Numbers 31 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Taa ndị Midia ahụhụ, ka i si otu a bọọrọ ndị Izrel ọbọ ihe ọjọọ ndị Midia mere ha. Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-anwụ.” 3 Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị, “Kwadoonụ ndị ikom unu ibuso ndị Midia agha, maka ịbọtara ONYENWE ANYỊ ọbọ. 4 Sinụ nʼebo ọbụla dị nʼIzrel gụpụta puku ndị ikom puku ndị ikom.” 5 Ya mere, e sitere nʼigwe ndị ikom niile nọ nʼIzrel zipụ puku ndị ikom iri na abụọ, ka ha gaa buo agha. Ebo ọbụla zipụrụ otu puku ndị ikom. 6 Mosis zipụrụ ha ibu agha, otu puku, otu puku site nʼebo ọbụla. Finehaz nwa Elieza, onye nchụaja, du ha gaa agha ahụ. O bu ngwongwo si nʼebe nsọ, tinyere opi ike nke a ga-afụ. 7 Ha busoro ndị Midia agha dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. Ha gburu onye ọbụla bụ nwoke. 8 Nʼime ndị ha gburu nʼagha ahụ bụ ndị eze Midia ise a na-akpọ Evi, Rekem, Zua, Hua na Reba. Ha jikwa mma agha gbuo Belam nwa Beoa. 9 Ndị agha Izrel chịkọtara ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile nọ nʼala Midia dịka ndị ha dọtara nʼagha. Ha chịkọtara ngwongwo niile ndị Midia ji biri, tinyere igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ ha niile, dịka ihe ha dọtara nʼagha. 10 Emesịa, ha mụnyere ọkụ nʼobodo ndị Midia niile na ebe ha mara ụlọ ikwu, rechapụ ha nʼọkụ. 11 Ha chịkọtara ihe niile ha dọtara nʼagha, ma mmadụ ma anụ ụlọ. 12 Ndị a niile ha dọtara nʼagha na ngwongwo niile ha lụtara nʼagha ka ha buteere Mosis, na Elieza onye nchụaja na ọgbakọ Izrel niile na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan na ncherita ihu Jeriko. 13 Mosis na Elieza onye nchụaja na ndị ndu ọgbakọ Izrel niile pụrụ gaa zute ha nʼazụ ebe ha mara ụlọ ikwu ha. 14 Ma Mosis were iwe megide ndịisi agha, ya bụ ndị ahụ na-achị imerime puku ndị agha, na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị si ibu agha lọta. 15 Mosis jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji debe ndị inyom niile ndị a ndụ? 16 Ọ bụ ndị a bụ ndị gbasoro ndụmọdụ Belam, rafuo ndị Izrel mee ka ha ghọọ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ONYENWE ANYỊ nʼihe gbasara okwu Peoa. Ọ bụ nke a mere ka nrịa nrịa ọjọọ ahụ na-efe efe dakwasị ndị nke ONYENWE ANYỊ. 17 Ugbu a, gbuonụ ụmụnta ndị nwoke niile, na ndị inyom niile matarala nwoke. 