Numbers 35 (BOICB)

1 Nʼoge a, mgbe ndị Izrel ka nọ nʼakụkụ osimiri Jọdan nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu Jeriko, ka ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha nye ndị Livayị ụfọdụ obodo ebe ha ga-ebi. Obodo ndị a ga-abụ ndị si nʼihe nketa ndị Izrel ketara. Nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ na-akpa nri, nke ga-agba obodo ndị a gburugburu. 3 Obodo ndị a ga-abụrụ ha ebe obibi, ma ala niile gbara ha gburugburu ga-abụ ebe ịta nri nke igwe ehi na atụrụ, na anụ ụlọ ha niile. 4 “Ala ebe ịta nri nke obodo niile nke unu ga-enye ndị Livayị ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼogologo site na mgbidi obodo ga gburugburu mgbidi obodo ọbụla. 5 Ya mere nʼobodo ndị Livayị ọbụla, ala ịzụ anụ ụlọ ga-adị narị mita anọ na ọkara site na mgbidi ha ruo nʼoke ala ha. Ọ ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ugwu, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ndịda. Obodo ha ga-adịkwa nʼetiti ala ịzụ anụ ụlọ ndị a. 6 “Obodo isii nʼime obodo ndị ahụ unu na-enye ndị Livayị ga-abụ obodo mgbaba, ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama nwere ike gbaga izere ndụ ya. Tinyere obodo ndị a unu ga-enyekwasị ha iri obodo anọ na abụọ ọzọ. 7 Ya mere obodo niile a ga-enye ndị Livayị ga-adị iri obodo anọ na asatọ, tinyere obosara ala ịzụ igwe ewu na atụrụ nke gbara obodo ndị a gburugburu. 8 Obodo unu na-enye ndị Livayị site nʼihe nketa ndị Izrel ga-abụ dịka unu si keta oke unu. A ga-esite nʼaka ebo nwere ọtụtụ obodo wepụta ọtụtụ obodo, ma site nʼaka ebo obodo ha nwere na-ehighị nne wepụta ole na ole.” 9 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 10 “Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan, 11 họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama. 12 Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ, ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ. 13 Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba. 14 Họpụta obodo mgbaba atọ nʼakụkụ ọzọ nke Jọdan. Ka atọ ndị ọzọ dịrị na Kenan. 15 Obodo ndị a agaghị abụ ebe izere ndụ maka naanị ndị Izrel, kama ọ dịkwara ndị ọbịa na ndị ọzọ bi nʼetiti unu, ka onye na-akpachaghị anya gbuo mmadụ gbaga ebe ahụ izere ndụ ya. 16 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ e jiri mkpirisi igwe tigbuo mmadụ ibe ya, a ga-agụ onye dị otu a dịka ogbu mmadụ. A ga-egbukwa ya. 17 A sịkwa na mmadụ ejide nʼaka ya nkume nke o nwere ike iji tugbuo mmadụ, ọ bụrụ na ọ tụọ mmadụ nkume ahụ tugbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. Ogbu mmadụ ahụ aghakwaghị ịnwụ. 18 A sikwa na mmadụ ji ihe e