Numbers 11 (BOICB)

1 Mgbe na-adịghị anya ụmụ Izrel bidoro itamu ntamu nʼihi ihe ike niile ha na-ezute nʼije ha. Ma ntamu a ruru ONYENWE ANYỊ ntị. Nʼihi ya, ONYENWE ANYỊ were iwe dị ukwuu megide ha. Ọkụ sitere nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ, ree nʼetiti ha, repịa ụfọdụ ndị bi nʼakụkụ ngwụsị ọmụma ụlọ ikwu ahụ. 2 Mgbe nke a mere, ụmụ Izrel tikuru Mosis mkpu akwa. Mosis kpere ekpere nye ONYENWE ANYỊ nʼihi ha, ọkụ ahụ kwụsịkwara. 3 Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Tabera, nʼihi ọkụ ahụ si nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ ree nʼetiti ha. 4 Ndị amakekwu so ụmụ Izrel nʼije a malitere itamu ntamu banyere nri ndị ọzọ na-agụ ha agụụ. Nke a mere ka ụmụ Izrel malite ịkwa akwa, na-asị, “A sịkwarị na anyị nwere anụ anyị ga-ata. 5 Anyị chetara azụ anyị tara nʼIjipt, nke na-adịghị efu anyị ego, ya na kukumba, na melọn, na liik, na ayo na galiik. 6 Ma ugbu a, anyị enweghịkwa agụụ iri nri, nʼihi na site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọ bụ naanị mánà bụ ihe oriri anyị nwere.” 7 Mánà dịka mkpụrụ kọrianda, na-acha ka eso osisi kpọrọ nkụ. 8 Ndị Izrel na-ejegharị na-achịkọta ha. Emesịa, ha na-eji nkume e ji akwọ nri na-akwọri ha. Oge ụfọdụ, ha na-eji ikwe nri sụọ ya. Emesịa, ha na-esi ya esi, maọbụ ghee ya eghe. Ọ na-atọ dịka ihe e ji mmanụ oliv ghee. 9 Mánà ndị a na-ada mgbe igirigi dara nʼọmụma ụlọ ikwu nʼabalị. 10 Mosis nụrụ mkpu akwa ụmụ Izrel niile, nke na-ada nʼezinaụlọ ọbụla nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha. Iwe were ONYENWE ANYỊ nke ukwuu. Otu a kwa, obi jọrọ Mosis njọ nke ukwuu. 11 Mosis jụrụ ONYENWE ANYỊ sị, “Gịnị mere i ji bokwasị ohu gị nsogbu dị otu a nʼisi? Gịnị ka m mere na m ahụtakwaghị amara nʼebe ị nọ, nke mere i ji bukwasị m ibu arọ nke ilekọta ndị a? 12 Ọ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ bụ m mụrụ ha? Gịnị mere i ji si m kuru ha nʼaka m gawa nʼala ahụ ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, dịka m bụ nne nwa na-ekugharị nwantakịrị? 13 Ebee ka m ga-achọta anụ ga-ezuru igwe mmadụ ndị a? Lee na ha na-akwasa m akwa na-asị m, ‘Nye anyị anụ!’ 14 Agaghị m ebulite ibu ịchịkọta ndị a niile nʼonwe m! Ibu a dị m arọ nke ukwuu. 15 Ọ bụrụ na ị ga-esi otu a meso m mmeso, biko napụ m ndụ m ugbu a, nʼihi na ọnwụ m ga-egosi na m natara amara nʼebe ị nọ. Site nʼọnọdụ a ga-ewetara m mbibi wezuga m.” 16 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, “Kpọkọta iri ndị okenye ụmụ Izrel asaa, ndị ị maara na ha bụ ndị ndu, na ndị nlekọta ije ozi nʼetiti ụmụ Izrel. Kpọta ha nʼụlọ nzute m ka ha soro gị guzoro. 