Numbers 22 (BOICB)

1 Ndị Izrel biliri njem bịarute nʼobosara ala Moab. Manye ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Jọdan ebe chere ihu nʼobodo Jeriko. 2 Ma Balak nwa Zipoa ahụlarị ihe niile Izrel mere ndị Amọrait. 3 Oke ụjọ jidere ndị Moab nʼihi na ndị Izrel dị ọtụtụ. Nʼezie, oke ụjọ dị ukwuu jidere ndị Moab nʼihi ụmụ Izrel. 4 Ndị Moab jekwuru ndị okenye Midia sị ha, “Igwe mmadụ ndị a ga-erichapụ ihe niile gbara anyị gburugburu. Ha ga-eripịa ha dịka ehi si erichapụ ahịhịa ndụ dị nʼala.”Ya mere, Balak nwa Zipoa, onye bụ eze ndị Moab nʼoge ahụ, 5 zigara ndị ozi ya ka ha jekwuru Belam, nwa Beoa onye bi nʼobodo ya bụ Petoa, nke dị nso nʼiyi ukwu Yufretis. O ziri ya sị,“Lee otu ndị sitere nʼIjipt pụta. Lee ka ha si kpuchie elu ala a; ugbu a, ha bi nʼakụkụ m. 6 Ugbu a, bịa ka ị bụọrọ m ha ọnụ, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ma eleghị anya aga m enwe ike merie ha, ma chụpụkwa ha site nʼala m. Nʼihi na amaara m na ndị ọbụla ị gọziri bụ ndị a gọziri agọzi, ndị ọbụla ị bụrụ ọnụ ga-anọgide bụrụ ndị a bụrụ ọnụ.” 7 Ndị ozi o zigara bụ ndị okenye obodo Moab na Midia. Ha ji ego ịjụta ase nʼaka ha. Mgbe ha ruru, ha ziri Belam ozi Balak ziri. 8 Belam gwara ha okwu sị, “Nọdụnụ nʼebe a nʼabalị a. Aga m ewetara unu ọsịsa ọbụla ONYENWE ANYỊ nyere m.” Ya mere, ndị ozi ahụ si Moab nọnyeere ya. 9 Nʼabalị ahụ, Chineke bịakwutere Belam jụọ ya sị, “Ndị ikom ndị a bịara ileta gị, ha bụ ndị ole?” 10 Belam sịrị Chineke, “Balak nwa Zipoa eze Moab zitere m ozi sị m, 11 ‘Otu ndị esitela nʼala Ijipt pụta, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Achọrọ m ka ị bịa bụọrọ m ha ọnụ. Ma eleghị anya aga m enwe ike lụso ha agha, ma chụpụkwa ha.’ ” 12 Ma Chineke sịrị Belam, “Esola ha aga! Ị gaghị abụ ndị a ọnụ, nʼihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.” 13 Mgbe chi bọrọ, Belam biliri gwa ndị ozi Balak sị ha, “Laghachinụ nʼobodo unu nʼihi na ONYENWE ANYỊ ekweghị ka m soro unu.” 14 Ya mere, ndị ozi Moab laghachikwuru Balak gwa ya sị, “Belam jụrụ iso anyị lọghachi.” 15 Balak nwara ike ya ọzọ. Nʼoge a, o zipụrụ ụmụ eze ndị dị ọtụtụ na ndị a maara aha ha karịa ndị mbụ. 16 Ha jiri ozi a bịakwute Belam sị ya,“Ihe a ka Balak nwa Zipoa sị anyị zie gị, Ọ sị gị ekwela ka ihe ọbụla gbochie gị ịbịakwute m. 17 Nʼihi na aghaghị ịsọpụrụ gị nʼebe ọ dị ukwuu m, mekwaa ihe ọbụla ị sị m mee. Naanị bịa ka ị bụọrọ m ndị a ọnụ.” 18 Ma Belam zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na Balak enye m ụlọeze ya nke juputara nʼọlaọcha na ọlaedo, apụghị m ime ihe ọbụla dị ukwuu maọbụ nke nta ịgabiga iwu ONYENWE ANYỊ bụ Chineke m. 19 Ma otu ọ dị, nọọnụ ka chị bọọ dịka ndị ọzọ ahụ mere ka m nwee ike chọpụta ma ọ dị ihe ONYENWE ANYỊ ga-atụkwasị nʼihe o kwuru na mbụ.” 20 Nʼabalị ahụ, Chineke gwara Belam okwu sị ya, “Ebe ọ bụ na ndị a bịara ịkpọ gị oku, bilie soro ha gaa, kama jikere ikwu naanị okwu m ga-etinye gị nʼọnụ.” 21 Ya mere, mgbe chi echi ya bọrọ, Belam rigooro nʼelu ịnyịnya ibu ya soro ụmụ eze Moab gaa. 22 Ma iwe were Chineke nʼihi na ọ na-aga, ma mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ guzochiri ụzọ igbochi ya. Belam na ndị odibo ya abụọ nọ na-elu ịnyịnya ibu ya. 23 Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ ka o guzochiri nʼụzọ, jide mma a mịpụtara amịpụta nʼaka ya, ịnyịnya ibu ahụ chigharịrị onwe ya hapụ okporoụzọ, tinye isi nʼọhịa. Ma Belam tiri ya ihe ịchụghachi ya nʼụzọ. 