Judges 4 (BOICB)

1 Mgbe Ehud nwụsịrị, ụmụ Izrel mekwara ihe ọjọọ megide ONYENWE ANYỊ. 2 Nʼihi ya, ONYENWE ANYỊ renyere ha nʼaka Jabin, eze Kenan, onye chịrị nʼobodo Hazọ. Aha onyeisi ndị agha ya bụ Sisera, onye bi nʼobodo a na-akpọ Heroshet Hagoyim. 3 Nʼihi na o nwere narị ụgbọ agha igwe itoolu, ma megbukwaa ụmụ Izrel nke ukwu iri afọ abụọ, ha tikuru ONYENWE ANYỊ mkpu akwa, ka o nyere ha aka. 4 Nʼoge a, Debọra, bụ nwanyị na-ebu amụma, nwunye Lapidọt bụ onyendu ụmụ Izrel. 5 Ọ na-anọ nʼokpuru osisi nkwụ a na-akpọ Nkwụ Debọra, nke dị nʼagbata Rema na Betel, bụ nʼala ugwu ugwu Ifrem na-ekpe ikpe. Nʼebe ahụ ka ụmụ Izrel na-ejekwuru ya ka o doziere ha okwu ha niile. 6 O ziri ozi kpọọ Barak, nwa Abinoam, onye bi nʼobodo Kedesh, nke dị nʼime Naftalị, ọ sịrị ya, “ONYENWE ANYỊ Chineke ụmụ Izrel na-enye gị iwu, ‘Gaa chịkọtaa puku ndị agha iri bụ ndị sitere nʼebo Naftalị na Zebụlọn, duru ha jeruo ugwu Taboa. 7 Aga m edute Sisera, ọchịagha ndị agha Jabin, mee ka ọ bịaruo nso iyi ukwu Kishọn, ya na ụgbọ agha ya niile na ndị agha ya niile ma nyefee ha nʼaka gị.’ ” 8 Barak sịrị ya, “Ejikeere m ịga ma ọ bụrụ na ị ga-eso m. Ọ bụrụkwanụ na ị jụ iso m, agaghị m aga.” 9 Debọra sịrị, “Aghaghị m isoro gị jee ma nʼihi mkpebi gị nʼihe a, nsọpụrụ agaghị abụ nke gị, nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-enyefe Sisera nʼaka nwanyị.” Ya mere, Debọra biliri soro Barak jee obodo Kedesh. 10 Barak sitere nʼebo Zebụlọn na Naftalị kpọkọtaa ndị ikom ga-eso ya jee agha ahụ, puku ndị agha iri ndị dịnyere ya. Debọra sokwa ya jee. 11 Nʼoge a, Heba, onye Ken, ahapụla ndị Ken ndị ọzọ, ndị bụ ụmụ ụmụ Hobab, nwanne nwunye Mosis gaa maa ụlọ ikwu ya nʼokpuru osisi ukwu dị na Zaananim, nke dị nso Kedesh. 12 Mgbe ha gwara Sisera na Barak nwa Abinoam arịgorola nʼelu ugwu Taboa, 13 Sisera kpọkọtara ndị agha ya niile, tinyere narị ụgbọ agha itoolu ya, site na Haroshet Haroyim gaa nʼiyi ukwu Kishọn. 14 Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke ONYENWE ANYỊ nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na ONYENWE ANYỊ apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa. 15 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ jiri mma agha ya chụsaa Sisera na ndị agha ya na ụgbọ agha igwe ha nʼihu Barak. Sisera nʼonwe ya hapụrụ ụgbọ agha ya jiri ụkwụ gbapụ ọsọ. 16 Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ. 17 Ma Sisera gbapụrụ ọsọ gaa zoo onwe ya nʼụlọ ikwu Jael, nwunye Heba, onye Ken. Nʼihi udo dị nʼetiti eze Jabin, onye Hazọ, na ndị ezinaụlọ Heba, onye Ken. 18 Jael pụrụ ije zute Sisera sị ya, “Bịa Onyenwe m, bakwute m. Atụla ụjọ.” Ya mere na ọ bara nʼime ụlọ ikwu ya, o weere akwa ịchụ oyi kpuchie ya. 19 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Akpịrị na-akpọ m nkụ, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” O meghere karama akpụkpọ mmiri ara ehi, nye ya ihe ọṅụṅụ, jirikwa akwa ahụ sachie ya. 20 Sisera gwara nwanyị ahụ bụ Jael okwu sị, “Guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ a. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa jụọ gị, ‘O nwere onye gbabatara nʼebe a?’ sị ya, ‘Mba.’ ” 21 Ike gwụrụ nnọọ Sisera. Mgbe ahụ, ọ malitere ịrahụ ụra, Jael, nwunye Heba, wepụtara otu ǹtu e ji a kpọgide ụlọ ikwu ahụ nʼala, werekwa mkpirisi igwe nʼaka ya. O jiri nwayọọ jekwuuru Sisera ebe o dina na-arahụ ụra, kpọọ ya ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. Otu a ka Sisera si nwụọ. 22 Mgbe Barak bịara ịchọ Sisera, Jael jekwuru ya sị, “Bịa ka m gosi gị nwoke ahụ ị na-achọ.” Barak sooro ya jee, ma lee, Sisera anwụọlarị site na ǹtu ahụ a kpọrọ ya nʼisi. 23 Nʼụbọchị ahụ, Chineke meriri Jabin, eze ndị Kenan nʼihu ụmụ Izrel. 24 Aka ụmụ Izrel bụ nke dị ike na-adịkwa ike nke ukwu megide Jabin bụ eze Kenan ruo mgbe ha lara ya nʼiyi.

