Judges 8 (BOICB)

1 Ndị Ifrem jụrụ Gidiọn ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji meso anyị mmeso dị otu a? Ọ bụ gịnị mere i zighị ozi kpọ anyị mgbe ị gara ibuso ndị Midia agha?” Ha tara ya ụta nke ukwuu. 2 Ma Gidiọn zaghachiri ha sị, “Gịnị ka m rụpụtara e ji atụnyere nke unu. Ọ bụ na ntụtụkọta ihe ubi Ifrem adịghị mma karịa owuwe ihe ubi nke Abieza? 3 Chineke nyefere unu Oreb na Zeeb, ndị ndu Midia, nʼaka. Gịnị ka m rụpụtara a ga-eji tụnyere nke unu?” Okwu a mere ka ọnụma ha nʼebe ọ nọ dajụọ. 4 Nʼoge a, Gidiọn gabigara, gafee osimiri Jọdan, ya na narị ndị agha atọ so ya. Ike gwụrụ ha nke ukwuu ma ha nọgidere na-achụsi ndị iro ha ọsọ ike. 5 Ọ sịrị ndị ikom Sukọt, “Nyetụnụ ndị agha m achịcha nʼihi na ike gwụrụ ha. Ana m na-achụso Zeba na Zalmuna, ndị eze Midia ọsọ.” 6 Ma ndịisi Sukọt sịrị, “Anyị ga-esi aṅaa nye ndị agha gị achịcha? Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị?” 7 Mgbe ahụ, Gidiọn zaghachiri, “Nʼihi nke a, mgbe ONYENWE ANYỊ nyefere m Zeba na Zalmuna nʼaka, aga m eji ogwu na ụga na-epu nʼọzara dọkasịa unu ahụ.” 8 O sitere nʼebe ahụ gaa Peniel rịọkwaa ndị obodo ahụ otu arịrịọ ahụ. Ma otu ụdị ọsịsa ahụ ndị Sukọt nyere ka ndị Peniel nyekwara. 9 Ya mere, ọ gwara ndị ikom Peniel sị, “Mgbe m nwere mmeri lọta, aga m akwatu ụlọ elu a.” 10 Nʼoge a, Zeba na Zalmuna na puku ndị agha iri na ise fọdụụrụ ha nọ na Kako. Ndị a bụ naanị ndị agha fọdụrụ nʼime usuu ndị agha ndị Midia niile. Nʼihi na ọnụọgụgụ ndị agha e gburu egbu dị narị puku na iri puku abụọ. 11 Gidiọn rigoro site ụzọ ndị na-achị anụ ụlọ nke dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Nọba na Jogbeha, bịakwasị ndị agha ahụ na mberede nʼihi na ha nọ nʼatụghị egwu ihe ọbụla ime ha. 12 Zeba na Zalmuna, eze abụọ ndị Midia, gbapụrụ ọsọ, ma Gidiọn na ndị agha ya chụgidere ha ọsọ, jide ha. Ha gweriri ndị agha ha niile. 13 Emesịa, Gidiọn nwa Joash, sitere nʼokporoụzọ Heres lọta agha ahụ. 14 Nʼebe ahụ ka Gidiọn nọ jide otu nwokorobịa onye Sukọt. O jụrụ ya ajụjụ, nwokorobịa ahụ depụtakwaara ya aha ndịisi obodo Sukọt. Ha dị iri asaa na asaa, ndị okenye obodo ahụ. 15 Mgbe Gidiọn bịaruru obodo Sukọt, ọ gwara ha okwu sị, “Ngwa leenụ Zeba na Zalmuna ndị unu kparịrị m maka ha, kwuo sị, ‘Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị ugbu a nke mere na anyị ga-enye ndị ikom gị ike gwụrụ achịcha?’ ” 16 O jidere ndị okenye obodo ahụ, were ogwu na ụga taa ndị ikom Sukọt ahụhụ ime ka ha mara ihe. 17 Ọ kwaturu ụlọ elu Peniel gbukwaa ndị ikom obodo ahụ niile. 