Job 8 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị: 2 “Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a?Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike. 3 Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ? 4 Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya,o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha. 5 Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike,rịọ Onye pụrụ ime ihe niile, 6 ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi,ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gịweghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị. 7 Ọ bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala,ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu. 8 “Jụọ ọgbọ ndị gara agama chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara. 9 Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara.Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo. 10 Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe?Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu? 11 Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị?Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị? 12 Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha,ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ. 13 Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke,otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi. 14 Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa;ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide. 15 Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi;ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa. 16 Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị,nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ. 17 Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ,ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a. 18 Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya,ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’ 19 Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ,site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa. 20 “Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ,maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume. 21 Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị.Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta. 22 Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe,ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa.”

In Other Versions

Job 8 in the ANGEFD

Job 8 in the ANTPNG2D

Job 8 in the AS21

Job 8 in the BAGH

Job 8 in the BBPNG

Job 8 in the BBT1E

Job 8 in the BDS

Job 8 in the BEV

Job 8 in the BHAD

Job 8 in the BIB

Job 8 in the BLPT

Job 8 in the BNT

Job 8 in the BNTABOOT

Job 8 in the BNTLV

Job 8 in the BOATCB

Job 8 in the BOATCB2

Job 8 in the BOBCV

Job 8 in the BOCNT

Job 8 in the BOECS

Job 8 in the BOGWICC

Job 8 in the BOHCB

Job 8 in the BOHCV

Job 8 in the BOHLNT

Job 8 in the BOHNTLTAL

Job 8 in the BOILNTAP

Job 8 in the BOITCV

Job 8 in the BOKCV

Job 8 in the BOKCV2

Job 8 in the BOKHWOG

Job 8 in the BOKSSV

Job 8 in the BOLCB

Job 8 in the BOLCB2

Job 8 in the BOMCV

Job 8 in the BONAV

Job 8 in the BONCB

Job 8 in the BONLT

Job 8 in the BONUT2

Job 8 in the BOPLNT

Job 8 in the BOSCB

Job 8 in the BOSNC

Job 8 in the BOTLNT

Job 8 in the BOVCB

Job 8 in the BOYCB

Job 8 in the BPBB

Job 8 in the BPH

Job 8 in the BSB

Job 8 in the CCB

Job 8 in the CUV

Job 8 in the CUVS

Job 8 in the DBT

Job 8 in the DGDNT

Job 8 in the DHNT

Job 8 in the DNT

Job 8 in the ELBE

Job 8 in the EMTV

Job 8 in the ESV

Job 8 in the FBV

Job 8 in the FEB

Job 8 in the GGMNT

Job 8 in the GNT

Job 8 in the HARY

Job 8 in the HNT

Job 8 in the IRVA

Job 8 in the IRVB

Job 8 in the IRVG

Job 8 in the IRVH

Job 8 in the IRVK

Job 8 in the IRVM

Job 8 in the IRVM2

Job 8 in the IRVO

Job 8 in the IRVP

Job 8 in the IRVT

Job 8 in the IRVT2

Job 8 in the IRVU

Job 8 in the ISVN

Job 8 in the JSNT

Job 8 in the KAPI

Job 8 in the KBT1ETNIK

Job 8 in the KBV

Job 8 in the KJV

Job 8 in the KNFD

Job 8 in the LBA

Job 8 in the LBLA

Job 8 in the LNT

Job 8 in the LSV

Job 8 in the MAAL

Job 8 in the MBV

Job 8 in the MBV2

Job 8 in the MHNT

Job 8 in the MKNFD

Job 8 in the MNG

Job 8 in the MNT

Job 8 in the MNT2

Job 8 in the MRS1T

Job 8 in the NAA

Job 8 in the NASB

Job 8 in the NBLA

Job 8 in the NBS

Job 8 in the NBVTP

Job 8 in the NET2

Job 8 in the NIV11

Job 8 in the NNT

Job 8 in the NNT2

Job 8 in the NNT3

Job 8 in the PDDPT

Job 8 in the PFNT

Job 8 in the RMNT

Job 8 in the SBIAS

Job 8 in the SBIBS

Job 8 in the SBIBS2

Job 8 in the SBICS

Job 8 in the SBIDS

Job 8 in the SBIGS

Job 8 in the SBIHS

Job 8 in the SBIIS

Job 8 in the SBIIS2

Job 8 in the SBIIS3

Job 8 in the SBIKS

Job 8 in the SBIKS2

Job 8 in the SBIMS

Job 8 in the SBIOS

Job 8 in the SBIPS

Job 8 in the SBISS

Job 8 in the SBITS

Job 8 in the SBITS2

Job 8 in the SBITS3

Job 8 in the SBITS4

Job 8 in the SBIUS

Job 8 in the SBIVS

Job 8 in the SBT

Job 8 in the SBT1E

Job 8 in the SCHL

Job 8 in the SNT

Job 8 in the SUSU

Job 8 in the SUSU2

Job 8 in the SYNO

Job 8 in the TBIAOTANT

Job 8 in the TBT1E

Job 8 in the TBT1E2

Job 8 in the TFTIP

Job 8 in the TFTU

Job 8 in the TGNTATF3T

Job 8 in the THAI

Job 8 in the TNFD

Job 8 in the TNT

Job 8 in the TNTIK

Job 8 in the TNTIL

Job 8 in the TNTIN

Job 8 in the TNTIP

Job 8 in the TNTIZ

Job 8 in the TOMA

Job 8 in the TTENT

Job 8 in the UBG

Job 8 in the UGV

Job 8 in the UGV2

Job 8 in the UGV3

Job 8 in the VBL

Job 8 in the VDCC

Job 8 in the YALU

Job 8 in the YAPE

Job 8 in the YBVTP

Job 8 in the ZBP