Job 42 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Job zara ONYENWE ANYỊ sị: 2 “Amara m na ị pụrụ ime ihe niile;ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa. 3 Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị,ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata. 4 “Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu;m ga-ajụ gị ajụjụ,gị onwe gị ga-azakwa m.’ 5 Ntị m nụrụ ihe banyere gịma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị. 6 Ya mere, ana m akpọ onwe m asị,na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.” 7 Mgbe ONYENWE ANYỊ gwasịrị Job okwu, ọ tụgharịrị gwa Elifaz onye Teman okwu sị ya, “Ana m ewesa gị na ndị enyi gị abụọ iwe, nʼihi na ihe unu kwuru banyere m ezighị ezi dịka nke ohu m Job kwuru. 8 Ugbu a, werenụ oke ehi asaa na ebule asaa, jekwuru ohu m bụ Job ka o jiri ha chụọrọ unu aja nsure ọkụ, ohu m bụ Job ga-ekpekwara unu ekpere. Aga m anabatakwa ekpere ọ ga-ekpe nʼihi unu. Agaghị m alakwa unu nʼiyi nʼihi okwu nzuzu unu. Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m dịka ohu m Job si kwuo.” 9 Ya mere, Elifaz onye Teman, na Bildad, onye Shu, na Zofa, onye Naaman mere dịka ONYENWE ANYỊ si nye ha nʼiwu. ONYENWE ANYỊ nabatakwara ekpere nke Job kpere nʼihi ndị enyi ya. 10 Mgbe Job kpesịrị ekpere maka ndị enyi ya, ONYENWE ANYỊ mekwara ka ọ baa ụba ọzọ. O nyekwara ya okpukpo abụọ nke ihe niile o nwere na mbụ. 11 Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom, na ndị enyi ya niile bịara soro ya rie oriri nʼụlọ ya, na-akasị ya obi nʼihi iru ụjụ ya niile. Ha kasịkwara ya obi nʼihi ọnwụnwa niile ONYENWE ANYỊ mere ka ọ bịakwasị ya. Ha niile nʼotu nʼotu nyere ya onyinye ọlaọcha na mgbaaka ọlaedo. 12 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu. 13 Chineke mekwara ka ọ mụta ụmụ ndị ikom asaa, na ụmụ ndị inyom atọ ọzọ. 14 Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk. 15 Nʼala ahụ niile, o nweghị ụmụ agbọghọ mara mma dịka ụmụ ndị inyom Job ndị a. Job mekwara ka ha bụrụ ndị ga-eso ụmụ ya ndị ikom keta oke nʼihe niile o nwere. 16 Job nọgidekwara ndụ narị afọ na iri afọ anọ ọzọ. Ọ hụrụ ụmụ ya, na ụmụ ha ruo ọgbọ nke anọ. 17 Job nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.

