Joshua 7 (BOICB)

1 Ma ụmụ Izrel ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe gbasara ihe ndị ahụ e debere iche nye ONYENWE ANYỊ. Nʼihi na Ekan nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera, onye si nʼebo Juda gara were ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ. Nke a mere ka iwe wee ONYENWE ANYỊ nke ukwuu megide ụmụ Izrel. 2 Emesịa, Joshua si Jeriko zipụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa Ai, obodo dị Bet-Aven nso, nʼọwụwa anyanwụ Betel. Ọ gwara ha sị ha, “Gaanụ nnyopụta akụkụ ala ahụ niile.” Ya mere, ndị ahụ gara nnyochapụta obodo Ai. 3 Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.” 4 Nʼihi nke a, ihe dịka puku ndị agha atọ ka e zigara imeri obodo Ai. Ma ngwangwa, ndị agha obodo Ai meriri ndị agha ụmụ Izrel, chụọ ha ọsọ. 5 Ihe dịka iri mmadụ atọ na isii nʼetiti ndị agha Izrel ka e gburu nʼagha ahụ. Ndị Ai chụrụ ha ọsọ site nʼụzọ ama obodo ruo nʼebe a na-awa nkume, gbuo ha na mgbada ugwu ahụ. Nʼihi nke a, ndị agha Izrel dara mba, obi lọkwara ha mmiri. 6 Mgbe ahụ, Joshua na ndị okenye Izrel sitere nʼobi mwute dọwaa uwe ha, daa nʼala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha wekwara ntụ wụkwasị onwe ha nʼisi igosi obi mwute ha. 7 Mgbe ahụ kwa, Joshua sịrị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ! Nʼihi gịnị ka i ji mee ka ndị a gabiga osimiri Jọdan, inyefe anyị nʼaka ndị Amọrait, ime ka ha tigbuo anyị? Ọ gaara adị anyị mma nke ọma ma ọ bụrụ na anyị nọdụrụ nʼofe ọzọ nke Jọdan. 8 Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ? 9 Nʼihi na mgbe ndị Kenan na ndị bi nʼakụkụ ala ahụ ga-anụ maka mmeri e meriri anyị, ha ga-agba anyị gburugburu lụso anyị agha, bipụ aha anyị nʼụwa. Ọ bụkwa gịnị ka ị ga-eme banyere aha ukwu gị dị ebube?” 10 Ma ONYENWE ANYỊ sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala? 11 Izrel emehiela. Ha emebiela ọgbụgba ndụ m nyere ha nʼiwu idebe, ha ewerela ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ e doro iche nye ONYENWE ANYỊ. Ọ bụghị naanị na ha zuru ohi, ha nọkwa nʼelu ya ghaa ụgha banyere ya. Ha ewerekwala ihe ndị ahụ tinyekọta nʼihe nke aka ha. 12 Ọ bụ nʼihi nke a mere na ụmụ Izrel enwekwaghị ike iguzo nʼihu ndị iro ha. Ọ bụkwa nke a mere ha ji tụgharịa gbaa ọsọ, nʼihi na ha aghọọla ndị kwesiri ka e bibie. Ya mere, agaghị m anọnyere unu ọzọ, tutu ruo mgbe unu wezugara ma mebie site nʼetiti onwe unu, ihe ọbụla e debere iche maka mbibi. 13 “Bilie! Doo Izrel nsọ. Gwa ndị m okwu sị ha, ‘Onye ọbụla nʼetiti unu ga-ejikere doo onwe ya nsọ maka echi. