Leviticus 7 (BOICB)

1 “ ‘Ndị a bụ usoro iwu banyere aja ikpe ọmụma, bụ nke dịkarịsịrị nsọ. 2 A ga-egbu anụ aja ikpe ọmụma ahụ nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, were ọbara ya fesaa nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja. 3 Abụba ya niile ka a ga-enye dịka onyinye: abụba dị nʼọdụdụ ya, na abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, 4 na akụrụ abụọ ya, na abụba nke dị nʼelu ha, ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya. 5 Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ. Ọ bụ aja ikpe ọmụma. 6 Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ fọdụrụ na ya, maọbụ nʼebe nsọ ka aghaghị ịnọ rie ya. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. 7 “ ‘Otu iwu a metụtakwara aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Anụ ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ nke ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie. Oke ya ka ọ bụ. 8 Onye nchụaja nke chụrụ aja nsure ọkụ nʼisi onye ọbụla, ka ọ dịrị iwere akpụkpọ niile si nʼanụ ahụ o ji chụọ aja nye onwe ya. 9 A ga-ebunye onye nchụaja chụrụ aja mkpụrụ ọka nke e ji ụtụ ọka chụọ, ụtụ ọka fọdụrụ. Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼaja achịcha ọbụla a nụrụ anụ, maọbụ nke e siri esi, maọbụ nke e ghere eghe. Ihe ọbụla fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja ahụ. 10 Aja mkpụrụ ọka ọbụla, ma nke e tinyere mmanụ, ma nke a na-etinyeghị mmanụ, nke fọdụrụ ga-abụ nke ụmụ ndị ikom Erọn. 11 “ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara aja udo nke mmadụ ọbụla nwere ike chụọrọ ONYENWE ANYỊ nʼaja: 12 “ ‘Ọ bụrụ na ha enye ya dịka aja ekele, tinyere aja ekele a ha ga-eweta ogbe achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke a gwakọtara ya na mmanụ oliv, na mbadamba achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke e tere mmanụ nʼelu ya, nakwa achịcha e ji ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara ya na mmanụ nʼime ya. 13 Ọ ga-ewetakwa onyinye achịcha ọzọ nke e ji ihe na-eko achịcha, ya bụ, yiist mee, tinyere aja udo nke ekele ha. 14 Ha ga-esikwa na ya weta otu nʼime onyinye ọbụla, chee nʼihu ONYENWE ANYỊ, dịka onyinye. Ọ bụ nke ndị nchụaja ahụ na-efesa ọbara anụ e ji chụọ aja udo nʼelu ebe ịchụ aja. 15 Ma anụ ahụ eji chụọ aja onyinye udo nke ekele, ka a ga-eri nʼotu ụbọchị ahụ e ji ha chụọ aja. O nweghị nke a ga-ahapụ ka ọ bọọ chi. 16 “ ‘Ma ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ onyinye afọ ofufu, maọbụ onyinye o wetara nʼihi nkwa o kwere, a ga-eri anụ aja ahụ nʼụbọchị ahụ a chụrụ ya, nweekwa ike rie nke fọdụrụ ma chi bọọ. 17 Ma anụ ọbụla fọdụrụ nʼime anụ aja ahụ, nke a na-erichapụghị nʼụbọchị nke abụọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ. 