17 Aga m abịa nʼebe ahụ gwa gị okwu. Mgbe ahụ kwa, aga m ewere ụfọdụ nʼime Mmụọ m dị nʼime gị tinye nʼime iri ndị ndu asaa ahụ. Ha ga-enyere gị aka ibu ibu arọ nke ịchịkọta ụmụ Izrel. Nʼụzọ dị otu a, ọ gaghị abụkwa ibu dịrị naanị gị ibu. 18 “Ugbu a, gwa ndị Izrel niile si ha, ‘Doonụ onwe unu nsọ, kwadoonụ maka echi, mgbe unu ga-ata anụ. ONYENWE ANYỊ nụrụ mgbe unu kwara akwa sị, “A sịkwa na anyị nwere anụ anyị ga-ata. Ihe dịrị anyị mma nʼIjipt karịa otu ọ dị ugbu a.” 19 Anụ unu ga-eri abụghị naanị nke otu ụbọchị, maọbụ ụbọchị abụọ, maọbụ ụbọchị ise, maọbụ iri, ma ọ bụkwanụ iri ụbọchị abụọ! 20 Kama unu ga-eri ya otu ọnwa zuru ezu, ruo mgbe ọ ga-esi unu nʼimi sọpụta, ghọrọ unu ihe ịsọ oyi. Nʼihi na unu ajụla ONYENWE ANYỊ, onye nọ nʼetiti unu, kwaa akwa nʼihu ya, sị, “Gịnị mere anyị ji site nʼala Ijipt pụta?” ’ ” 21 Ma Mosis sịrị ONYENWE ANYỊ, “Ọnụọgụgụ ndị ikom dị narị puku isii ndị ji ụkwụ eje ka m nọ nʼetiti ha, ma ị na-asị, ‘Aga m enye ha anụ otu ọnwa.’ 22 Ọ ga-ezuru ha ma ọ bụrụ na e gbuoro ha igwe ehi na atụrụ? Ọ bụ azụ niile nke dị nʼoke osimiri ga-ezuru ha ma egbuo ha niile nye ha?” 23 ONYENWE ANYỊ sịrị Mosis, “Aka ONYENWE ANYỊ ọ dị mkpụmkpụ? Ugbu a, ị ga-ahụ ma m ga-emezu okwu m, maọbụ na m agaghị emezu ya.” 24 Ya mere, Mosis pụrụ ga gwa ụmụ Izrel ihe ONYENWE ANYỊ kwuru. Ọ chịkọtara iri ndị okenye asaa ahụ nye ha ọnọdụ gburugburu ụlọ nzute ahụ. 25 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ rịdatara nʼime igwe ojii. Ya na Mosis kparịtaa ụka. ONYENWE ANYỊ weere ụfọdụ nʼime Mmụọ dị nʼime Mosis, tinye ya nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ. Mgbe Mmụọ a batara nʼime ha, ha niile buru amụma. Ma ha ebughị amụma gaa nʼihu. 26 Ma mmadụ abụọ nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ, Eldad na Medad nọgidere nʼọmụma ụlọ ikwu ha. Ọ bụ ezie na e depụtara aha ha dịka ndị ndu, ma ha esoghị ndị ọzọ gaa nʼụlọ nzute. Ma Mmụọ ahụ bịakwasịrị ha nʼebe ahụ ha nọ. Ha bukwara amụma. 27 Otu okorobịa gbapụrụ ọsọ gaa kọọrọ Mosis sị ya, “Eldad na Medad na-ebu amụma nʼọmụma ụlọ ikwu ha.” 28 Joshua nwa Nun, onyeozi Mosis site na mgbe ọ bụ okorobịa, gwara Mosis okwu sị ya, “Onyenwe m Mosis, mee ka ndị a kwụsị ibu amụma.” 29 Ma Mosis zara sị, “Ọ bụ nʼihi ikwochitara m ekworo ka i ji chọọ ka m kwụsị ha? Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na ndị ONYENWE ANYỊ niile bụ ndị amụma, ndị ONYENWE ANYỊ ga-etinye Mmụọ ya nʼime ha!” 30 Mgbe ahụ Mosis na ndị okenye Izrel ndị ahụ niile lọghachiri nʼebe ụlọ ikwu ha dị. 31 Otu oke ifufe sitere nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ bịa si nʼosimiri bute ọtụtụ nnụnụ a na-akpọ kweel. O mere ka nnụnụ ndị a daa nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha, nʼime ogige ya niile. Nnụnụ ndị a fere ihe dịka otu mita site nʼelu ala, nʼakụkụ niile, ruo nʼebe mmadụ pụrụ iji ụkwụ jeruo nʼotu ụbọchị. Ha jupụtakwara ebe niile. 32 Ya mere ndị Izrel biliri ụbọchị ahụ niile, na nʼabalị ahụ niile, na echi ya niile pụọ ịchịkọta nnụnụ kweel ndị a! Onye gbutere nke nta gbutezuru ihe ọtụtụ homa iri. Ha gbasara ha akụkụ niile nke ogige ọmụma ụlọ ikwu ahụ. 33 Ma mgbe anụ ndị a ka dị ha nʼọnụ, ONYENWE ANYỊ were iwe dị ukwuu megide ha. O tiri ha nrịa nrịa na-efe efe. 34 Nʼihi nke a, a kpọrọ aha ebe ahụ Kibrọt Hataava, nʼihi na nʼebe ahụ ka e liri ndị Izrel nwụrụ nʼihi oke ọchịchọ nri. 35 Site na Kibrọt Hataava, ndị Izrel biliri njem rute Hazerọt ebe ha nọrọ.