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel na-ekwu sị, Ihe ndị e doro nsọ dị nʼetiti unu, Izrel. Unu apụghịkwa iguzosi ike nʼihu ndị iro unu, tutu ruo mgbe unu ga-esite nʼetiti onwe unu wezuga ihe ndị ahụ.’ 14 “ ‘Nʼụtụtụ echi, unu ga-apụta nʼebo nʼebo. Ebo ọbụla ONYENWE ANYỊ họpụtara ga-apụta nʼikwu nʼikwu, ikwu ọbụla ONYENWE ANYỊ họpụtara ga-apụta bịa nʼezinaụlọ nʼezinaụlọ, ụlọ ọbụla nke ONYENWE ANYỊ họọrọ, ndị ikom ya ga-apụta nʼotu nʼotu. 15 Ma onye ọbụla e jidere ji ihe ndị ahụ e doro nsọ ka a ga-akpọ ọkụ, ya onwe ya, na ihe niile ọ nwere, nʼihi o mebiela iwu ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, meekwa ihe jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel.’ ” 16 Nʼihi nke a, Joshua biliri nʼisi ụtụtụ. O mere ka ebo niile dị nʼIzrel bịaruo nso nʼebo nʼebo, ebo Juda ka a họọrọ. 17 Mgbe ahụ, e mere ka ikwu niile dị nʼebo Juda bịaruo nso, ikwu Zera ka ahọpụtara. Mgbe e mere ka ikwu Zera pụta nʼezinaụlọ ha niile nʼotu nʼotu, ezinaụlọ Zimri bụ nke ahọpụtara. 18 Joshua mere ka ndị ikom niile dị nʼezinaụlọ Zimri pụta nʼotu nʼotu, ma e jidere Ekan, nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera onye ebo Juda. 19 Mgbe ahụ, Joshua sịrị Ekan, “Nwa m, nye ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel otuto, nyekwa ya nsọpụrụ. Gwa m ihe i mere. Ezonarịkwala m ihe ọjọọ i mere.” 20 Mgbe ahụ, Ekan zara Joshua sị ya, “Ọ bụ eziokwu! Emehiela m megide ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel. Lee ihe m mere. 21 Mgbe m hụrụ nʼetiti ihe ndị a kwatara nʼagha, otu uwe mwụda Babilọn mara mma, na narị Shekel ọlaọcha abụọ, na mkpirisi ọlaedo ịdị arọ ya ruru iri shekel ise. E nwere m anya ukwu nʼebe ihe ndị a dị, chịrị ha. Lee, ezoro m ha nʼime ala nʼụlọ ikwu m, ọlaọcha ahụ dịkwa nʼokpuru ya.” 22 Ya mere, Joshua zigara ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa chọọ ihe ahụ Ekan zoro. Ndị a gara nʼụlọ ikwu ahụ, chọpụta ihe ahụ ezuru nʼohi. Dịka Ekan kwuru, ihe ikpeazụ ha hụrụ bụ ọlaọcha ahụ. 23 Ha chịkọtara ha niile chịtara ha Joshua. Mgbe ha bịaruru ebe Joshua na ndị Izrel niile nọ, ha chịsara ya nʼala nʼihu ONYENWE ANYỊ. 24 Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ. 25 Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? ONYENWE ANYỊ ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.”Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ. 26 Ha tụkọtara ọtụtụ nkume tụkwasị ya nʼelu Ekan. Nkume ndị a dị nʼebe ahụ ruo taa. Ọ bụkwa nʼụzọ dị otu a ka iwe ọkụ ONYENWE ANYỊ ji dajụọ. Ya mere, e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Akọ ruo taa.

