Jeremiah 11 (BOICB)
1 Nke a bụ okwu nke sị nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ bịakwute Jeremaya, 2 “Gee ntị nʼihe niile metụtara ọgbụgba ndụ a, gwakwa ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem. 3 Gwa ha na nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwuru, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-adịghị edebe ihe niile banyere ọgbụgba ndụ a, 4 bụ nke m nyere nna nna unu ha, mgbe m si nʼIjipt, site nʼoke ọkụ e ji agbaze igwe, kpọpụta ha.’ Asịrị m, Ruberenụ m isi, meekwa ihe niile m nyere unu nʼiwu, unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụkwa Chineke unu. 5 ‘Mgbe ahụ, aga m emezu iyi ahụ m ṅụụrụ nna nna unu ha, inye ha ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,’ ya bụ, ala ahụ unu bi nʼime ya taa.”Azara m sị, “Amen, ONYENWE ANYỊ.” 6 ONYENWE ANYỊ sịrị m, “Kpọsaa okwu ndị a nʼobodo Juda niile, na nʼokporoụzọ Jerusalem niile, ‘Geenụ ntị nʼiwu nke ọgbụgba ndụ ahụ, ma mezuo ihe o kwuru. 7 Site nʼoge ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha ruo taa, adọọla m unu aka na ntị mgbe mgbe sị, “Ruberenụ m isi.” 8 Ma ha jụrụ ige ntị. Ha akpọkwaghị okwu m mkpa dịrị ha. Kama ha jegharịrị nʼisiike nke obi ọjọọ ha. Ọ bụ nke a mere m ji mee ka ọbụbụ ọnụ niile nke ya na ọgbụgba ndụ ahụ so bịakwasị ha, dịka m buru ụzọ nye nʼiwu, ma ihe ndị a emeghị ka ha jezie ije.’ ” 9 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara m sị, “Achọpụtala na-enwere njikọta na ịgba izu mmegide nʼetiti ndị Juda na ndị bi na Jerusalem. 10 Ha alaghachila azụ nʼụdị mmehie ahụ nna nna ha mehiere, bụ ndị ahụ jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha agbasoola chi ndị ọzọ na-efe ha. Ụlọ Izrel na ụlọ Juda adịghị edebekwa ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara. 11 Nʼihi ya, nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Aga m eme ka mbibi, nke ha na-enweghị ike ịgbanarị, bịakwasị ha. Ọ bụrụkwa na ha akpọkuo m agaghị m aṅa ntị. 12 Ndị obodo Juda na ndị bi na Jerusalem ga-apụ kpọkuo chi ndị ahụ niile ha na-achụrụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ma chi ndị a agaghị enyere ha aka mgbe mbibi a bịakwasịrị ha. 13 Gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ Baal aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na Jerusalem.’ 14 “Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha. 15 “Gịnị ka onye m hụrụ nʼanya na-eme nʼime ụlọnsọ ukwuu m,mgbe ya na ọtụtụ ndị ọzọ na-ejikọta onwe ha nʼotu ịtụ atụmatụ ihe ọjọọ?Anụ e doro nsọ apụghị ime ka ahụhụ unu kwesiri ịnata hapụ ịbịakwasị unu.A sị na o si otu a dịrị, mgbe ahụ, unu pụrụ ịṅụrị ọṅụmgbe unu na-eme ihe ọjọọ unu.” 16 Aha ONYENWE ANYỊ nyere gị bụ Osisi oliv dị ndụ,nke na-amị mkpụrụ mara mma.Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzoka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ;alaka gị ga-agbajisikwa. 17 ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị Izrel na Juda emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal. 18 Ọ bụ ONYENWE ANYỊ kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ. 19 Mụ onwe m dị ka nwa atụrụ dị nwayọọ nke e du na-aga ebe a ga-egbu ya. Ma aghọtaghị m na ọ bụ m ka ha zubererị nzube ọjọọ megide. Ha kwuru sị,“Bịanụ ka anyị bibie osisi a na mkpụrụ ya.Ka anyị site nʼala ndị dị ndụ wezuga ya,ka a hapụ ichetakwa aha ya ọzọ” 20 Ma gị, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi,na-anwapụtakwa obi mmadụ na mmụọ ya.Mee ka m hụ mgbe ị ga-abọ ọbọ megide ha,nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m na-etinye okwu a metụtara m. 21 Ya mere, nke a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu banyere ndị Anatot ahụ na-achọ ịnapụ gị ndụ gị, ndị ahụ na-asị gị, “Ebukwala amụma site nʼaha ONYENWE ANYỊ ka ị ghara ịnwụ nʼaka anyị.” 22 Nʼihi nke a ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, sị, “Aga m ata ha ahụhụ. Ụmụ okorobịa ha ga-anwụ site na mma agha, ụnwụ ga-egbukwa ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. 23 O nweghị ndị ga-afọdụ ndụ nʼime ha nʼihi na a ga-eme ka oke mbibi bịakwasị ndị Anatot nʼafọ ahụ m ga-ata ha ahụhụ.”