18 Naanị ụmụntakịrị ndị nwanyị ha nke nwoke na-edinabeghị ka unu ga-ahapụ ka ha dịrị ndụ. Unu nwere ike debere onwe unu ndị dị otu a. 19 “Ma ugbu a, unu niile bụ ndị soro gbuo mmadụ, maọbụ bitụ ozu ha aka, unu abatala nʼime ogige Izrel tutu ụbọchị asaa agafee. Nʼoge a, doonụ onwe unu ọcha, dokwaanụ ndị niile unu dọtara nʼagha ọcha, nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. 20 Debekwanụ uwe niile ọcha, ya na ihe niile e ji akpụkpọ anụ na ajị ewu, maọbụ osisi, mee.” 21 Mgbe ahụ, Elieza onye nchụaja gwara ndị ikom niile ahụ jere agha okwu sị ha, “Nke a bụ iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis. 22 Otu ọ dị ọlaedo, ọlaọcha, bronz, igwe, gbamgbam na opu, 23 na ihe ọ bụla ọzọ bụ nke ga-anagide ọkụ, ka a ga-eme ka ọ gabiga site nʼọkụ, mgbe ahụ ọ ga-adịkwa ọcha. Ma aghaghị ịga nʼihu ime ka ha dị ọcha site nʼịsacha ha nʼime mmiri nke nsacha. Ma ihe ọbụla nke na-agaghị anagide ọkụ ka a ga-eji mmiri sachaa, maka ido ya ọcha. 24 Nʼụbọchị nke asaa, unu aghaghị ịsacha uwe unu niile, bụrụ ndị dị ọcha. Mgbe ahụ, unu pụrụ ịlọghachi nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.” 25 Ma ONYENWE ANYỊ sịrị Mosis, 26 “Gị na Elieza onye nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ nke ọgbakọ Izrel niile, ga-agụkọ ihe niile unu dọtara nʼagha chọpụta ọnụọgụgụ mmadụ na anụmanụ. 27 Mgbe ahụ, kee ihe ndị a niile ụzọ abụọ. Ọkara ya ga-abụ nke ndị ikom ahụ niile gara agha, ma ọkara nke ọzọ ka a ga-enye ọgbakọ Izrel niile. 28 Ma ONYENWE ANYỊ nwere oke site nʼoke ndị ahụ jere agha: mmadụ, na ehi niile, na ịnyịnya ibu niile, na atụrụ na ewu niile. Oke ONYENWE ANYỊ bụ otu ụzọ nʼime narị ise ọbụla. 29 Nye Elieza onye nchụaja oke sitere nʼaja a dịka ihe ONYENWE ANYỊ ketara. 30 Otu aka ahụ kwa, site nʼoke ndị Izrel ga-eketa, kee ụtụ. Otu ụzọ nʼime iri ise, maọbụ mmadụ, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, maọbụ igwe anụ ụlọ ụzọ. Were ha nye ndị Livayị, ndị ọ dị nʼaka ilekọta ụlọ nzute ONYENWE ANYỊ, ka ọ bụrụ oke nke ha.” 31 Ya mere, Mosis na Elieza onye nchụaja mere dịka ONYENWE ANYỊ nyere ha nʼiwu. 32 Ihe nweta bụ nke fọdụrụ nʼihe ndị agha lụtara nʼagha bụ ndị a, bụ atụrụ dị narị puku isii, iri puku asaa na puku ise (675,000), 33 Ehi dị iri puku asaa na puku abụọ (72,000), 34 ịnyịnya ibu dị iri puku isii na otu puku (61,000), 35 Ụmụ agbọghọ na-amatabeghị nwoke dị iri puku atọ na puku abụọ (32,000). 36 Ya mere, ọkara e nyere ndị gara lụọ agha dị: Igwe ewu na atụrụ dị narị puku atọ na iri puku atọ na puku asaa na narị ise (337,500). 