Leviticus 17 (BOICB)
1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 2 “Gwa Erọn, na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu. 3 Onye ọbụla bụ onye ụlọ Izrel gbuo ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu nʼogige ebe obibi, maọbụ nʼazụ ebe obibi, 4 ma o wetaghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute iche ya dịka onyinye nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼihu ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, a ga-agụ onye ahụ dịka onye ikpe iwufu ọbara mara. Ọ wụfuola ọbara, nʼihi ya, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya. 5 Ihe e ji nye iwu a bụ ka ụmụ Izrel wetara ONYENWE ANYỊ aja niile ha na-achụ ugbu a na mbara ezi ọbụla. Ha kwesiri iwetara ya ONYENWE ANYỊ site nʼaka onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka o jiri ya chụọrọ ha aja udo. 6 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-efesa ọbara ahụ nʼebe ịchụ aja dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, kpọọkwa abụba ya ọkụ, ka ọ bụrụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị ONYENWE ANYỊ ezi ụtọ. 7 O kwesikwaghị ka ndị Izrel chụọ aja ha ọzọ na mbara ezi nye arụsị ewu ndị ha na-akpọ isiala nye. Iwu a ga-adịgide nye ha na ụmụ ha niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.’ 8 “Gwa ha, ‘Onye Izrel ọbụla, maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu, nke ga-achụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ọzọ, 9 ma o webataghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebe a ga-achụrụ ya ONYENWE ANYỊ, ka a ga-ewezuga site nʼetiti ndị ya. 10 “ ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti ha, nke riri ọbara ọbụla ka m ga-eche ihu m megide. A ga-ewezuga ya site nʼetiti ndị m. 11 Nʼihi na ndụ ihe nwere ndụ dị nʼọbara ya, ọ bụ nʼihi nke a ka m ji nye iwu na a ga-awụsa ọbara niile nʼelu ebe ịchụ aja, maka iji ya kpuchie mmehie unu. Ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie maka ndụ mmadụ. 12 Nʼihi nke a, a sịrị ndị Izrel, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu, maọbụ onye ọbịa ọbụla nke bi nʼetiti unu ga-eri ọbara.” 13 “ ‘Onye Izrel ọbụla, na onye ọbịa ọbụla binyere unu nke gara ịchụ nta, gbuo anụ maọbụ nnụnụ ọbụla a na-eri eri, ga-awụfu ọbara ya were aja kpuchie ya. 14 Nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara. Ọ bụ ya mere m ji nye ụmụ Izrel iwu si unu erila ọbara anụmanụ ọbụla, nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara ya. Nʼihi ya onye ọbụla riri ọbara, a ga-ekewapụ ya site nʼetiti ndị m. 15 “ ‘Mmadụ ọbụla, maọbụ nwa afọ ma ọ bụkwanụ onye ọbịa, nke riri anụ nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, ga-eji mmiri saa uwe ya na ahụ ya, ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi tupu ọ dị ọcha ọzọ. 16 Ma ọ bụrụ na ọ saghị uwe ya na ahụ ya, ikpe ọmụma dị ya nʼisi.’ ”
In Other Versions
Leviticus 17 in the ANGEFD
Leviticus 17 in the ANTPNG2D
Leviticus 17 in the AS21
Leviticus 17 in the BAGH
Leviticus 17 in the BBPNG
Leviticus 17 in the BBT1E
Leviticus 17 in the BDS
Leviticus 17 in the BEV
Leviticus 17 in the BHAD
Leviticus 17 in the BIB
Leviticus 17 in the BLPT
Leviticus 17 in the BNT
Leviticus 17 in the BNTABOOT
Leviticus 17 in the BNTLV
Leviticus 17 in the BOATCB
Leviticus 17 in the BOATCB2
Leviticus 17 in the BOBCV
Leviticus 17 in the BOCNT
Leviticus 17 in the BOECS
Leviticus 17 in the BOGWICC
Leviticus 17 in the BOHCB
Leviticus 17 in the BOHCV
Leviticus 17 in the BOHLNT
Leviticus 17 in the BOHNTLTAL
Leviticus 17 in the BOILNTAP
