Leviticus 25 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị sị ya, 2 “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ m ga-enye unu, unu ga-eme ka ala ahụ nwee afọ izuike nke ya nye ONYENWE ANYỊ. 3 Afọ isii ka unu ga-akụ ihe nʼubi, afọ isii ka unu ga-ewe ihe ubi, kwachaakwa alaka osisi vaịnị unu. 4 Ma mgbe o ruru afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ala ubi unu ka o zuo ike, afọ izuike nye ONYENWE ANYỊ. Unu akụla ihe ọbụla nʼubi unu maọbụ kwachaa osisi vaịnị unu. 5 Unu agaghị ewe ihe ubi ọbụla ga-epupụtara onwe ha nʼoge a, maọbụ tụtụọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị ga-ada ada. Nʼihi na afọ ahụ bụ afọ ozuzu ike dịrị ala ubi niile. 6 Ihe ubi puputara nʼala ahụ niile nʼafọ izuike ahụ bụ nri dịrị unu onwe unu, na ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, na onye i goro ọrụ, na onye ọbịa bi nʼetiti unu. 7 Ihe ubi ahụ dịkwara anụ ụlọ gị, na anụ ọhịa bi nʼala gị. Ihe ọbụla puputara nʼala bụ ihe unu ga-eri. 8 “ ‘Gụpụta afọ izuike asaa, afọ asaa, ụzọ asaa. Ngụkọ afọ izuike ndị a niile ga-enye iri afọ anọ na itoolu. 9 Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa, zipụ onye ga-egbu opi ike, ya bụ, nʼụbọchị mkpuchi mmehie, a ga-egbu opi ike nʼala Izrel niile. 10 Doonụ afọ nke iri ise ahụ nsọ, kwusaakwa inwere onwe nye mmadụ niile nʼala ahụ niile. Afọ ahụ ga-abụ afọ inwere onwe nye unu. Onye ọbụla nʼime unu ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ezinaụlọ ya, onye ọbụla kwa ga-alaghachi nʼagbụrụ ya. 11 Afọ nke iri ise bụ afọ inwere onwe nye unu. A gaghị akụ ihe ọbụla nʼubi, a gakwaghị ewe ihe ubi ọbụla puputara nʼonwe ya, maọbụ mkpụrụ osisi vaịnị mịrị nʼonwe ya. 12 Ọ bụ afọ inwere onwe, bụrụkwa afọ dị nsọ nye unu, nke onye ọbụla ga-eri naanị ihe e wetara nʼubi. 13 “ ‘Onye ọbụla ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ya, nʼafọ inwere onwe a. 14 “ ‘Ọ bụrụ na i resiri onye agbataobi gị ala, maọbụ na o nwere nke ọ zụrụ site nʼaka gị, unu aghọgbula ibe unu. 15 Ị ga-azụrụ ala site nʼaka onye agbataobi dịka ọnụọgụgụ afọ si dị site nʼafọ inwere onwe. Ha ga-eresi gị ya dịka ọnụọgụgụ afọ ole fọdụrụ maka ịkọ ihe nʼala ahụ. 16 Ọ bụrụ na a zụrụ ala ahụ nso nso mmemme iri afọ ise a, ọnụahịa ala ahụ ga-adị ala, ọ bụrụkwanụ na ọ dị anya site na mmemme ahụ, ọnụahịa ya ga-adị elu, nʼihi na ụgwọ onye ahụ na-akwụ bụ ụgwọ ugboro ole ọ ga-akụ ihe nʼala ahụ. 17 Unu emegbula ibe unu kama tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 18 “ ‘Gbasoonụ ụkpụrụ m, ma lezie anya imezu ihe m nyere nʼiwu, ka unu nwee ike ibi obi udo nʼala ahụ. 19 Mgbe ahụ, ala ga-amị mkpụrụ ya, unu ga-eriju afọ, birikwa nʼala ahụ nʼudo. 