18 Mgbe ahụ, ọ jụrụ Zeba na Zalmuna, “Ndị ikom dị aṅaa ka unu gburu na Taboa?”Ha zara sị ya, “Ha nwere ụdịdị ka gị onwe gị, onye ọbụla nwere ụdịdị dịka nwa eze.” 19 Gidiọn zaghachiri sị, “Ndị ahụ bụ ụmụnne m ndị ikom, ndị nke nne m mụrụ. Ugbu a, ONYENWE ANYỊ nʼonwe ya maara na a sị na unu egbughị ha, agaraghị m egbu unu.” 20 O chigharịrị gwa Jeta, ọkpara ya, sị ya, “Gbuo ha!” Ma Jeta amịpụtaghị mma, nʼihi na ọ bụ naanị nwokorobịa. Ọ tụrụ egwu igbu ha. 21 Zeba na Zalmuna, gwara Gidiọn okwu sị, “Jiri aka gị gbuo anyị. ‘A hụ dimkpa, a hụ ike ya.’ ” Nʼihi nke a, Gidiọn were aka ya gbuo ha, chịkọrọkwa ihe olu niile ha nyakwasịrị ịnyịnya kamel ha nʼolu. 22 Mgbe ahụ, ndị Izrel gwara Gidiọn sị ya, “Bịa ka ị bụrụ eze anyị! Gị na ụmụ gị ndị ikom, na ezinaụlọ gị niile, ga-abụ ndị ga-achị, nʼihi na ị gbapụtala anyị site nʼaka usuu ndị agha Midia.” 23 Ma Gidiọn gwara ha okwu sị, “Mụ onwe m na ụmụ m agaghị abụ eze unu, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke bụ eze unu.” 24 Ọ sịrị, “Enwere m otu arịrịọ m ga-arịọ unu. Onye ọbụla nʼime unu nye m ọlantị site nʼoke unu nwetara site nʼihe nkwata nʼagha.” (Ọ bụ omenaala ndị Ishmel niile iyi ọlantị ọlaedo.) 25 Ha jiri obi ụtọ kwenye, gbasaa akwa nʼala, tinyechaa ọlantị ha nʼime ya. Onye ọbụla nʼime ha mere nke a. 26 Ịdị arọ nke ọlantị ọlaedo ndị a bụ otu puku na narị shekel asaa, na-agụnyeghị ihe ịchọ mma ndị ọzọ, na ihe olu, na uwe odo odo ndị eze Midia na-eyi, na ihe olu dị nʼolu ịnyịnya kamel ha. 27 Gidiọn jiri ọlaedo ahụ niile kpụọ efọọd debe ya nʼOfra, nʼobodo nke aka ya. Ma mgbe na-adịghị anya, ụmụ Izrel niile malitere ịgbaso na ife ihe ahụ ofufe. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọọrọ Gidiọn na ezinaụlọ ya ihe ịma nʼọnya. 28 Otu a ka Midia si ghọọ ndị Izrel meriri emeri. Midia eweliteghị isi ya ọzọ. Nʼihi nke a, Izrel biri nʼudo iri afọ anọ, nʼụbọchị niile Gidiọn dị ndụ. 29 Jerub-Baal, nwa Joash laghachiri nʼụlọ nke aka ya, biri nʼebe ahụ. 30 Ọ mụtakwara iri ụmụ ndị ikom asaa, nʼihi na ọ lụrụ ọtụtụ ndị inyom. 31 O nwekwara iko nwanyị nʼobodo Shekem, onye mụtaara ya nwa nwoke aha ya bụ Abimelek. 32 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Gidiọn nwa Joash, nwụrụ, mgbe ọ kasịrị nka nke ukwu. E liri ya nʼili nna ya Joash nʼobodo Ofra, nʼala Abieza. 33 Ọ dịghị anya ka Gidiọn nwụsịrị, ụmụ Izrel laghachiri azụ bido ife chi Baal. Ha guzobere Baal-Berit ka ọ bụrụ chi ha. 34 Ma ụmụ Izrel echetaghị ONYENWE ANYỊ Chineke ha, onye napụtara ha site nʼaka ndị iro ha niile gbara ha gburugburu. 35 Ha ekwesighịkwa ntụkwasị obi nye ezinaụlọ Jerub-Baal (ya bụ Gidiọn) dịka ezi ihe niile o mere ha si dị.