Leviticus 17 in the BOITCV
Leviticus 17 in the BOKCV
Leviticus 17 in the BOKCV2
Leviticus 17 in the BOKHWOG
Leviticus 17 in the BOKSSV
Leviticus 17 in the BOLCB
Leviticus 17 in the BOLCB2
Leviticus 17 in the BOMCV
Leviticus 17 in the BONAV
Leviticus 17 in the BONCB
Leviticus 17 in the BONLT
Leviticus 17 in the BONUT2
Leviticus 17 in the BOPLNT
Leviticus 17 in the BOSCB
Leviticus 17 in the BOSNC
Leviticus 17 in the BOTLNT
Leviticus 17 in the BOVCB
Leviticus 17 in the BOYCB
Leviticus 17 in the BPBB
Leviticus 17 in the BPH
Leviticus 17 in the BSB
Leviticus 17 in the CCB
Leviticus 17 in the CUV
Leviticus 17 in the CUVS
Leviticus 17 in the DBT
Leviticus 17 in the DGDNT
Leviticus 17 in the DHNT
Leviticus 17 in the DNT
Leviticus 17 in the ELBE
Leviticus 17 in the EMTV
Leviticus 17 in the ESV
Leviticus 17 in the FBV
Leviticus 17 in the FEB
Leviticus 17 in the GGMNT
Leviticus 17 in the GNT
Leviticus 17 in the HARY
Leviticus 17 in the HNT
Leviticus 17 in the IRVA
Leviticus 17 in the IRVB
Leviticus 17 in the IRVG
Leviticus 17 in the IRVH
Leviticus 17 in the IRVK
Leviticus 17 in the IRVM
Leviticus 17 in the IRVM2
Leviticus 17 in the IRVO
Leviticus 17 in the IRVP
Leviticus 17 in the IRVT
Leviticus 17 in the IRVT2
Leviticus 17 in the IRVU
Leviticus 17 in the ISVN
Leviticus 17 in the JSNT
Leviticus 17 in the KAPI
Leviticus 17 in the KBT1ETNIK
Leviticus 17 in the KBV
Leviticus 17 in the KJV
Leviticus 17 in the KNFD
Leviticus 17 in the LBA
Leviticus 17 in the LBLA
Leviticus 17 in the LNT
Leviticus 17 in the LSV
Leviticus 17 in the MAAL
Leviticus 17 in the MBV
Leviticus 17 in the MBV2
Leviticus 17 in the MHNT
Leviticus 17 in the MKNFD
Leviticus 17 in the MNG
Leviticus 17 in the MNT
Leviticus 17 in the MNT2
Leviticus 17 in the MRS1T
Leviticus 17 in the NAA
Leviticus 17 in the NASB
Leviticus 17 in the NBLA
Leviticus 17 in the NBS
Leviticus 17 in the NBVTP
Leviticus 17 in the NET2
Leviticus 17 in the NIV11
Leviticus 17 in the NNT
Leviticus 17 in the NNT2
Leviticus 17 in the NNT3
Leviticus 17 in the PDDPT
Leviticus 17 in the PFNT
Leviticus 17 in the RMNT
Leviticus 17 in the SBIAS
Leviticus 17 in the SBIBS
Leviticus 17 in the SBIBS2
Leviticus 17 in the SBICS
Leviticus 17 in the SBIDS
Leviticus 17 in the SBIGS
Leviticus 17 in the SBIHS
Leviticus 17 in the SBIIS
Leviticus 17 in the SBIIS2
Leviticus 17 in the SBIIS3
Leviticus 17 in the SBIKS
Leviticus 17 in the SBIKS2
Leviticus 17 in the SBIMS
Leviticus 17 in the SBIOS
Leviticus 17 in the SBIPS
Leviticus 17 in the SBISS
Leviticus 17 in the SBITS
Leviticus 17 in the SBITS2
Leviticus 17 in the SBITS3
Leviticus 17 in the SBITS4
Leviticus 17 in the SBIUS
Leviticus 17 in the SBIVS
Leviticus 17 in the SBT
Leviticus 17 in the SBT1E
Leviticus 17 in the SCHL
Leviticus 17 in the SNT
Leviticus 17 in the SUSU
Leviticus 17 in the SUSU2
Leviticus 17 in the SYNO
Leviticus 17 in the TBIAOTANT
Leviticus 17 in the TBT1E
Leviticus 17 in the TBT1E2
Leviticus 17 in the TFTIP
Leviticus 17 in the TFTU
Leviticus 17 in the TGNTATF3T
Leviticus 17 in the THAI
Leviticus 17 in the TNFD
Leviticus 17 in the TNT
Leviticus 17 in the TNTIK
Leviticus 17 in the TNTIL
Leviticus 17 in the TNTIN
Leviticus 17 in the TNTIP
Leviticus 17 in the TNTIZ
Leviticus 17 in the TOMA
Leviticus 17 in the TTENT
Leviticus 17 in the UBG
Leviticus 17 in the UGV
Leviticus 17 in the UGV2
Leviticus 17 in the UGV3
Leviticus 17 in the VBL
Leviticus 17 in the VDCC
Leviticus 17 in the YALU
Leviticus 17 in the YAPE
Leviticus 17 in the YBVTP
Leviticus 17 in the ZBP