In Other Versions

Job 42 in the ANGEFD

Job 42 in the ANTPNG2D

Job 42 in the AS21

Job 42 in the BAGH

Job 42 in the BBPNG

Job 42 in the BBT1E

Job 42 in the BDS

Job 42 in the BEV

Job 42 in the BHAD

Job 42 in the BIB

Job 42 in the BLPT

Job 42 in the BNT

Job 42 in the BNTABOOT

Job 42 in the BNTLV

Job 42 in the BOATCB

Job 42 in the BOATCB2

Job 42 in the BOBCV

Job 42 in the BOCNT

Job 42 in the BOECS

Job 42 in the BOGWICC

Job 42 in the BOHCB

Job 42 in the BOHCV

Job 42 in the BOHLNT

Job 42 in the BOHNTLTAL

Job 42 in the BOILNTAP

Job 42 in the BOITCV

Job 42 in the BOKCV

Job 42 in the BOKCV2

Job 42 in the BOKHWOG

Job 42 in the BOKSSV

Job 42 in the BOLCB

Job 42 in the BOLCB2

Job 42 in the BOMCV

Job 42 in the BONAV

Job 42 in the BONCB

Job 42 in the BONLT

Job 42 in the BONUT2

Job 42 in the BOPLNT

Job 42 in the BOSCB

Job 42 in the BOSNC

Job 42 in the BOTLNT

Job 42 in the BOVCB

Job 42 in the BOYCB

Job 42 in the BPBB

Job 42 in the BPH

Job 42 in the BSB

Job 42 in the CCB

Job 42 in the CUV

Job 42 in the CUVS

Job 42 in the DBT

Job 42 in the DGDNT

Job 42 in the DHNT

Job 42 in the DNT

Job 42 in the ELBE

Job 42 in the EMTV

Job 42 in the ESV

Job 42 in the FBV

Job 42 in the FEB

Job 42 in the GGMNT

Job 42 in the GNT

Job 42 in the HARY

Job 42 in the HNT

Job 42 in the IRVA

Job 42 in the IRVB

Job 42 in the IRVG

Job 42 in the IRVH

Job 42 in the IRVK

Job 42 in the IRVM

Job 42 in the IRVM2

Job 42 in the IRVO

Job 42 in the IRVP

Job 42 in the IRVT

Job 42 in the IRVT2

Job 42 in the IRVU

Job 42 in the ISVN

Job 42 in the JSNT

Job 42 in the KAPI

Job 42 in the KBT1ETNIK

Job 42 in the KBV

Job 42 in the KJV

Job 42 in the KNFD

Job 42 in the LBA

Job 42 in the LBLA

Job 42 in the LNT

Job 42 in the LSV

Job 42 in the MAAL

Job 42 in the MBV

Job 42 in the MBV2

Job 42 in the MHNT

Job 42 in the MKNFD

Job 42 in the MNG

Job 42 in the MNT

Job 42 in the MNT2

Job 42 in the MRS1T

Job 42 in the NAA

Job 42 in the NASB

Job 42 in the NBLA

Job 42 in the NBS

Job 42 in the NBVTP

Job 42 in the NET2

Job 42 in the NIV11

Job 42 in the NNT

Job 42 in the NNT2

Job 42 in the NNT3

Job 42 in the PDDPT

Job 42 in the PFNT

Job 42 in the RMNT

Job 42 in the SBIAS

Job 42 in the SBIBS

Job 42 in the SBIBS2

Job 42 in the SBICS

Job 42 in the SBIDS

Job 42 in the SBIGS

Job 42 in the SBIHS

Job 42 in the SBIIS

Job 42 in the SBIIS2

Job 42 in the SBIIS3

Job 42 in the SBIKS

Job 42 in the SBIKS2

Job 42 in the SBIMS

Job 42 in the SBIOS

Job 42 in the SBIPS

Job 42 in the SBISS

Job 42 in the SBITS

Job 42 in the SBITS2

Job 42 in the SBITS3

Job 42 in the SBITS4

Job 42 in the SBIUS

Job 42 in the SBIVS

Job 42 in the SBT

Job 42 in the SBT1E

Job 42 in the SCHL

Job 42 in the SNT

Job 42 in the SUSU

Job 42 in the SUSU2

Job 42 in the SYNO

Job 42 in the TBIAOTANT

Job 42 in the TBT1E

Job 42 in the TBT1E2

Job 42 in the TFTIP

Job 42 in the TFTU

Job 42 in the TGNTATF3T

Job 42 in the THAI

Job 42 in the TNFD

Job 42 in the TNT

Job 42 in the TNTIK

Job 42 in the TNTIL

Job 42 in the TNTIN

Job 42 in the TNTIP

Job 42 in the TNTIZ

Job 42 in the TOMA

Job 42 in the TTENT

Job 42 in the UBG

Job 42 in the UGV

Job 42 in the UGV2

Job 42 in the UGV3

Job 42 in the VBL

Job 42 in the VDCC

Job 42 in the YALU

Job 42 in the YAPE

Job 42 in the YBVTP

Job 42 in the ZBP