In Other Versions

Judges 8 in the ANGEFD

Judges 8 in the ANTPNG2D

Judges 8 in the AS21

Judges 8 in the BAGH

Judges 8 in the BBPNG

Judges 8 in the BBT1E

Judges 8 in the BDS

Judges 8 in the BEV

Judges 8 in the BHAD

Judges 8 in the BIB

Judges 8 in the BLPT

Judges 8 in the BNT

Judges 8 in the BNTABOOT

Judges 8 in the BNTLV

Judges 8 in the BOATCB

Judges 8 in the BOATCB2

Judges 8 in the BOBCV

Judges 8 in the BOCNT

Judges 8 in the BOECS

Judges 8 in the BOGWICC

Judges 8 in the BOHCB

Judges 8 in the BOHCV

Judges 8 in the BOHLNT

Judges 8 in the BOHNTLTAL

Judges 8 in the BOILNTAP

Judges 8 in the BOITCV

Judges 8 in the BOKCV

Judges 8 in the BOKCV2

Judges 8 in the BOKHWOG

Judges 8 in the BOKSSV

Judges 8 in the BOLCB

Judges 8 in the BOLCB2

Judges 8 in the BOMCV

Judges 8 in the BONAV

Judges 8 in the BONCB

Judges 8 in the BONLT

Judges 8 in the BONUT2

Judges 8 in the BOPLNT

Judges 8 in the BOSCB

Judges 8 in the BOSNC

Judges 8 in the BOTLNT

Judges 8 in the BOVCB

Judges 8 in the BOYCB

Judges 8 in the BPBB

Judges 8 in the BPH

Judges 8 in the BSB

Judges 8 in the CCB

Judges 8 in the CUV

Judges 8 in the CUVS

Judges 8 in the DBT

Judges 8 in the DGDNT

Judges 8 in the DHNT

Judges 8 in the DNT

Judges 8 in the ELBE

Judges 8 in the EMTV

Judges 8 in the ESV

Judges 8 in the FBV

Judges 8 in the FEB

Judges 8 in the GGMNT

Judges 8 in the GNT

Judges 8 in the HARY

Judges 8 in the HNT

Judges 8 in the IRVA

Judges 8 in the IRVB

Judges 8 in the IRVG

Judges 8 in the IRVH

Judges 8 in the IRVK

Judges 8 in the IRVM

Judges 8 in the IRVM2

Judges 8 in the IRVO

Judges 8 in the IRVP

Judges 8 in the IRVT

Judges 8 in the IRVT2

Judges 8 in the IRVU

Judges 8 in the ISVN

Judges 8 in the JSNT

Judges 8 in the KAPI

Judges 8 in the KBT1ETNIK

Judges 8 in the KBV

Judges 8 in the KJV

Judges 8 in the KNFD

Judges 8 in the LBA

Judges 8 in the LBLA

Judges 8 in the LNT

Judges 8 in the LSV

Judges 8 in the MAAL

Judges 8 in the MBV

Judges 8 in the MBV2

Judges 8 in the MHNT

Judges 8 in the MKNFD

Judges 8 in the MNG

Judges 8 in the MNT

Judges 8 in the MNT2

Judges 8 in the MRS1T

Judges 8 in the NAA

Judges 8 in the NASB

Judges 8 in the NBLA

Judges 8 in the NBS

Judges 8 in the NBVTP

Judges 8 in the NET2

Judges 8 in the NIV11

Judges 8 in the NNT

Judges 8 in the NNT2

Judges 8 in the NNT3

Judges 8 in the PDDPT

Judges 8 in the PFNT

Judges 8 in the RMNT

Judges 8 in the SBIAS

Judges 8 in the SBIBS

Judges 8 in the SBIBS2

Judges 8 in the SBICS

Judges 8 in the SBIDS

Judges 8 in the SBIGS

Judges 8 in the SBIHS

Judges 8 in the SBIIS

Judges 8 in the SBIIS2

Judges 8 in the SBIIS3

Judges 8 in the SBIKS

Judges 8 in the SBIKS2

Judges 8 in the SBIMS

Judges 8 in the SBIOS

Judges 8 in the SBIPS

Judges 8 in the SBISS

Judges 8 in the SBITS

Judges 8 in the SBITS2

Judges 8 in the SBITS3

Judges 8 in the SBITS4

Judges 8 in the SBIUS

Judges 8 in the SBIVS

Judges 8 in the SBT

Judges 8 in the SBT1E

Judges 8 in the SCHL

Judges 8 in the SNT

Judges 8 in the SUSU

Judges 8 in the SUSU2

Judges 8 in the SYNO

Judges 8 in the TBIAOTANT

Judges 8 in the TBT1E

Judges 8 in the TBT1E2

Judges 8 in the TFTIP

Judges 8 in the TFTU

Judges 8 in the TGNTATF3T

Judges 8 in the THAI

Judges 8 in the TNFD

Judges 8 in the TNT

Judges 8 in the TNTIK

Judges 8 in the TNTIL

Judges 8 in the TNTIN

Judges 8 in the TNTIP

Judges 8 in the TNTIZ

Judges 8 in the TOMA

Judges 8 in the TTENT

Judges 8 in the UBG

Judges 8 in the UGV

Judges 8 in the UGV2

Judges 8 in the UGV3

Judges 8 in the VBL

Judges 8 in the VDCC

Judges 8 in the YALU

Judges 8 in the YAPE

Judges 8 in the YBVTP

Judges 8 in the ZBP