In Other Versions

Judges 4 in the ANGEFD

Judges 4 in the ANTPNG2D

Judges 4 in the AS21

Judges 4 in the BAGH

Judges 4 in the BBPNG

Judges 4 in the BBT1E

Judges 4 in the BDS

Judges 4 in the BEV

Judges 4 in the BHAD

Judges 4 in the BIB

Judges 4 in the BLPT

Judges 4 in the BNT

Judges 4 in the BNTABOOT

Judges 4 in the BNTLV

Judges 4 in the BOATCB

Judges 4 in the BOATCB2

Judges 4 in the BOBCV

Judges 4 in the BOCNT

Judges 4 in the BOECS

Judges 4 in the BOGWICC

Judges 4 in the BOHCB

Judges 4 in the BOHCV

Judges 4 in the BOHLNT

Judges 4 in the BOHNTLTAL

Judges 4 in the BOILNTAP

Judges 4 in the BOITCV

Judges 4 in the BOKCV

Judges 4 in the BOKCV2

Judges 4 in the BOKHWOG

Judges 4 in the BOKSSV

Judges 4 in the BOLCB

Judges 4 in the BOLCB2

Judges 4 in the BOMCV

Judges 4 in the BONAV

Judges 4 in the BONCB

Judges 4 in the BONLT

Judges 4 in the BONUT2

Judges 4 in the BOPLNT

Judges 4 in the BOSCB

Judges 4 in the BOSNC

Judges 4 in the BOTLNT

Judges 4 in the BOVCB

Judges 4 in the BOYCB

Judges 4 in the BPBB

Judges 4 in the BPH

Judges 4 in the BSB

Judges 4 in the CCB

Judges 4 in the CUV

Judges 4 in the CUVS

Judges 4 in the DBT

Judges 4 in the DGDNT

Judges 4 in the DHNT

Judges 4 in the DNT

Judges 4 in the ELBE

Judges 4 in the EMTV

Judges 4 in the ESV

Judges 4 in the FBV

Judges 4 in the FEB

Judges 4 in the GGMNT

Judges 4 in the GNT

Judges 4 in the HARY

Judges 4 in the HNT

Judges 4 in the IRVA

Judges 4 in the IRVB

Judges 4 in the IRVG

Judges 4 in the IRVH

Judges 4 in the IRVK

Judges 4 in the IRVM

Judges 4 in the IRVM2

Judges 4 in the IRVO

Judges 4 in the IRVP

Judges 4 in the IRVT

Judges 4 in the IRVT2

Judges 4 in the IRVU

Judges 4 in the ISVN

Judges 4 in the JSNT

Judges 4 in the KAPI

Judges 4 in the KBT1ETNIK

Judges 4 in the KBV

Judges 4 in the KJV

Judges 4 in the KNFD

Judges 4 in the LBA

Judges 4 in the LBLA

Judges 4 in the LNT

Judges 4 in the LSV

Judges 4 in the MAAL

Judges 4 in the MBV

Judges 4 in the MBV2

Judges 4 in the MHNT

Judges 4 in the MKNFD

Judges 4 in the MNG

Judges 4 in the MNT

Judges 4 in the MNT2

Judges 4 in the MRS1T

Judges 4 in the NAA

Judges 4 in the NASB

Judges 4 in the NBLA

Judges 4 in the NBS

Judges 4 in the NBVTP

Judges 4 in the NET2

Judges 4 in the NIV11

Judges 4 in the NNT

Judges 4 in the NNT2

Judges 4 in the NNT3

Judges 4 in the PDDPT

Judges 4 in the PFNT

Judges 4 in the RMNT

Judges 4 in the SBIAS

Judges 4 in the SBIBS

Judges 4 in the SBIBS2

Judges 4 in the SBICS

Judges 4 in the SBIDS

Judges 4 in the SBIGS

Judges 4 in the SBIHS

Judges 4 in the SBIIS

Judges 4 in the SBIIS2

Judges 4 in the SBIIS3

Judges 4 in the SBIKS

Judges 4 in the SBIKS2

Judges 4 in the SBIMS

Judges 4 in the SBIOS

Judges 4 in the SBIPS

Judges 4 in the SBISS

Judges 4 in the SBITS

Judges 4 in the SBITS2

Judges 4 in the SBITS3

Judges 4 in the SBITS4

Judges 4 in the SBIUS

Judges 4 in the SBIVS

Judges 4 in the SBT

Judges 4 in the SBT1E

Judges 4 in the SCHL

Judges 4 in the SNT

Judges 4 in the SUSU

Judges 4 in the SUSU2

Judges 4 in the SYNO

Judges 4 in the TBIAOTANT

Judges 4 in the TBT1E

Judges 4 in the TBT1E2

Judges 4 in the TFTIP

Judges 4 in the TFTU

Judges 4 in the TGNTATF3T

Judges 4 in the THAI

Judges 4 in the TNFD

Judges 4 in the TNT

Judges 4 in the TNTIK

Judges 4 in the TNTIL

Judges 4 in the TNTIN

Judges 4 in the TNTIP

Judges 4 in the TNTIZ

Judges 4 in the TOMA

Judges 4 in the TTENT

Judges 4 in the UBG

Judges 4 in the UGV

Judges 4 in the UGV2

Judges 4 in the UGV3

Judges 4 in the VBL

Judges 4 in the VDCC

Judges 4 in the YALU

Judges 4 in the YAPE

Judges 4 in the YBVTP

Judges 4 in the ZBP