18 Ọ bụrụ na e rie anụ aja udo ahụ nʼụbọchị nke atọ, a gaghị anabata ya. A gaghị agụnyere ya onye ahụ wetara ya nʼihi na ihe rụrụ arụ ka ọ bụ. Onye ọbụla riri ya ga-abụ onye ikpe mara. 19 “ ‘Anụ ọbụla nke metụrụ ihe rụrụ arụ aghọọla ihe na-adịghị ọcha. A gaghị eri ya. A ga-akpọ ya ọkụ. Ma nʼebe anụ ndị ọzọ dị, onye ọbụla e mere ka ọ dị ọcha nwere ike iri ya. 20 A ga-esite nʼetiti ndị m kewapụ onye ọbụla riri anụ e ji chụọ aja udo nye ONYENWE ANYỊ mgbe onye ahụ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha. 21 Onye ọbụla metụrụ ihe ọbụla rụrụ arụ aka, ma ịrụ arụ ahụ o si na mmadụ, ma o si nʼanụ ọhịa, ma o si nʼihe ọbụla ọzọ, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya ma ọ bụrụ na onye ahụ anọrọ nʼọnọdụ ahụ rie anụ e ji chụọ aja udo nye ONYENWE ANYỊ.’ ” 22 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 23 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Unu erila abụba ehi, maọbụ nke ewu, maọbụ nke atụrụ. 24 Abụba anụ ọbụla nwụrụ anwụ maọbụ nke anụ ọhịa gburu adịghị mma oriri. E nwere ike jiri ha mee ihe ọzọ. 25 A ga-ekewapụ mmadụ ọbụla site nʼetiti ndị ya, bụ onye na-eri abụba anụmanụ nke a ga-esite na ya chee onyinye nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ. 26 Ọzọkwa, unu erila ọbara nnụnụ maọbụ nke anụmanụ nʼebe ọbụla unu bi. 27 Onye ọbụla riri ọbara ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.’ ” 28 ONYENWE ANYỊ gwakwara Mosis sị, 29 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla wetaara ONYENWE ANYỊ onyinye aja udo aghaghị iweta ụfọdụ nʼime onyinye ahụ dịka onyinye pụrụ iche nye Onyenwe anyị. 30 Ha ga-eji aka ha chee onyinye nsure ọkụ ahụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ha ga-eweta abụba ahụ, ya na obi anụ, fufee obi anụ ahụ nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka aja mfufe. 31 Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja, ma obi anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị ikom. 32 Unu ga-enye onye nchụaja apata aka nri nke anụ aja udo ahụ, dịka onyinye. 33 Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya. 34 Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’ ” 35 Nke a bụ akụkụ anụ ahụ e ji chụọ aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ, nke e nyekwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼụbọchị ahụ e chere ha nʼihu ONYENWE ANYỊ ijere ya ozi dịka ndị nchụaja. 36 Nʼihi na nʼụbọchị ahụ e tere ha mmanụ ka ONYENWE ANYỊ nyere ụmụ Izrel iwu sị ha nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom oke ndị a oge niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 37 Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na aja mmehie, na aja ikpe ọmụma, na onyinye ido nsọ, na aja udo. 38 ONYENWE ANYỊ nyere Mosis iwu ndị a nʼugwu Saịnaị nʼụbọchị ahụ o nyere ụmụ Izrel iwu sị ha, wetara ONYENWE ANYỊ onyinye nʼọzara Saịnaị.

