Micah 6 (BOICB)
1 Geenụ ntị nʼihe Onyenwe anyị na-ekwu,“Bilienụ ọtọ, ma kwuonụ nʼihu ugwu niile ụzọ m siri mejọọ unu.Ka ugwu nta niile nụkwa ihe i nwere ikwu. 2 “Ma ugbu a geenụ ntị, unu ugwu niile,geenụ ntị, unu ntọala ebighị ebi niile nke ụwa,nʼihi na ONYENWE ANYỊ nwere ikpe megide ndị nke ya.Ọ bụkwa Izrel ka ọ ga-arụso ụka. 3 “Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu?Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m. 4 Nʼihi na e si m nʼala Ijipt kpọpụta unu.Agbapụtara m unu site na ịbụ ohu,nye unu Mosisna Erọn na Miriam ka ha nyere unu aka. 5 Ndị m, chetanụihe Balak eze Moab zuberena ihe Belam nwa Beoa zara ya.Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal,ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.” 6 Gịnị ka m ga-eji bịa nʼihu ONYENWE ANYỊ,ịkpọ isiala nʼihu Chineke onye dị oke elu?M ga-eji onyinye aja nsure ọkụ bịa nʼihu yanke e ji ụmụ ehi gbara otu afọ chụọ? 7 Ọ ga-atọ ONYENWE ANYỊ ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule,ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi?Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m,maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m? 8 Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma.Gịnịkwa bụ ihe ahụ ONYENWE ANYỊ na-achọ nʼaka gị,Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya,na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije? 9 Gee ntị! Olu ONYENWE ANYỊ na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ,nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe.“Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya. 10 Ọ ga-abụ na m ga-echezọ akụ ị kpara nʼụzọ na-ezighị ezi, gị ụlọ ajọ omume,ya na ihe ọtụtụ nke na-erughị eru unu ji ere ahịa, bụ nke abụrụ ọnụ? 11 M ga-asị onye na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ azụ ahịa,na onye bu akpa nke ihe ọtụtụ aghụghọ dị iche iche juru nʼime ya na aka ya dị ọcha? 12 Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike,ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha,ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ. 13 Nʼihi ya, ebidola m ịla unu nʼiyi,na ime ka unu bụrụ ndị e bibiri nʼihi mmehie unu 14 Unu ga-eri nri ma afọ agaghị eju unu;afọ agaghị ejukwa unu eju.Unu ga-ewezuga ihe, ma unu agaghị echekwa ha,nʼihi na ihe ọbụla unu nwere ike chekwaa, ka m ga-ewere nyefee nʼaka mma agha. 15 Unu ga-akụ mkpụrụ, ma unu agaghị ewe ihe ubi,unu ga-azọchapụta mmanụ oliv, ma unu agaghị ete ya nʼahụ unu;unu ga-azọchapụtakwa mmanya site na mkpụrụ vaịnị, ma unu agaghị aṅụ mmanya ya. 16 Unu edebela ụkpụrụ niile bụ nke Omri,na omenaala niile nke ụlọ Ehab,unu gbasokwara ndụmọdụ ha niile.Nʼihi ya, aga m enyefe unu nʼaka mbibimee ka ndị gị ghọọkwa ihe ọchị,unu ga-aghọkwara mba niile ihe nkọcha.”