In Other Versions

Joshua 7 in the ANGEFD

Joshua 7 in the ANTPNG2D

Joshua 7 in the AS21

Joshua 7 in the BAGH

Joshua 7 in the BBPNG

Joshua 7 in the BBT1E

Joshua 7 in the BDS

Joshua 7 in the BEV

Joshua 7 in the BHAD

Joshua 7 in the BIB

Joshua 7 in the BLPT

Joshua 7 in the BNT

Joshua 7 in the BNTABOOT

Joshua 7 in the BNTLV

Joshua 7 in the BOATCB

Joshua 7 in the BOATCB2

Joshua 7 in the BOBCV

Joshua 7 in the BOCNT

Joshua 7 in the BOECS

Joshua 7 in the BOGWICC

Joshua 7 in the BOHCB

Joshua 7 in the BOHCV

Joshua 7 in the BOHLNT

Joshua 7 in the BOHNTLTAL

Joshua 7 in the BOILNTAP

Joshua 7 in the BOITCV

Joshua 7 in the BOKCV

Joshua 7 in the BOKCV2

Joshua 7 in the BOKHWOG

Joshua 7 in the BOKSSV

Joshua 7 in the BOLCB

Joshua 7 in the BOLCB2

Joshua 7 in the BOMCV

Joshua 7 in the BONAV

Joshua 7 in the BONCB

Joshua 7 in the BONLT

Joshua 7 in the BONUT2

Joshua 7 in the BOPLNT

Joshua 7 in the BOSCB

Joshua 7 in the BOSNC

Joshua 7 in the BOTLNT

Joshua 7 in the BOVCB

Joshua 7 in the BOYCB

Joshua 7 in the BPBB

Joshua 7 in the BPH

Joshua 7 in the BSB

Joshua 7 in the CCB

Joshua 7 in the CUV

Joshua 7 in the CUVS

Joshua 7 in the DBT

Joshua 7 in the DGDNT

Joshua 7 in the DHNT

Joshua 7 in the DNT

Joshua 7 in the ELBE

Joshua 7 in the EMTV

Joshua 7 in the ESV

Joshua 7 in the FBV

Joshua 7 in the FEB

Joshua 7 in the GGMNT

Joshua 7 in the GNT

Joshua 7 in the HARY

Joshua 7 in the HNT

Joshua 7 in the IRVA

Joshua 7 in the IRVB

Joshua 7 in the IRVG

Joshua 7 in the IRVH

Joshua 7 in the IRVK

Joshua 7 in the IRVM

Joshua 7 in the IRVM2

Joshua 7 in the IRVO

Joshua 7 in the IRVP

Joshua 7 in the IRVT

Joshua 7 in the IRVT2

Joshua 7 in the IRVU

Joshua 7 in the ISVN

Joshua 7 in the JSNT

Joshua 7 in the KAPI

Joshua 7 in the KBT1ETNIK

Joshua 7 in the KBV

Joshua 7 in the KJV

Joshua 7 in the KNFD

Joshua 7 in the LBA

Joshua 7 in the LBLA

Joshua 7 in the LNT

Joshua 7 in the LSV

Joshua 7 in the MAAL

Joshua 7 in the MBV

Joshua 7 in the MBV2

Joshua 7 in the MHNT

Joshua 7 in the MKNFD

Joshua 7 in the MNG

Joshua 7 in the MNT

Joshua 7 in the MNT2

Joshua 7 in the MRS1T

Joshua 7 in the NAA

Joshua 7 in the NASB

Joshua 7 in the NBLA

Joshua 7 in the NBS

Joshua 7 in the NBVTP

Joshua 7 in the NET2

Joshua 7 in the NIV11

Joshua 7 in the NNT

Joshua 7 in the NNT2

Joshua 7 in the NNT3

Joshua 7 in the PDDPT

Joshua 7 in the PFNT

Joshua 7 in the RMNT

Joshua 7 in the SBIAS

Joshua 7 in the SBIBS

Joshua 7 in the SBIBS2

Joshua 7 in the SBICS

Joshua 7 in the SBIDS

Joshua 7 in the SBIGS

Joshua 7 in the SBIHS

Joshua 7 in the SBIIS

Joshua 7 in the SBIIS2

Joshua 7 in the SBIIS3

Joshua 7 in the SBIKS

Joshua 7 in the SBIKS2

Joshua 7 in the SBIMS

Joshua 7 in the SBIOS

Joshua 7 in the SBIPS

Joshua 7 in the SBISS

Joshua 7 in the SBITS

Joshua 7 in the SBITS2

Joshua 7 in the SBITS3

Joshua 7 in the SBITS4

Joshua 7 in the SBIUS

Joshua 7 in the SBIVS

Joshua 7 in the SBT

Joshua 7 in the SBT1E

Joshua 7 in the SCHL

Joshua 7 in the SNT

Joshua 7 in the SUSU

Joshua 7 in the SUSU2

Joshua 7 in the SYNO

Joshua 7 in the TBIAOTANT

Joshua 7 in the TBT1E

Joshua 7 in the TBT1E2

Joshua 7 in the TFTIP

Joshua 7 in the TFTU

Joshua 7 in the TGNTATF3T

Joshua 7 in the THAI

Joshua 7 in the TNFD

Joshua 7 in the TNT

Joshua 7 in the TNTIK

Joshua 7 in the TNTIL

Joshua 7 in the TNTIN

Joshua 7 in the TNTIP

Joshua 7 in the TNTIZ

Joshua 7 in the TOMA

Joshua 7 in the TTENT

Joshua 7 in the UBG

Joshua 7 in the UGV

Joshua 7 in the UGV2

Joshua 7 in the UGV3

Joshua 7 in the VBL

Joshua 7 in the VDCC

Joshua 7 in the YALU

Joshua 7 in the YAPE

Joshua 7 in the YBVTP

Joshua 7 in the ZBP