Job 27 (BOICB)

1 Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị: 2 “Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi,Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi. 3 Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m,mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m, 4 egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ,ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ. 5 Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi;ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m. 6 Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya;o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m. 7 “Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume,ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu. 8 Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya,mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya? 9 Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa yamgbe nsogbu dakwasịrị ya? 10 Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile?Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile? 11 “Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke;agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile. 12 Unu onwe unu ahụla ihe ndị a,gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi? 13 “Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume,nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. 14 Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha;ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha. 15 Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ;ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha. 16 Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu,ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ, 17 ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha,ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya. 18 Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla,dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru. 19 Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ;mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola. 20 Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri;oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị. 21 Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ;ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya. 22 Ọ na-atụfu ya na-enweghị eberemgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya. 23 Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo,were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”

In Other Versions

Job 27 in the ANGEFD

Job 27 in the ANTPNG2D

Job 27 in the AS21

Job 27 in the BAGH

Job 27 in the BBPNG

Job 27 in the BBT1E

Job 27 in the BDS

Job 27 in the BEV

Job 27 in the BHAD

Job 27 in the BIB

Job 27 in the BLPT

Job 27 in the BNT

Job 27 in the BNTABOOT

Job 27 in the BNTLV

Job 27 in the BOATCB

Job 27 in the BOATCB2

Job 27 in the BOBCV

Job 27 in the BOCNT

Job 27 in the BOECS

Job 27 in the BOGWICC

Job 27 in the BOHCB

Job 27 in the BOHCV

Job 27 in the BOHLNT

Job 27 in the BOHNTLTAL

Job 27 in the BOILNTAP

Job 27 in the BOITCV

Job 27 in the BOKCV

Job 27 in the BOKCV2

Job 27 in the BOKHWOG

Job 27 in the BOKSSV

Job 27 in the BOLCB

Job 27 in the BOLCB2

Job 27 in the BOMCV

Job 27 in the BONAV

Job 27 in the BONCB

Job 27 in the BONLT

Job 27 in the BONUT2

Job 27 in the BOPLNT

Job 27 in the BOSCB

Job 27 in the BOSNC

Job 27 in the BOTLNT

Job 27 in the BOVCB

Job 27 in the BOYCB

Job 27 in the BPBB

Job 27 in the BPH

Job 27 in the BSB

Job 27 in the CCB

Job 27 in the CUV

Job 27 in the CUVS

Job 27 in the DBT

Job 27 in the DGDNT

Job 27 in the DHNT

Job 27 in the DNT

Job 27 in the ELBE

Job 27 in the EMTV

Job 27 in the ESV

Job 27 in the FBV

Job 27 in the FEB

Job 27 in the GGMNT

Job 27 in the GNT

Job 27 in the HARY

Job 27 in the HNT

Job 27 in the IRVA

Job 27 in the IRVB

Job 27 in the IRVG

Job 27 in the IRVH

Job 27 in the IRVK

Job 27 in the IRVM

Job 27 in the IRVM2

Job 27 in the IRVO

Job 27 in the IRVP

Job 27 in the IRVT

Job 27 in the IRVT2

Job 27 in the IRVU

Job 27 in the ISVN

Job 27 in the JSNT

Job 27 in the KAPI

Job 27 in the KBT1ETNIK

Job 27 in the KBV

Job 27 in the KJV

Job 27 in the KNFD

Job 27 in the LBA

Job 27 in the LBLA

Job 27 in the LNT

Job 27 in the LSV

Job 27 in the MAAL

Job 27 in the MBV

Job 27 in the MBV2

Job 27 in the MHNT

Job 27 in the MKNFD

Job 27 in the MNG

Job 27 in the MNT

Job 27 in the MNT2

Job 27 in the MRS1T

Job 27 in the NAA

Job 27 in the NASB

Job 27 in the NBLA

Job 27 in the NBS

Job 27 in the NBVTP

Job 27 in the NET2

Job 27 in the NIV11

Job 27 in the NNT

Job 27 in the NNT2

Job 27 in the NNT3

Job 27 in the PDDPT

Job 27 in the PFNT

Job 27 in the RMNT

Job 27 in the SBIAS

Job 27 in the SBIBS

Job 27 in the SBIBS2

Job 27 in the SBICS

Job 27 in the SBIDS

Job 27 in the SBIGS

Job 27 in the SBIHS

Job 27 in the SBIIS

Job 27 in the SBIIS2

Job 27 in the SBIIS3

Job 27 in the SBIKS

Job 27 in the SBIKS2

Job 27 in the SBIMS

Job 27 in the SBIOS

Job 27 in the SBIPS

Job 27 in the SBISS

Job 27 in the SBITS

Job 27 in the SBITS2

Job 27 in the SBITS3

Job 27 in the SBITS4

Job 27 in the SBIUS

Job 27 in the SBIVS

Job 27 in the SBT

Job 27 in the SBT1E

Job 27 in the SCHL

Job 27 in the SNT

Job 27 in the SUSU

Job 27 in the SUSU2

Job 27 in the SYNO

Job 27 in the TBIAOTANT

Job 27 in the TBT1E

Job 27 in the TBT1E2

Job 27 in the TFTIP

Job 27 in the TFTU

Job 27 in the TGNTATF3T

Job 27 in the THAI

Job 27 in the TNFD

Job 27 in the TNT

Job 27 in the TNTIK

Job 27 in the TNTIL

Job 27 in the TNTIN

Job 27 in the TNTIP

Job 27 in the TNTIZ

Job 27 in the TOMA

Job 27 in the TTENT

Job 27 in the UBG

Job 27 in the UGV

Job 27 in the UGV2

Job 27 in the UGV3

Job 27 in the VBL

Job 27 in the VDCC

Job 27 in the YALU

Job 27 in the YAPE

Job 27 in the YBVTP

Job 27 in the ZBP