Joshua 21 (BOICB)

1 Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel, 2 na Shaịlo, nʼime ala Kenan, sị ha, “ONYENWE ANYỊ nyere iwu site nʼaka Mosis ka enye anyị obodo ụfọdụ ebe anyị ga-ebi, na ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.” 3 Nʼihi nke a, dịka iwu ONYENWE ANYỊ si dị, ụmụ Izrel sitere nʼihe nketa ha nye ndị Livayị obodo ụfọdụ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. 4 Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja. 5 Ma ndị fọdụrụ nʼụmụ Kohat ka e nyere obodo iri site nʼobodo nke ikwu ndị ebo Ifrem, na Dan, na ọkara ebo Manase. 6 Ụmụ Geshọn nwetara obodo iri na atọ site nʼife nza. Obodo ha nwetara dị na Bashan. Ha sikwa nʼala ndị ikwu ebo Isaka na Asha, na Naftalị, na ọkara ebo Manase nweta oke ahụ. 7 Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị ketara obodo iri na abụọ site nʼala ndị ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn. 8 Ya mere, ụmụ Izrel mezuru iwu niile ONYENWE ANYỊ nyere Mosis site nʼikenye ndị Livayị obodo ha ga-ebi, nakwa ebe anụ ụlọ ha ga-ata nri. 9 Ha sitere nʼebo Juda na Simiọn, kepụta obodo ndị a akpọrọ aha 10 kenye ndị ikwu Kohat, ndị bụ ụmụ ụmụ Erọn, bụrụkwa ụmụ ụmụ Livayị. Ọ bụ ha ka e bụ ụzọ kenye ihe nketa site nʼife nza. 11 E kenyere ha obodo Kiriat Aaba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Obodo a dị nʼala ugwu ugwu Juda, ya na ala gbara ya gburugburu ka ọ bụrụ ebe ịta nri anụ ụlọ. (Aaba bụ nna nna ndị Anak.) 12 Ma eburularị ụzọ nye Kaleb nwa Jefune obodo ukwu na obodo nta niile, na ala ubi niile dị nʼakụkụ ya ka ọ bụrụ ihe nketa ya. 13 Ya mere, ụmụ ụmụ Erọn, onye nchụaja, ka e kenyere obodo Hebrọn, nke bụkwa obodo mgbaba, kenyekwa ha obodo ndị a: Libna, 14 Jatịa, Eshtemoa, 15 Họlọn, Debịa, 16 Ain, Juta na Bet-Shemesh. E nyekwara ha ala niile gbara obodo ndị a gburugburu ka ọ bụrụ ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Ya mere, ọ bụ obodo itoolu ka e si nʼala ebo Juda na Simiọn kenye ha. 17 Ebo Benjamin nyere ha obodo anọ ndị a,Gibiọn, Geba, 18 Anatot, Almon na ala dị ya gburugburu ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri, bụ obodo anọ. 19 Ya mere, obodo niile e nyere ndị nchụaja, ụmụ ụmụ Erọn dị iri na atọ, tinyere ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. 20 Ụmụ Kohat ndị fọdụrụ, ndị agbụrụ Livayị ka e kenyere obodo anọ ndị a site nʼaka ebo Ifrem. 21 E sitere nʼala ugwu ugwu Ifrem nye ha:Shekem, nke bụ obodo mgbaba na Gaza, 22 Kibzaim na Bet-Horon, tinyere ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ. 