Leviticus 18 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Gwa ụmụ Izrel okwu ndị a sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 3 Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha. 4 Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 5 Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ site na ha. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 6 “ ‘Onye ọbụla ya na mmadụ bụ nwanne e jekwurukwala ya ka ha nwe mmekọ edina, i ji kpughee ọtọ ya. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 7 “ ‘Ị gaghị eleda nna gị anya site na i jekwuru nne gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nne gị ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe ụdị mmekọ dị otu a. 8 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nke a bụ ileda nna gị anya. 9 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne gị nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, maọbụ nwa nwanyị nke a mụụrụ nna gị, maọbụ nwa nwanyị nke nne gị mụrụ, ma a mụrụ ya nʼụlọ ma a mụrụ nʼama. 10 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nke nwa gị nwoke mụrụ, maọbụ nwa nwanyị nke nwa gị nwanyị mụrụ i nwe mmekọ edina; nʼihi na nke a ga-eweta nleda anya nye gị. 11 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nwunye nna gị mụrụ, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọ bụ nwa nna gị mụrụ; nwanne gị nwanyị ka ọ bụ. 12 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nwanyị nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nna gị, ha bụ otu ahụ. 13 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nne gị nke nwanyị, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nne gị, ha bụ otu ahụ. 14 “ ‘Ị gaghị eleda nwanne nna gị nke nwoke anya, site nʼijekwuru nwunye ya, ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nʼihi na nwunye nwanna gị ka ọ bụ. 15 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwa gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina; nwunye nwa gị nwoke ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe mmekọrịta ọbụla gosiri mkpughe ọtọ ya. 16 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwanne gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na nke a bụ omume nleda anya nye nwanne gị nwoke. 17 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanyị na nwa ya nwanyị ka gị na ha nwe mmekọ edina. Ị gaghị akpọrọ nwa nwanyị nwa ya nwoke, maọbụ nwa nwanyị nke nwa ya nwanyị mụrụ dinaa ya; nʼihi na otu ọbara ka ha bụ. Ihe dị otu a bụ arụ. 18 “ ‘Ị gaghị alụ nwanne nwanyị nwunye gị, dịka nwunye ọzọ gị, nʼihi ịkpagbu ya, gị na ya a na-enwe mmekọrịta edina, ị na-ekpughe ọtọ nwunye gị mgbe ọ ka dị ndụ. 19 “ ‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka. 20 “ ‘A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a. 21 “ ‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja. Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 22 “ ‘Gị na nwoke edinala, dịka nwanyị na nwoke si edina. Ihe akpọrọ asị ka ọ bụ. 23 “ ‘Gị na anụmanụ ọbụla edinakwala, site otu a merụọ onwe gị. Nwanyị agakwaghị ewere onwe ya nye ka ya na oke anụmanụ nwee mmekọrịta, arụ a na-adịghị eme eme ka ọ bụ. 24 “ ‘Unu emerụkwala onwe unu site na-ime ihe ndị a, nʼihi na ihe ndị a bụ ihe mba ndị ahụ na-eme. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ga-eji chụpụ ha site nʼala ahụ m ga-enye unu. 25 Ọ bụladị ala ahụ niile ghọrọ ihe rụrụ arụ site nʼomume ndị a. Ọ bụ nke a mere m ji ata ndị bi nʼime ya ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ala ahụ meghere ọnụ ya gbọpụta ndị bi nʼime ya. 26 Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu. 27 Ala m na-aga inye unu rụrụ arụ nʼihi na ndị bi nʼime ya na-eme omume ndị a rụrụ arụ. 28 Unu emekwala ihe arụ ndị a, nʼihi na ọ bụrụ na unu emee ha, ọ ga-emeghe ọnụ ya gbọpụta unu, dịka o si mee mba niile bụ ndị buru unu ụzọ biri nʼime ya. 29 “ ‘Onye ọbụla nʼetiti unu mere ihe arụ ndị a, ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya. 30 Nʼihi ya, lezienụ anya ka unu debe iwu m, ka unu ghara ime ihe arụ ndị a, nke ndị buru unu ụzọ biri nʼala ahụ mere. Ka unu gharakwa imerụ onwe unu site nʼomume arụ ndị a. Abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu.’ ”