In Other Versions
Jeremiah 11 in the ANGEFD
Jeremiah 11 in the ANTPNG2D
Jeremiah 11 in the AS21
Jeremiah 11 in the BAGH
Jeremiah 11 in the BBPNG
Jeremiah 11 in the BBT1E
Jeremiah 11 in the BDS
Jeremiah 11 in the BEV
Jeremiah 11 in the BHAD
Jeremiah 11 in the BIB
Jeremiah 11 in the BLPT
Jeremiah 11 in the BNT
Jeremiah 11 in the BNTABOOT
Jeremiah 11 in the BNTLV
Jeremiah 11 in the BOATCB
Jeremiah 11 in the BOATCB2
Jeremiah 11 in the BOBCV
Jeremiah 11 in the BOCNT
Jeremiah 11 in the BOECS
Jeremiah 11 in the BOGWICC
Jeremiah 11 in the BOHCB
Jeremiah 11 in the BOHCV
Jeremiah 11 in the BOHLNT
Jeremiah 11 in the BOHNTLTAL
Jeremiah 11 in the BOILNTAP
Jeremiah 11 in the BOITCV
Jeremiah 11 in the BOKCV
Jeremiah 11 in the BOKCV2
Jeremiah 11 in the BOKHWOG
Jeremiah 11 in the BOKSSV
Jeremiah 11 in the BOLCB
Jeremiah 11 in the BOLCB2
Jeremiah 11 in the BOMCV
Jeremiah 11 in the BONAV
Jeremiah 11 in the BONCB
Jeremiah 11 in the BONLT
Jeremiah 11 in the BONUT2
Jeremiah 11 in the BOPLNT
Jeremiah 11 in the BOSCB
Jeremiah 11 in the BOSNC
Jeremiah 11 in the BOTLNT
Jeremiah 11 in the BOVCB
Jeremiah 11 in the BOYCB
Jeremiah 11 in the BPBB
Jeremiah 11 in the BPH
Jeremiah 11 in the BSB
Jeremiah 11 in the CCB
Jeremiah 11 in the CUV
Jeremiah 11 in the CUVS
Jeremiah 11 in the DBT
Jeremiah 11 in the DGDNT
Jeremiah 11 in the DHNT
Jeremiah 11 in the DNT
Jeremiah 11 in the ELBE
Jeremiah 11 in the EMTV
Jeremiah 11 in the ESV
Jeremiah 11 in the FBV
Jeremiah 11 in the FEB
Jeremiah 11 in the GGMNT
Jeremiah 11 in the GNT
Jeremiah 11 in the HARY
Jeremiah 11 in the HNT
Jeremiah 11 in the IRVA
Jeremiah 11 in the IRVB
Jeremiah 11 in the IRVG
Jeremiah 11 in the IRVH
Jeremiah 11 in the IRVK
Jeremiah 11 in the IRVM
Jeremiah 11 in the IRVM2
Jeremiah 11 in the IRVO
Jeremiah 11 in the IRVP
Jeremiah 11 in the IRVT
Jeremiah 11 in the IRVT2
Jeremiah 11 in the IRVU
Jeremiah 11 in the ISVN
Jeremiah 11 in the JSNT
Jeremiah 11 in the KAPI
Jeremiah 11 in the KBT1ETNIK
Jeremiah 11 in the KBV
Jeremiah 11 in the KJV