20 Unu nwere ike jụọ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị ga-eri nʼafọ nke asaa ahụ ebe ọ bụ na anyị agaghị akụ ihe ọbụla, maọbụ wee ihe ubi ọbụla nʼafọ ahụ?” 21 Aga m ezitere unu ngọzị dị ukwuu nʼafọ nke isii, nke ga-eme ka ala mee ihe omume nke ga-ezuru unu afọ atọ. 22 Mgbe unu ga-akụ ihe ubi nʼafọ nke asatọ unu ga na-eri site nʼowuwe ihe ubi ochie unu tutu ruo nʼafọ nke itoolu mgbe unu ga-ewebata ihe ubi ọhụrụ. 23 “ ‘Chetanụ na ala bụ nke m, nʼihi nke a, o kwesighị ka unu ree ala ọbụla kpamkpam. Unu bụ naanị ndị ọbịa na ndị nlekọta nye m. 24 Nʼala obibi unu niile, unu ga-enye ohere maka mgbapụta ala erere ere. 25 “ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu aghọọ onye ogbenye si otu a ree ala ya, nwanna ya dị ya nso ga-abịa gbapụta ala ahụ. 26 Ọ bụrụ na-enweghị onye ga-agbapụta ala ahụ nye ha, ma ha mesịa ghọọ ndị bara ụba nwekwa ihe ga-ezu ịgbapụta ala ahụ nʼonwe ha. 27 A ga-agụ afọ ole gara site na mgbe o rere ala ahụ, nyeghachi ya ego ole o kwesiri inweta. Onye rere ala ga-alaghachikwa nʼala ya. 28 Ọ bụrụ na onyenwe ya enweghị ike ịchọta ego ọ ga-eji gbara ya, ala ahụ ga-adị nʼaka onye ahụ zụrụ ya tutu ruo nʼafọ inwere onwe. Mgbe ahụ ọ ga-ewerekwa ala ahụ nyeghachi ya onye resiri ya. 29 “ ‘Onye ọbụla rere ụlọ obibi dị nʼobodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nwere ikike mgbapụta ya naanị mgbe otu afọ zuru site na mgbe e rere ya. Nʼoge ahụ ka onye rere ya nwere ike ịgbaghachi ya. 30 Ọ bụrụ na a gbapụtaghị ya tupu otu afọ agafee, ụlọ ahụ dị nʼime obodo nwere mgbidi ga-abụ nke onye ahụ zụrụ ya mgbe niile, bụrụkwa nke ụmụ ụmụ ya. A gaghị enyeghachikwa ya mgbe afọ inwere onwe ruru. 31 Ma ụlọ ndị dị nʼobodo nta na-enweghị mgbidi a ga-agụ ha dịka ihe dị nʼọhịa. E nwere ike ịgbapụta ha, ha bụkwa nke a ga-eweghachite mgbe afọ inwere onwe ruru. 32 “ ‘Ma banyere obodo niile nke ndị Livayị dị iche iche. Ha nwere ikike ịgbapụta ụlọ ha dị nʼime nketa ha mgbe ọbụla. 33 Ihe onwunwe ndị Livayị bụ nke e nwere ike ịgbapụta, bụ ndị a, ụlọ niile e rere nke dị nʼobodo ha nwere. Ọ ga-abụ nʼafọ inwere onwe ka aga enwetaghachi ha, nʼihi na ụlọ ndị ahụ dị nʼobodo ndị Livayị bụ naanị oke ha nwere nʼetiti ụmụ Izrel. 34 Ma a gaghị ere ala ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara obodo ha gburugburu ere, nʼihi ọ bụ ihe ha nwee nʼọha ruo ebighị ebi. 35 “ ‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye ruo na o nweghị ike inyere onwe ya aka, ọ dị gị nʼaka inyere ya aka, kpọbata ya ka ọ bịa biri nʼụlọ gị dịka ị ga-esi kpọbata onye ọbịa. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-anọgide biri nʼetiti unu. 36 Tụọ egwu Chineke, kwerekwa ka nwanna gị soro gị biri nʼala ahụ. A nakwala ụma maọbụ ọmụrụnwa ọbụla. 37 Ị gaghị ana ọmụrụnwa nʼego i gbazinyere ha, maọbụ rie uru site na nri i resiri ha. 38 Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, inye unu ala Kenan, na ị bụ Chineke unu. 39 “ ‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọbụla adaa ogbenye, resi gị onwe ya, emela ka o jere gị ozi dịka onye ohu. 40 Kama ị ga-emeso ya mmeso dịka ị ga-esi meso onye ọrụ e goro ego, maọbụ dịka onye ọbịa nọ nʼetiti unu. Ọ ga-ejere gị ozi tutu ruo afọ inwere onwe. 41 Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha. 42 Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu. 43 A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ. Tụọnụ egwu Chineke unu. 44 “ ‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu. 45 Unu nwere ike ịzụ ndị ohu site nʼetiti ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, maọbụ site nʼetiti ndị agbụrụ ha a mụrụ nʼala Izrel. Ndị dị otu a ga-abụkwa ihe onwunwe unu. 46 Unu nwere ike kenye ha ụmụ unu dịka ihe nketa, ma mee ha ndị ohu unu ụbọchị ndụ ha niile. Ma unu agaghị eji aka ike chịa onye Izrel ibe unu. 47 “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbịa bi nʼetiti unu aghọọ ọgaranya, ma otu nʼime ụmụnna unu adaa ogbenye were onwe ya resi onye ọbịa ahụ bi nʼetiti unu, maọbụ were onwe ya resi nwanna ndị ikwu onye ọbịa ahụ, 48 ha nwere ikike ịgbapụta ya mgbe ha resiri onwe ha. Otu nʼime ụmụnna ya nwere ike gbapụta ha. 49 Nwanne nne ya, maọbụ nwanne nna ya, maọbụ nwanna nʼikwu ha ọbụla nwere ike ịgbapụta ya. Ọ nwekwara ike ịgbapụta onwe ya ma ọ bụrụ na ọ kpata ego. 50 Ya na onye ahụ o resiri onwe ya ga-agụ afọ ole ọ bụ site na mgbe o rere onwe ya ruo nʼafọ inwere onwe. Ego a ga-akwụ nʼihi ịgbapụta ya ga-abụ ego ọ ga-efu ịkwụ ohu ọzọ ụgwọ ịrụ ọrụ ọnụọgụgụ afọ ndị ahụ niile. 51 Ọ bụrụ nʼọtụtụ afọ fọdụrụ, ọ ga-esite nʼọnụ ego e rere ha kwụọ nke dị ukwu dịka ego mgbapụta ha. Naanị ihe ntakịrị ga-apụ nʼime ego ahụ. 52 Ọ bụrụ naanị afọ ole na ole fọdụrụ tupu afọ inwere onwe eruo, ọ ga-agụkọ ihe ego ahụ pụtara, kwụọ ya maka ịgbara onwe ya dịka o kwesiri. 53 A ga-emeso ha dịka ndị ọrụ e goro ego kwa afọ, ma ị ga-ahụ na onye ha nọ nʼokpuru ya agaghị eji aka ike chịa ha. 54 “ ‘Ma ọ bụrụ na e nweghị ike gbapụta ya site nʼụzọ ndị a niile, ya na ụmụ ya ga-enwere onwe ha mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru. 55 Nʼihi na mụ ka ụmụ Izrel bụ ndị ohu nye. Ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara site nʼala Ijipt. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu.