ji osisi tụọ nʼaka ya, nke o nwere ike i ji tigbuo mmadụ, ọ bụrụ na o tie mmadụ ihe osisi ahụ, tigbuo ya, ọ bụ ogbu mmadụ. A ghaghị ime ka ogbu mmadụ ahụ nwụọ. 19 Onye na-abọ ọbọ ọbara ga-egbu ogbu mmadụ ahụ nʼonwe ya mgbe ọbụla o zutere ya. 20 Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼekworo nuo onye ọzọ aka, maọbụ kpachara anya tụọ onye ahụ ihe nke mere ka ọ nwụọ, 21 maọbụ na o sitere nʼobi ọnụma jiri aka ya tie mmadụ ihe nke mere ka ọ nwụọ, a ga-egbu onye ahụ, nʼihi na ogbu mmadụ ka ọ bụ. Onye na-agwachite ọchụ ga-egbu ogbu mmadụ ahụ mgbe ọbụla o zutere ya. 22 “ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ ebughị iro nʼobi nutuo mmadụ ibe ya na mberede, maọbụ tụọ ya ihe, 23 maọbụ tụtuo nkume nke datara dagbuo mmadụ ibe ya mgbe ọ na-ahụghị ya, bụ onye na-abụghị onye iro ya, onye ọ na-ebughị nʼobi imejọ, 24 mgbe ahụ, ndị ọgbakọ ga-ekpe ikpe nʼetiti onye e boro ebubo na onye na-agwachite ọchụ dịka usoro iwu ndị a si dị. 25 Nzukọ aghaghị ichekwa onye e boro ebubo na o gburu mmadụ site nʼaka onye na-agwachite ọchụ, zilaga onye ahụ e boro ebubo nʼobodo mgbaba, bụ ebe ha gbalagara. Onye ahụ e boro ebubo ga-anọgide nʼobodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ, bụ onye ahụ e tere mmanụ nsọ. 26 “ ‘Ma ọ bụrụ na ogbu mmadụ a ahapụ obodo mgbaba ahụ pụọ, ọ bụrụkwa, 27 na onye ahụ na-abọ ọbọ ọbara achọta ya nʼazụ obodo mgbaba ahụ, o nwere ike igbu onye ahụ e boro ebubo, ikpe igbu mmadụ agaghị ama ya. 28 Onye ahụ e boro ebubo na o gburu mmadụ aghaghị ịnọ nʼime obodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ. Ọ bụ naanị mgbe onyeisi nchụaja nwụchara, ka ha nwere ike ịlaghachi nʼụlọ ya, nʼihe nketa ya. 29 “ ‘Ndị a bụ usoro iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ, nʼebe obibi unu niile. 30 “ ‘Onye ọbụla gburu mmadụ ga-anwụ. A ga-ama ya ikpe ọnwụ naanị mgbe e nwere karịa otu onye akaebe. Ọ dịghị onye ọbụla a ga-egbu nʼihi akaebe nke otu onye gbara megide ya. 31 “ ‘Unu a narakwala ihe ịgbara isi nʼọnọdụ ndụ nke onye gburu mmadụ, bụ onye nke ikpe ọnwụ mara. Aghaghị ime ka ha nwụọ. 32 “ ‘Unu a narakwala ihe mgbapụta site nʼaka onye ọbụla nke gbagara nʼobodo mgbaba, site otu a kwere ka ha lọghachite azụ ga biri nʼala nke aka ha tupu onyeisi nchụaja anwụọ. 33 “ ‘Unu emerụkwala ala ahụ nke unu bi nʼime ya. Ọbara igbu ọchụ na-emerụ ala. Ọ dịkwaghị mkpuchi mmehie a ga-eme banyere ala a wufuru ọbara nʼime ya, ma ọ bụghị naanị ọbara nke onye ahụ gburu ọchụ ahụ. 34 Unu emerụla ala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya. Nʼihi na mụ onwe m bikwa nʼebe ahụ, mụ bụ ONYENWE ANYỊ bi nʼetiti ụmụ Izrel.’ ”

