Numbers 16 (BOICB)

1 Ugbu a, Kora nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livayị, na ụfọdụ ndị agbụrụ Ruben bụ Datan, na Abiram ụmụ Eliab, na On, nwa Pelet nupuru isi 2 bilie imegide Mosis. Ndị so ha bụ narị ndị ikom abụọ na iri ise, ndị ndu a maara nke ọma, ndị so nọdụ nʼụlọ nzukọ ukwuu ndị Izrel. 3 Ha kpọrọ ọgbakọ imegide Mosis na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ Izrel dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. ONYENWE ANYỊ nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ ONYENWE ANYỊ?” 4 Mgbe Mosis nụrụ ihe ndị a ha kwuru, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala. 5 Mgbe ahụ, ọ gwara Kora na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, ONYENWE ANYỊ ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso. 6 Lee ihe ị ga-eme, Echi gị onwe gị Kora, na ndị niile nọnyeere gị, chịrịnụ ihe ịgụ ọkụ, 7 mụnye ha ọkụ. Tinyekwanụ ụda na-esi isi ụtọ nʼime ha, were ha bịa nʼihu ONYENWE ANYỊ. Onye ahụ ONYENWE ANYỊ họpụtara ga-abụ onye ahụ dị nsọ. O zuorola unu, unu ụmụ Livayị!” 8 Mgbe ahụ, Mosis gwakwara Kora okwu ọzọ sị ya, “Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị Livayị! 9 Ọ bụ ihe dị nta nʼanya unu na Chineke nke Izrel kewapụtara unu site na nzukọ ndị Izrel niile, mee ka unu bịaruo ya nso, nʼihi ije ozi nʼụlọ nzute ONYENWE ANYỊ, nakwa iguzo nʼihu nzukọ Izrel niile ijere ha ozi? 10 Ọ kpọbatala gị na ndị Livayị ibe gị nso ebe ọ nọ. Ugbu a, unu na-achọkwa ọrụ nchụaja? 11 Ọ bụ ONYENWE ANYỊ ka gị na ndị sonyeere gị gbara izu megide. Onye ka Erọn bụ unu ji atamu ntamu megide ya?” 12 Mgbe ahụ, Mosis ziri ozi ka a kpọọ Datan na Abiram, ụmụ ndị ikom Eliab, ma ha sịrị, “Anyị agaghị abịa. 13 Ọ bụ na o zurughị gị na i si nʼala Ijipt ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru kpọpụta anyị igbuchapụ anyị nʼọzara a? Ugbu a ị chọkwara ime onwe gị onyenwe anyị? 14 Nke kachasị nke, ị kpọbatabeghị anyị nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. I nyebeghị anyị ihe nketa ala ubi na ubi vaịnị. Ị chọrọ ịghụpụsị ndị ikom ndị a mkpụrụ anya? Anyị agaghị abịa!” 15 Mgbe ahụ, oke iwe were Mosis. Ọ kpọkuru ONYENWE ANYỊ sị ya, “Anabatakwala aja ha niile! Ọ dịbeghị oge m naara ha ihe ọbụla, ọbụladị otu ịnyịnya ibu! O nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha m mejọrọ.” 16 Mgbe ahụ, Mosis sịrị Kora, “Echi, gị na ndị na-esonyere gị ga-apụta bịa nʼihu ONYENWE ANYỊ. Erọn ga-abịakwa. 17 Nwoke ọbụla ga-eweta ihe ịgụ ọkụ nke ya, tinye ya ụda na-esi isi ụtọ, chee ha nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ha niile dị ihe ịgụ ọkụ narị abụọ na iri ise. Gị na Erọn ga-ejikwa nke unu bịa.” 18 Ya mere, nwoke ọbụla wetara ihe ịgụ ọkụ nke ya, mụnye ya ọkụ, ma tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Ha niile guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, ha na Mosis na Erọn. 19 Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-eso ya imegide Mosis na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube ONYENWE ANYỊ pụtara ihe nye ọgbakọ Izrel niile. 