Jeremiah 11 in the KNFD
Jeremiah 11 in the LBA
Jeremiah 11 in the LBLA
Jeremiah 11 in the LNT
Jeremiah 11 in the LSV
Jeremiah 11 in the MAAL
Jeremiah 11 in the MBV
Jeremiah 11 in the MBV2
Jeremiah 11 in the MHNT
Jeremiah 11 in the MKNFD
Jeremiah 11 in the MNG
Jeremiah 11 in the MNT
Jeremiah 11 in the MNT2
Jeremiah 11 in the MRS1T
Jeremiah 11 in the NAA
Jeremiah 11 in the NASB
Jeremiah 11 in the NBLA
Jeremiah 11 in the NBS
Jeremiah 11 in the NBVTP
Jeremiah 11 in the NET2
Jeremiah 11 in the NIV11
Jeremiah 11 in the NNT
Jeremiah 11 in the NNT2
Jeremiah 11 in the NNT3
Jeremiah 11 in the PDDPT
Jeremiah 11 in the PFNT
Jeremiah 11 in the RMNT
Jeremiah 11 in the SBIAS
Jeremiah 11 in the SBIBS
Jeremiah 11 in the SBIBS2
Jeremiah 11 in the SBICS
Jeremiah 11 in the SBIDS
Jeremiah 11 in the SBIGS
Jeremiah 11 in the SBIHS
Jeremiah 11 in the SBIIS
Jeremiah 11 in the SBIIS2
Jeremiah 11 in the SBIIS3
Jeremiah 11 in the SBIKS
Jeremiah 11 in the SBIKS2
Jeremiah 11 in the SBIMS
Jeremiah 11 in the SBIOS
Jeremiah 11 in the SBIPS
Jeremiah 11 in the SBISS
Jeremiah 11 in the SBITS
Jeremiah 11 in the SBITS2
Jeremiah 11 in the SBITS3
Jeremiah 11 in the SBITS4
Jeremiah 11 in the SBIUS
Jeremiah 11 in the SBIVS
Jeremiah 11 in the SBT
Jeremiah 11 in the SBT1E
Jeremiah 11 in the SCHL
Jeremiah 11 in the SNT
Jeremiah 11 in the SUSU
Jeremiah 11 in the SUSU2
Jeremiah 11 in the SYNO
Jeremiah 11 in the TBIAOTANT
Jeremiah 11 in the TBT1E
Jeremiah 11 in the TBT1E2
Jeremiah 11 in the TFTIP
Jeremiah 11 in the TFTU
Jeremiah 11 in the TGNTATF3T
Jeremiah 11 in the THAI
Jeremiah 11 in the TNFD
Jeremiah 11 in the TNT
Jeremiah 11 in the TNTIK
Jeremiah 11 in the TNTIL
Jeremiah 11 in the TNTIN
Jeremiah 11 in the TNTIP
Jeremiah 11 in the TNTIZ
Jeremiah 11 in the TOMA
Jeremiah 11 in the TTENT
Jeremiah 11 in the UBG
Jeremiah 11 in the UGV
Jeremiah 11 in the UGV2
Jeremiah 11 in the UGV3
Jeremiah 11 in the VBL
Jeremiah 11 in the VDCC
Jeremiah 11 in the YALU
Jeremiah 11 in the YAPE
Jeremiah 11 in the YBVTP
Jeremiah 11 in the ZBP