24 Nʼoge a, mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ guzochiri nʼụzọ dị warawara, nke dị nʼetiti mgbidi ogige ubi vaịnị abụọ. 25 Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ, o tinyere isi nʼahụ mgbidi ogige ubi ahụ, chọọ isite nʼebe ahụ gafee. Mgbe ọ na-eme nke a, o mere ka mgbidi ahụ chihịapụ Belam ụkwụ. Ya mere Belam tiri ịnyịnya ibu ahụ ihe ọzọ. 26 Mgbe ahụ, mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ gakwara nʼihu nʼokporoụzọ ahụ nọchie ụzọ ahụ ebe dị nnọọ mkpakọta, ebe ịnyịnya ibu ahụ na-agaghị enwe ike gafee, maọbụ ichigharị aka nri maọbụ aka ekpe. 27 Nʼihi nke a, mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ o dinara ala nʼokporoụzọ. Nʼoke iwe, Belam ji mkpara dị ya nʼaka tie ya ihe ọzọ. 28 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ mere ka ịnyịnya ibu ahụ kwuo okwu. Ọ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị ka m mere gị i ji tie m ihe ugboro atọ?” 29 Belam zara ịnyịnya ibu ahụ sị, “Ọ bụ nʼihi na i meela ka m dị ka onye nzuzu! Nʼezie, a sị na m ji mma agha nʼaka m, agaara m egbu gị.” 30 Ịnyịnya ibu ahụ gwara Balam okwu ọzọ sị ya, “Ọ bụ na mụ onwe m abụghị ịnyịnya ibu gị nke ị na-anọ nʼelu ya ogologo oge ndị a niile? Ọ dịla mgbe m si otu a meso gị omume nʼime ndụ m niile?”Belam zara sị ya, “Ee.” 31 Mgbe ahụ ka ONYENWE ANYỊ meghere anya Belam. Ọ hụrụ mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ ka o ji mma agha ya guzochie ụzọ. Belam dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼala nʼihu ya. 32 Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ ahụ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị mere i ji tie ịnyịnya ibu gị ihe ugboro atọ? Abịara m igbochi gị ka ịla nʼiyi dị na-eche gị ghara irute gị. 33 Ugboro atọ ka ịnyịnya ibu a hụrụ m, ma site nʼihu m wezuga onwe ya. A sị na ọ bụghị ntụgharị ọ tụgharịrị site nʼebe m nọ, nʼezie, ugbu a, a gara m egbu gị ma hapụ ịnyịnya ibu gị ndụ.” 34 Nʼoge a, Belam sịrị mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ, “Emehiela m. Amaghị m na i guzo nʼụzọ igbochi m. Ọ bụrụ iwe na-ewe gị, ejikeere m ịlaghachi azụ.” 35 Ma mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ sịrị Belam, “Soro ndị ikom a gaa, ma kwuo naanị ihe m sị gị kwuo.” Ya mere, Belam soro ndị ozi eze Balak gaa. 36 Mgbe Balak nụrụ na Belam nọ nʼụzọ na-abịa, ọ pụrụ gaa izute Belam nʼotu obodo Moab nke dị nʼọnụ mmiri Anọn, nke dị na ngwụcha oke ala ya. 37 Mgbe ọ bịarutere, Balak jụrụ Belam ajụjụ sị ya, “Eziri m gị ozi ka ị bịa ngwangwa, gịnị mere ị bịaghị? Ọ bụ na m enweghị ike ịsọpụrụ gị?” 38 Belam zaghachiri, “Lee, Abịakwutelam gị ugbu a, ma enweghị m ike ikwu ihe ọbụla dị m mma. Ọ bụ naanị ihe Chineke tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu.” 39 Belam sooro Balak gaa Kiriat Huzot. 40 Balak jiri ehi na atụrụ chụọ aja. O nyere Belam ụfọdụ, nyekwa ma ndị ozi eze ndị ya na ha nọ nʼebe ahụ. 41 Nʼụtụtụ echi ya, Balak kpọọrọ Belam, duru ya rigoo Bamot Baal. O sitere nʼebe ahụ hụ nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.