20 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn okwu sị, 21 “Sitenụ nʼetiti ọgbakọ ndị a pụọ, ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” 22 Ma Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu ONYENWE ANYỊ rịọọ ya sị, “O Chineke, gị bụ Chineke nwe ndụ mmadụ niile, ị ga-ewe iwe megide nzukọ niile nʼihi mmehie otu onye?” 23 Ma ONYENWE ANYỊ zara Mosis sị ya, 24 “Gwa nzukọ Izrel niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu Kora, Datan na Abiram.’ ” 25 Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis. 26 Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.” 27 Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile. 28 Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ ONYENWE ANYỊ zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m. 29 Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị ONYENWE ANYỊ zitere m. 30 Ma ọ bụrụ na ONYENWE ANYỊ emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala ONYENWE ANYỊ anya.” 31 Mgbe Mosis kpụ okwu a nʼọnụ ya, lee ala ahụ Kora, na Datan, na Abiram, na ndị ezinaụlọ ha niile guzo nʼelu ya kewara abụọ nʼotu ntabi anya ahụ, 32 ala ahụ meghere ọnụ ya, loo ha, na ezinaụlọ ha niile, na ndị ahụ niile so Kora, na ihe niile ha nwere. 33 Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi. 34 Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.” 35 Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. 36 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 37 “Gwa Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile. 38 Ha bụ ihe ịgụ ọkụ nke ndị ikom sitere na mmehie ha tufuo ndụ ha. Ka etipịa ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ. Mee ha ka ha ghọọ ihe sara mbara nke a ga-eji machite ebe ịchụ aja, nʼihi na e chere ha nʼihu ONYENWE ANYỊ, ha aghọọla ihe dị nsọ. Ka ha bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Izrel niile.” 39 Ya mere Elieza, onye nchụaja, chịkọtara ihe ịgụ ọkụ bronz ndị ahụ nke ndị ahụ a kpọrọ ọkụ wetara, tipịa ha, mee ka ha ghọọ ihe sara mbara e ji ekpuchi ebe ịchụ aja, 40 dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru ONYENWE ANYỊ nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha. 41 Ma nʼụtụtụ echi ya, nzukọ Izrel niile malitere itamu ntamu megide Mosis na Erọn sị, “Unu egbuchaala ndị nke ONYENWE ANYỊ.” 42 Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube ONYENWE ANYỊ pụtakwara ihe. 43 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn gara nʼihu ụlọ nzute ahụ. 44 Ma Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 45 “Sinụ nʼetiti ọgbakọ a pụọ ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ha dara kpuo ihu nʼala. 46 Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ Izrel ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ ONYENWE ANYỊ adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.” 47 Erọn mere dịka Mosis kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị Izrel nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile. 48 O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị. 49 Ma ihe otiti ahụ egbuolarị puku mmadụ iri, puku anọ na narị asaa (14,700). A gụnyeghị ndị niile ahụ so Kora nwụọ nʼụbọchị gara aga. 50 Mgbe ahụ, Erọn laghachikwutere Mosis nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, nʼihi na nrịa nrịa ahụ na-efe efe akwụsịla.