37 Nʼime ya, ụtụ e nyere ONYENWE ANYỊ site nʼigwe atụrụ ahụ dị narị isii na iri asaa na ise (675). 38 Igwe ehi dị iri puku atọ na puku isii (36,000). Nʼime ya, ihe e nyere ONYENWE ANYỊ bụ iri asaa na abụọ (72). 39 Ịnyịnya ibu dị iri puku atọ na narị ise (30,500). Nke e nyere ONYENWE ANYỊ bụ iri isii na otu (61). 40 Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ dị puku iri na isii (16,000). Ndị e nyere ONYENWE ANYỊ dị iri atọ na abụọ (32). 41 Mosis nyere Elieza bụ onye nchụaja ONYENWE ANYỊ oke nʼihe ndị ahụ niile a tụrụ nʼụtụ, dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 42 Ma ọkara nke ahụ dịrị ndị Izrel, nke Mosis kewapụtara site na nke ndị ikom lụrụ agha. 43 Ọkara nke nzukọ dị, igwe ewu na atụrụ, narị puku atọ, iri puku atọ, puku asaa na narị ise (337,500), 44 igwe ehi, iri puku atọ na isii (36,000), 45 ịnyịnya ibu, iri puku atọ na narị ise (30,500), 46 ụmụ agbọghọ, puku iri na isii (16,000). 47 Site nʼoke ndị Izrel Mosis họpụtara otu ụzọ nʼime iri ise, ma mmadụ ma anụ ụlọ dịka ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu. O nyere ha ndị Livayị na-elekọta ụlọ nzute ONYENWE ANYỊ mmadụ na anụ ụlọ ndị a. 48 Mgbe ahụ, ndịisi agha niile na ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha bịakwutere Mosis, 49 sị ya, “Ndị ohu gị agụọla ndị niile gara agha nọ nʼokpuru anyị, chọpụta na o nweghị onye ọbụla a na-achọ achọ. 50 Ya mere, anyị wetaara ONYENWE ANYỊ onyinye site nʼihe anyị kwatara nʼagha. Onyinye anyị bụ ihe onye ọbụla nwetara, ihe ọlaedo a na-agba nʼụkwụ na mgbaaka, na ọlaaka ikike, na ọlantị na ihe iyi nʼolu niile, i ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onwe anyị nʼihu ONYENWE ANYỊ.” 51 Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị ahụ bụ ihe a kpụrụ akpụ site nʼaka ha. 52 Ịdị arọ nke ihe ọlaedo niile nke ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha, nke Mosis na Elieza chere nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka onyinye, dị narị kilogram na iri itoolu. 53 Ndị ahụ lụrụ agha ahụ nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha debeere onwe ha. 54 Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị a dị iche site nʼaka ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha na narị ndị agha. E webatara onyinye ndị a nʼụlọ nzute, debe ha nʼihu ONYENWE ANYỊ ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ONYENWE ANYỊ nʼihi ndị Izrel niile.

