Numbers 26 (BOICB)

1 Mgbe ihe otiti ahụ niile gasịrị, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Elieza nwa Erọn, onye nchụaja okwu sị ha, 2 “Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.” 3 Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha, 4 “Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta: 5 Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a:site na Hanok, ikwu Hanok,site na Palu, ikwu Palu, 6 site na Hezrọn, ikwu Hezrọnsite na Kami, ikwu Kami 7 Ndị a bụ agbụrụ Ruben. Ọnụọgụgụ ha dị iri puku anọ, puku atọ na narị asaa na iri atọ (43,730). 8 Nwa Palu bụ Eliab, 9 ụmụ Eliab bụ Nemuel, Datan na Abiram. Datan na Abiram bụ ndị ndu ọgbakọ ahụ nupuru isi megide Mosis na Erọn. Ha sonyere ndị ahụ so Kora mgbe ha nupuru isi megide ONYENWE ANYỊ. 10 Ala meghere ọnụ ya, loo ha na Kora, ma ọkụ rechapụrụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ ahụ sonyere ha. Ọnwụ ha ghọrọ ihe ịdọ aka na ntị. 11 Otu ọ dị, ndị niile si nʼezinaụlọ Kora anwụchaghị. 12 Ụmụ ụmụ Simiọn dịka ikwu ha si dị bụ,site na Nemuel, ikwu Nemuel,site na Jamin, ikwu Jamin,site na Jakin, ikwu Jakin, 13 Site na Zera, ikwu Zera,site na Shaul, ikwu Shaul. 14 Ndị a bụ ndị agbụrụ Simiọn. Ọnụọgụgụ ndị ikom ha dị iri puku abụọ, puku abụọ na narị abụọ (22,200). 15 Ụmụ ụmụ Gad dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:ikwu Zefọn, site na Zefọn,ikwu Hagi, site na Hagi,ikwu Shuni, site na Shuni, 16 ikwu Ozni, site na Ozni,ikwu Eri, site na Eri, 17 ikwu Arodi, site na Arodi,ikwu Areli, site na Areli, 18 Ndị a bụ agbụrụ Gad. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ na narị ise (40,500). 19 Ụmụ ndị ikom Juda abụọ, Ịa na Onan, nwụrụ nʼala Kenan. 20 Ma ụmụ ụmụ Juda ndị ọzọ, dịka ikwu ha dị iche iche si dị bụ ndị a:ikwu Shela, site na Shela,ikwu Perez, site na Perez,ikwu Zera, site na Zera. 21 Ikwu abụọ ọzọ si nʼagbụrụ Perez bụ ndị a:Ikwu Hezrọn, site na Hezrọn,Ikwu Hamul, site na Hamul. 22 Ndị a bụ agbụrụ Juda. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku asaa, puku isii na narị ise (76,500). 23 Ụmụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:ikwu Tola, site na Tola,ikwu Pua, site na Pua 24 ikwu Jashub, site na Jashub,ikwu Shịmrọn, site na Shịmrọn. 25 Ndị a bụ agbụrụ Isaka. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị atọ (64,300). 26 Ụmụ ụmụ Zebụlọn dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:ndị Sered, site nʼikwu Sered,ndị Elọn, site nʼikwu Elọn,ndị Jaliil, site nʼikwu Jaliil. 27 Ndị a bụ agbụrụ Zebụlọn. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii na narị ise (60,500). 28 Ụmụ ụmụ Josef dịka ha si dị nʼagbụrụ Manase na Ifrem bụ ndị a: 29 Ụmụ ụmụ Manase bụ ndị a:ndị Makia, site nʼikwu Makia. Makia bụ nna Gilead.Ikwu Gilead, site na Gilead. 30 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Gilead:ikwu Leza, site na Leza,ikwu Helek, site na Helek. 31 Ikwu Asriel, site na Asriel.Ikwu Shekem, site na Shekem. 32 Ikwu Shemida, site na Shemida,ikwu Hefa, site na Hefa. 33 (Hefa mụtara nwoke a na-akpọ Zelofehad. Ma Zelofehad amụtaghị nwoke ọbụla kama ndị inyom ndị a ka ọ mụtara, Mahla, na Noa, na Hogla, na Milka, na Tịaza.) 34 Ndị a bụ agbụrụ Manase. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku abụọ na narị asaa (52,700). 35 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Ifrem dịka ikwu ha si dị:ikwu Shutela site na Shutela,ikwu Beka site na Beka,ikwu Tahan site na Tahan. 