In Other Versions

Leviticus 7 in the ANGEFD

Leviticus 7 in the ANTPNG2D

Leviticus 7 in the AS21

Leviticus 7 in the BAGH

Leviticus 7 in the BBPNG

Leviticus 7 in the BBT1E

Leviticus 7 in the BDS

Leviticus 7 in the BEV

Leviticus 7 in the BHAD

Leviticus 7 in the BIB

Leviticus 7 in the BLPT

Leviticus 7 in the BNT

Leviticus 7 in the BNTABOOT

Leviticus 7 in the BNTLV

Leviticus 7 in the BOATCB

Leviticus 7 in the BOATCB2

Leviticus 7 in the BOBCV

Leviticus 7 in the BOCNT

Leviticus 7 in the BOECS

Leviticus 7 in the BOGWICC

Leviticus 7 in the BOHCB

Leviticus 7 in the BOHCV

Leviticus 7 in the BOHLNT

Leviticus 7 in the BOHNTLTAL

Leviticus 7 in the BOILNTAP

Leviticus 7 in the BOITCV

Leviticus 7 in the BOKCV

Leviticus 7 in the BOKCV2

Leviticus 7 in the BOKHWOG

Leviticus 7 in the BOKSSV

Leviticus 7 in the BOLCB

Leviticus 7 in the BOLCB2

Leviticus 7 in the BOMCV

Leviticus 7 in the BONAV

Leviticus 7 in the BONCB

Leviticus 7 in the BONLT

Leviticus 7 in the BONUT2

Leviticus 7 in the BOPLNT

Leviticus 7 in the BOSCB

Leviticus 7 in the BOSNC

Leviticus 7 in the BOTLNT

Leviticus 7 in the BOVCB

Leviticus 7 in the BOYCB

Leviticus 7 in the BPBB

Leviticus 7 in the BPH

Leviticus 7 in the BSB

Leviticus 7 in the CCB

Leviticus 7 in the CUV

Leviticus 7 in the CUVS

Leviticus 7 in the DBT

Leviticus 7 in the DGDNT

Leviticus 7 in the DHNT

Leviticus 7 in the DNT

Leviticus 7 in the ELBE

Leviticus 7 in the EMTV

Leviticus 7 in the ESV

Leviticus 7 in the FBV

Leviticus 7 in the FEB

Leviticus 7 in the GGMNT

Leviticus 7 in the GNT

Leviticus 7 in the HARY

Leviticus 7 in the HNT

Leviticus 7 in the IRVA

Leviticus 7 in the IRVB

Leviticus 7 in the IRVG

Leviticus 7 in the IRVH

Leviticus 7 in the IRVK

Leviticus 7 in the IRVM

Leviticus 7 in the IRVM2

Leviticus 7 in the IRVO

Leviticus 7 in the IRVP

Leviticus 7 in the IRVT

Leviticus 7 in the IRVT2

Leviticus 7 in the IRVU

Leviticus 7 in the ISVN

Leviticus 7 in the JSNT

Leviticus 7 in the KAPI

Leviticus 7 in the KBT1ETNIK

Leviticus 7 in the KBV

Leviticus 7 in the KJV

Leviticus 7 in the KNFD

Leviticus 7 in the LBA

Leviticus 7 in the LBLA

Leviticus 7 in the LNT

Leviticus 7 in the LSV

Leviticus 7 in the MAAL

Leviticus 7 in the MBV

Leviticus 7 in the MBV2

Leviticus 7 in the MHNT

Leviticus 7 in the MKNFD

Leviticus 7 in the MNG

Leviticus 7 in the MNT

Leviticus 7 in the MNT2

Leviticus 7 in the MRS1T

Leviticus 7 in the NAA

Leviticus 7 in the NASB

Leviticus 7 in the NBLA

Leviticus 7 in the NBS

Leviticus 7 in the NBVTP

Leviticus 7 in the NET2

Leviticus 7 in the NIV11

Leviticus 7 in the NNT

Leviticus 7 in the NNT2

Leviticus 7 in the NNT3

Leviticus 7 in the PDDPT

Leviticus 7 in the PFNT

Leviticus 7 in the RMNT

Leviticus 7 in the SBIAS

Leviticus 7 in the SBIBS

Leviticus 7 in the SBIBS2

Leviticus 7 in the SBICS

Leviticus 7 in the SBIDS

Leviticus 7 in the SBIGS

Leviticus 7 in the SBIHS

Leviticus 7 in the SBIIS

Leviticus 7 in the SBIIS2

Leviticus 7 in the SBIIS3

Leviticus 7 in the SBIKS

Leviticus 7 in the SBIKS2

Leviticus 7 in the SBIMS

Leviticus 7 in the SBIOS

Leviticus 7 in the SBIPS

Leviticus 7 in the SBISS

Leviticus 7 in the SBITS

Leviticus 7 in the SBITS2

Leviticus 7 in the SBITS3

Leviticus 7 in the SBITS4

Leviticus 7 in the SBIUS

Leviticus 7 in the SBIVS

Leviticus 7 in the SBT

Leviticus 7 in the SBT1E

Leviticus 7 in the SCHL

Leviticus 7 in the SNT

Leviticus 7 in the SUSU

Leviticus 7 in the SUSU2

Leviticus 7 in the SYNO

Leviticus 7 in the TBIAOTANT

Leviticus 7 in the TBT1E

Leviticus 7 in the TBT1E2

Leviticus 7 in the TFTIP

Leviticus 7 in the TFTU

Leviticus 7 in the TGNTATF3T

Leviticus 7 in the THAI

Leviticus 7 in the TNFD

Leviticus 7 in the TNT

Leviticus 7 in the TNTIK

Leviticus 7 in the TNTIL

Leviticus 7 in the TNTIN

Leviticus 7 in the TNTIP

Leviticus 7 in the TNTIZ

Leviticus 7 in the TOMA

Leviticus 7 in the TTENT

Leviticus 7 in the UBG

Leviticus 7 in the UGV

Leviticus 7 in the UGV2

Leviticus 7 in the UGV3

Leviticus 7 in the VBL

Leviticus 7 in the VDCC

Leviticus 7 in the YALU

Leviticus 7 in the YAPE

Leviticus 7 in the YBVTP

Leviticus 7 in the ZBP