In Other Versions

Numbers 35 in the ANGEFD

Numbers 35 in the ANTPNG2D

Numbers 35 in the AS21

Numbers 35 in the BAGH

Numbers 35 in the BBPNG

Numbers 35 in the BBT1E

Numbers 35 in the BDS

Numbers 35 in the BEV

Numbers 35 in the BHAD

Numbers 35 in the BIB

Numbers 35 in the BLPT

Numbers 35 in the BNT

Numbers 35 in the BNTABOOT

Numbers 35 in the BNTLV

Numbers 35 in the BOATCB

Numbers 35 in the BOATCB2

Numbers 35 in the BOBCV

Numbers 35 in the BOCNT

Numbers 35 in the BOECS

Numbers 35 in the BOGWICC

Numbers 35 in the BOHCB

Numbers 35 in the BOHCV

Numbers 35 in the BOHLNT

Numbers 35 in the BOHNTLTAL

Numbers 35 in the BOILNTAP

Numbers 35 in the BOITCV

Numbers 35 in the BOKCV

Numbers 35 in the BOKCV2

Numbers 35 in the BOKHWOG

Numbers 35 in the BOKSSV

Numbers 35 in the BOLCB

Numbers 35 in the BOLCB2

Numbers 35 in the BOMCV

Numbers 35 in the BONAV

Numbers 35 in the BONCB

Numbers 35 in the BONLT

Numbers 35 in the BONUT2

Numbers 35 in the BOPLNT

Numbers 35 in the BOSCB

Numbers 35 in the BOSNC

Numbers 35 in the BOTLNT

Numbers 35 in the BOVCB

Numbers 35 in the BOYCB

Numbers 35 in the BPBB

Numbers 35 in the BPH

Numbers 35 in the BSB

Numbers 35 in the CCB

Numbers 35 in the CUV

Numbers 35 in the CUVS

Numbers 35 in the DBT

Numbers 35 in the DGDNT

Numbers 35 in the DHNT

Numbers 35 in the DNT

Numbers 35 in the ELBE

Numbers 35 in the EMTV

Numbers 35 in the ESV

Numbers 35 in the FBV

Numbers 35 in the FEB

Numbers 35 in the GGMNT

Numbers 35 in the GNT

Numbers 35 in the HARY

Numbers 35 in the HNT

Numbers 35 in the IRVA

Numbers 35 in the IRVB

Numbers 35 in the IRVG

Numbers 35 in the IRVH

Numbers 35 in the IRVK

Numbers 35 in the IRVM

Numbers 35 in the IRVM2

Numbers 35 in the IRVO

Numbers 35 in the IRVP

Numbers 35 in the IRVT

Numbers 35 in the IRVT2

Numbers 35 in the IRVU

Numbers 35 in the ISVN

Numbers 35 in the JSNT

Numbers 35 in the KAPI

Numbers 35 in the KBT1ETNIK

Numbers 35 in the KBV

Numbers 35 in the KJV

Numbers 35 in the KNFD

Numbers 35 in the LBA

Numbers 35 in the LBLA

Numbers 35 in the LNT

Numbers 35 in the LSV

Numbers 35 in the MAAL

Numbers 35 in the MBV

Numbers 35 in the MBV2

Numbers 35 in the MHNT

Numbers 35 in the MKNFD

Numbers 35 in the MNG

Numbers 35 in the MNT

Numbers 35 in the MNT2

Numbers 35 in the MRS1T

Numbers 35 in the NAA

Numbers 35 in the NASB

Numbers 35 in the NBLA

Numbers 35 in the NBS

Numbers 35 in the NBVTP

Numbers 35 in the NET2

Numbers 35 in the NIV11

Numbers 35 in the NNT

Numbers 35 in the NNT2

Numbers 35 in the NNT3

Numbers 35 in the PDDPT

Numbers 35 in the PFNT

Numbers 35 in the RMNT

Numbers 35 in the SBIAS

Numbers 35 in the SBIBS

Numbers 35 in the SBIBS2

Numbers 35 in the SBICS

Numbers 35 in the SBIDS

Numbers 35 in the SBIGS

Numbers 35 in the SBIHS

Numbers 35 in the SBIIS

Numbers 35 in the SBIIS2

Numbers 35 in the SBIIS3

Numbers 35 in the SBIKS

Numbers 35 in the SBIKS2

Numbers 35 in the SBIMS

Numbers 35 in the SBIOS

Numbers 35 in the SBIPS

Numbers 35 in the SBISS

Numbers 35 in the SBITS

Numbers 35 in the SBITS2

Numbers 35 in the SBITS3

Numbers 35 in the SBITS4

Numbers 35 in the SBIUS

Numbers 35 in the SBIVS

Numbers 35 in the SBT

Numbers 35 in the SBT1E

Numbers 35 in the SCHL

Numbers 35 in the SNT

Numbers 35 in the SUSU

Numbers 35 in the SUSU2

Numbers 35 in the SYNO

Numbers 35 in the TBIAOTANT

Numbers 35 in the TBT1E

Numbers 35 in the TBT1E2

Numbers 35 in the TFTIP

Numbers 35 in the TFTU

Numbers 35 in the TGNTATF3T

Numbers 35 in the THAI

Numbers 35 in the TNFD

Numbers 35 in the TNT

Numbers 35 in the TNTIK

Numbers 35 in the TNTIL

Numbers 35 in the TNTIN

Numbers 35 in the TNTIP

Numbers 35 in the TNTIZ

Numbers 35 in the TOMA

Numbers 35 in the TTENT

Numbers 35 in the UBG

Numbers 35 in the UGV

Numbers 35 in the UGV2

Numbers 35 in the UGV3

Numbers 35 in the VBL

Numbers 35 in the VDCC

Numbers 35 in the YALU

Numbers 35 in the YAPE

Numbers 35 in the YBVTP

Numbers 35 in the ZBP