In Other Versions

Numbers 16 in the ANGEFD

Numbers 16 in the ANTPNG2D

Numbers 16 in the AS21

Numbers 16 in the BAGH

Numbers 16 in the BBPNG

Numbers 16 in the BBT1E

Numbers 16 in the BDS

Numbers 16 in the BEV

Numbers 16 in the BHAD

Numbers 16 in the BIB

Numbers 16 in the BLPT

Numbers 16 in the BNT

Numbers 16 in the BNTABOOT

Numbers 16 in the BNTLV

Numbers 16 in the BOATCB

Numbers 16 in the BOATCB2

Numbers 16 in the BOBCV

Numbers 16 in the BOCNT

Numbers 16 in the BOECS

Numbers 16 in the BOGWICC

Numbers 16 in the BOHCB

Numbers 16 in the BOHCV

Numbers 16 in the BOHLNT

Numbers 16 in the BOHNTLTAL

Numbers 16 in the BOILNTAP

Numbers 16 in the BOITCV

Numbers 16 in the BOKCV

Numbers 16 in the BOKCV2

Numbers 16 in the BOKHWOG

Numbers 16 in the BOKSSV

Numbers 16 in the BOLCB

Numbers 16 in the BOLCB2

Numbers 16 in the BOMCV

Numbers 16 in the BONAV

Numbers 16 in the BONCB

Numbers 16 in the BONLT

Numbers 16 in the BONUT2

Numbers 16 in the BOPLNT

Numbers 16 in the BOSCB

Numbers 16 in the BOSNC

Numbers 16 in the BOTLNT

Numbers 16 in the BOVCB

Numbers 16 in the BOYCB

Numbers 16 in the BPBB

Numbers 16 in the BPH

Numbers 16 in the BSB

Numbers 16 in the CCB

Numbers 16 in the CUV

Numbers 16 in the CUVS

Numbers 16 in the DBT

Numbers 16 in the DGDNT

Numbers 16 in the DHNT

Numbers 16 in the DNT

Numbers 16 in the ELBE

Numbers 16 in the EMTV

Numbers 16 in the ESV

Numbers 16 in the FBV

Numbers 16 in the FEB

Numbers 16 in the GGMNT

Numbers 16 in the GNT

Numbers 16 in the HARY

Numbers 16 in the HNT

Numbers 16 in the IRVA

Numbers 16 in the IRVB

Numbers 16 in the IRVG

Numbers 16 in the IRVH

Numbers 16 in the IRVK

Numbers 16 in the IRVM

Numbers 16 in the IRVM2

Numbers 16 in the IRVO

Numbers 16 in the IRVP

Numbers 16 in the IRVT

Numbers 16 in the IRVT2

Numbers 16 in the IRVU

Numbers 16 in the ISVN

Numbers 16 in the JSNT

Numbers 16 in the KAPI

Numbers 16 in the KBT1ETNIK

Numbers 16 in the KBV

Numbers 16 in the KJV

Numbers 16 in the KNFD

Numbers 16 in the LBA

Numbers 16 in the LBLA

Numbers 16 in the LNT

Numbers 16 in the LSV

Numbers 16 in the MAAL

Numbers 16 in the MBV

Numbers 16 in the MBV2

Numbers 16 in the MHNT

Numbers 16 in the MKNFD

Numbers 16 in the MNG

Numbers 16 in the MNT

Numbers 16 in the MNT2

Numbers 16 in the MRS1T

Numbers 16 in the NAA

Numbers 16 in the NASB

Numbers 16 in the NBLA

Numbers 16 in the NBS

Numbers 16 in the NBVTP

Numbers 16 in the NET2

Numbers 16 in the NIV11

Numbers 16 in the NNT

Numbers 16 in the NNT2

Numbers 16 in the NNT3

Numbers 16 in the PDDPT

Numbers 16 in the PFNT

Numbers 16 in the RMNT

Numbers 16 in the SBIAS

Numbers 16 in the SBIBS

Numbers 16 in the SBIBS2

Numbers 16 in the SBICS

Numbers 16 in the SBIDS

Numbers 16 in the SBIGS

Numbers 16 in the SBIHS

Numbers 16 in the SBIIS

Numbers 16 in the SBIIS2

Numbers 16 in the SBIIS3

Numbers 16 in the SBIKS

Numbers 16 in the SBIKS2

Numbers 16 in the SBIMS

Numbers 16 in the SBIOS

Numbers 16 in the SBIPS

Numbers 16 in the SBISS

Numbers 16 in the SBITS

Numbers 16 in the SBITS2

Numbers 16 in the SBITS3

Numbers 16 in the SBITS4

Numbers 16 in the SBIUS

Numbers 16 in the SBIVS

Numbers 16 in the SBT

Numbers 16 in the SBT1E

Numbers 16 in the SCHL

Numbers 16 in the SNT

Numbers 16 in the SUSU

Numbers 16 in the SUSU2

Numbers 16 in the SYNO

Numbers 16 in the TBIAOTANT

Numbers 16 in the TBT1E

Numbers 16 in the TBT1E2

Numbers 16 in the TFTIP

Numbers 16 in the TFTU

Numbers 16 in the TGNTATF3T

Numbers 16 in the THAI

Numbers 16 in the TNFD

Numbers 16 in the TNT

Numbers 16 in the TNTIK

Numbers 16 in the TNTIL

Numbers 16 in the TNTIN

Numbers 16 in the TNTIP

Numbers 16 in the TNTIZ

Numbers 16 in the TOMA

Numbers 16 in the TTENT

Numbers 16 in the UBG

Numbers 16 in the UGV

Numbers 16 in the UGV2

Numbers 16 in the UGV3

Numbers 16 in the VBL

Numbers 16 in the VDCC

Numbers 16 in the YALU

Numbers 16 in the YAPE

Numbers 16 in the YBVTP

Numbers 16 in the ZBP