In Other Versions

Numbers 31 in the ANGEFD

Numbers 31 in the ANTPNG2D

Numbers 31 in the AS21

Numbers 31 in the BAGH

Numbers 31 in the BBPNG

Numbers 31 in the BBT1E

Numbers 31 in the BDS

Numbers 31 in the BEV

Numbers 31 in the BHAD

Numbers 31 in the BIB

Numbers 31 in the BLPT

Numbers 31 in the BNT

Numbers 31 in the BNTABOOT

Numbers 31 in the BNTLV

Numbers 31 in the BOATCB

Numbers 31 in the BOATCB2

Numbers 31 in the BOBCV

Numbers 31 in the BOCNT

Numbers 31 in the BOECS

Numbers 31 in the BOGWICC

Numbers 31 in the BOHCB

Numbers 31 in the BOHCV

Numbers 31 in the BOHLNT

Numbers 31 in the BOHNTLTAL

Numbers 31 in the BOILNTAP

Numbers 31 in the BOITCV

Numbers 31 in the BOKCV

Numbers 31 in the BOKCV2

Numbers 31 in the BOKHWOG

Numbers 31 in the BOKSSV

Numbers 31 in the BOLCB

Numbers 31 in the BOLCB2

Numbers 31 in the BOMCV

Numbers 31 in the BONAV

Numbers 31 in the BONCB

Numbers 31 in the BONLT

Numbers 31 in the BONUT2

Numbers 31 in the BOPLNT

Numbers 31 in the BOSCB

Numbers 31 in the BOSNC

Numbers 31 in the BOTLNT

Numbers 31 in the BOVCB

Numbers 31 in the BOYCB

Numbers 31 in the BPBB

Numbers 31 in the BPH

Numbers 31 in the BSB

Numbers 31 in the CCB

Numbers 31 in the CUV

Numbers 31 in the CUVS

Numbers 31 in the DBT

Numbers 31 in the DGDNT

Numbers 31 in the DHNT

Numbers 31 in the DNT

Numbers 31 in the ELBE

Numbers 31 in the EMTV

Numbers 31 in the ESV

Numbers 31 in the FBV

Numbers 31 in the FEB

Numbers 31 in the GGMNT

Numbers 31 in the GNT

Numbers 31 in the HARY

Numbers 31 in the HNT

Numbers 31 in the IRVA

Numbers 31 in the IRVB

Numbers 31 in the IRVG

Numbers 31 in the IRVH

Numbers 31 in the IRVK

Numbers 31 in the IRVM

Numbers 31 in the IRVM2

Numbers 31 in the IRVO

Numbers 31 in the IRVP

Numbers 31 in the IRVT

Numbers 31 in the IRVT2

Numbers 31 in the IRVU

Numbers 31 in the ISVN

Numbers 31 in the JSNT

Numbers 31 in the KAPI

Numbers 31 in the KBT1ETNIK

Numbers 31 in the KBV

Numbers 31 in the KJV

Numbers 31 in the KNFD

Numbers 31 in the LBA

Numbers 31 in the LBLA

Numbers 31 in the LNT

Numbers 31 in the LSV

Numbers 31 in the MAAL

Numbers 31 in the MBV

Numbers 31 in the MBV2

Numbers 31 in the MHNT

Numbers 31 in the MKNFD

Numbers 31 in the MNG

Numbers 31 in the MNT

Numbers 31 in the MNT2

Numbers 31 in the MRS1T

Numbers 31 in the NAA

Numbers 31 in the NASB

Numbers 31 in the NBLA

Numbers 31 in the NBS

Numbers 31 in the NBVTP

Numbers 31 in the NET2

Numbers 31 in the NIV11

Numbers 31 in the NNT

Numbers 31 in the NNT2

Numbers 31 in the NNT3

Numbers 31 in the PDDPT

Numbers 31 in the PFNT

Numbers 31 in the RMNT

Numbers 31 in the SBIAS

Numbers 31 in the SBIBS

Numbers 31 in the SBIBS2

Numbers 31 in the SBICS

Numbers 31 in the SBIDS

Numbers 31 in the SBIGS

Numbers 31 in the SBIHS

Numbers 31 in the SBIIS

Numbers 31 in the SBIIS2

Numbers 31 in the SBIIS3

Numbers 31 in the SBIKS

Numbers 31 in the SBIKS2

Numbers 31 in the SBIMS

Numbers 31 in the SBIOS

Numbers 31 in the SBIPS

Numbers 31 in the SBISS

Numbers 31 in the SBITS

Numbers 31 in the SBITS2

Numbers 31 in the SBITS3

Numbers 31 in the SBITS4

Numbers 31 in the SBIUS

Numbers 31 in the SBIVS

Numbers 31 in the SBT

Numbers 31 in the SBT1E

Numbers 31 in the SCHL

Numbers 31 in the SNT

Numbers 31 in the SUSU

Numbers 31 in the SUSU2

Numbers 31 in the SYNO

Numbers 31 in the TBIAOTANT

Numbers 31 in the TBT1E

Numbers 31 in the TBT1E2

Numbers 31 in the TFTIP

Numbers 31 in the TFTU

Numbers 31 in the TGNTATF3T

Numbers 31 in the THAI

Numbers 31 in the TNFD

Numbers 31 in the TNT

Numbers 31 in the TNTIK

Numbers 31 in the TNTIL

Numbers 31 in the TNTIN

Numbers 31 in the TNTIP

Numbers 31 in the TNTIZ

Numbers 31 in the TOMA

Numbers 31 in the TTENT

Numbers 31 in the UBG

Numbers 31 in the UGV

Numbers 31 in the UGV2

Numbers 31 in the UGV3

Numbers 31 in the VBL

Numbers 31 in the VDCC

Numbers 31 in the YALU

Numbers 31 in the YAPE

Numbers 31 in the YBVTP

Numbers 31 in the ZBP