23 Ha sitere nʼala ndị ebo Dan keta obodo anọ ndị a:Elteke na Gibeton, 24 Aijalon na Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ. 25 Ọkara ebo Manase nyere ha obodo abụọ,Teanak, Gat Rimọn na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha. 26 Ya mere, obodo niile na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ e nyere ndị fọdụrụ nʼikwu Kohat dị iri. 27 Ụmụ Geshọn, ndị agbụrụ Livayị, ketara obodo abụọ ndị a, ya na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.Ọkara ebo Manase nyere:Golan, nʼime Bashan, nke bụ obodo mgbaba, na Be Eshtera. 28 Ebo Isaka nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ,Kishiọn, Daberat, 29 Jamut na En-Ganim, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ. 30 Ebo Asha nyekwara ha obodo anọ. Ha bụ,Mishal, Abdon, 31 Helkat na Rehob, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ. 32 Ebo Naftalị nyere ha obodo atọ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Obodo ndị a bụ,Kedesh, nʼime Galili, nke bụkwa obodo mgbaba, Hamot Doa na Katan. 33 Obodo iri na atọ, na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ka e nyere ikwu Geshọn. 34 Ndị ikwu Merari, bụ ụmụ ụmụ Livayị fọdụrụ nwetara site nʼaka:Ebo Zebụlọn,Jokneam, Kata, 35 Dimna na Nahalal, obodo anọ tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. 36 Ebo Ruben nyere ha obodo anọ:Beza, Jahaz, 37 Kedemot, Mefaat na ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ kpaa nri. 38 Ebo Gad nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ,Ramọt, nʼime Gilead nke bụ obodo mgbaba, Mahanaim, 39 Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ. 40 Ọnụọgụgụ obodo niile e kenyere agbụrụ Merari bụ obodo iri na abụọ, ha bụ ndị fọdụrụ na ndị Livayị. 41 Ọnụọgụgụ obodo niile na ebe ịta nri nke anụ ụlọ e sitere nʼala ụmụ Izrel nye ndị Livayị dị iri anọ na asatọ. 42 Obodo ọbụla nwere ala gbara ya gburugburu ebe anụ ụlọ ga-anọ kpaa nri. 43 Ya mere, ONYENWE ANYỊ nyere ụmụ Izrel ala ahụ ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha. Ha nwetara ya, biri nʼime ya. 44 ONYENWE ANYỊ nyere ha izuike nʼakụkụ niile, dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye ndị nna nna ha. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị iro ha ọbụla guzogidere ha, nʼihi na ONYENWE ANYỊ nyefere ndị iro ha niile nʼaka ha. 45 O nweghị otu nʼime nkwa ọma niile ONYENWE ANYỊ kwere Izrel nke na-emezughị. O mezuru nkwa niile o kwere ha.