36 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Shutela:ikwu Eran site na Eran. 37 Ndị a bụ agbụrụ Ifrem. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku atọ, puku abụọ na narị ise (32,500).Ndị a bụ ụmụ ụmụ Josef dịka ikwu ha si dị. 38 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Benjamin dịka ikwu ha si dị:ikwu Bela site na Bela,ikwu Ashbel site Ashbel,ikwu Ahiram site na Ahiram. 39 Ikwu Shufam site na Shufam,ikwu Hufam site na Hufam. 40 Ụmụ ụmụ Bela site na Aad, na Naaman bụ,ikwu Aad site na Aad,ikwu Neeman site na Neeman. 41 Ndị a bụ agbụrụ Benjamin. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị isii (45,600). 42 Ụmụ ụmụ Dan dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:ikwu Shuham, site na Shuham.Ndị a bụ naanị ikwu dị na Dan. 43 Ha niile si nʼagbụrụ Shuham. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị anọ (64,400). 44 Ụmụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:ikwu Imna site na Imna,ikwu Ishvi, site na Ishvi,ikwu Beriya, site na Beriya. 45 Ikwu e nwere site nʼụmụ ụmụ Beriya bụ ndị a:ikwu Heba, site na Heba,ikwu Malkiel, site na Malkiel. 46 Asha mụtakwara otu nwa nwanyị aha ya bụ Sera. 47 Ndị a bụ agbụrụ Asha. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400). 48 Ụmụ ụmụ Naftalị dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:ikwu Jaziil, site na Jaziil,ikwu Guni, site na Guni, 49 ikwu Jeza, site na Jeza,ikwu Shilem, site na Shilem. 50 Ndị a si nʼagbụrụ Naftalị. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị anọ (45,400). 51 Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom niile tozuru ije agha nʼIzrel dị narị puku isii, otu puku na narị asaa, na iri atọ (601,730). 52 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 53 “Ị ga-ekenye ha ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha dịka ọnụọgụgụ aha ha si dị. 54 Ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ ga-eketa ala dị ukwuu, ma ndị dị nta ga-eketa ala dị nta. Ihe nketa nke onye ọbụla ga-enweta ga-adị ka ọnụọgụgụ ahụ e dere. 55 Lezie anya hụ na e kesara ala ahụ site nʼife nza. Ala ndị ọbụla ga-eketa ga-abụ dịka aha nna ochie ebo ha si dị. 56 A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.” 57 Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị,ikwu Geshọn, site na Geshọn,ikwu Kohat, site na Kohat,ikwu Merari, site na Merari. 58 Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị:ikwu Libni,ikwu Hebrọn,ikwu Mahali,ikwu Mushi, naikwu Kora.(Kohat bụ nna nna Amram. 59 Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị. 60 Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama. 61 Ma Nadab na Abihu nwụrụ mgbe ha chere ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu ONYENWE ANYỊ.) 62 Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ (23,000). Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha. 63 Ya mere, ndị a bụ nchọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Izrel, dịka Mosis na Elieza onye nchụaja kwadobere gụọ na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko. 64 Ma nʼetiti ndị a, o nweghị otu onye ọbụla Mosis na Erọn onye nchụaja gụrụ nʼọnụọgụgụ mgbe ha gụrụ ndị Izrel ọnụ nʼọzara Saịnaị. 65 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ gwara ndị Izrel ahụ na ha ga-anwụ nʼime ọzara ahụ. Naanị ndị a hapụrụ ndụ bụ Kaleb, nwa Jefune, na Joshua nwa Nun.