In Other Versions

Leviticus 25 in the ANGEFD

Leviticus 25 in the ANTPNG2D

Leviticus 25 in the AS21

Leviticus 25 in the BAGH

Leviticus 25 in the BBPNG

Leviticus 25 in the BBT1E

Leviticus 25 in the BDS

Leviticus 25 in the BEV

Leviticus 25 in the BHAD

Leviticus 25 in the BIB

Leviticus 25 in the BLPT

Leviticus 25 in the BNT

Leviticus 25 in the BNTABOOT

Leviticus 25 in the BNTLV

Leviticus 25 in the BOATCB

Leviticus 25 in the BOATCB2

Leviticus 25 in the BOBCV

Leviticus 25 in the BOCNT

Leviticus 25 in the BOECS

Leviticus 25 in the BOGWICC

Leviticus 25 in the BOHCB

Leviticus 25 in the BOHCV

Leviticus 25 in the BOHLNT

Leviticus 25 in the BOHNTLTAL

Leviticus 25 in the BOILNTAP

Leviticus 25 in the BOITCV

Leviticus 25 in the BOKCV

Leviticus 25 in the BOKCV2

Leviticus 25 in the BOKHWOG

Leviticus 25 in the BOKSSV

Leviticus 25 in the BOLCB

Leviticus 25 in the BOLCB2

Leviticus 25 in the BOMCV

Leviticus 25 in the BONAV

Leviticus 25 in the BONCB

Leviticus 25 in the BONLT

Leviticus 25 in the BONUT2

Leviticus 25 in the BOPLNT

Leviticus 25 in the BOSCB

Leviticus 25 in the BOSNC

Leviticus 25 in the BOTLNT

Leviticus 25 in the BOVCB

Leviticus 25 in the BOYCB

Leviticus 25 in the BPBB

Leviticus 25 in the BPH

Leviticus 25 in the BSB

Leviticus 25 in the CCB

Leviticus 25 in the CUV

Leviticus 25 in the CUVS

Leviticus 25 in the DBT

Leviticus 25 in the DGDNT

Leviticus 25 in the DHNT

Leviticus 25 in the DNT

Leviticus 25 in the ELBE

Leviticus 25 in the EMTV

Leviticus 25 in the ESV

Leviticus 25 in the FBV

Leviticus 25 in the FEB

Leviticus 25 in the GGMNT

Leviticus 25 in the GNT

Leviticus 25 in the HARY

Leviticus 25 in the HNT

Leviticus 25 in the IRVA

Leviticus 25 in the IRVB

Leviticus 25 in the IRVG

Leviticus 25 in the IRVH

Leviticus 25 in the IRVK

Leviticus 25 in the IRVM

Leviticus 25 in the IRVM2

Leviticus 25 in the IRVO

Leviticus 25 in the IRVP

Leviticus 25 in the IRVT

Leviticus 25 in the IRVT2

Leviticus 25 in the IRVU

Leviticus 25 in the ISVN

Leviticus 25 in the JSNT

Leviticus 25 in the KAPI

Leviticus 25 in the KBT1ETNIK

Leviticus 25 in the KBV

Leviticus 25 in the KJV

Leviticus 25 in the KNFD

Leviticus 25 in the LBA

Leviticus 25 in the LBLA

Leviticus 25 in the LNT

Leviticus 25 in the LSV

Leviticus 25 in the MAAL

Leviticus 25 in the MBV

Leviticus 25 in the MBV2

Leviticus 25 in the MHNT

Leviticus 25 in the MKNFD

Leviticus 25 in the MNG

Leviticus 25 in the MNT

Leviticus 25 in the MNT2

Leviticus 25 in the MRS1T

Leviticus 25 in the NAA

Leviticus 25 in the NASB

Leviticus 25 in the NBLA

Leviticus 25 in the NBS

Leviticus 25 in the NBVTP

Leviticus 25 in the NET2

Leviticus 25 in the NIV11

Leviticus 25 in the NNT

Leviticus 25 in the NNT2

Leviticus 25 in the NNT3

Leviticus 25 in the PDDPT

Leviticus 25 in the PFNT

Leviticus 25 in the RMNT

Leviticus 25 in the SBIAS

Leviticus 25 in the SBIBS

Leviticus 25 in the SBIBS2

Leviticus 25 in the SBICS

Leviticus 25 in the SBIDS

Leviticus 25 in the SBIGS

Leviticus 25 in the SBIHS

Leviticus 25 in the SBIIS

Leviticus 25 in the SBIIS2

Leviticus 25 in the SBIIS3

Leviticus 25 in the SBIKS

Leviticus 25 in the SBIKS2

Leviticus 25 in the SBIMS

Leviticus 25 in the SBIOS

Leviticus 25 in the SBIPS

Leviticus 25 in the SBISS

Leviticus 25 in the SBITS

Leviticus 25 in the SBITS2

Leviticus 25 in the SBITS3

Leviticus 25 in the SBITS4

Leviticus 25 in the SBIUS

Leviticus 25 in the SBIVS

Leviticus 25 in the SBT

Leviticus 25 in the SBT1E

Leviticus 25 in the SCHL

Leviticus 25 in the SNT

Leviticus 25 in the SUSU

Leviticus 25 in the SUSU2

Leviticus 25 in the SYNO

Leviticus 25 in the TBIAOTANT

Leviticus 25 in the TBT1E

Leviticus 25 in the TBT1E2

Leviticus 25 in the TFTIP

Leviticus 25 in the TFTU

Leviticus 25 in the TGNTATF3T

Leviticus 25 in the THAI

Leviticus 25 in the TNFD

Leviticus 25 in the TNT

Leviticus 25 in the TNTIK

Leviticus 25 in the TNTIL

Leviticus 25 in the TNTIN

Leviticus 25 in the TNTIP

Leviticus 25 in the TNTIZ

Leviticus 25 in the TOMA

Leviticus 25 in the TTENT

Leviticus 25 in the UBG

Leviticus 25 in the UGV

Leviticus 25 in the UGV2

Leviticus 25 in the UGV3

Leviticus 25 in the VBL

Leviticus 25 in the VDCC

Leviticus 25 in the YALU

Leviticus 25 in the YAPE

Leviticus 25 in the YBVTP

Leviticus 25 in the ZBP