In Other Versions

Joshua 21 in the ANGEFD

Joshua 21 in the ANTPNG2D

Joshua 21 in the AS21

Joshua 21 in the BAGH

Joshua 21 in the BBPNG

Joshua 21 in the BBT1E

Joshua 21 in the BDS

Joshua 21 in the BEV

Joshua 21 in the BHAD

Joshua 21 in the BIB

Joshua 21 in the BLPT

Joshua 21 in the BNT

Joshua 21 in the BNTABOOT

Joshua 21 in the BNTLV

Joshua 21 in the BOATCB

Joshua 21 in the BOATCB2

Joshua 21 in the BOBCV

Joshua 21 in the BOCNT

Joshua 21 in the BOECS

Joshua 21 in the BOGWICC

Joshua 21 in the BOHCB

Joshua 21 in the BOHCV

Joshua 21 in the BOHLNT

Joshua 21 in the BOHNTLTAL

Joshua 21 in the BOILNTAP

Joshua 21 in the BOITCV

Joshua 21 in the BOKCV

Joshua 21 in the BOKCV2

Joshua 21 in the BOKHWOG

Joshua 21 in the BOKSSV

Joshua 21 in the BOLCB

Joshua 21 in the BOLCB2

Joshua 21 in the BOMCV

Joshua 21 in the BONAV

Joshua 21 in the BONCB

Joshua 21 in the BONLT

Joshua 21 in the BONUT2

Joshua 21 in the BOPLNT

Joshua 21 in the BOSCB

Joshua 21 in the BOSNC

Joshua 21 in the BOTLNT

Joshua 21 in the BOVCB

Joshua 21 in the BOYCB

Joshua 21 in the BPBB

Joshua 21 in the BPH

Joshua 21 in the BSB

Joshua 21 in the CCB

Joshua 21 in the CUV

Joshua 21 in the CUVS

Joshua 21 in the DBT

Joshua 21 in the DGDNT

Joshua 21 in the DHNT

Joshua 21 in the DNT

Joshua 21 in the ELBE

Joshua 21 in the EMTV

Joshua 21 in the ESV

Joshua 21 in the FBV

Joshua 21 in the FEB

Joshua 21 in the GGMNT

Joshua 21 in the GNT

Joshua 21 in the HARY

Joshua 21 in the HNT

Joshua 21 in the IRVA

Joshua 21 in the IRVB

Joshua 21 in the IRVG

Joshua 21 in the IRVH

Joshua 21 in the IRVK

Joshua 21 in the IRVM

Joshua 21 in the IRVM2

Joshua 21 in the IRVO

Joshua 21 in the IRVP

Joshua 21 in the IRVT

Joshua 21 in the IRVT2

Joshua 21 in the IRVU

Joshua 21 in the ISVN

Joshua 21 in the JSNT

Joshua 21 in the KAPI

Joshua 21 in the KBT1ETNIK

Joshua 21 in the KBV

Joshua 21 in the KJV

Joshua 21 in the KNFD

Joshua 21 in the LBA

Joshua 21 in the LBLA

Joshua 21 in the LNT

Joshua 21 in the LSV

Joshua 21 in the MAAL

Joshua 21 in the MBV

Joshua 21 in the MBV2

Joshua 21 in the MHNT

Joshua 21 in the MKNFD

Joshua 21 in the MNG

Joshua 21 in the MNT

Joshua 21 in the MNT2

Joshua 21 in the MRS1T

Joshua 21 in the NAA

Joshua 21 in the NASB

Joshua 21 in the NBLA

Joshua 21 in the NBS

Joshua 21 in the NBVTP

Joshua 21 in the NET2

Joshua 21 in the NIV11

Joshua 21 in the NNT

Joshua 21 in the NNT2

Joshua 21 in the NNT3

Joshua 21 in the PDDPT

Joshua 21 in the PFNT

Joshua 21 in the RMNT

Joshua 21 in the SBIAS

Joshua 21 in the SBIBS

Joshua 21 in the SBIBS2

Joshua 21 in the SBICS

Joshua 21 in the SBIDS

Joshua 21 in the SBIGS

Joshua 21 in the SBIHS

Joshua 21 in the SBIIS

Joshua 21 in the SBIIS2

Joshua 21 in the SBIIS3

Joshua 21 in the SBIKS

Joshua 21 in the SBIKS2

Joshua 21 in the SBIMS

Joshua 21 in the SBIOS

Joshua 21 in the SBIPS

Joshua 21 in the SBISS

Joshua 21 in the SBITS

Joshua 21 in the SBITS2

Joshua 21 in the SBITS3

Joshua 21 in the SBITS4

Joshua 21 in the SBIUS

Joshua 21 in the SBIVS

Joshua 21 in the SBT

Joshua 21 in the SBT1E

Joshua 21 in the SCHL

Joshua 21 in the SNT

Joshua 21 in the SUSU

Joshua 21 in the SUSU2

Joshua 21 in the SYNO

Joshua 21 in the TBIAOTANT

Joshua 21 in the TBT1E

Joshua 21 in the TBT1E2

Joshua 21 in the TFTIP

Joshua 21 in the TFTU

Joshua 21 in the TGNTATF3T

Joshua 21 in the THAI

Joshua 21 in the TNFD

Joshua 21 in the TNT

Joshua 21 in the TNTIK

Joshua 21 in the TNTIL

Joshua 21 in the TNTIN

Joshua 21 in the TNTIP

Joshua 21 in the TNTIZ

Joshua 21 in the TOMA

Joshua 21 in the TTENT

Joshua 21 in the UBG

Joshua 21 in the UGV

Joshua 21 in the UGV2

Joshua 21 in the UGV3

Joshua 21 in the VBL

Joshua 21 in the VDCC

Joshua 21 in the YALU

Joshua 21 in the YAPE

Joshua 21 in the YBVTP

Joshua 21 in the ZBP