In Other Versions

Numbers 26 in the ANGEFD

Numbers 26 in the ANTPNG2D

Numbers 26 in the AS21

Numbers 26 in the BAGH

Numbers 26 in the BBPNG

Numbers 26 in the BBT1E

Numbers 26 in the BDS

Numbers 26 in the BEV

Numbers 26 in the BHAD

Numbers 26 in the BIB

Numbers 26 in the BLPT

Numbers 26 in the BNT

Numbers 26 in the BNTABOOT

Numbers 26 in the BNTLV

Numbers 26 in the BOATCB

Numbers 26 in the BOATCB2

Numbers 26 in the BOBCV

Numbers 26 in the BOCNT

Numbers 26 in the BOECS

Numbers 26 in the BOGWICC

Numbers 26 in the BOHCB

Numbers 26 in the BOHCV

Numbers 26 in the BOHLNT

Numbers 26 in the BOHNTLTAL

Numbers 26 in the BOILNTAP

Numbers 26 in the BOITCV

Numbers 26 in the BOKCV

Numbers 26 in the BOKCV2

Numbers 26 in the BOKHWOG

Numbers 26 in the BOKSSV

Numbers 26 in the BOLCB

Numbers 26 in the BOLCB2

Numbers 26 in the BOMCV

Numbers 26 in the BONAV

Numbers 26 in the BONCB

Numbers 26 in the BONLT

Numbers 26 in the BONUT2

Numbers 26 in the BOPLNT

Numbers 26 in the BOSCB

Numbers 26 in the BOSNC

Numbers 26 in the BOTLNT

Numbers 26 in the BOVCB

Numbers 26 in the BOYCB

Numbers 26 in the BPBB

Numbers 26 in the BPH

Numbers 26 in the BSB

Numbers 26 in the CCB

Numbers 26 in the CUV

Numbers 26 in the CUVS

Numbers 26 in the DBT

Numbers 26 in the DGDNT

Numbers 26 in the DHNT

Numbers 26 in the DNT

Numbers 26 in the ELBE

Numbers 26 in the EMTV

Numbers 26 in the ESV

Numbers 26 in the FBV

Numbers 26 in the FEB

Numbers 26 in the GGMNT

Numbers 26 in the GNT

Numbers 26 in the HARY

Numbers 26 in the HNT

Numbers 26 in the IRVA

Numbers 26 in the IRVB

Numbers 26 in the IRVG

Numbers 26 in the IRVH

Numbers 26 in the IRVK

Numbers 26 in the IRVM

Numbers 26 in the IRVM2

Numbers 26 in the IRVO

Numbers 26 in the IRVP

Numbers 26 in the IRVT

Numbers 26 in the IRVT2

Numbers 26 in the IRVU

Numbers 26 in the ISVN

Numbers 26 in the JSNT

Numbers 26 in the KAPI

Numbers 26 in the KBT1ETNIK

Numbers 26 in the KBV

Numbers 26 in the KJV

Numbers 26 in the KNFD

Numbers 26 in the LBA

Numbers 26 in the LBLA

Numbers 26 in the LNT

Numbers 26 in the LSV

Numbers 26 in the MAAL

Numbers 26 in the MBV

Numbers 26 in the MBV2

Numbers 26 in the MHNT

Numbers 26 in the MKNFD

Numbers 26 in the MNG

Numbers 26 in the MNT

Numbers 26 in the MNT2

Numbers 26 in the MRS1T

Numbers 26 in the NAA

Numbers 26 in the NASB

Numbers 26 in the NBLA

Numbers 26 in the NBS

Numbers 26 in the NBVTP

Numbers 26 in the NET2

Numbers 26 in the NIV11

Numbers 26 in the NNT

Numbers 26 in the NNT2

Numbers 26 in the NNT3

Numbers 26 in the PDDPT

Numbers 26 in the PFNT

Numbers 26 in the RMNT

Numbers 26 in the SBIAS

Numbers 26 in the SBIBS

Numbers 26 in the SBIBS2

Numbers 26 in the SBICS

Numbers 26 in the SBIDS

Numbers 26 in the SBIGS

Numbers 26 in the SBIHS

Numbers 26 in the SBIIS

Numbers 26 in the SBIIS2

Numbers 26 in the SBIIS3

Numbers 26 in the SBIKS

Numbers 26 in the SBIKS2

Numbers 26 in the SBIMS

Numbers 26 in the SBIOS

Numbers 26 in the SBIPS

Numbers 26 in the SBISS

Numbers 26 in the SBITS

Numbers 26 in the SBITS2

Numbers 26 in the SBITS3

Numbers 26 in the SBITS4

Numbers 26 in the SBIUS

Numbers 26 in the SBIVS

Numbers 26 in the SBT

Numbers 26 in the SBT1E

Numbers 26 in the SCHL

Numbers 26 in the SNT

Numbers 26 in the SUSU

Numbers 26 in the SUSU2

Numbers 26 in the SYNO

Numbers 26 in the TBIAOTANT

Numbers 26 in the TBT1E

Numbers 26 in the TBT1E2

Numbers 26 in the TFTIP

Numbers 26 in the TFTU

Numbers 26 in the TGNTATF3T

Numbers 26 in the THAI

Numbers 26 in the TNFD

Numbers 26 in the TNT

Numbers 26 in the TNTIK

Numbers 26 in the TNTIL

Numbers 26 in the TNTIN

Numbers 26 in the TNTIP

Numbers 26 in the TNTIZ

Numbers 26 in the TOMA

Numbers 26 in the TTENT

Numbers 26 in the UBG

Numbers 26 in the UGV

Numbers 26 in the UGV2

Numbers 26 in the UGV3

Numbers 26 in the VBL

Numbers 26 in the VDCC

Numbers 26 in the YALU

Numbers 26 in the YAPE

Numbers 26 in the YBVTP

Numbers 26 in the ZBP