges 3 in the YALU

Judges 3 in the YAPE

Judges 3 in the YBVTP

Judges 3 in the ZBP