In Other Versions

Numbers 22 in the ANGEFD

Numbers 22 in the ANTPNG2D

Numbers 22 in the AS21

Numbers 22 in the BAGH

Numbers 22 in the BBPNG

Numbers 22 in the BBT1E

Numbers 22 in the BDS

Numbers 22 in the BEV

Numbers 22 in the BHAD

Numbers 22 in the BIB

Numbers 22 in the BLPT

Numbers 22 in the BNT

Numbers 22 in the BNTABOOT

Numbers 22 in the BNTLV

Numbers 22 in the BOATCB

Numbers 22 in the BOATCB2

Numbers 22 in the BOBCV

Numbers 22 in the BOCNT

Numbers 22 in the BOECS

Numbers 22 in the BOGWICC

Numbers 22 in the BOHCB

Numbers 22 in the BOHCV

Numbers 22 in the BOHLNT

Numbers 22 in the BOHNTLTAL

Numbers 22 in the BOILNTAP

Numbers 22 in the BOITCV

Numbers 22 in the BOKCV

Numbers 22 in the BOKCV2

Numbers 22 in the BOKHWOG

Numbers 22 in the BOKSSV

Numbers 22 in the BOLCB

Numbers 22 in the BOLCB2

Numbers 22 in the BOMCV

Numbers 22 in the BONAV

Numbers 22 in the BONCB

Numbers 22 in the BONLT

Numbers 22 in the BONUT2

Numbers 22 in the BOPLNT

Numbers 22 in the BOSCB

Numbers 22 in the BOSNC

Numbers 22 in the BOTLNT

Numbers 22 in the BOVCB

Numbers 22 in the BOYCB

Numbers 22 in the BPBB

Numbers 22 in the BPH

Numbers 22 in the BSB

Numbers 22 in the CCB

Numbers 22 in the CUV

Numbers 22 in the CUVS

Numbers 22 in the DBT

Numbers 22 in the DGDNT

Numbers 22 in the DHNT

Numbers 22 in the DNT

Numbers 22 in the ELBE

Numbers 22 in the EMTV

Numbers 22 in the ESV

Numbers 22 in the FBV

Numbers 22 in the FEB

Numbers 22 in the GGMNT

Numbers 22 in the GNT

Numbers 22 in the HARY

Numbers 22 in the HNT

Numbers 22 in the IRVA

Numbers 22 in the IRVB

Numbers 22 in the IRVG

Numbers 22 in the IRVH

Numbers 22 in the IRVK

Numbers 22 in the IRVM

Numbers 22 in the IRVM2

Numbers 22 in the IRVO

Numbers 22 in the IRVP

Numbers 22 in the IRVT

Numbers 22 in the IRVT2

Numbers 22 in the IRVU

Numbers 22 in the ISVN

Numbers 22 in the JSNT

Numbers 22 in the KAPI

Numbers 22 in the KBT1ETNIK

Numbers 22 in the KBV

Numbers 22 in the KJV

Numbers 22 in the KNFD

Numbers 22 in the LBA

Numbers 22 in the LBLA

Numbers 22 in the LNT

Numbers 22 in the LSV

Numbers 22 in the MAAL

Numbers 22 in the MBV

Numbers 22 in the MBV2

Numbers 22 in the MHNT

Numbers 22 in the MKNFD

Numbers 22 in the MNG

Numbers 22 in the MNT

Numbers 22 in the MNT2

Numbers 22 in the MRS1T

Numbers 22 in the NAA

Numbers 22 in the NASB

Numbers 22 in the NBLA

Numbers 22 in the NBS

Numbers 22 in the NBVTP

Numbers 22 in the NET2

Numbers 22 in the NIV11

Numbers 22 in the NNT

Numbers 22 in the NNT2

Numbers 22 in the NNT3

Numbers 22 in the PDDPT

Numbers 22 in the PFNT

Numbers 22 in the RMNT

Numbers 22 in the SBIAS

Numbers 22 in the SBIBS

Numbers 22 in the SBIBS2

Numbers 22 in the SBICS

Numbers 22 in the SBIDS

Numbers 22 in the SBIGS

Numbers 22 in the SBIHS

Numbers 22 in the SBIIS

Numbers 22 in the SBIIS2

Numbers 22 in the SBIIS3

Numbers 22 in the SBIKS

Numbers 22 in the SBIKS2

Numbers 22 in the SBIMS

Numbers 22 in the SBIOS

Numbers 22 in the SBIPS

Numbers 22 in the SBISS

Numbers 22 in the SBITS

Numbers 22 in the SBITS2

Numbers 22 in the SBITS3

Numbers 22 in the SBITS4

Numbers 22 in the SBIUS

Numbers 22 in the SBIVS

Numbers 22 in the SBT

Numbers 22 in the SBT1E

Numbers 22 in the SCHL

Numbers 22 in the SNT

Numbers 22 in the SUSU

Numbers 22 in the SUSU2

Numbers 22 in the SYNO

Numbers 22 in the TBIAOTANT

Numbers 22 in the TBT1E

Numbers 22 in the TBT1E2

Numbers 22 in the TFTIP

Numbers 22 in the TFTU

Numbers 22 in the TGNTATF3T

Numbers 22 in the THAI

Numbers 22 in the TNFD

Numbers 22 in the TNT

Numbers 22 in the TNTIK

Numbers 22 in the TNTIL

Numbers 22 in the TNTIN

Numbers 22 in the TNTIP

Numbers 22 in the TNTIZ

Numbers 22 in the TOMA

Numbers 22 in the TTENT

Numbers 22 in the UBG

Numbers 22 in the UGV

Numbers 22 in the UGV2

Numbers 22 in the UGV3

Numbers 22 in the VBL

Numbers 22 in the VDCC

Numbers 22 in the YALU

Numbers 22 in the YAPE

Numbers 22 in the YBVTP

Numbers 22 in the ZBP