In Other Versions

Leviticus 18 in the ANGEFD

Leviticus 18 in the ANTPNG2D

Leviticus 18 in the AS21

Leviticus 18 in the BAGH

Leviticus 18 in the BBPNG

Leviticus 18 in the BBT1E

Leviticus 18 in the BDS

Leviticus 18 in the BEV

Leviticus 18 in the BHAD

Leviticus 18 in the BIB

Leviticus 18 in the BLPT

Leviticus 18 in the BNT

Leviticus 18 in the BNTABOOT

Leviticus 18 in the BNTLV

Leviticus 18 in the BOATCB

Leviticus 18 in the BOATCB2

Leviticus 18 in the BOBCV

Leviticus 18 in the BOCNT

Leviticus 18 in the BOECS

Leviticus 18 in the BOGWICC

Leviticus 18 in the BOHCB

Leviticus 18 in the BOHCV

Leviticus 18 in the BOHLNT

Leviticus 18 in the BOHNTLTAL

Leviticus 18 in the BOILNTAP

Leviticus 18 in the BOITCV

Leviticus 18 in the BOKCV

Leviticus 18 in the BOKCV2

Leviticus 18 in the BOKHWOG

Leviticus 18 in the BOKSSV

Leviticus 18 in the BOLCB

Leviticus 18 in the BOLCB2

Leviticus 18 in the BOMCV

Leviticus 18 in the BONAV

Leviticus 18 in the BONCB

Leviticus 18 in the BONLT

Leviticus 18 in the BONUT2

Leviticus 18 in the BOPLNT

Leviticus 18 in the BOSCB

Leviticus 18 in the BOSNC

Leviticus 18 in the BOTLNT

Leviticus 18 in the BOVCB

Leviticus 18 in the BOYCB

Leviticus 18 in the BPBB

Leviticus 18 in the BPH

Leviticus 18 in the BSB

Leviticus 18 in the CCB

Leviticus 18 in the CUV

Leviticus 18 in the CUVS

Leviticus 18 in the DBT

Leviticus 18 in the DGDNT

Leviticus 18 in the DHNT

Leviticus 18 in the DNT

Leviticus 18 in the ELBE

Leviticus 18 in the EMTV

Leviticus 18 in the ESV

Leviticus 18 in the FBV

Leviticus 18 in the FEB

Leviticus 18 in the GGMNT

Leviticus 18 in the GNT

Leviticus 18 in the HARY

Leviticus 18 in the HNT

Leviticus 18 in the IRVA

Leviticus 18 in the IRVB

Leviticus 18 in the IRVG

Leviticus 18 in the IRVH

Leviticus 18 in the IRVK

Leviticus 18 in the IRVM

Leviticus 18 in the IRVM2

Leviticus 18 in the IRVO

Leviticus 18 in the IRVP

Leviticus 18 in the IRVT

Leviticus 18 in the IRVT2

Leviticus 18 in the IRVU

Leviticus 18 in the ISVN

Leviticus 18 in the JSNT

Leviticus 18 in the KAPI

Leviticus 18 in the KBT1ETNIK

Leviticus 18 in the KBV

Leviticus 18 in the KJV

Leviticus 18 in the KNFD

Leviticus 18 in the LBA

Leviticus 18 in the LBLA

Leviticus 18 in the LNT

Leviticus 18 in the LSV

Leviticus 18 in the MAAL

Leviticus 18 in the MBV

Leviticus 18 in the MBV2

Leviticus 18 in the MHNT

Leviticus 18 in the MKNFD

Leviticus 18 in the MNG

Leviticus 18 in the MNT

Leviticus 18 in the MNT2

Leviticus 18 in the MRS1T

Leviticus 18 in the NAA

Leviticus 18 in the NASB

Leviticus 18 in the NBLA

Leviticus 18 in the NBS

Leviticus 18 in the NBVTP

Leviticus 18 in the NET2

Leviticus 18 in the NIV11

Leviticus 18 in the NNT

Leviticus 18 in the NNT2

Leviticus 18 in the NNT3

Leviticus 18 in the PDDPT

Leviticus 18 in the PFNT

Leviticus 18 in the RMNT

Leviticus 18 in the SBIAS

Leviticus 18 in the SBIBS

Leviticus 18 in the SBIBS2

Leviticus 18 in the SBICS

Leviticus 18 in the SBIDS

Leviticus 18 in the SBIGS

Leviticus 18 in the SBIHS

Leviticus 18 in the SBIIS

Leviticus 18 in the SBIIS2

Leviticus 18 in the SBIIS3

Leviticus 18 in the SBIKS

Leviticus 18 in the SBIKS2

Leviticus 18 in the SBIMS

Leviticus 18 in the SBIOS

Leviticus 18 in the SBIPS

Leviticus 18 in the SBISS

Leviticus 18 in the SBITS

Leviticus 18 in the SBITS2

Leviticus 18 in the SBITS3

Leviticus 18 in the SBITS4

Leviticus 18 in the SBIUS

Leviticus 18 in the SBIVS

Leviticus 18 in the SBT

Leviticus 18 in the SBT1E

Leviticus 18 in the SCHL

Leviticus 18 in the SNT

Leviticus 18 in the SUSU

Leviticus 18 in the SUSU2

Leviticus 18 in the SYNO

Leviticus 18 in the TBIAOTANT

Leviticus 18 in the TBT1E

Leviticus 18 in the TBT1E2

Leviticus 18 in the TFTIP

Leviticus 18 in the TFTU

Leviticus 18 in the TGNTATF3T

Leviticus 18 in the THAI

Leviticus 18 in the TNFD

Leviticus 18 in the TNT

Leviticus 18 in the TNTIK

Leviticus 18 in the TNTIL

Leviticus 18 in the TNTIN

Leviticus 18 in the TNTIP

Leviticus 18 in the TNTIZ

Leviticus 18 in the TOMA

Leviticus 18 in the TTENT

Leviticus 18 in the UBG

Leviticus 18 in the UGV

Leviticus 18 in the UGV2

Leviticus 18 in the UGV3

Leviticus 18 in the VBL

Leviticus 18 in the VDCC

Leviticus 18 in the YALU

Leviticus 18 in the YAPE

Leviticus 18 in the YBVTP

Leviticus 18 in the ZBP