In Other Versions

Numbers 11 in the ANGEFD

Numbers 11 in the ANTPNG2D

Numbers 11 in the AS21

Numbers 11 in the BAGH

Numbers 11 in the BBPNG

Numbers 11 in the BBT1E

Numbers 11 in the BDS

Numbers 11 in the BEV

Numbers 11 in the BHAD

Numbers 11 in the BIB

Numbers 11 in the BLPT

Numbers 11 in the BNT

Numbers 11 in the BNTABOOT

Numbers 11 in the BNTLV

Numbers 11 in the BOATCB

Numbers 11 in the BOATCB2

Numbers 11 in the BOBCV

Numbers 11 in the BOCNT

Numbers 11 in the BOECS

Numbers 11 in the BOGWICC

Numbers 11 in the BOHCB

Numbers 11 in the BOHCV

Numbers 11 in the BOHLNT

Numbers 11 in the BOHNTLTAL

Numbers 11 in the BOILNTAP

Numbers 11 in the BOITCV

Numbers 11 in the BOKCV

Numbers 11 in the BOKCV2

Numbers 11 in the BOKHWOG

Numbers 11 in the BOKSSV

Numbers 11 in the BOLCB

Numbers 11 in the BOLCB2

Numbers 11 in the BOMCV

Numbers 11 in the BONAV

Numbers 11 in the BONCB

Numbers 11 in the BONLT

Numbers 11 in the BONUT2

Numbers 11 in the BOPLNT

Numbers 11 in the BOSCB

Numbers 11 in the BOSNC

Numbers 11 in the BOTLNT

Numbers 11 in the BOVCB

Numbers 11 in the BOYCB

Numbers 11 in the BPBB

Numbers 11 in the BPH

Numbers 11 in the BSB

Numbers 11 in the CCB

Numbers 11 in the CUV

Numbers 11 in the CUVS

Numbers 11 in the DBT

Numbers 11 in the DGDNT

Numbers 11 in the DHNT

Numbers 11 in the DNT

Numbers 11 in the ELBE

Numbers 11 in the EMTV

Numbers 11 in the ESV

Numbers 11 in the FBV

Numbers 11 in the FEB

Numbers 11 in the GGMNT

Numbers 11 in the GNT

Numbers 11 in the HARY

Numbers 11 in the HNT

Numbers 11 in the IRVA

Numbers 11 in the IRVB

Numbers 11 in the IRVG

Numbers 11 in the IRVH

Numbers 11 in the IRVK

Numbers 11 in the IRVM

Numbers 11 in the IRVM2

Numbers 11 in the IRVO

Numbers 11 in the IRVP

Numbers 11 in the IRVT

Numbers 11 in the IRVT2

Numbers 11 in the IRVU

Numbers 11 in the ISVN

Numbers 11 in the JSNT

Numbers 11 in the KAPI

Numbers 11 in the KBT1ETNIK

Numbers 11 in the KBV

Numbers 11 in the KJV

Numbers 11 in the KNFD

Numbers 11 in the LBA

Numbers 11 in the LBLA

Numbers 11 in the LNT

Numbers 11 in the LSV

Numbers 11 in the MAAL

Numbers 11 in the MBV

Numbers 11 in the MBV2

Numbers 11 in the MHNT

Numbers 11 in the MKNFD

Numbers 11 in the MNG

Numbers 11 in the MNT

Numbers 11 in the MNT2

Numbers 11 in the MRS1T

Numbers 11 in the NAA

Numbers 11 in the NASB

Numbers 11 in the NBLA

Numbers 11 in the NBS

Numbers 11 in the NBVTP

Numbers 11 in the NET2

Numbers 11 in the NIV11

Numbers 11 in the NNT

Numbers 11 in the NNT2

Numbers 11 in the NNT3

Numbers 11 in the PDDPT

Numbers 11 in the PFNT

Numbers 11 in the RMNT

Numbers 11 in the SBIAS

Numbers 11 in the SBIBS

Numbers 11 in the SBIBS2

Numbers 11 in the SBICS

Numbers 11 in the SBIDS

Numbers 11 in the SBIGS

Numbers 11 in the SBIHS

Numbers 11 in the SBIIS

Numbers 11 in the SBIIS2

Numbers 11 in the SBIIS3

Numbers 11 in the SBIKS

Numbers 11 in the SBIKS2

Numbers 11 in the SBIMS

Numbers 11 in the SBIOS

Numbers 11 in the SBIPS

Numbers 11 in the SBISS

Numbers 11 in the SBITS

Numbers 11 in the SBITS2

Numbers 11 in the SBITS3

Numbers 11 in the SBITS4

Numbers 11 in the SBIUS

Numbers 11 in the SBIVS

Numbers 11 in the SBT

Numbers 11 in the SBT1E

Numbers 11 in the SCHL

Numbers 11 in the SNT

Numbers 11 in the SUSU

Numbers 11 in the SUSU2

Numbers 11 in the SYNO

Numbers 11 in the TBIAOTANT

Numbers 11 in the TBT1E

Numbers 11 in the TBT1E2

Numbers 11 in the TFTIP

Numbers 11 in the TFTU

Numbers 11 in the TGNTATF3T

Numbers 11 in the THAI

Numbers 11 in the TNFD

Numbers 11 in the TNT

Numbers 11 in the TNTIK

Numbers 11 in the TNTIL

Numbers 11 in the TNTIN

Numbers 11 in the TNTIP

Numbers 11 in the TNTIZ

Numbers 11 in the TOMA

Numbers 11 in the TTENT

Numbers 11 in the UBG

Numbers 11 in the UGV

Numbers 11 in the UGV2

Numbers 11 in the UGV3

Numbers 11 in the VBL

Numbers 11 in the VDCC

Numbers 11 in the YALU

Numbers 11 in the YAPE

Numbers 11 in the YBVTP

Numbers 11 in the ZBP