In Other Versions
Micah 6 in the ANGEFD
Micah 6 in the ANTPNG2D
Micah 6 in the AS21
Micah 6 in the BAGH
Micah 6 in the BBPNG
Micah 6 in the BBT1E
Micah 6 in the BDS
Micah 6 in the BEV
Micah 6 in the BHAD
Micah 6 in the BIB
Micah 6 in the BLPT
Micah 6 in the BNT
Micah 6 in the BNTABOOT
Micah 6 in the BNTLV
Micah 6 in the BOATCB
Micah 6 in the BOATCB2
Micah 6 in the BOBCV
Micah 6 in the BOCNT
Micah 6 in the BOECS
Micah 6 in the BOGWICC
Micah 6 in the BOHCB
Micah 6 in the BOHCV
Micah 6 in the BOHLNT
Micah 6 in the BOHNTLTAL
Micah 6 in the BOILNTAP
Micah 6 in the BOITCV
Micah 6 in the BOKCV
Micah 6 in the BOKCV2
Micah 6 in the BOKHWOG
Micah 6 in the BOKSSV
Micah 6 in the BOLCB
Micah 6 in the BOLCB2
Micah 6 in the BOMCV
Micah 6 in the BONAV
Micah 6 in the BONCB
Micah 6 in the BONLT
Micah 6 in the BONUT2
Micah 6 in the BOPLNT
Micah 6 in the BOSCB
Micah 6 in the BOSNC
Micah 6 in the BOTLNT
Micah 6 in the BOVCB
Micah 6 in the BOYCB
Micah 6 in the BPBB
Micah 6 in the BPH
Micah 6 in the BSB
Micah 6 in the CCB
Micah 6 in the CUV
Micah 6 in the CUVS
Micah 6 in the DBT
Micah 6 in the DGDNT
Micah 6 in the DHNT
Micah 6 in the DNT
Micah 6 in the ELBE
Micah 6 in the EMTV
Micah 6 in the ESV
Micah 6 in the FBV
Micah 6 in the FEB
Micah 6 in the GGMNT
Micah 6 in the GNT
Micah 6 in the HARY
Micah 6 in the HNT
Micah 6 in the IRVA
Micah 6 in the IRVB
Micah 6 in the IRVG
Micah 6 in the IRVH
Micah 6 in the IRVK
Micah 6 in the IRVM
Micah 6 in the IRVM2
Micah 6 in the IRVO
Micah 6 in the IRVP
Micah 6 in the IRVT
Micah 6 in the IRVT2
Micah 6 in the IRVU
Micah 6 in the ISVN
Micah 6 in the JSNT
Micah 6 in the KAPI
Micah 6 in the KBT1ETNIK
Micah 6 in the KBV
Micah 6 in the KJV
Micah 6 in the KNFD
Micah 6 in the LBA
Micah 6 in the LBLA
Micah 6 in the LNT
Micah 6 in the LSV
Micah 6 in the MAAL
Micah 6 in the MBV
Micah 6 in the MBV2
Micah 6 in the MHNT
Micah 6 in the MKNFD
Micah 6 in the MNG
Micah 6 in the MNT
Micah 6 in the MNT2
Micah 6 in the MRS1T
Micah 6 in the NAA
Micah 6 in the NASB
Micah 6 in the NBLA
Micah 6 in the NBS
Micah 6 in the NBVTP
Micah 6 in the NET2
Micah 6 in the NIV11
Micah 6 in the NNT
Micah 6 in the NNT2
Micah 6 in the NNT3
Micah 6 in the PDDPT
Micah 6 in the PFNT
Micah 6 in the RMNT
Micah 6 in the SBIAS
Micah 6 in the SBIBS
Micah 6 in the SBIBS2
Micah 6 in the SBICS
Micah 6 in the SBIDS
Micah 6 in the SBIGS
Micah 6 in the SBIHS
Micah 6 in the SBIIS
Micah 6 in the SBIIS2
Micah 6 in the SBIIS3
Micah 6 in the SBIKS
Micah 6 in the SBIKS2
Micah 6 in the SBIMS
Micah 6 in the SBIOS
Micah 6 in the SBIPS
Micah 6 in the SBISS
Micah 6 in the SBITS
Micah 6 in the SBITS2
Micah 6 in the SBITS3
Micah 6 in the SBITS4
Micah 6 in the SBIUS
Micah 6 in the SBIVS
Micah 6 in the SBT
Micah 6 in the SBT1E
Micah 6 in the SCHL
Micah 6 in the SNT
Micah 6 in the SUSU
Micah 6 in the SUSU2
Micah 6 in the SYNO
Micah 6 in the TBIAOTANT
Micah 6 in the TBT1E
Micah 6 in the TBT1E2
Micah 6 in the TFTIP
Micah 6 in the TFTU
Micah 6 in the TGNTATF3T
Micah 6 in the THAI
Micah 6 in the TNFD
Micah 6 in the TNT
Micah 6 in the TNTIK
Micah 6 in the TNTIL
Micah 6 in the TNTIN
Micah 6 in the TNTIP
Micah 6 in the TNTIZ
Micah 6 in the TOMA
Micah 6 in the TTENT
Micah 6 in the UBG
Micah 6 in the UGV
Micah 6 in the UGV2
Micah 6 in the UGV3
Micah 6 in the VBL
Micah 6 in the VDCC
Micah 6 in the YALU
Micah 6 in the YAPE
Micah 6 in the YBVTP
Micah 6 in the ZBP